Abù Ọma 66:1-20

Lesson 187 - Senior

Memory Verse
“Ọ BURU NA ọ BU AJọ IHE KA M’LEWOWRO ANYA NIME OBIM, ONYE-NWE-AYI AGAGH-ANU OLUM” (ABù ỌMA 66:18).
Cross References

I Ịdị Ukwu Nke Ike Chineke

1. Ana adụsi ndị bi n’ụwa dum ọdụ ike ka ha bụkue Chineke abù otuto, Abù Ọma 66:1, 2; 100:1

2. Chineke aghaghị iwedata ndị iro Ya niile n’okpuru Ya site n’ike Ya, Abù Ọma 66:3, 4; 65:5; 18:44; 46:8; Aisaia 45:22, 23

3. Ike Chineke gazuru ebe niile, dị kwa mgbe ebighịebi, Abù Ọma 66:5-7; Ọpupu 14;21; Joshua 3;14-16

II Ọnwụnwa Ọkụ Niile Maka Nnụcha

1. Ana Adụ anyị ọdụ ka anyị gọzie ma too kwa Chineke, Onye naejide mkpụrụobi anyị ná ndụ, Onye naekweghị ka ewezuga ụkwụ anyị, Abù Ọma 66: 8, 9; 120:1

2. Onyenweanyị naanụcha ndị nke Ya site n’ọnwụnwaọkụ ọjọọ nke naadakwasị ha, Abù Ọma 66:10-12; 17:3; Aisaia 48:10; Zekaraia 13:9; I Pita 1:6, 7; 4:12, 13

III Nkwụghachị Nke Mkwà Dị Icheiche

1. Devid kwụghachịrị mkwà dị icheiche nke o kwere mgbe ọ nọ ná nsogbu, Abù Ọma 66:13-15; 116:14; Eklisiastis 5:4

2. O kwuru ihe Chineke meere ya, Abù Ọma 66:16, 17; 34:11

3. Ọ bụrụ na ọ bụ ajọ ihe ka anyị leworo anya nime obi anyị, Onyenweanyị agaghị anụ olu anyị, Abù Ọma 66:18-20; Job 27:9; Ilu 15:29; Aissaia 1:15; Jọn 9:31; Jemes 4:3

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Otuto Dịrị Chineke

N’Abù Ọma a nke juru n’otuto, ka Devid naagụkọ ụfọdụ ihe ukwu dị icheiche nke Chineke meere ndị bi n’ụwa. Obi Devid jupụtara n’ọñụ, o wee naadụsi mba niile ọdụ ike ka ha bụkue, ma nye kwa Chineke otuto na nsọpurụ ma tikusie Chineke mkpu ọñụ ike.

N’ezie mgbe anyị gụkọrọ ọtụtụ ngọzi anyị -- n’otù n’otù -- anyị, onweanyị kwa, obi anyị gaejupụta n’ọñụ n’ihi ịhụn’anya na obi ebere niile nke Chineke, nke gaeme ka anyị tisie mkpu ike: “Ka ihe nile ọ bula nēku ume to JA.”

Ọ bụ inye ekele ziriezi nke sitere nime alaala obi nye Chineke naeme ka abụ nwee ụdị mmetụta dị otú a. Ọ bụghị abụ iruuju ka Devid naadụsị ụmụ mmadụ ọdụ ịke ka ha bụọ, ma, kama nka, ọ gwara ha ka ha, “tikusie JEHOVA nkpu ọñu ike,” “Menu ka otuto Ya di nsọpuru.” O wee kwue okwu amụma ahụ nke dị ukwu banyere mpụta ìhè nke Ọchịchị Otù Puku Arọ nke Kraist: “uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; ha gābùku aha-Gi Abù Ọma.”

