Lesson 188 - Senior
Memory Verse
“Ùnu amatagh na ibu eyi nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyi nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4).Cross References
I Ndụmọdụ Dị Icheiche, Ịdọ Akanántị Dị Icheiche Na Nnupụisi
1. Enyere ndụmọdụ ịchụpụ ndị niile bi na Kenean site n’aka Moses, Ọnu-ọgugu 33:50-53
2. Joshua nyere ịdọakanántị dị icheiche, Joshua 23:11-13
3. Mmụọozi nke Chineke bara mba n’ihi nnupụisi nke ndị Israel, Ndi-Ikpe 2:1-5
II Nrubeisi Nke Ndị Ọgbọ Joshua
1. Enwetara ala ahụ, Ndi-ikpe 2:6
2. Ndị ahụ fèrè Chineke òfùfè, Ndi-ikpe 2:7
3. Joshua nwụrụ, Ndi-ikpe 2:8, 9
III NdaghachịAzụ Nke Ọgbọ Niile Ahụ Na Esochita
1. Ha amaghị Chineek, Ndi-ikpe 2:10
2. Ha wee jeso chi ọzọ dị icheiche, Ndi-ikpe 2:11-13
3. Chineke ji ikpe Ya dị icheiche leta ha, Ndi-ikpe 2:14, 15
IV Nwebata Nke Oge Ndị Ikpe
1. Chineke mere ka ndị ikpe biliere ha, Ndi-ikpe 2:16-19
2. Iwe were Chineke n’ihi nnupụisi nke ndị Israel kwa mgbe kwa mgbe, Ndi-ikpe 2:20-23
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEN’ala nke ihe naadịghị nke Moab bụ nke jupụtara ná ahịhịa n’ofe osimiri Jọdan site na Jeriko, Moses mere ka okwu niile nke Chineke dị kwa ọhụụ ná ntị ndị Israel. Ọ bụ na nso ọgwụgwụ nke ibụ onyendú nke Moses. Ọ gbawo otù narị na iri arọ abụọ (120), ma anya ya adịghị ahụ inyoghoinyogho, ike nke anụarụ ya atalataghị kwa. Anaanụ olu ya nkeọma ọbụná ndụmọdụ niile ahụ bụ ihe doro anya nke ọma dịka ha na-aba ná ntị nke ndi ahụ “ Mgbe unu onweunu nāgabiga Jọdan ba n’ala Kenean, unu gānapu kwa n’aka ndi nile bi n’ala ahu ala-ha n’iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n’iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n’iyi, me kwa ka ebe di elu ha nile tọgbọrọ n’efu. Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n’ihi na ọ bu unu ka M’nyewowro ala ahu inweta ya” (Ọnu-ọgugu 33:51-55).
Ịdị Ọcha
Ndị niile bi n’ala Kenean tutu ụmụ Israel abịa bụ ndị naemebi iwu. Kenean bụ ala maramma, ala nke Chineke hụrụ n’anya. Chineke chọrọ ka ọ bụrụ nke ndị ya. Kama Ọ chọrọ ka eme ka ọ dị ọcha. Ndị Ya agaghị agwakọta onwe ha n’ebe ndị ahụ na amaghị Chineke nọ, maobụ soro ụzọ nke ikpere arusị ha niile. Ụmụ Israel gaabụ mba dị nsọ. Chinke chọrọ ka emee ka ala ha dị ọcha; anụụlọ ha agaghị eso anụụlọ ndị ahụ kpakọta nrị, maọbụ ịkụ n’ubi ha mkpụrụ ọghịgha nke agwakọtara ha na nke ndị ahụ. Chineke hụrụ ịdịọcha n’anya. Mmehie na eziomume adịghị agwakọta. Ọ bụrụ na ị gaebi ndụ ịsọpurụ Chineke ị ghaghị iwepụ aka ná mmehie niile.
