Matiu 20:1-16

Lesson 183 - Senior

Memory Verse
“Ya mere, ganu, me madu nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptizim bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: nēzi ha ka ha debe ihe nile ka ha ra, bù nke M’nyere unu n’iwu; ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile rue ọgwugwu oge a” (Matiu 28:19, 20).
Cross References

I Igo Ndịọlụ Nke Nna Nweụlọ Goro

1. Enwere mkwekọrịta banyere ihe aga akwụ ndị egoro ọlụ n’isi ụtụtụ, Matiu 20:1, 2

2. Ndị nke abụọ, bụ ndị egoro ọlụ, ka ekwere mkwà ịkwụ ụgwọọlụ ziriezi, Matiu 20:3, 4

3. Ndị nke atọ na nke anọ ka ekwe kwara otù mkwà ahụ, Matiu 20:5

4. Ndị nke ise ka ekwe kwara otù mkwà ahụ, bụ ndị akpọrọ n’oge hour nke irinaotù nke ụbọchị ahụ, Matiu 20:6, 7

II Ụgwọọlụ Akwurụ Mgbe O Ruru Anyasị

1. Agwara onyeozi ahụ ka ọ kwụọ ndịọlụ ahụ otù shilling, otù shilling malite ná ndị egoro ọlụ n’ikpéazụ, Matiu 20:8, 9; 19:30; 21;31; Luk 13:30

2. Ndị bụ ụzọ tamuru ntamù n’ihi na akwụghị ha ụgwọọlụ karịrị nke ndị ahụ lụrụ ọlụ náánị otù hour, Matiu 20:10-12

3. Ọ bụghị dịka mmadụ si agbakọ urù ijéozi anyị ka Chineke si agbakọ ya, Matiu 20:13-15; I Ndi Kọrint 4:2

4. Ndịozi ndị natara ụgwọọlụ ha dịka iwu Chineke si dị natara ụgwọ ihe ha lụtara dịka ịdịmma ihe ha lụrụ si dị, ọ bụchaghị n’ihi ịdị ukwuu nke ihe ha lụrụ, Matiu 20:16; Nkpughe 2:10

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ubivine Niile Nke Chineke Na Ubi Owuweiheubi Dị Icheiche

Nime okwu dị icheiche nke dị na Baịbụl nke Chineke nyere anyị dịka ihe onyinyo iji kọwapụta eziokwu dị omimi n’Akwụkwọ Nsọ bụ ndị ahụ nke gbasara oge ọma ahụ nke náadị nime arọ: bụ oge iwe ihe ubi na ịchịkọta mkpụrụ nke ala n’ọba. Ihe onyinyo ndịa ka enyere iji kuziere anyị ihe banyere owuweiheubi nke ụwa, mgbe agaewe mkpụrụ dị oké ọnụahịa nke ụwa -- bụ ndị agbapụtara n’ọgbọ niile -- ịbà n’Ulo ebighịebi ha.

Chineke agwawo anyị okwu banyere mkpà ikwesị ntụkwasịobi na ige ntị n’iwu Ya niile site n’ilu ahụ banyere ụmụ ndịkom abụọ ahụ ndị agwara ka ha gaa n’ubivine nna ha. Otù nime ha kwere na ya gaeje, ma o jeghị; ma nke ọzọ sịrị, na ya agaghị eje, emesịa o jee.

Chineke agwawo anyị n’ilu ahụ banyere nnanwe ụlọ ahụ nke nyefere onyeọlụ ubi vine ya, gwa kwa anyị banyere ikpé nke nke ikpeazụ ahụ nke gaje ịbịakwasị ndị niile jụrụ Ọkpara Ya bụ Jisọs Kraist. Ndị ọlụubi ndịa jụrụ inye ndị orù nke nnanwe ụlọ ahụ mkpụrụ ahụ ndị nke kwesịrị ịbụ nke Ya; ma mgbe náánị otù nwa ahụ, onye nketa bịara n’ikpeazụ ịnata ya, ha wee gbue Ya.