Ọkpụkpọòkù Ahụ

Devid onye dere Abù Ọma, onye, anyị pụkwara ịhụ na ọ bụ kwa onye amụma, onye bamiri nime mmụọ n’ihi ịdị ukwu nke ọlụ aka Chineke nke mere o ji dị ka onye pụrụ n’ezi izipụ ọkpụkpọòkù ahụ nye mmadụ niile n’ụwa sị, “Jenu, hu ọlu nile nke Chineke.” Nka bụ kwa ezi mmụọ nke Oziọma ahụ. Ọkpụkpọòkù nke Chineke bụ nye “Onye nāchọ.” Ihe anyị gaeme bụ ibu ụzọ bịa, ma n’ikpé azụ “Detunu ire, hu na JEHOVA di nma” (Abù Ọma 34:8).

Nka naechetara anyị ihe banyere nwayị Sameria ahụ, onye, mgbe ọ chọtara Mesaia ahụ, o wee gbaghachị azụ nime obodo wee gwa ndị ya: “Bianu, le … Ònye a gābu Kraist ahu?” (Jọn 4:29).

Nka naechetakwara anyị maka ihe mere mgbe Filip chọtara Nataniel ma gwa ya ihe banyere Jisọs. Nataniel ekweghị na ọ dị ezi ihe pụrụ isi na Nazaret pụta, ma Filip sịrị, “Bia le” (Jọn 1:46). N’ebe a otú ọ dị, nka bụ ọkpụkpọòkù nke Oziọma ahụ nye ụwa niile: “Jenu hu ọlu nile nke Chineke: Onye di egwù ka Ọ bu n’omume-Ya n’ebe umu-madu nọ.”

Ọlụ Ebube Niile Nke Chineke

Onye dere Abù Ọma malitere ịgụkọ ụfọdụ n’ọlụ niile nke Chineke lụrụ. O chetara ọlụebube dị icheiche nke Chineke lụrụ mgbe O mere ka ụmụ Israel si n’Ijipt pụta, na otú óké osimiri ji ghọọ la akọrọ, ndi ahụ wee were ụkwụ gabiga. Nka mere ka obi ya jupụta n’ọñụ na ekele o wee tie mkpu sị: “Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya.”

Ọ bụrụ na anyị gaeji nwayọ gukọọ ngọzi niile nke Chineke n’ebe anyị nọ, ma cheta kwa na Ọ dọpụtara anyị ná mmehie ma napụta kwa anyị n’agbụ nke onyeiro, obi anyị gaejupụta kwa n’otuto karịsịa nye Chineke.

Ndị Anwapụtaworo

Nime mbúli elu niile na otuto niile nye Chineke, onye dere Abù Ọma chetara na ọ bụghị mgbe niile ka anaeburu ha n’elu nku ugo gafee nsogbu na arụ ụfụ. Chineke naanwapụta karị ndị nke Ya. O kwuwo na ha gaabụ ndị anwapụtara anwapụta. Chineke duru ụmụ Israel gafee ọzara ka O weda ha n’ala, ịnwapụta ha, ka o wee mata ihe dị n’obi ha. Devid kwuru n’Abù Ọma a: “I mere ka ayi ma n’ọnya; I tukwasiwo n’úkwù-ayi ibu nānyigbu ayi.” Chineke nwere ụzọ dị icheiche iji nwapụta anyị nke anyị naenweghị ike irọ nrọ banyere ya, O nwee ike ikwenye ka “ihe ana-ahụbeghị mgbe ọ bụla” bịakwasị onye ọ bụla nime anyị. O kwere ndị ụkọ si na Babilon bịakute Hezekaia ka o we nwaa Hezekaia “mara kwa ihe nile di n’obi ya” (II Ihe Emere 32:31).

Chineke naanwa anyị ime ka anyị mara ihe dị n’obi anyị onweanyị. Ọ maara otú anyị dị. Ọ maara adịghịike anyị niile. Ọ maara ọdịda anyị. Otù onye naede akwụkwọ ekwusiwo ya ike sị: “Madụ ịmata onwe-ya bụ ihe-ọmụmụ nke madụ na-enweghị ike ịmụta ma ọ bụghị site na Mụọ Nsọ Chineke.” Mgbe ụfọdu, mkpagbu na ọnwụnwa anyị naadị ka o sikarịrị ike, oge ahụ o wee di ka anyị enweghị ike ịga n’iru ọzọ, ma Pọl kpọrọ ha mkpagbu anyị nke “di nfe” naagwa anyị na ha na alụpụtara anyị ebube nke ukwu ri nne kachasị ihe niile, bụ ebube nke dị ukwu dị kwa ebighịebi.

