Matiu 20:22-28; Jemes 4:1-3

Lesson 184 - Senior

Memory Verse
“Unu nāriọ aririọ, ma unu adigh anata ihe, n’ihi na unu nāriọ n’obi ọjọ, ka unu we mefu ya n’ihe-utọ nile unu” (Jemes 4:3).
Cross References

I Otù Ekpere Náenweghị Amamihe

1. Nne Jemes na Jọn ji otù arịrịọ bịakute Jisọs, náakpọ isiala nye Ya, Matiu 20:20

2. Ọ rịọrọ ka ụmụ ya ndịkom abụọ nọdụ n’akụkụ Jisọs n’Alaeze Ya, Matiu 20:21

3. Ibuagha na ịlụọgụ naabịa site n’agụụ nke anụarụ, Jemes 4:1, 2; Ndi Rom 7:23; Ndi Galetia 5:17; I Pita 2:11

4. Ọtụtụ ekpere ka anaadịghị aza n’ihi ọchịchọ nke náezighị ezi, Jemes 4:3; Abù Ọma 66:18

II Ụgwọọlụ Dịka Ọlụ Si Dị

1. Jisọs zaghachịrị arịrịọ ahụ site n’ịjụ ma ha jikere iso Ya, Matiu 20:22; 12:50; Mak 14:34

2. Ọ gwara ha ihe ha gaatụ anya ya ịnwapụta, na ebe mbulielu naesi abịa, Matiu 20:23; 19:28; 25:34

III Ijéozi Nke Kraist

1. Jisọs kọwara ihe dị iche n’etiti ọnọdụ nke ọchịchị alaeze nke ụwa na Alaeze nke Eluigwe, Matiu 20:25-27; 23:11; I Pita 5:3

2. Ọ bịara dịka orù, ijéozi na inye ndụ Ya ka ọ bụrụ ihe iji kwụọ ụgwọ mmehie n’ihi ọtụtụ mmadụ, Matiu 20:28; Aisaia 53:10, 11; Jọn 11:51, 52; 13:4; Ndi Filipai 2:7; I Timọti 2:6; Taitọs 2:14

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Iheọmụmụ anyị malitere site n’ịkọ banyere otù nne ụmụ Zebedi si bịakute Jisọs ya na ụmụ ya, Jemes na Jọn, náakpọ isiala nye Jisọs. Ọ dịchasị ka ịkpọ isiala ya abụghị náánị inye Jisọs otuto kama ọ karịrị n’ụzọ nke ịrịọ Ya arịrịọ. N’ịmara nke a, Jisọs wee jụọ ya sị, “Gini ka I nāchọ?” ọ zara sị: “Kwue ka umum ndikom abua ndia nọdu, otù n’aka-nri-Gi, otù n’aka-ekpe-Gi, n’ala-eze-Gi.” Anyị gaahụ na nke a bụ arịrịọ nke óké ọchịchọ nke, náenweghị ihe ịgbaagụgọ, ọ bụ ụmụ ndịkom abụọ ahụ kpalitere ya.

Ọchịchọ Dị Elu Nke Onweonye

Ebumn’uche nnenanna anyị ha n’ebe anyị nọ, na ọchịchọ nke onweanyị, ekwesịghị ịbụ ihemkwalite na ike nke ndụ anyị. Nzube na agụụ obi anyị ekwesịghị ịbụ nke gaatụkwasị uche n’Oziọma gaebuli anyị n’elu ugwu, maọbụ ime ka anyị dị elu karịa ndị ibe anyị. Jisọs kwuru n’otù oge sị, “Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n’ala, M’gādọrọ kwa madu nile nye Onwem.” Nzube nke Oziọma bụ ka ebulie Jisọs elu, ka ewee si otú a dọrọ mmadụ niile nye Ya. Ọ bụrụ na anyị naagbalịsi ike ịhụ na Oziọma buliri anyị elu tinye anyị n’ọnọdụ dị elu nke ukwu, anyị nọ ebe dị anya nke ukwu site n’ebe àtụmààtụ Chineke dị nye anyị. Pọl sịrị, “Ma Chineke ekwela ka m’nya isi, ma-ọbugh n’obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke siteworo na ya kpọgide uwa n’ebe m’nọ, kpọgide kwa mu onwem n’ebe uwa di” (Ndi Galetia 5:20, 21).

