Lesson 186 - Senior
Memory Verse
“Ọ digh onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọgh-ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n’ọnwu bilie n’ubọchi ikpé-azu” (Jọn 6:44).Cross References
I Oge Nke Nleta
1. Onyeisi ndị ọnáụtụ, Zakiọs, chọrọ ịhụ Jisọs, Luk 19:1-4; 5:15; Matiu 4:24; 9:31; Aisaia 52:13, 15; Jọn 6:2
2. Mmasị Zakiọs nwere bụrị n’ịzá òkù nye ike ndọrọ nke Chineke, Luk 19:5; Abù nke Abù 1:4; Jeremaia 31:3; Hosea 11:4; Jọn 6:44
3. Zakiọs nyere ọzịzá dị nkọ n’ọkpụkpọòkù nke Jisọs, were kwa ọñụ nabata Ya, Luk 19:5, 6; Aisaia 9:2; Jọn 1:4, 9
4. Ọtụtụ mmadụ kwuru okwu ọjọ megide Jisos n’ihi na O jere n’ụlọ onye mmehie, ebe ha naaghọtaghị ọlụ ịrịbaàmà nke nzọpụta maọbụ ịbụ Chineke nke Kraist, Luk 19:7; 19:44; Jọn 1:5, 26; 3:9, 10, 19; Ndi Efesọs 4:18; Matiu 13:15
II Mkpụrụ Nke Nchègharị
1. Nzute nke Zakiọs zutere Kraist bụ otù iheatụ nke mmadụ ịbụ onye chègharịrị n’otù ntabianya na kwa ihe nke naeso náetufughị oge, Luk 19:6; Ọlu Ndi-ozi 2:4; 16:34
2. Nkwupụta nke omume ọjọọ ochie ya ahụ nke Zakiọs kwupụtara n’otù oge ahụ, na mkwà nke idozi ụzọ ya nke o kwere, bụ ihe naegosi na Zakiọs nwere ezi nchègharị nke Chineke nke na-eduba ná nzọpụta, Luk 19:8; 3:8; 18:22, 23; Abù Ọma 41:1; Levitikọs 6:1-6; Ilu 6:30, 31; Matiu 5:23, 24; II Ndi Kọrint 7:10
3. Jisọs mere ka anyị mata na Zakiọs chègharịrị n’ezie, Luk 19:9, 10; 2:30-32
4. Zakiọs gosịrị n’ezie na ya onweya bụ ezi nwa nke Abraham site n’ikwere na Jisos bụ Kraist ahụ, Luk 19:8-10; 13:16; Ndi Galetia 3:7-9, 29; Jọn 8:33, 37-44, 52-58
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEỌchịchọ Nke Onye Ọnáụtụ
Zakiọs, onye ọnáụtụ nke bụ kwa ọgaranya, chọrọ ịhụ Jisọs. Nka bụ ọchịchọ kwesịrị ekwesị nye onye ọ bụla, ọ kwesị kwara nnọọ ekwesị nye Zakiọs, onye bụ onyeisi ndị ọnáụtụ. Ọnọdụ ọlụ a nke bụ ọnáụtụ (nke bụ ndị na ahụ maka ịnakọta ụtụ isi nye ọchịchị nke Ndi Rom) bụ ọlụ nke Ndị Ju kpọrọ asị n’ihi ọtụtụ aghụghọ na anyaukwu nke jupụtara nime ya. Oghere nke ụdị aghụghọ ahụ bụ ihe ana ahụ ọtụtụ mgbe n’etiti ndị ọnáụtụ ahụ. Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Zakiọs ekwesịghị ntụkwasịobi n’ọlụ ya, àmà nke ya onweya naeme ka anyị ghọta na ọ mejọrọ ndị mmadụ n’oge garaaga.
Ọ bụghị ihe anaahụ mgbe niile na mmadụ dị ka Zakiọs na onye naalụ ụdị ọlụ ahụ gaegosi nnukwu mmasị o nwere n’ebe onye sị ka Jisọs Kraist nọ, mmasị ahụ nke ọ nwere esiteghị n’amaghị ama. Ihe kpaliri obi Zakiọs bụ ọlụ nke àtụmàtụ mgbapụta nke Chineke site na Jisọs Kraist. Óké ọlụ ọma nke Kraist na akụkọ nke ọlụ ịrịbaàmà dị ịtụn’anya nke Ọ lụrụ akpaliwo obi mmadụ niile ndị nọ n’ala ahụ na kwa mba ndị nọ ha gburugburu.