Ndị Israel tara ahụhụ dị ukwuu n’aka ndị ahụ nke naachị ha n’ihe ike nke Ijipt tupu ha agabiga Osimiri Uhie n’elu ala akọrọ. Ha gabigara ọkụ nnụcha nke mkpagbu, anwara ha dịka anaanụcha ọlaọcha, tupu ha ahụ nnapụta nke sitere na Chineke. Chineke naarapụ anyị ka anyị taa ahụhụ rue mgbe anyị gafesịrị ọkụ nnụcha ahụ kpamkpam. Ọ maara ihe dị anyị mma, anyị maara ma kwere kwa na anyị naerita úrù nke anyị gafere.

Mgbe Chineke hụrụ na o zuwo, O wee kpọpụta Israel baa n’ala ebe àkụ na ụba dị -- Ala Kenean. Ma mgbe Ọ hụrụ na ọnwụnwa anyị na nnụcha anyị ezuwo, ọ naeweputa anyị baa n’ebe àkụ na ụba nke ngọzi nke imemmụọ dị.

Nkwụghacị Nke Mkwà Anyị Dị Icheiche

Mgbe ndị bụ ezi ụmụ Chineke gafere ọkụ nnụcha nke mkpagbu, Chineke wee napụta ha, ha naenwe obiumeala, obiekele; dịka Devid, ha naachọ ịga n’ụlọ Chineke ịkwụghachị mkwà niile nke egbugbereọnụ ha kwuru mgbe ha nọ ná mkpà. Ha na amata na ọ bụ Chineke mere ka ha pụta site ná nsogbu ha, ma site n’obi ekele too aha Ya, jikere kwa ito ya ná nzukọ nke ndị eziomume.

Ma ọtụtụ mmadụ naechefu mkwa ha kwere na ihe niile nke Chineke meere ha ngwangwa. Ha naetisi mkpu ike maka inyeaka ná mkpagbu ha, ma ngwangwa Chineke napụtara ha, ha echefue Ya chee na nwere ike ime ka ụzọ ha gaa nke ọma n’onweha. Okwu Chineke sịrị: “Mgbe I nēkwe Chineke nkwà, alala azu n’ikwughachi ya” (Eklisiastis 5:4). Nsogbu dị ukwu gaabiakwasị anyị ma ọ bụrụ na anyị nwere nlefuru anya na nka. Chineke naachọ ka anyị kwụghachị Ya ihe anyị kwere ná mkwà mgbe anyị nọ ná nsogbu.

Mgbe ha naeji otuto na ihe mkwughachị nke mkwà bịa, ndị Israel naeweta kwa àjà ha dị icheiche -- bụ anụ ụlọ ha nke kasị mma, na “ihe nēsi ísì utọ nke ebulu.” Ànyị naecheta kwa ime nka mgbe niile? “Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n’anya” na ðọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.”

Mgbe enyi anyị meere anyị ihe pụrụ iche, ọ bụ ihe naadịkarị nime mmadụ ịchọ ịkwụghachị ya n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ nke ọzọ. Onyenweanyị meere anyị ihe ukwu, ọ bụ kwa ihe naadị ngwangwa n’obi anyị inye ha chị Ya ihe. Anyị apughị ịkwụghachị Ya ihe O meere anyị n’ihi na nka bụ ihe anaapụghị ime. Ma onyinye ịhụn’anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị. O nwere ike ịbụ ọtụtụ ihe. Chineke chọrọ ijé ozi afọ ofufo anyị, inye onweanyị, ịgba àmà anyị, ụzọ anyị si enweta ihe, na ihe ọ bụla O ji gọzie anyị. Ọ chọrọ ihe niile anyị bụ na nke anyị nwere.

