Lesson 185 - Senior
Memory Verse
“Irem ganēkwu Okwu, dika onye nātughari uche, banyere ezi-omume-Gi, baye-kwa-ra otuto-Gi ogologo ubọchi nile” (Abù Ọma 35:28).Cross References
I Ịnọgidesiike N’Arịrọ Nke Batimiọs Maka Ebere
1. Batimiọs naanọdụ ala n’akụkụ ụzọ náarịọ arịrịọ mgbe Jisọs naagabiga, Mak 10:46; Matiu 20:29-34; Luk 18:35-43
2. Batimọs naeti mkpu maka ebere, Mak 10:47; Luk 18:13
3. Agbalịrị n’efu ime ka o kpuchie ọnụ, Mak 10:48; Ezra 4:4, 5; Nehemaia 4:7-9; Zekaraia 3:1; I Ndi Kọrint 16:9
II Ụgwọọlụ Nke Okwukwe
1. Mgbe Jisọs nụrụ itimkpu ya, zigara ka akpọọ ya, Mak 10:49
2. Batimiọs wụsara uwe ya wee bịakute Jisọs, Mak 10:50; Ndi Hibru 12;1
3. Emere ka ọ hụ ụzọ site n’okwukwe o wee naeso kwa Jisọs, Mak 10:51, 52
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEIjéozi nke Jisọs ji ngwangwa ná abịaru ná mmechi. O wee kpọọ ndị náesoụzọ irinaabụọ ahụ bịakute Ya wee gwa ha na ha gaeje Jerusalem na ọ bụ ebe ahụ ka agaama Ya ikpé ọnwụ wee gbue Ya. Nke ahụ bụ ijé Ya nke ikpéazụ ịgabiga Jeriko. Ude Ya eruwo ebe dị anya, ìgwè mmadụ naeso kwa Ya. Ihe Ya naatọ kwa ọtụtụ mmadụ ụtọ mgbe naadịghị anya, ìgwè madụ gaje itimkpu sị “Onye agọziri agọzi ka Eze nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi bu” (Luk 19:38).
Okwukwe
N’akụkụ ụzọ nke sitere Jeriko garue Jerusalem ka ndị arịrịọ abụọ nọdụrụ ala. Eleghịanya ndịọzọ nọ kwa. Ma mmadụ abụọ ndịa, bụ ndị Matiu 20:30 kọrọ ihe banyere ha nwere okwukwe. Okwukwe bụ ihe ịtụkwasị obi ma dabere kwa na Chineke. Ọ bụ ikwenye na Chineke gaeme ihe O kwuru. Mgbe okwu Chineke sịrị, “Otú nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri” (Joshua 23:10), okwukwe naeme ka mmadụ bilie izute nnù ndikom abụọ na ọgụ iri ahụ. Ọ bụghị náánị okwukwe naeweta ngọzi ahụ, kama ọ bụ otù akụkụ nime ihe niile ana anata n’aka Chineke. Ọ bụ ndarere nke ihe anaele anya. Ọ bụ site n’okwukwe ka ndi mgbe ochie ji lụgbue alaeze, ndinyom wee nata ndị ha ndị nwụrụ anwụ site na mbiliten’ọnwụ. Anaeji okwukwe lụọọlụ site n’itinye ihe ndị ahụ anyị kwere banyere Chineke n’ọlụ.
Obiọmiko
Náánị ụbọchị olenaole fọdụrụ Jisọs ijeru Kalvarị. O rughị iri maịlị abụọ n’etiti Jeriko na Jerusalem. Ma Jisọs gara n’iru n’ijéozi ebere Ya; O nwere obiọmiko rue n’ọgwụgwụ. O tinyeghachirị ntị nke mmaagha Pita bipụrụ n’ogige ahụ, wee zọpụta kwa onye ori ahụ n’elu obe.