Chupụ, ndị niile bi n’ala ahụ; bibie onyinyo arụsị ha niile na onyinyo arụsị ha niile awụrụ awụ; ma kwatue kwa ebe dị elu ha niile. Ọ dịghị oghere ọ bụla dị nye mmehie n’ala nsọ ahụ. Aghaghị enwe mmasị nye ya, agaghị emere ya ebere maọbụ metụ ya aka. Gwuda ya; chụpụsịa ya, la ya n’iyi! Mmehie bụ ihe dị egwù. Otù mmehie -- ọdịda eso ya; otù nnupụisi – ewee tufue Paradise ahụ. Chineke nwere àtụmàtụ dị ukwu nye Israel. Ha gaabụ alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ. Site n’aka ha ka mba niile nke ụwa gaabịaru ná mmazu nke ezi Chineke ahụ. Ma ha erughị kwa n’àtụmàtụ niile nke Chineke nwere banyere ha. Ha wee tinye aka ná mmehie, wee rapụ ịchụpụsi ndị bi n’ala ahụ. Ịdọakanántị niile nke Joshua wee mezue: “Ha gāburu unu igbudu na ọnyà, na utari n’akuku aru-unu, na ogwu n’anya unu” (Joshua 23:13).
Enweghị Ndụmọdụ
Mgbe ọnwụ Joshua gasirị ya ndị ahụ niile ndị matara ya bụ ndị ewuliri mmụọ ha elu site n’ịchịisi ya, ọgbọ ọzọ wee bilie bụ ndị naamaghị Chineke. Ọ gaabụ na ndị mụrụ ha ekwesịghị ntụkwasịobi inye ụmụ ha ndụmọdụ site n’iwu niile nke Chineke? Ha esiwo otú chefuesịa iwu ahụ ngwangwa: “Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, gādikwasi kwa n’obi gi: i gējisi kwa ike izi ha umu gi, i gēkwu kwa okwu banyere ha mgbe ị nānọdun’ulo-gi, na mgbe i nēje ijé n’uzọ, na mgbe i nēdina ala, na mgbe i nēbili ọtọ” (Deuteronomi 6:6, 7)? Ụfọdụ ndị nne na nna naenwe nlefuru anya n’ụbọchị taa ịgụrụ ụmụ ha Okwu Chineke, ma ha adịghị eme ihe Chineke chọrọ site n’ụzọ dị otú a. Ha nwere oghere dị ebube ịgha mkpurụ nke eziokwu ahụ nime obi nke ndị ahụ nọ n’okpuru nlekọta ha, ma ha adighị eme nka.
Enweghị Obi Ekele
Chineke gosịrị ikwesị ntụkwasịobi Ya n’ebe ọgbọ a naamaghị Ya nọ. O wee zipụ mmụọozi Ya -- maọbụ na onye a gaabụ Onyenweanyị Jisọs Kraist n’ụdị mmadụ. Anyị kwere na Jisos pụtara ìhè nye Joshua dịka “Onye-isi-ùsù-ndi-agha JEHOVA.” Onyeozi ahụ nke si n’Eluigwe buru ụzọ kwue okwu n’ụzọ pụtara ìhè na dịka onye nwere ike. “Emerem unu ka unu si n’Ijipt rigota, M’we me ka unu bata n’ala nke M’ñuru nna-unu-ha iyi inye ha; M’we si, M’gagh-emebi ọgbugba-ndum rue mgbe ebigh-ebi bú nke Mu na unu gbara; ma unu onwe-unu na ndi bi n’ala nke agbala ndu; unu gākwatu ebe ichu-àjà nile ha: ma unu egegh nti olum: gini bu nka unu meworo?”
“Gini bu nka unu meworo?” Náánị obiekele kwesịrị ịkpali ha irubere Chineke isi. Chineke anapụtawo ha n’ịbụ orù, mee ka osimiri uhie takọrọ n’iru ha, were mana zụọ ha n’ọzara iri arọ anọ, lụara ha agha ha niile, ma nye kwa ha ala ọma nka. Igosi obi ekele n’ihi ebere niile nke Chineke kwesịrị ịkpali ụmụ mmadụ ifè Chineke òfùfè n’ụbọchị taa. Ịhụn’anya nke Chineke n’inye Ọkpara Ya ịburụ anyị Onyemgbapụta kwesịrị ime ka anyị were obiumeala soro Ya naeje ijé ụbọchị niile nke ndụ anyị. Ka anyị were onweanyị dịka ndị akpọchiri n’ụlọmkpọrọ, ndị amakwara ikpe ọnwụ. Nna ahụ wee nye Ọkpara Ya ịbụ ihe mgbapụta nye anyị. Egburu Ọkpara ahụ ma anyị onweanyị ka emere ka anyị nwere onweanyị. Ọ bụ na anyị ejighị ụgwọ ekele nye Nna na Ọkpara Ya?