Nkọwa nke Jisọs kọwara ihe ndị amụma nke mgbe ochie dere na Iwu nke Moses bụ ihe dị iche n’ebe iwu na ozízí nke Ndi Farisii di nke mere na nnyukwu nkewa na ịrụụka malitere. Mmadụ niile n’ebe naekwu ihe banyere Jisọos, na ihe niile nke O kwuru na nke O mere.
Dịka anyị naatụgharị uche banyere Jisọs Kraist site n’okwu Chineke, anyị hurụ na, dịka Zakiọs hụ kwara n’ikpeazụ, na Kraist karịrị mmadụ nke purụ ịnwụ anwụ. Ọ bụ Ọkpara Chineke, Ọ bụ kwa Onye nke gaenye, na Onye nyere, ihe mgbapụta n’ihi mmehie nke mmadụ Ọ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe nke furuefu, Zakiọs bụ otù onye nke furuefu, bụrụ kwa onye Kraist chọtara.
Ìhè Nke Chineke
N’otù oge Aisaia kwuru okwu nke amụma banyere Kraist ịbụ ìhè ukwu: “Ndi nējeghari n’ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n’ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha” (Aisaia 9:2). Jọn onye ọwụmmiri kwuru okwu banyere Kraist dịka ìhè nke mmadụ: “Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè” (Jọn 1:9). Ọ bụ ìhè ahụ, Ìhè nke ezi nghọta na nke ọmụma nke Kraist, nke malitere inwubata nime obi Zakiọs. (Lee II Pita 1:3).
Anyị amataghị nnọọ ihe mere Zakiọs jiri chọọ ịhụ Jisọs, ma anyị matara na ọ gaabụworị onye naenweghị añụrị. Ebe ọ bụ na mmadụ niile kpọrọ ya asị, Zakiọs gaahụworị ịbụ ọgaranya ya na ịnọ n’ọchịchị ya na ịbụ onye nwere ike ụfọdụ n’ebe ọ naalụ ọlụ dịka ihe naabaraghị ya n’ihe.Ọ bịakutere Onye kwesịrị ka ọ bịakute mgbe ọ chọrọ inyeaka. Akwụkwọ Nsọ kwuru okwu banyere Jisọs: “N’ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi-nma ka òzùzù nile bigide nime ya” (Ndi Kọlọsi 1:19), ọ bụghị ihe isiagụgọ bụ ihe ọ naakọwa, na ọ bụ nime Kraist na ihe ọzọ niile nke dị mma nke sitere na Chineke bụ òzùzù niile nke ndụ, ọ dịghị kwa ebe ọzọ agaenweta ya.
Ọ gaabụworị náánị oghere ahụ ka Zakiọs nwere iji chọọ Jisọs. Ọ bụ maka ọdịmma nke ya rue mgbe ebighịebi na ọñụ ebighịebi nke ọ gaenweta ka o jiri wee mee otú ahụ. Jisọs esiteghị kwa n’ụzọ Jeriko wee gabiga ọzọ N’ụbọchị ikpeazụ niile nke Kraist n’elu ụwa, eleghịanya Zakiọs dị ka onye naenweghị olileanya n’etiti ndị ahụ niile nọ gburugburu ịnata ihe ọ bụla site n’aka Jisọs Kraist; ma ọ bụ otù nime mmadụ olenaole ndị natara ihe. Zakiọs nwere ụdị obi ahụ nke onye arịrịọ ahụ kpuru ísì nke Jeriko na onyeori ahụ nke nọ n’elu obe nwere, ndị mgbe ha tikuru Jisos mkpu maka ebere, ha natara ọzịzá nke arịrịọ ha. Mmadụ izute Jisọs náánị otù ugbò bụ ihe ọ dị ka agaasị na ọ dị Zakiọs mkpà ịmata na Ọ bụ Ndụ, na Ìhè nke mmadụ (Jọn 1:4).
