Ndi-ikpe 3:1-31

Lesson 189 - Senior

Memory Verse
“Ọ buru na ajọ ihe adi n’aka-gi, me ka ọ di n’ebe di anya, ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri n’ulo-ikwu-gi nile” (Job 11:14).
Cross References

I Otniel

1. Arapụrụ mba ụfọdụ nke ndị Kenean iji nwaa Israel, Ndi-ikpe 3:1-4

2. Erere Israel nye n’aka eze nke ndị Mesopọtemịa, Ndi-ikpe 3:5-8

3. Otniel napụtara Israel, Ndi-ikpe 3:9-11

II Ihud

1. Ndị Israel naefe Moab òfùfè, Ndi-ikpe 3:12-14

2. Ihud naemeri Moab, Ndi-ikpe 3:15-30

III Shamga

1. Shamga naanapụta ndị Israel site n’aka ndị Filistia, Ndi-ikpe 3:31

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ebe Nnwapụta

“Ma ndia bu mba ndi JEHOVA rapuru, iji nwa Israel.” Mmadụ nwere ike naatụgharị n’obi ya ihe mere Chineke gaeji rapụ mba ndịa náekpere arụsị ndị gaje ịbụ ọnyà na ọnwụnwa nye ndị Israel. Gịnị mere O ji rapụ onye ọnwụnwa ahụ ka ọ bànye n’ogige Iden? Anyị pụrụ ịtụle ha niile dịka ihe ọdachi nke iji nye onye agha ọzụzụ. Na mbụ ọzụzụ ahụ naesi ike, ma site n’ịgafe ihe ọdachi ahụ mgbe niile na imeri ihe niile ahụ náakpọbi ụkwụ gaeme ka obi onye agha ahụ sie ike, o wee bụrụ kwa onye nwere ike ịgafesị nsogbu niile nke gaabịa n’ụzọ ya.

Anaeji ọkụ mee ka ọlaedo dị ọcha. Ana ekwu na óké osisi apụrụ iji wue ụlọ naeto nke ọma sie kwa ike n’ala ugwu mmiriòzùzò zachapụrụ karịa otú ọ naeto na ndagwurugwu echekwara nkeọma. Ịlụ ọlụ naeme ka nkwonkwo na akwarà sie ike. Ma okwukwe na nkwonkwo na akwarà bụ ihe ana aghaghị ịnwa ma nwapụta kwa. Pita naagwa anyị sị “Ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n’ọnwunwa di iche iche nwa oge ugbu a, ma asi na ọ di nkpà, ka nnwaputa nke okwukwe unu, ebe ọ dịkariri ọla-edo óké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n’iyi, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru” (I Pita 1:6, 7). Ndị Kraist siri ike bụ ndị ahụ anwapụtaworo.

Anaeme kwa ka ntachiobi baa ụba otù aka ahụ, site n’ọnwụnwa dị icheiche, n’ihi na anyị naagụ na “nnwaputa nke okwukwe-unu nāluputa ntachi-obi” (Jemes 1:3). Baịbụl naakọwa kwa na: “Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n’ọnwunwa: n’ihi na mgbe anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahụ, bú ndu, nke Onye-nwe-ayị kwere nkwà inye ndi huru Ya n’anya” (Jemes 1:12). Ọ bụ ihe dị mma ka OnyeKraist cheta n’etiti ọnwụnwa niile na “Ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe” (Ndi Rom 8:28). Nka gaagba ya ume, nye kwa ya ike, mee kwa ka o guzosie ike n’oge ọnwụnwa, ka o wee nwee ike ịpụta dịka ọlaedo nke anụchaworo n’ọkụ.

Ngwakọrịta Dị icheiche

“Umu Israel we biri n’etiti ndi Kenean … ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè.” Nke mbụ, Ụmụ Israel malitere imehie site n’ibi n’etiti ndị Kenean, emesịa ha na ha wee naemekọrịta ma, n’ikpeazụ ha wee fè chi niile ha òfùfè.

Ikwenyere (maọbụ ịgwakọrịta) n’ihe naezighịezi naamalite site n’ụmụ ihe ntà dị icheiche. Nleda anya ntakịrị n’ebe a, ịtọgbọ ezi usoro nke okpukpé n’ebe ahụ, mgbe ahụ kwa ụwa nke mmehie ewee bata, ewee tụfue ụkpụrụ niile nke onye Kraist, ewee malite kwa ifè chi dị icheiche nke ụwa nka n’òzùzùòkè ha niile.