N’oge naadịghị anya, tutu nka emee Jemes, Jọn na Pita ka Jisọs kpọworo gaa n’otù ugwu, ebe ha hụrụ ọnọdụ ebube nke nnwogha nke Jisọs. Eleghịanya nka tọrọ agụ anụarụ nke ka dị nime obi Jemes, na Jọn ụtọ rue ogo nke mere ha ji naeche na Jisọs ebulie ha elu karịa iteghete ndịọzọ ahụ naesoụzọ Ya. Ya mere, Pita bụ náánị onye apụrụ ibuli elu karịa ha, ọzọ kwa eleghịanya ha echewo na ọ bụrụ na ha arịọ arịrịọ a mgbe oge dị, agaenye ha ọnọdụ niile ndị ahụ niile nke obi ha naachọsi ike.

Dịka Ụmụntakịrị

Mgbe ọ bụla ekwensu ji ọchịchọ nke inwe nsọpụrụ gbeba n’obi mmadụ ọ bụla maọbụ nke ịdị elu n’etiti ụmụ mmadụ, o nwetala ihe ọ gaeji malite ịlụ ọlụ n’obi ahụ, ịdọpụ onye ahụ site n’ebe Chineke nọ.

Ọ dịbeghị óké anya tutu nka, mgbe ndị naesoụzọ Ya nwere ndọrọndọrọ n’etiti onweha iji chọpụta onye gaabụ onye dịkasịrị ukwuu n’alaeze nke Eluigwe. Na nzaghachị Ya, Ọ kpọtara otù nwatakirị wee guzo ya n’etiti ha ma sị: “Ọ buru na unu echigharigh, bia di ka umu-ntakiri, unu agagh-abà n’ala-eze elu-igwe ma-ọli. Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n’ala-eze elu-igwe.” Aghaghị ịsacha obi ahụ pụọ n’ọchịchọ niile nke anụarụ, ma ọ bụrụ na anyị gaadị ndụ nke ịtụ egwù Chineke na nke eziomume. Obi ahụ aghaghị inwere onweya dịka nwantakịrị pụọ n’agụ niile nke ọnọdụ dị elu nke ụwa, ịchọ ọnọdụ na ụdị ndụ ahụ nke naachọ otuto nke mmadụ. Ihe ndịa niile abànyewo ka ha wee mebie obi ọtụtụ ndị naesoụzọ Onye Nazaret ahụ ewedaraala mgbe ha kwenyere n’ọnwụnwa nke ekwensu.

Ibuli onweonye elu naeduba ná nnupụisi, ọ bụ nke ahụ wetaara Miriam, nwanne Moses, ekpenta. Ọ gaeweta kwa ekpenta nke ime mmụọ nye mkpụrụobi mmadụ ọ bụla nke gaekwe ka ọ bànyema nọgide kwa nime obi ya. Akwukwọ Nsọ naagwa anyị na anyị ganaadị ndụ mgbe niile “n’akuku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ” (Ndi Rom 12:10).

Ibu Agha Megide Mmụọ Nsọ

Ọchịchọ na agụ niile nke anụarụ naebu agha megide Mmụọ nke Chineke. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụọkụ n’obi na obi eziokwu kpee ekpere, Chineke gaanụrụ ma zaa kwa ekpere anyị, ma ọbụrụ na ọ dịghị ụzọ anyị siri rịọhie. Ọ bụrụ na ọ dịghị otú esiri gbochie ọchịchọ niile nke anụarụ, ha gaeme ka esemokwu, na ibuagha bịa. Ma mgbe anyị naesesị onyeagbataobi anyị okwu, naachọ idebe onweayị n’iru, ibuagha dị otú a (mgbe ụfọdụ naamaghị ama nke anyị) naalụ ọgụ megide mkpụrụobi anyị ọbụná megide kwa Mmụọ nke Chineke. Nwa Chineke aghaghị ime ka ọchịchọ na agụ niile ndịa nwụọ nime ya ozugbo ahụ ha gosipụtara onweha nke ntà.

Ozughị óké ịrịọ ezi ihe, ma anyị aghaghị iji ezi mmụọ na ezinzube naarịọ. “Unu nāriọ aririọ, ma unu adigh-anata ihe, n’ihi na unu nāriọ n’obi ọjọ, ka unu we mefu ya n’ihe-utọ nile unu.” Ọ bụrụ na anyị arịọ n’ụzọ ziriezi, ihe niile anyị naachọ ka agaenye anyị. Ọchịchọ ahụ niile naezighị ezi nke naeweta “ibu-agha na ilu ọgu” gaakwụsị kwa mgbe ahụ.