Ebe ọ bụ na Zakiọs bụ mmadụ dị ntakịrị, ọ rịgoro n’elu osisi ka ọ wee hụ Jisọs nkeọma mgbe Ọ naagabiga. N’ọñụ nke ịtụn’anya nye Zakiọs, ọ bụghị náánị na Jisọs hụrụ ya n’elu osisi kama Ọ gwara ya ka ọ mee ngwa rịdata, n’ihi na Ọ chọrọ ka Ọ nọnyere ya n’ụbọdhị ahụ. Anyị amataghị ihe niile nke mere n’etiti Jisọs na Zakiọs nime nkeji olenaole ahụ nke soro, kama anyị matara na n’oge naadịghị anya Zakios nwere óké mgbanwe nke uche, obi na ndụ. Okwu mbụ nke Zkiọs kwuru mgbe ọ rịdatara site n’elu osisi ahụ bụ ezi iheàmà pụtara ìhè nke obi nke naechègharị n’ezie: “Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m’nwere ka m’gēnye ndi-ogbenye, ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ.” Okwu ndịa naeguzo ebighịebi ná ngọnarị megide ndị ahụ niile naekweghị ekwe bụ ndị naagọnarị ozízí Baịbụl banyere idoziụzọ dịka ọ si metụta nzọpụta na ụzọ ibindụ nke Onye Kraist.
Mkpụrụ Nke Nchègharị
Jọn Onyeọwụmmiri dorọ ndị Farisii ka ná ntị mgbe ha bịakutere ya ka ha mịa mkpụrụ nke kwesịrị nchègharị (Matiu 3:8). Aisaia gosịrị ndị Israel daghachịrị azụ ihe bụ nchègharị: “Ọ bugh nka bu obubu-ọnu M’nārọputa ? itọpu agbu nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-òkíké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmegbu emegbu ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula? Ọ bugh ikesara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n’ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n’ulo-gi? Mgbe i huru onye gba ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?” (Aisaia 58:6, 7). Ụdị omume dị otú ahụ bụ ihe naegosi Chineke na mmadụ na anyị naechègharị n’ezie.
Zakiọs gosịrị ezi nchègharị site n’ikwe mkwà ime ihe ahụ nke ọ hụrụ na ọ dị mkpà ka o mee ọsọsọ: inyere ndị ogbenye aka, na idozi ụzọ n’ebe niile o mehiere n’oge garaaga.
Nye ndị niile nke naagọnarị eziokwu nke idozi ụzọ, ndị naakụzi kwa na o megidere ihe Chineke chọrọ n’aka mmadụ, anyị naasị, Tụlee okwu ahụ nke Zakiọs kwuru: “Ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo-ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ.” Iwu niile nke Chineke chọrọ idozi ụzọ, Chineke agbanweghị kwa n’ihe niile nke Ọ chọrọ n’aka mmadụ n’ụbọchị taa. Mgbe ụfọdụ anaekwupụta ihe ọjọọ nke emere, ọ bụrụ kwa na ọ dị mkpà ka ewere ego dozie ụzọ agaeme ya. “Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu” (maọbụ nhazi nke ihe ochie garaaga) (Eklisiastis 3:15).
Jisọs mere ka amata na Zakiọs chègharịrị n’ezie site n’ịgwa ya, “Ta ka nzọputa biaruru ulo a.” Ihe ọ bụla nke dị ala karịa nchègharị nke gaeme ka amalite ịmịrị Chineke mkpụrụ ọsọsọ, na ịgbaàmà nke Chineke naenye ka ewee naagbara Ya àmà, abughị nchègharị maọlị.
Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke naalụ ụdị ọlụ nke Zakiọs na onye nwere ụdị omume ya, maobụ onye dị elu maọbụ onye dị ala, gaekwe mkwà nke idozi ụzọ n’iru ọra mmadụ, náánị ma aka Chineke dị na ya. Ọ dị ka agaasị na Zakiọs ghọtara nke ọma na idozi ụzọ dị mkpà. Iruuju maka mmehie ya gaemeworị ka ọ bụrụ onye na adịghị ararụ ụra ọtụtụ abalị ka Chineke nọ naagwa ya okwu.
Mgbe Jisọs kpọrọ Zakiọs òkù ọ gaabụworị onye kpebiri ịza òkù ahụ naagbanyeghị ihe ọ bụla nke ọ gaefu ya. Zakiọs kwupụtara mmehie ya niile nye Jisọs wee kwe kwa mkwà ime ihe niile nke achọrọ ka o mee, ọñụ nke nzọpụta wee malite naerugharị n’obi ya.