Ọ dị ndị gaachọ ijikọta okpukpé niile ka ha bụrụ otù. Ha naachọ ịchọpụta otù ihe nke ha niile gaekwekọta. Ụdị òtù dị otú a naakpọ òkù maka iwedata ịdịelu nke ezi ozízí na ezi nguzo dị icheiche nke Baịbụl, ma nka megidere uche Chineke. Ihe iwu ahụ chọrọ bụ: “Mgbe nwa-nne gi nwoke, bú nwa-nke-nne-gi, ma-ọbu nwa-gi¸ nwoke, nwa-gị nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyi-gi, nke di ka mkpuru obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, ka ayi je fè chi ọzọ … kama i ghagh igbu ya” (Deuteronomi 13:6, 9). Pọl onyeozi nke Kraist weere nguzogide dị ukwuu na nkwuwa okwu ahụ n’ihe nke mmụọ, megide ndị ahụ ndị gaeduhie mmadụ site n’Oziọma nke Kraist. Ọ sịrị: “Ma asi kwa na ayi onwe-ayi ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n’elu-igwe, gēzi unu Ozi-ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi ziri unu, ya buru anathema (maọbu onye aburu ọnu)” (Ndi Galetia 1:8).

Onye Ikpé Mbụ

Mgbe Israel naerubere Chineke isi ọ dịghị nwoke ọ bụla nke naenwe ike iguzo n’iru ha; ma mgbe ha mehiere, Chineke erenye ha n’aka ndị iro ha. Obodo mbụ nke ndị mba ọzọ bu ụzọ nọchigide ala ha n’agha bụ site n’ala eze ndị Mesopọtemia, otù mba nke ịdị anya ya dị ọtụtụ narị maịlị n’akụkụ ugwu na n’Ọwụwa anyanwụ nke Palestine. Rue arọ asatọ ka mba ọzọ a dị ike mekpara Ụmụ Israel arụ tutu rue mgbe ndị Israel tikuru Chineke. Ọ bụ mgbe ahụ ka Chineke kpọlitere onye ikpé mbụ, bụ Otniel, nwa nwanne Keleb.

Keleb bụ onye nke Chineke ahụ naadịghị atụ egwù, onye ya na Joshua, weghachịrị Moses akụkọ ọma banyere ala Kenean. Ndị nledo iri ahụ ekwuwo sị: “Ndi bi n’ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n’ebe ahu” (Ọnu-ọgugu 13:28). Ma Keleb nwere mmụọ dị iche. Ọ chọrọ ịrịgo ka o nweta ala ahụ. E, ma mgbe iri arọ anọ gasịrị, mgbe ọ gbara iri arọ asatọ na ise, Keleb rọọrọ ka enye ya Ugwu Hebron ka ọ bụrụ ihenketa nke aka ya. Ugwu Hebron ebe ụmụ Anak naebi na mgbe ahụ, bụ ihe icheakamgba n’iru nye okwukwe na mmụọ nke dị ike nke onye nke Chineke.

Nwa nwanne Keleb bụ Otniel, nwere ụfọdụ ụdị mmụọ ọma ahụ nke dị nime Keleb. Mgbe Keleb sịrị “Onye ahu nke gētigbu Kiriat-sefa, were ya, m’gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi na nwunye” (Ndi-ikpe 1:12), Otniel wee were obodo ahụ. Mgbe mmụọ Chineke bịakwasịrị Otniel o wee jee bue agha napụta kwa Israel site n’aka eze nke ndị Mesopọtemia. Chineke nọnyeere Otniel, ala ahụ wee zuru ike iri arọ anọ.