Ihe Ịma N’ọnyà Nke Gaabịa

Iji gosipụta iheọjọ nke ọchịchọ nke onweonye gaewetara ndụ imemmụọ, Onyenweanyị jiri isiokwu ahụ kwue okwu. Ọ gwara ha na iheịma n’ọnyà aghaghị ịbịa, ma Ọ kpọ kwasịrị ọbubuọnụ nye mmadụ ọ bụla nke iheịma n’ọnyà ndị ahụ gaesi n’aka ya bịa. “Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka ị ma n’ọnyà, wepụ ya, tupu kwa ya n’aru-gi: ọ di gi nma ibà n’ala-eze chineke nēnwe otù anya kari inwe anya kari inwe anya abua atubà gi n’ọku ala-mọ.” Jisọs siri “unu na ibe-unu di kwa n’udo” (Mak 9:50).

Ịdọ isi Oche

Nime otù iheọmụmụ garaaga anyị mụrụ n’otù oge Jisọs hụrụ otù ndị mmadụ ji arọrọ isi ọnọdụ n’oriri, O we sị: “Mgbe ọ bụla madu gākpọ gi n’oriri ọlulu-nwunye, anọdula n’isi ọnọdu; ma elegh anya ọ kpọwori otù onye ka gi ná nsọpuru, onye kpọrọ gị na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mgbe ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu. Ma mgbe ọ bula agākpọ gi ga nọdu n’ọnọdu ikp-azu; ka, mgbe onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyim, rigo n’ọnọdu ka elu: mgbe ahu i gēnwe otuto n’iru ndi nile gi na ha nānọdu ná nri. N’ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu” (Luk 14:7-11).

Ndị ahụ naesoụzọ Ya anaụworị ka Jisọs baara ndị Farisii mba otú ha si na ahụ isi ọnodụ niile n’anya mgbe akpọrọ ha n’oriri,isi oche niile n’ụlọ nzukọ, na ikele ekele n’ọma ahịa niile. Ma lee otú eji were ngwangwa chefue ozízí ọma niile ahụ dị ebube mgbe onweonye weere ọnọdụ dị elu ma mee ka ezi Mmụọ nke Chineke rapụ obi ahụ.

Otù Iko Nke Agaje Ịñụ

Nime ịzaghachị ha arịrịọ ha, Jisọs gwara Jemes na Jọn na ha amataghị ihe ha naarịọ; O wee jụọ ha ma ha pụrụ ịñụ iko ahụ nke Ya onweya gaje ịñụ maọbụ ime baptizim ahụ nke Ya onweya gaje ime -- na egosi na ọtụtụ ahụhụ gaadịrị ha n’ihi ịbụ ndị naesoụzọ Ya. Ha zaghachịrị na ha pụrụ ịñụ otù iko ahụ, ma ndụ han’ọdịn’iru gosipụtara na ha kwuru eziokwu; ma ịnọgidesiike ha bụ náánị site n’amara Chineke. Jemes ka Herod bipụrụ isi, Jọn ka atụbara n’agweetiti Patmọs n’ihi Oziọma; ọzọ akụkọ omen’ala naagwa anyị atụnyere Jọn na ndụ nime ite manụ n’asụgharị asụgharị nke si kwa n’ọkụ, ma Chineke zọnyuru ihe ụfụ nke manụ ọkụ wee napụta ndụ ya.

Anyị nụrụ na Pọl, ka ewee ghara ibuli ya elu gafee ókè n’ihi ọtụtụ mkpughe nke Chineke kpughere ya, enyere ya ogwu n’anuarụ -- mmụọozi nke setan -- ka o wee tie ya aka. Ugbò atọ ka ọ rịọrọ Onyenweanyị ka o wepụ ya ma Onyenweanyị sịrị, “Amaram ezuworo gi: n’ihi na emewo ka ikem zu ókè n’adigh-ike” (II Ndi Kọrint 12:9).