Jisọs gwara ndị odeakwụkwọ na ndị – Farisii okwu n’otù oge, sị: “N’ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abá n’ala-eze Chineke” (Matiu 21:31). Ndịa buru ọtụtụ mmadụ ụzọ baa n’Alaeze Chineke n’ezie. Ọ bụghị n’ihi na Chineke emesighị ha ike maọbụ na O nwere obi ebere n’ebe ha nọ karịa n’ihi óké mmehie ha; kama ọ bụ n’ihi na ha naekwere n’eziokwu ọsọsọ, ha naadị njikere karịa ndị ahụ bụ ndị ezi omume nke onweha, ikwupụta na Kraist dị ha mkpà. Ụdị ndị dị otú ahụ ka Zakiọs bụ. Ọ hụrụ na Kraist na nzọpụta Ya dị ya mkpà, o mekwara ọsọsọ nabata Ya mgbe o nwere oghere.
Onye amụma Ezikiel kwuru okwu nke ịgba ume nye ndị naemebi iwu: “Mgbe M’nāsi onye nēmebi iwu, I ghagh inwu; ọ we si ná nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n’ikpe na ezi omume; asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n’ike, jegharia n’ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghagh idi ndu, ọ gagh anwu” (Ezikiel 33:14, 15). Zakiọs mere otú ahụ. Otú ahụ ka ọtụtụ mmadụ meworo site n’oge ahụ, otú ahụ kwa ka ndị niile chọrọ ka azọputa ha site ná mmehie niile ha gaeme kwa n’ụbọchị taa. Otú a ka Chineke gaesi kwa nabata ha.
Àmà Nke Chineke
Ọ bụrụ na amụrụ anyị ọzọ n’ezie, ọ bụrụ na agbanwewo ndụ anyị site n’ike nke ọlụebube nke Chineke, Chineke gaagba àmà n’eziokwu nke ịgbaàmà anyị. Otú ahụ ka ọ dịrị n’ebe Zakiọs nọ, otú ahụ ka ọ naadị kwa nye onye ọ bụla nke chègharịrị n’ezie.
Jisọs kwuru okwu banyere Zakiọs: “Ta ka nzọputa biara ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.” Ndi Farisii, mgbe ha na Jisọs naekwurịta okwu, ha kwuru nnọọ ọtụtụ ezi ihe banyere okpukpé ha, ha wee ná anyaisi na ha bụ ụmụ nke Abraham. Jisọs sịrị ha: “Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham. Ma ugbu a unu gāchọ uzọ igbum, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M’nuru n’ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmegh” (Jọn 8:39, 40).
Zakiọs natara nzọpụta, wee ghọọ ezi nwa nke Abraham n’ihi na o nwere okwukwe nime Kraist na Ọ bụ Onye Nzọpụta nke mkpụrụobi nke mmadụ niile. Ndi Fraisii, nime eziomume nke aka ha niile, ha enweghị ike itozu n’ịbụ ụmụ Chineke, n’ihi na ha anabataghị Kraist dịka ezi Mesaia ahụ.
Okwukwe n’ozi nke Chineke na ịgbaàmà nke Chineke nye ọlụ Ya naabụ ụzọ nke nzọpụta mgbe niile. Ụzọ nke nzọpụta bụ ihe ghere oghe mgbe niile nye ndị nwere okwukwe na Chineke na n’Ọkpara Chineke, Jisọs Kraist, dịka Onye Nzọpụta nke mkpụrụobi nke mmadụ niile. Ọ dịghị kwa ụzọ ọzọ dị.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Ònye bụ Zakiọs, gịnị bụ kwa ọlụ ya?
- Gịnị mere ndị mmadụ jirir kpọọ ndị ọnáụtụ asị?
- Gịnị mere Zakiọs jiri chọọ ịhụ Jịsọs?
- Ọ bụ gịnị ka Jisọs gwara Zakiọs mgbe Ọ hụrụ ya n’elu osisi?
- Gịnị bụ ihe naegosi anyị na Zakiọs bụ onye nwere ezi nchègharị?
- Gịnị ka mkpụrụ nke nchègharị pụtara?
- Òlee ndị bụ ụmụ nke Abraham?