Lesson 190 - Senior
Memory Verse
“Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwù Gi n’otù ka m’bu, onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-àmà-Gi nile n’otù” (Abù Ọma 119:63).Cross References
I Otù Akụkụ nke Ụgwọọlụ Ụmụ Israel n’ihi Mmehie Ha
1. Ụmụ Israel mere ihe ọjọọ wee meere onweha chi ọhụụ dị icheiche, Ndi-ikpe 4:1; 5:8; Ọpupu 20:2-6; Levitikọs 26:1; Joshua 23:6-16
2. Chineke jiri ndị Kenean mere ngwaọlụ iji nye Ụmụ Israel ahụhụ, Ndi-ikpe 4:2, 3; 5:6-8; Eklisiastis 2:26; Ndi Rom 6:23; II Pita 2:12, 13
3. Oge nke mmekpàarụ ahụ niile abawo ụba n’ịdị ogologo bụrụ kwa ihe naabịaghachị kwa mgbe kwa mgbe, Ndi-ikpe 3:8, 14; 4:3; Ilu 13:15
II Mkwà nke Nnapụta na Ngwáọlụ Dị Icheiche nke Chineke
1. Ákwá nke sitere n’obi nke onye naechègharị ka Chineke naanụ mgbe niile, Ndi-ikpe 4:3; Abù Ọma 34:18; Aisaia 63:7-9; 65:24; Maika 7:18
2. Chineke nwere ndị ozi na ndị na anọchi anya Ya, ọbụná n’oge ihe siriike karịsịa, Ndi-ikpe 4:4, 5; Aisaia 1:9; I Ndi-Eze 19:18; Ndi Rom 11:5; Ndi Hibru 11:32-40
3. Akpọrọ Berak ma nye kwa ya ike idu ndịagha nke Israel, Ndi-ikpe 4:6, 7; Job 5:17-22
. Berak naegosi akparamaagwa niile nke onye naatụ egwù Chineke n’omume ya na ịzaòkù Chineke ya, Ndi-ikpe 4:8-10; Ọpupu 33:12-17; I Ihe-Emere 21:13
III Nnapụta nye Onye Naechègharị na Mbibi nye Onye nke Naechègharịghị
1. Sisera, site ná nkekọta nke ya na ọtụtụ mmadụ, naazọ ijè naaga n’iru ịchụsọ Ụmụ Israel, Ndi-ikpe 4:11-13, 17; Abù Ọma 33:12-19
2. Debora naagba Berak ume naenye kwa ya iwu Chineke, Ndi-ikpe 4:14; Ọpupu 33:2; Joshua 1:9
3. Chineke naalụrụ Israel ọgụ naebibi ndịiro ahụ, Ndi-ikpe 4:15, 16; 5:20-22; Joshua 23:5
4. Nchebe nke ndị ụwa na ọgbụgbandụ nke ụmụmmadụ adịghị mgbe ha gaenwe ike igbochi ikpé nke Chineke, Ndi-ikpe 4:17; Aisaia 28:15-18; Emos 9:10; Obadaia 3; Luk 12:16-21
5. Mbibi nke Chineke bibiri ndị Kenean na nchebe nke O chebere Ndị Israel bụ ihe naegosi ikpé Ya megide ndị niile naemebi iwu na ebere Ya n’ebe ndị eziomume nọ, Ndi-ikpe 4:18-24; Abù Ọma 37:1-40
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEỊtamụntamụ na Ikperearụsị
Ọ dị otù ihe naeme n’etiti Ụmụ Israel nke ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ ghọọrọ ha usoro n’arọ niile ndị ahụ naesochita ọchịchị nke Moses na Joshua, n’oge nke ndị ikpe, mgbe ha matara mmegide ọtụtụ oge. Ngwangwa onye ikpe ọ bụla nwụrụ, Israel “we me kwa ọzọ ihe ọjọ n’anya JEHOVA,” ikpe nke Chineke ewee bịakwasị kwa ha. Eji ha naatụnyere “umu” n’ezie n’ihi na ha dị ka ndị náenweghị ike ime ihe ọma ọ bụla ma ọ bụghị náánị mgbe enwere otù onye ndú eziomume nke naezi ha ụzọ ime kwa ka ha guzozie. Ihe kpatara ọdịda ha n’oge niile nime ọzara, naabụkarị, n’ihi ntamù ha megide Chineke na imegide nrọpụta Ya nye ha. Ugbu a n’Ala Mkwà ahụ, isi ihe ọjọọ ha naeme bụ ikpere arụsị.