Ákwá Maka Ebere

“Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n’anya JEHOVA ọzọ: JEHOVA we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel” Leenụ otú akụkọ banyere ndi Israel ga-esiworị bụrụ ihe dị iche! “Ọ gādim nọ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka, ma asi na ha gāghọta ikpe-azụ ha!” (Deuteronomi 32:29). Onye ahụ buworo Israel “n’elu nku ugo” atụgharịwo n’otù aka ahụ imegide ha wee mee ka ndị iro ha dị ike karịa ha. Ogologo arọ iri na asatọ ka ha fère eze Moab òfùfè n’ihi nnupụisi ha n’ebe iwu Chineke dị. Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa naachọpụta onweha ịbụ onye ekere agbụ n’ihi mmehie. Njigide nke ekwensu naadịwanye ike nkentà nkentà n’arụ onye mmehie rue mgbe ọ gaamata na ya aghaghị itiku Chineke maka nnapụta site n’aka mkpagbu ahụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịbụ onye agaanapụta site n’aka ịlan’iyi ebighịebi. Chineke site n’ebere Ya naaza ekpere nke obi ahụ nke naechègharị. O wee kpọlite onye nnapụta nye ndị Israel, Ihud nwa Gira, onye Benjamin nke naeme aka èkpè.

Ngwa Ọlụ

Ihud wee meere onwe ya mmaagha nke nwere iru abụọ. Ngwa agha nke nwa Chineke abụghị nke anụarụ kama “ha sitere na Chineke bú ihe puru ikwada ebe ewusiri ike” (II Ndi Kọrint 10:4). Adụrụ onye Kraist ọdụ ka o “yikwasi ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa” (Ndi Efesọs 6:11). Anyị nwere agha nke anyị gaebu, ọ bụghị agha ụgha maọbụ nke iru abụọ kama anyị nwere Onyeisi agha nke ana adịghị emeriemeri n’agha ọ bụla. Anyị nwere ike ịgba mgba ọma ahụ nke okwukwe naenwe ezi ntụkwasịobi na Ya Onweya gaeduru anyị rue n’ọgwụgwụ.

Chineke nyere onye Benjamin a nke naeme aka èkpè agbamume ịlụso onye iro ahụ ọgụ n’ala nke aka ya naejighị ihe ọ bụla ma ọ bụghị náánị mmaagha nke emere n’ụlọ. Ọ mara ya mmà ahụ náánị otù ugbò, ma o tinyere ike ya niile na ya. Ka Chineke nyere ndịagha Ya niile aka n’ụbọchị taa ka ha tinye ike ha niile na okwukwe ha niile iji lụsoo mmehie ọgụ! Atụkwasịrị ọbụbụọnụ n’isi onye ahụ nke naeji nlefuanya lụa ọlụ Chineke maọbụ “wezuga mma-agha site n’ọbara.” N’oge niile nke Ihud naabụ onye ndú, ka emeriri ndị Moab ala ahụ wee zuru ike iri arọ asatọ.

Shamga

Akụkọ banyere Shamga dị nkenke, kama nwoke ọ bụla nke nwere ike iji ndụdụ eji achụ ehi tigbue narị mmadụ isii ekwesịghị ka elelịa ya anya. Chineke jiri Shamga lụa ọlụ, ma Shamga jiri ngwáọlụ nke dị n’aka ya lụọ ọlụ. Ụfọdụ mmadụ naanọdụ ala naeru óké uju na ha enweghị talent maọbụ iheagha dị icheiche, ma Shamga weere ndụdụ ya eji achụ ehi gaa ọlụ. Ọ napụtara Israel.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Onyenweanyị Jehova ji rapụ ụfọdụ ndị Kenean n’ala ahụ?
  2. Chọta otù amaokwu nke dị n’Akwụkwọ Nsọ nke megidere ndị Israel ịlụ nwunye na Kenean.
  3. Òlee ozízí nke dị ka nka banyere ọlụlụ di na nwunye nime Agba Ọhụụ?
  4. Ònye bụ onyeikpe mbụ nke ndị Israel nwere?
  5. Òlee otú o siri nata nrọpụta?
  6. Òlee obodo buru ụzọ merie ndị Israel n’oge nke ndiikpe?
  7. Ndị Moab òle ka etigburu n’agha ahụ mmiri ya naemighị emi nke Jọdan?
  8. Ogologo oge ra añaa ka ala ahụ zuruike mgbe anapụtasịrị ya site n’aka Otniel? Na n’aka Ihud?
  9. Òlee ihe dị icheiche nke apụrụ ịmụta site ná ndụ Shamga?
  10. Gịnị bụ ndụdụ eji achụ ehi?