Ugbu a, dịka Kraist naarapụ Jeriko, ntị dị nkọ nke Batimọs ahụ kpuru ìsì, nwa Timiọs, nụrụ nzọụkwụ nke ìgwè mmadụ ahụ ndị náabịaru nso. Ka ya na ibè ya nke kpu kwara ìsì dịka ya onweya naanọdụ, ọ bụ ezie na amataaghị ihe banyere onye ọzọ ahụ nkeọma, Batimiọs jụrụ ihe mkpọtụ nke ìgwè mmadụ ahụ nke náabịaru nso pụtara. Olileanya walitere nime obi ya ka ọ naagwa ibe ya ahụ na ọ bụ Jisọs. N’otù ha abụọ wee malite itimkpu, sị, “Onye-nwe-ayị, mere ayi ebere, Nwa Devid’ (Matiu 20:30). Ìgwè mmadụ ahụ wee baara ha mba. Ihe dị n’obi ha bụ: Enyela Onyeòzízí nsọgbu; ka ndịa kpuruìsì ghara ime ka ike gwụsịa Ya. Ma Nwa Devid nwere obi ebere n’ebe ha nọ.
Ịnọ Jụụ
Ìgwè mmadụ ahụ hà asịwo gị: “Nọdụ jii, ọ baghị úrù”; “Ị ka bụ nnọọ nwata”; “Ị na-etufu ndụ-gị”; “Ọ dighị mkpà ikpe ekpere rue otú ahụ”; “O kwesịghị ime ngwa ngwa”; “Ị na-eme onwe-gị onye-nzuzu”? Egela ìgwè mmadụ ahụ ntị. Jesoo Ya. O nwere obiọmiko – O juru n’ebere. Obodo Nineve niile tikuru Chineke mkpu nke ukwuu, O wee naputa obodo ha. Hezekaia kwara ákwá dị ilu, Chineke wee tụkwasị arọ irinaise n’elu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ekwensu gaagbọ ụjá ọkụalammụọ pụrụ igbochi, ma anyị purụ ịkwara onweanyị ụzọ wee gabiga. Ìgwè mmadụ ahụ gaedere duu, ebili mmiri ahụ gaakwụsị, anyị gaanụ olu Ya. “Gini ka i nāchọ ka M’mere gi?”
Ọchịchịrị
Ọ dịghị mfe ime ka Batimiọs kpuchie ọnụ ya. Náagbaghị agụgọ ọ gụsiwo ya agụ ike ọtụtụ arọ ịhụ ìhè nke ụbọchị. Ọ maghị ihe banyere ịdịmma niile nke iheòkìkè. Ọ bụghị náánị nke ahụ, ịchọta ihe ọ gaeri funarịrị ya nime ọchịchịrị. Ị nọ náarịọ arịrịọ tutu ya erie nri abụghị ọchịchọ ya. Ọ bụ ihe siri ike inwe nchekwube náánị n’enyemaka nke umummadụ. Ebe o ji mkpàn’aka ná achọ ụzọ, naasọ kwa ìsì, naasụ ngọngọ, ná anọ n’ọchịchịrị mgbe niile -- ọ bụrụ gị ihe ijuanya na Batimiọs tiri mkpu?
Mgbe onye mmehie ghọtara ọnọdụ ya n’ezie – na ọ bụ “onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebeere na onye dara ogbeye na onye kpuru ìsì na onye nāgba ọtọ” (Nkpughe 3:17), ya onweya n’otù aka ahụ gaeti kwa mkpu, “Jisus, Nwa Devid, merem ebere.” Ọ gaadị nnọọ mma ka Chineke mee ka ndị mmehie niile ghọta na ha naejegharị n’ọchịchịrị, naasụ ngọngọ ịdaba n’ịla n’iyi ebighịebi! O, ka ha tikue Onyenzọpụta mkpu maka ebere!