Chineke ekwuwo n’ebe dị icheiche na Baịbụl, banyere ọlụ nke ịgbasa Oziọma dịka ọlụ nke owuwe iheubi (Matiu 9:37; Luk 10:2; Jọn 4:35, 36; Ndi Galetia 6:9). N’iheọmụmụ a Ọ kụziworo anyị eziokwu di omimi site n’iji ihe onyinyo nke ndikom egoro ọlụ nime ubi owuwe iheubi ahụ bụ ndị akwụkwara ụgwọọlụ mgbe o ruru anyasị dịka esi kwekọrịta mgbe ha naaga ọlụ n’ubi ahụ. anyị pụrụ ịhụ na ilu a naekwu ihe banyere ọlụ nke ịgbasa Oziọma n’oge Agba Ọhụụ nka.

Ọlụ Nke Mmụọ Nsọ Nime Ụwa

Nime Agba Ochie Chineke nyefere mba Israel ubi vine Ya n’aka, were Ịgbandụ jikọta ha na Onweya ka ha wee bụrụ mba dị nsọ, ndị nke aka Ya, ọgbọ ndị nchụàjà -- ndịozi nke Ọgbụgbandụ Ebighịebi – iwetara ụwa niile ozi nke Oziọma (Ọpupu 19:3-6; Deuteronomi 5;2, 3). Anyị ahụworị otù ha si daa n’ebe ọ dị nwuta n’ọkpụkpọ ha, laghachị azụ, ma mebie kwa, Ọgbụgbandụ nke ha na Chineke gbara; n’ikpeazụ ha wee gbue otù Ọkpara Chineke nke ezitere ha náánị. Ọgbọ Ọhụụ a Mmụọ Nsọ Onweya naalụsị nnọọ ọlụ nke “ubi-vine” ahụ ike, n’ihi na Ọ bụ Ya naatụ ụwa “nmehie, na eziomume na ikpe n’anya.”

Ma agaghị eche na nka bụ oge mbụ nke Mmụọ naalụ ọlụ n’ụwa, n’ihi na mgbe Chineke hụrụ na ajọomume niile nke mmadụ di ukwuu, n’oge Noa, Ọ sịrị, “Mọm agagh achi achi nime madu” (Jenesis 6:3). Anyị gaesite na nke a hụ na Mmụọ Nsọ nọrị náagba mgbá nime mmadụ, náatụ ha mmehie ha n’anya, náachọ iwerute ha rue nchègharị . Onye dere Abù Ọma ghọta kwara urù nke Mmụọ Nsọ bara na óké ịda mbà nke mmụọ gaeso ma anapụ ya Nnọnye ahụ nke Dị Nsọ n’ihi na ọ sịrị “Atupulam n’iru Gi; anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi” (Abù Ọma 51:11). Ọ bụ Mmụọ nke Chineke bụ onye ya na ụmụ Israel yikọrọ jee ijè, naatụziri ha aka, naachọ kwa idubà ha n’izu òkè niile nke dị n’ụzọ Chineke; ọ bụ kwa Mmụọ Nsọ ka ha mejọrọ mgbe ha nupụrụ isi wee chee iru n’ụzọ niile nke ka ha (Nehemaia 9:20; Aisaia 63:10, 11).

N’otù ụzọ n’Ọgbọ Ọhụụ a anyị nwere ike ikwu na Mmụọ Nsọ bụ onyeozízí ikuru anyị bịakute Kraist. N’Ọgbọ Ochie Iwu ahụ bụrụ ndị Ju onyeozízí ikuru ha bịakute Kraist, ka ha wee duru ụwa mmehie bịakute Ya. N’ụzọ ụfọdụ Iwu ahụ enyere n’Ugwu Sainai ka dị kwa irè n’ihi nke a, n’ihi na ọtụtụ mmadụ naesite na ya nwee nghọta na nzọpụta dị ha mkpà ya na mgbapụta nke sitere na Kraist. Ma, n’ezie emezuwo Iwu ahụ nime Kraist ná mpụtaìhè Ya n’ụdị mmadụ; esitekwara n’ọnwụ Kraist mezue ịchụàjà niile di icheiche nke ememe òfùfè ha, ma site kwa ná ndụ Ya na òzízí Ya niile mezue iwu dị icheiche na ụkpụrụ ahụ niile.