Otù Alaeze Nke Dị Iche

N’alaeze niile nke ụwa, ndị ukwu ha naeme ha dịka ndị nwe ha naachị kwa ha. Ma o kwesịghị ịdị otú a n’Alaeze a nke Jisọs naewu n’obi niile nke ndị naesoụzọ Ya. Jisọs sịrị, “Onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n’etiti unu, ọ gābu orù-unu: dika Nwa nke madu abiagh ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe mgbaputa n’ọnọdụ ọtutu madu.” Ma lee óké mgbapụta nke bụ! Jisọs gosipụtara nweda n’ala Ya mmetụta Ya, mgbe O jere n’elu obe. N’ebe ahụ Ọ tara ahụhụ ma nwụọ kwa n’ọnọdụ anyị, ka anyị, ndị ikpé mara na ndị mmehie, amaraikpé, wee ghara ịkwụ ụgwọ mehie anyị niile. Leenụ ka o si bụrụ ihe dị ọcha, ihe naenweghị ntụpọ, ihe zuruókè ihe dị elu nke ukwuu na nke anaagwagbughị agwagbu bụ Oziọma a dị ebube! “Ndi ume-ala n’obi gānu ya, we ñuria ọñu” (Abù Ọma 34:2).

Ebe Jisọs bịara dịka orù, ka O wee nye ndụ Ya iji kwụọ ụgwọ mgbapụta nke ọtutụ mmadụ, anyị aghaghị echeta na anyị niile gaabụ kwa ndị orù dị obiumuala n’ihi ijé ozi Ya. Anyị matara na anyị aghaghị ijé ijè na nzọụkwụ niile nke Jisọs ma soro kwa keta òkè n’ahụhụ ya niile, mgbe niile anyị naadị ndụ n’eluuwa nka ma ọ bụrụ na anyị gaeyi Ya mgbe anyị gaaga ịnọnyere Ya n’Eluigwe (II Timọti 2:11, 12; I Pita 2:21-23). Ihe eji mara ezi onyeozi bụ na ọ naewere obi ya niile na oge ya dum jeere Chineke ozi ọ naalụsi kwa ọlụ nke Alaeze Chineke ike ugbu a ọ nọ n’elu ụwa n’ebe a. Ụfọdụ emebiela ọnọdụ nke ịbụ onyeozi na oghere ijéozi niile ha nwere, naeche na ebuliri ha onweha akpọrọ ijé ozi elu karịa ndị ahụ akpọrọ ha ka ha bịa jeere ozi. Ọ bụ ezie na o kwesịrị ka enye ndị ahụ naadọgbu onweha n’ọlụ nime ozi ahụ nsọpụrụ okpukpu abụọ (I Timọti 5:17), ma nka abụghị maka iji bulie ma tụkwasị ha n’elu ụlọelu karịsịrị ibe ya elu -- nke ka nke n’anya onweha – mbuli elu dị ukwu dị otú a nke onweonye naemegide iwu Jisọs nyere na ihe nlereanya nke Ya Onweya debeworo.

Dịka anyị maara nke ọma, iheọmụmụ a emewo ka ọchịchọ anuarụ niile nke Jemes na Jọn ịbụ ndịisi kwụsị. ha wee bụrụ ndikom nwere obiumeala nke Chineke, ma bụrụ ndị naadịghị atụ egwù, ha wee gosipụta kwa ikwesị ntụkwasịobi ha n’ọkpụkpọọkù nke akpọrọ ha; n’ihi na n’Oririanyasị ikpeazụ, mgbe Jisọs ñụsịrị n’iko ahụ wee nye ndị naesoụzọ Ya, Ọ sịrị ha, “Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n’ọnwunwam nile; Mu onwem nāgba kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam gbara ndu inyem, ka unu we rie ñu kwa na table nkem n’ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n’oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé” (Luk 22:28-30).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe ibuagha na ịlụ ọgụ si abịa n’etiti ụmụmmadụ?
  2. Òlee mgbe anyị naarịọ n’obi ọjọọ?
  3. Gịnị bụ aha nna Jemes na Jọn?
  4. Gịnị bụ arịrịọ nne ahụ?
  5. Jisọs O kwenyere ná arịrịọ ya?
  6. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ajụjụ ahụ?
  7. Gịnị kpalitere iwe dị ukwuu n’etiti ndị naesoụzọ Ya?
  8. Ònye gaabụ onyeisi n’etiti ha?
  9. Jisọs Ọ bịara ijé ozi kaọbụ ka ejeere Ya ozi?