Ibu Arọ
“Jisus we guzo.” Ọkpara Chineke, Onye kere ihe niile, kwụsịrị, n’ihi ákwá nke onye arịrịọ. Ìgwè mmadụ ahụ nupuru Batimiọs n’akụkụ, ma Jisọs nyere iwu ka akpọta ya n’ebe Ọ nọ. “Ọ nākpọ gi.” Nka ezuworo nwa Timiọs. O wee chịsa uwe ya n’akụkụ wee bịakute Jisọs. Ọtụtụ mmadụ taa ejikereghị ka ha “tupu ibu nile ọ bula, na nmehie ahu nārapara n’aru” (Ndi Hibru 12:1). Ọtụtụ mmadụ ejikereghị ka ha tụpụ échìchè ọjọ ha. Ndịọzọ naejigide eziomume nke aka ha maọbụ ọlụ ọma ha naele anya ịnata iruọma Chineke. “Dika uwe emeruru emeru, otú a k ezi-omume nile ayi di” (Aisaia 64:6). Náánị otù olileanya fọdụrụ mmadụ bụ ịbịa dịka ndiìsì nke naachọ ebe Chineke, tutu rue oge mgbe agbapụtara ya.
Nkwupụta
Mgbe Batimiọs bịara, Jisọs jụrụ, “Gini ka I nāchọ ka M’mere gi?” Onye-ìsì ahụ zara sị Ya, “Rabonai, ka eme ka m’hu uzọ.” Nka bụ nkwupụta nke ịnọ n’ìsì na ọchịchọ nke isi na ya pụta. “Onye nēkpuchi njehie ya nile, ọ gagh-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru-ya” (Ilu 28:13). Ọ gaabụ ihe nzuzu ma ọ buru na onyeìsì agọnarị ikpuìsì ya; otù aka ahụ ọ bụ kwa ihe nzuzu ka mmadụ onye meworo mmehie gọpụ onweya maọbụ chọọ ụzọ ikpuchi mmehie ya.
Ọgwụgwọ
Mgbe Jisọs nụrụ arịrịọ Batimiọs Ọ zaghachịrị ya, “Laba; okwukwe-gi azọputawo gi.” Okwukwe wetara ịhụụzọ nye nwoke ahụ kpuru ìsì. N’akwụwkọ Mak 11:24 anyị gụrụ na Jisọs sịrị: “Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n’ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu.” Site n’okwukwe nime Chineke, alụwo ọtutụ ọlaebube nke igwọ ọrịa n’ụbọchị taa. Chineke chọrọ ka ndị Ya tụkwasị Ya obi maka ọgwụgwọ ha. Ọ gwara ndị Israel, “Mu onwem bu JEHOVA nke nēme ka aru di gi nma” (Ọpupu 15:26). Ọgwụgwọ nke mkpụrụobi na anụarụ dị nime àjà nke Jisọs chụrụ n’elu obe. Aisaia buru amụma sị: “Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo sitena njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo sitse n’ajọ omume nile nke ayi: ahuhu nmehie nke uso-ayi di n’aru-ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike” (Aisaia 53:5).
Ụmụ Chineke agaghị atụkwasị ndi dibịa maọbụ ọgwụ obi n’ihi ọgwụgwọ nke arụ ha kama ana-adụ ha ọdụ sị: “Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike? Ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:14, 15). Otù Jisọs ahụ Onye Batimiọs soro naaga n’ụzọ Jeriko n’ụbọchị ahụ naagwọ kwa ndị ọrịa taa. “Jisus Kraist di otú aka ahu nyahuru na ta, e, ru kwa mgbe nile ebigh-ebi” (Ndi Hibru 13:8).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Chọpụta nime Akwụwkọ Nsọ ebe dị icheiche akpọrọ ahụghị ụzọ nke imemmụọ ikpuìsì.
- Chọta ebe akọrọ akụkọ Jeriko na Baịbụl.
- Kwue ụzọ ọchịchọ Batimiọs ịhụ ụzọ si yie onye mmehie na-achọ nzọpụta.
- Kpọọ aha ụfọdụ omume ọma dị iche iche dị ná ndụ Batimiọs.
- Site n’Akwụkwọ Nsọ kwagide ozízí nke ọgwụgwọ-nsọ.
- Òlee ama-okwu nke dị nime Akwụkwọ Nsọ nke na-arụtụ aka na onye-Kraist ga-atụkwasị Chineke obi karịa ịdabere ná ndi dibịa ma-ọbụ ọgwụ n’ihi ọgwụgwụ ya?
- Kọwaa ihe okwukwe pụtara.
- Kpọọ aha ihe ụfọdụ ahụ nke Akwụkwọ Nsọ kọrọ na alụrụ ha site n’okwukwe.