Anyị ndị bi n’Oge nke Oziọma nke a nwere oghere pụrụ iche ịnata Mmụọ Nsọ ahụ n’ụzọ ka ukwuu karia ndị nsọ nke Agba Ochie. N’ihi nka anyị nwere ike ịhụ na ọ bụghị náánị na Mmụọ Nsọ Onweya naagagharị n’ụwa naatụ ụmụ mmadụ mmehie ha na ajọ omume ha n’anya nke ukwuu n’ụzọ ra otú O si alụsi ọlụ ike taa, kama Ọ nọ kwa naemeso ụwa mmehie site ná ndị nke Kraist ndị nataworo Ya n’uju nime obi ha -- bụ ndị enwereike ikwu banyere ha sị na emejuwo ha nnọọ na Mmụọ Nsọ na Nwanyị ahụ anaalụ Ọhụụ nke Kraist bụ ụzọ nke Chineke si eme ka ozi ịkpọòkù Ya rute ndị mmehie niile taa (Nkpughe 22:17).

Ọlụ Onye Kraist Nime Ụwa

Ya mere, enwere ọtụtụ dị ukwuu nke Mmụọ Nsọ nime ọlụ niile nke Chineke n’ebe mmadụ nọ nime ọgbọ a, nke a pụtara ìhè n’okwu nke Jisọs, onye kwuru sị na Mmụọ Nsọ agaghị abia rue mgbe Ya rịgosịrị n’Eluigwe. Mmụọ Nsọ rịdatara mgbe ụbọchị iri gasịrị site mgbe Jisọs rịgoro n’eluigwe, wee mejue ndị náesoụzọ ya ndị nọ kwa náechere n’ụlọ elu ahụ nke dị na Jerusalem. Anyị naekele kwa Chineke na Ọ naeme kwa otú a taa.

Anyị ahụwo na n’ọgbọ nke garaaga, “nna-nwe-ulo” ahụ -- nyefere nlekọta nke ubivine ahụ n’aka ndịọzọ; ma n’Ọgbọ Ọhụụ a anyị hụrụ na Ya na Ọkpara Ya Jisọs Kraist, site n’inye aka nke Mmụọ Nsọ, ji nnọọ aka ha náalụsị ọlụ ike ịkpọbata mkpụrụobi n’alaeze bụ ndị ahụ naachọsi ike ịbụ otù nime ndị òtù nke Nzukọ ahụ nke ana adịghị ahụ anya -- bụ Nwunye Ọhụụ nke Kraist. Ọ dị ọtụtụ mmadụ taa ndị náaeguzo náalụghị ọlụ, ọ bụ kwa ndịa ka Chineke naakpọ òkù, náarịọ ha ka ha bịa lụọọlụ n’ubivine Ya náagwa ha maka ịdị mkpụmkpụ nke oge na ụkọ nke ndịọlụ. Ọ naaga n’iru n’ọlụ a ọbụná rue ọgwụgwụ -- rue n’oge hour nke iri na otù nke ụbọchị ahụ -- ka enwee ike ịchịkọbata ka ha ra bụ ihe ubi dị óké ọnụahịa enwereike ịchịkọta ka ha gbanarị mbibi gaabịakwasị ha n’ọgwụgwụ nke ndụ ha.