Otù Ịgbáàmà

Mgbe Devid tụgharịsirị uche n’ihe ọma niile nke Chineke meere ndị Israel, o wee tikue ndị ahụ mkpu sị “Jenu hu” (maọbụ, bịanụ hụ). Ma mgbe o jesịrị n’ụlọ Chineke ịkwụghachị mkwà ya wee chee kwa àjà ya dị icheiche, o wee tikue ndị ahụ mkpu sị “bianu nuru.” Ọ chọrọ ịkọrọ ha ihe Chineke meere mkpụrụobi ya. Lee ụdị ịgbaàjà nka bụ! Ọ chọrọ nnọọ inye ya! Náagbaghị agụgọ ọ bụ kwa otù ịgbaàmà ahụ ọ gbara mgbe ọ sịrị: “Gọzie JEHOVA, nkpuru-obim: ka ihe nile nke di nimem, gọzi kwa aha nsọ Ya. Gọzie JEHOVA nkpuru-obim, echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya Ọ nēmeso gi: bú onye nāgbaghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāgbaputa ndu-gi n’aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze bú ebere na obi-ebere di iche iche; Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọ hu dika ugo” (Abù Ọma 103:1-5). Ọ kwụghachịwo mkwà ya. O wetawo kwara Chineke àjà ya. O jiwo ekele bịa n’ụlọ Chineke. N’ihi nka, Chineke. N’ihi nka, Chineke gọziri ya.

Ihe Mgbochi Nke Ajọ Omume

Mgbe anyị gụsịrị ịgbaàmà dị otú a, anyị gaahụ na Devid nwere obi dị ọcha. Ọ matara na Chineke anụwo ekpere ya. Ọ matakwara ihe ọ gaeme ka Chineke wee za ekpere ya. O wee sị: “Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m’leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agagh-anu olum: N’ezie Chineke anuwo olum.” Nka bụ kwa ịgbaàmà ọzọ maka eziomume nke Devid. Ọ dịghị ajọomume dị n’obi ya. O zuru òkè n’iru Chineke.

Mmehie naekewapụ mmadụ n’ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na anyị eburu ajọomume nime obi, anyị agaghị adị ọcha n’ebe Chineke nọ. Tutu mkpụrụobi ọ bụla abụrụ onye eziomume n’iru Chineke, ọ gaarapụ mmehie. Ọ ga agbakụta ya azụ site n’obi ya niile, ma gwa kwa Chineke na ya arapụwo ha. Mgbe o mere nka, ekpere ya gaeru Eluigwe, mgbe ahụ Chineke gaeledata anya ma gbaghara kwa mmehie ya niile. Mmụọ Nsọ gaewere Ọbara hichapụ amamikpé. Ọ bụ kwa n’oge ahụ ka ya onweya, gaabụsi abụ otuto nke Chineke ike, ma soro kwa Devid sị: “Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugagh ekperem, o sigh kwa n’ebe m nọ wezugaa ebere Ya.”

Abu Ọma a n’eziokwu bụ abụ ekele dị mkpà nke ukwuu, isiokwu ya bụ maka otuto, ịñụrị ọñụ na ịgọzi Chineke. Ọ bụ abụ nke ezi onye Kraist ọ bụla, onye ọ bụla nke nọ nime èzínaụlọ nke okwukwe, na onye ọ bụla nọ nime òtù ezi ndị kwere ekwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ isiokwu nke Abù Ọma a?
  2. Ònye ka Devid chọrọ ka ọ bụọabụ a?
  3. Gịnị mere Devid ji gaa n’ụlọ Chineek?
  4. Gịnị ka o mere n’ebe ahụ?
  5. Gịnị meere Chineke ji naele ndị nke Ya ule?
  6. Òlee mgbe Chineke naagaghị anụ ekpere anyị?