Ihe Atụ Dị Icheiche
Ha ji ụgwọ ekele dị ukwuu, n’ihi na ịdị ndụ ha dabere n’ime uche Chineke. “N’ihi na ọ bugh ihe èfù ka ọ bu n’ebe unu nọ; n’ihi na nka bu ndu-unu” (Deuteronomi 32:47). Ọ bụghị náánị na emere ka eziokwu a baa ha nime obi site n’ikwu ya ọtụtụ ugbò nime Iwu, ma ọtụtụ ihe àtụ nime akụkọ ha naeme ka nka pụta ìhè. Lee ihe àtụ nke Ekan na mmeri emeriri ha na Ai. Òlee maka 14,700 ndị nwụrụ site n’iheotiti n’ihi nnupụisi nke Kora? maọbụ ndị ahụ nke nwurụ mgbe Chineke zitere agwọ ahụ nke yiri ọkụ n’etiti ha? Ndụ ha niile dabere náánị ná nrubeisi, ma ha nupurụ-isi. Ọ bụghị ihe ijuanya na Mmụọozi nke Chineke jụrụ, “Gini bu nka unu meworo?”
Anọgideghị N’otù Ebe
Ọ bụ ezie na Israel wụsara anyammiri wee chụọ kwa àjà nye Chineke, ma n’oge naadịghị anya obi ha wee tụgharịa kwa ịchụso ihe nke ụwa. Ọ naadịrị ha mfe mgbe niile ịda mba! Ndụ nke OnyeKraist taa pụtara ikesi iheagha ike na ịlụọgụ nke okwukwe ahụ. Énweghị nlezianya na mmasị naeduba n’ịrapụ Chineke ngwangwa na ifè chi niile nke ụwa a òfùfè. Échìchè ọlụ na iheụtọ nwere ike were ọnọdụ n’obi wee chụpụ ịhụn’anya Chineke.
Ndi Ikpe
“JEHOVA we me ka ndi-ikpe bilie, ha we zọputa ha n’aka ndi nāputara ha ihe” (Ndi-ikpe 2:16). Amaokwu nka n’isi ebe ọgụgụ niile ọzọ dị ka bụ nchịkọta nke akụkọ nke ndị israel n’oge nke ndị ikpe site na Ọtniel wee rue na Samuel. Ndị ikpe ndịa jikọtara Gideon, Samson, Jefta, na Samuel, tinyere ndịọzọ ndị Chineke kwuru ihe banyere ha sị: “Ndi sitere n’okwukwe lugbu ala-eze, lu ọlu ezi-omume, nata nkwà di iche iche, kpuchie ọnu-ọdum, menyu ike ọku, gbanari iru mma-aagha, ndi esitere n’okwukwe me ka ha di ike site n’adigh-ike, me ka ha di ike n’agha, ndi site n’okwukwe chulaga ùsù-ndi-agha nke ndi ala ọzọ” (Ndi Hibru 11:33, 34).
Akụkọ ndị Israel n’oge nke ndị ikpe bụ náánị nke ọdịda kwamgbe kwamgbe, ma Chineke naegosi ebere Ya dị ukwuu n’ihi na mgbe ịnapụta ha n’aka ndịiro ha n’ụbọchị niile nke ndị ikpe. Israel nwapụtara na “JEHOVA nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ digh ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n’ebere” (Abù Ọma 103:8).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee ebe Gilgal dị? Gịnị mere n’ebe ahụ?
- Gịnị mere agaeji chụpụsịa ndị niile bi na Kenean?
- Gịnị bụ ikpe amara Israel?
- Gịnị bụ ahụhu ahụ mmụọozi ahụ nyere ha?
. Gịnị bụ mmetuta nke ndụ Joshua n’ebe ndị Israel nọ?
- Joshua ọ gbara arọ òle mgbe ọ nwụrụ?
- Were ịdọakanántị nke dị na Joshua 23:11-13 tụlee ozi nke Mmụọozi ahụ ziri.
- Òlee otú agaeji ịdọakanántị nka tụnyere ndụmọdụ niile Moses nyere n’Ọnu-ọgugu 33:50-53?
- Kpọọ aha ndị ikpe ụfọdụ nke Israel.
- Gịnị mere Chineke enyeghị mba niile nke Kenean n'aka Joshua?