Chineke chere ndị Mba ọzọ iru mgbe ndị Ju jụrụ Ya, ma ọ dịghị mgbe ọ bụla Ya na mba ọ bụla n’etiti ndị Mba ọzọ gbara ndụ -- dịka otù mba -- dịka nke Ya na ndị Israel mere! Ọ dịbeghị mgbe Ọ gwara ha dịka otù mba, ka ha bụrụ ọgbọ ndị nchụàjà, na mba dị nsọ, maọbụ ihe nke aka Ya! Ma ka ha ra bụ ndị zaworo òkù ijéozi ahụ n’ubi vine Ya ka enyeworo ike n’ụzọ dị ebube, n’ihi na ha batara n’okpurù ihe niile jikọtara àtụmààtụ Ọgbụgbandụ Ebighịebi ahụ nke Ya na Abraham gbara, ndịa nọkwa ugbu a náejezue ozi nke ịgbasa Oziọma ahụ.

Mgbe Onyenweanyị zipụrụ ndị ozi iri asaa ahụ, abụọ, Ọ sịrị “Owuwe-ihe-ubi riri nne n’ezie, ma ndi-ọlu di ole na ole: ya mere, nāriọnu onye nwe owuwe-ihe-ubi ahu ka O zipu ndi ọlu ba n’owuwe-ihe-ubi-Ya” (Luk 10:2). Mgbe nnanwe ụlọ hụrụ ndikom ahụ ka ha naeguzo n’ọma ahịa naalụghị ọlụ, Ọ sịrị, “gini mere unu guzoro n’ebe a ubọchi dum nālugh ọlu?”

Anyị nwere ike iwu na anyị naebi ndụ n’ụbọchị ikpeazụ nke ọgbọ a, mgbe owuwe iheubi riri nne n’ezie, ma ndị ọlụ dị olenaole. Ọ dighị ọnọdụ dịrị mmadụ ịnodụ naalughị ọlụ n’óké ubi vine nke Onyenweanyị, n’oge ahụ maọbụ ugbu a. Ụwa bụ ubi vine ya onye ọ bụla nke Ọ kpọrọ ka Ọ naakpọ ka o wee jee lụọ ọlụ n’ubi vine Onyenweanyị ma ghara kwa ịlaghachị azụ dịka ndị Ju mere n’ọgbọ garaaga.

Akpọghị onye Kraist ka ọ kụkụba aka, “inọ ju na Zaiọn.” Anyị agaghị ekwe ka “ike gwu ayị n’ime ihe ọma.” “Ọtutu ka akpọworo ma ole-na-ole ka arọputara,” n’ihi na ha adịghị aza òkù ahụ wee jee lụara Onyenweanyị ọlụ. Onye ọ bụla amụbatara n’Alaeze nke Eluigwe bụ nnọọ onye ọlụ n’otù ụzọ. Ọ dịghị onye agụpụrụ!

Ụgwọọlụ Nke Onye Kraist N’ihi Ọlụ

Ọ dị ugwọọlụ dịrị ijéozi n’ikwesi ntụkwasịobi. Jisọs agwawo anyị n’ebe ọzọ banyere ọlụ dị icheiche nke agaenye n’alaeze nke Ọchịchị Puku Arọ, dịka ọtụtụ nke ikwesị ntụkwasịobi anyị n’ijéozi nke ubi vine Alaeze Ya n’ebe a si dị n’oge dị ugbu a. Agwakwara anyị na aga enye anyị ụgwọọlụ dị icheiche, n’ihi na Baịbụl naekwu ma ndị náeme ọra mmadụ ka ha ghọọ ndị eziomume ga náamụ kwa “dika kpakpando rue mgbe nile ebigh-ebi,” na agaenye kwa ụgwọọlụ n’ihi “nání iko miri oyi” enyere “n’aha onye nēso uzọm,” ya na ụgwọọlụ nke onyeamụma nke agaenye onye ahụ nke náanabata onye nke Chineke, ya na ụgwọọlụ onye eziomume nke agaenye n’ihi ijere onye eziomume ozi (Matiu 10:41, 42).

Ma ụzọ nke Chineke abụghị ụzọ nke mmadụ. N’ilu a anyị jụrụ na nnanweụlọ kwụrụ ndịọlụ ahụ ụgwọ mgbe o ruru anyasị, “malite site ná ndị ikpeazu rue ndị bu uzọ.” Ọ maliteghị ná ndị bu ụzọ; kama Ọ malitere ná ndị ahụ jere n’ubi vine n’oge hour nke irinaotù. Nka bu nnọọ ihe onyinyo maramma nke naegosi ụzọ Chineke gaeji kwughachị ndị ozi Ya ụgwọọlụ. Baịbụl naagwa anyị na ọ dị ndị bu ụzọ nke gaabụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ dị ndị gaabụ kwa ndị bu ụzọ.

Lee ka o si bụrụ ihe nkasiobi ịmata na ndị ahụ anaenyeghị oghere ahụ dị ebube ijéozi n’ubi vine Chineke rue n’oge hour nke irinaotù agaghị enwe ntaramaahụhụ n’ihi nka, ọ bụrụ na ha gosịrị ikwesị ntụkwasịobi mgbe ọkpụkpọòkù nke Chineke bịara ha! Ụfọdụ nime anyị enwewo oghere ijére Chineke ozi ọtụtụ arọ, anyị enwewo kwa ọñụ ma keta kwa urù n’oge ọ bụla nke ijéozi a. nke ahụ, n’onweya, bụ ụgwọolụ riri nne n’ihi ijéozi anyị, n’ihi na ọ bụ nnọọ oghere dị ebube bụ imere Chineke ihe ọ bụla, ọbụná ma asị na ọ bụ ihe ahụ nke ụwa naagụ n’ozi eledara anya. Ma mgbe ụbọchị ahụ gaabịa mgbe Chineke gaenye ụgwọọlụ ebighịebi, anyị gaahụ ka anaenye ndị ahụ niile mere ihe Chineke naachọ otù ụgwọọlụ ebighịebi ahụ, ọ bụ ezie na ha jere ozi náánị nwa oge ntà. Ọ bụ ezie na nke a abụghị dịka ụzọ nke mmadụ si dị; ma ọ bụ ụzọ nke Chineke. Ọ bụ kwa ụzọ ziriezi!

Ndị náenwe ndịọlụ nke ụwa a naatụ ụgwọọlụ onyeọlụ dịka oge o ji lụọọlụ ra na otú ihe nke ọ lụpụtara ra. Nke a ziri nnọọ ezi iji tụọ ụgwọọlụ nke ruru ọlụ anaalụ n’ụwa ebe ndị ji ike ha etinye kwa uchu n’ọlụ ha kwesịrị ka enye ha ihe ruru ha n’ihi ike ha tinyeworo ya na oge ha jiworo lụọọlụ ha. Aga akwụ ndị ọlụ nke Chineke ụgwọọlụ, ọ bụchaghị iri nne nke ọlụ ha lụrụ, maobụ dịka ọtụtụ oge ha jiworo lụọọlụ ma eleghịanya, kama ị bụ dịka ịmamma nke ọlụ ha lụụrụ Chineke. Ụfọdụ nime ihe ndị náekpebi ụdị ịmamma nke ọlụ anyị bụ ihe ndịa:

Ikwesị Ntụkwasịobi anyị nye Chineke nye kwa ọlụ Ya gaabụ isi ihe mbụ, náagbaghị agụgọ, nime ihe ndị ahụ náekpebi ụdị ijéozi anyị. Ọtụtụ naamalite, ma ọ bụ náánị olenaole naeru n’ọgwụgwụ. Ụfọdụ naenwe ọñụ n’imere Chineke ihe mgbe ọ malitere ma dị kwa ọhụụ, mgbe ọ naakpalite mmụọ ha n’ihi mmasị ha nwere na ya. Ma onye gaanata ụgwọọlụ nke eluigwe bụ onye ahụ nke gaanọgide n’ọlụ mgbe ịdị ọhụụ ya n’anya gwurụ, mgbe ọ malitere ịbụrụ ụfọdụ ndịọzọ ibu arọ, maọbụ mgbe ndị ka n’ọnụọgụgụ tụfuworo mmasị ha nwere kpamkpam. Onyeọlụ kwesịrị ntụkwasịobi gaabịarute n’oge kwesịrị ma bụrụ kwa otù nime ndị ikpeazụ gaala, náanọgide n’ọlụ ahụ rue mgbe ọ gwụsịrị. Agaghị agwa ya agwa ka o mee nke a kama ọ gaejikere ime nke a ma were kwa ọñụ mee ya.

Ebumn’obi (Nzube) anyị n’ozi anyị naejere Chineke bụ otù ihe ukwu ọzọ náekpebi ụdị ọlụ alaeze anyị naalụ. Ànyị naeme ihe anyị naeme n’ihi otuto nke Chineke náánị? Ka ọ bụ na ànyị naeme ya n’ihi ojujuafọ nke onweanyị? n’ihi otuto nke onweanyị? kaọbụ ka mmadụ hụ anyị? ka ọ bụ dịka ụzọ ịnata amara n’aka mmadụ? Ná nkenke okwu, èmere ya ime ihe gaatọ anyị onweanyị ụtọ n’ụzọ ọ bụla? Ọ dịghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ebumn’obi kachasị ọcha gaalụpụta ụdị ịmamma achọrọ maka ụgwọọlụ ebighịebi!

Otú (maọbụ ụzọ) anyị si alụọlụ bụ kwa ihe dị ukwu nke anaeji ekpebi. Ànyị naeme ihe anyị naeme ná mmanye? Ka ànaeme ya site n’ezi ịhụn’anya nke Chineke na n’ihi mkpụrụobi ụmụmmadụ? Ọ dị enweghị njikere dị n’obi anyị, na kwa n’omume anyị n’ebe ndị anyị na ha naalụkọ ọlụ, banyere akụkụ ọ bụla nke ọlụ ahụ? Ànyị bụ ndị náenweghị ntachịobi ná mkpà dị icheiche nke akpọrọ anyị izute? Ànyị dị ka ndị ọlụ ahụ nke lụzuru ọlụ ha n’ụbọchị nke dị n’ilu ahụ, ndị tamuru ntamù megide mkpebi nke onyenweubi ahụ ịkwụ ndị malitere ọlụ n’oge hour nke irinaotù otù ụgwọọlụ ahụ dịka ndị ahụ nke lụrụọlụ n’ụbọchị ahụ dum? Ọ dị ihe ọ bụla nke dị nime anyị nke náadịghị dịka mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ si dị?

Chineke chọrọ ihe kachasị mma nke dị nime anyị. Ihe nke náesote ihe kachasị mma ná ndụ anyị agaghị eju Ya afọ. O nyere ihe Ya niile O nwere n’ihi anyị! Anyị aghaghị inye Ya ihe anyị niile! Ma mgbe anyị mesịrị ihe niile ndịa agwaworo anyị ime, anyị gaasị, ma ọ bụrụ na anyị kwesịrị ụgwọọlụ: “Ayi bu ndi orù nābagh n’ihe: ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime” (Luk 17:10).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kọọ banyere ilu nke Ndị ahụ egoro ọlụ n’Ubivine ahụ site
  2. ná mmalite nke ọlụ ha rue mgbe ha lụsịrị ọlụ nke ụbọchị ahụ.
  3. Òlee ndị eburu ụzọ kwụọ ụgwọ?
  4. Òlee ụdị omume ndị eburu ụzọ goo ọlụ mesoro ndị bịara n’ikpeazụ?
  5. Omume ha ò ziriezi? Nnanweụlọ ahụ ò mejọrọ ha?
  6. N’ụzọ dị añaa ka mgbakọ urù nke Chineke maka ijéozi anyị nye Ya ji dị iche na nke mmadụ?
  7. Kpọọ aha ihe ụfọdụ gaekpebi ịdị mma nke ọlụ anyị.
  8. Ì nwere ike ịkpọ aha ihe ụfọdụ ọzọ nke anaakpọtụbeghị aha n’iheọmụmụ a?
  9. Ná anwanụ onweunu, were kwa ekpere na nleruanya tụlee
  10. ozi ị náejere Chineke ma ọ ga agafe kwa ule nnyocha nke Chineke.