Chineke ekweworị Israel mkwà izuike, udo, akụnaụba, na ibi n’ezi nchebe na Kenean, ma ọ bụrụ na ha gaebibi mba niile ndị bi n’ala ahụ; wezuga kwa ihe niile ọ bụla nke gaeme ka ha si n’iso Ya laghachị àzụ. O kwere mkwà ịbụ Chineke ha -- Onye gaesi na mmehie gbapụta ha -- ma ọ bụrụ na ha gaeso Ya. Ma n’ebe a ha dara ule Ya. Ha achọghị iso iwu nke Chineke maọbụ ibibi mba Kenean niile ahụ naekpere arụsị kpamkpam; n’ihi nka, mba ndịa naamaghị Chineke rafuru ha, n’ihi na ịhụn’anya nke ndị ahụ bụ “umu” -- ndị ka n’ọnụọgụgụ n’etiti Ụmụ Israel, igwè mmadụ ahụ ndị naesogidesighị Chineke ike inweta eziomume Ya site ná nrọpụta ahụ dị nsọ, Ọbara nke Ọgbụgbandụ Ebighịebi ahụ -- adịghị “n’ihe ahụ nke di n’elu,” dịka ndị ahụ niile nke nna ha Abraham, onye “na-ele anya obodo ahu nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bu onye-ọkà-ya na onye lụrụ ya.” Kama ịhụn’anya ha dị, “n’ihe nke di n’ụwa”; n’ihi nka ha wee bụrụ kwa ihe dịrị onyeiro nke mkpụrụobi mmadụ mfè inweta, bụ ekwensu, onye naanwa iwú alaeze nke naemegide Alaeze nke Chineke.
“Uzọ Ndi-Nghọgbu” na Àtụmààtụ nke Chineke
Mbànye nke Ụmụ Israel banyere nime ajọ omume mgbe ọnwụ Ihud gasịrị, mere ka ha nwapụta ihe dị óké ilu ná ndụ ha. N’ihi nwezuga nke ndịa wezugara onweha, ndị Kenean kpagburu ha arọ iriabụọ. Ha nọchirị ụzọ niile atụliri atụli nke ala ahụ; ndị niile naeje njèm naesite n’ụzọ niile dị n’àzụ obodo naagafe, kama isite n’ezi ụzọ. Ndị bi n’obodo ntà dị icheiche ka ana amànye ịrapụ obodo ntà ha niile, ndị anaewusighị ike ịga n’ebe ha gaenwe nchebe dị mma. Agha dị n’ọnụụzọámá ha niile, ma ọ dịghị otù ubè maọbụ mmaagha nke dị n’etiti mmadụ ndịa ọnụọgụgụ ha ra ka iri puku anọ (40,000) n’akụkụ a nke Israel. Ihe ndịa niile naabịakwasị ha n’ihi na ha achọwo chi ọhụụ dị icheiche wee rapụ Chineke nke Abraham, Aisak na Jekob, ndị bụ nna ha. Otú a ka ụzọ onye nghọgbu (onye naemebi iwu) dị!
Ma náagbanyeghị otú nhụjuanya ahụ si di n’ebe ha nọ, ọ bụ náánị ezi “ugwọ-ọlu” nke mmehie náaghaghị iwetara ha, tinyekwara ndị niile nke gaajụ ịrapụ mmehie ha chigharịkute kwa Chineke site n’obi ha niile. Ọ dịghị mgbanarị gaadịrị ụgwọọlụ niile ahụ. Ịchọmma dị icheiche nke naeso agaghị egbochi ha. Ọ dịghị ohere O nyere nke naegosi na nkwụghachị nke ụgwọọlụ ahụ agaghị abịa ngwangwa. Mmehie naeweta ọnwụ, ma náánị ihe mgbapụ nke dị n’ụgwọ ahụ bụ itiku Chineke maka ebere.
Lee otú nrọpụta niile nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ji bụrụ ihe jupụtara n’amamihe! Lee otú o si dị ukwuu dị kwa ebube bụ àtụmàtụ niile nke Chineke tụpụtaworo, site ná nrọpụta ahụ niile nke bụ ka onye Ya “achupuru achupu” wee ghara ịbụ onye “achupuru” n’ebe Ọ nọ! (II Samuel 14:14). Mmehie anyị niile naebutara anyị ụgwọọlụ nke ọnwụ; ma Kraist nyere Onweya, hụ kwa ahụhụ, wee nwụọ, ka O wee kwụọ ụgwọ mmehie anyị ka ewee gụọ kwa anyị ná ndị eziomume site n’amara na ebere Ya nke naenweghi nsọtụ. Ọ dịghị mgbanwe dịrị Iwu ebighịebi Ya n’ebe a, n’ihi na akwụrụ ụgwọ mmehie ahụ kpamkpam. Ọ nọgidere ịbụ onye eziomume, wee bụrụ kwa onye naagụ ndị niile kwere na Jisọs ná ndị eziomume.
Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ imeworị nka, n’ihi na anyị niile nọ n’okpuru ikpeọmụma nke ọnwụ n’ihi mmehie anyị niile. O weere ịwụsa Ọbara ahụ nke naemeghi ihe ọjọọ iji kpuchie mmehie niile nke mmadụ. Mmehie ahụ bụ mmebi nke emebiri iwu ahụ nke naenweghị nsọtụ; ya mere ụgwọọlụ nke mmebi iwu ahụ gaabụ kwa nke naenweghi nsọtụ. Ihe Ndochi ahụ otù aka ahụ aghaghị kwa ịbụ ihe nke naenweghị nsọtụ. Enwere náánị otù onye Onye pụrụ imezu ihe ndịa niile achọrọ; Aha Ya bụ Jisọs!
Ihe Niile nke “Ogho Uhie” ahụ Lụpụtara
Site na mbụ, ihe dị n’obi Chineke Nna, bụ na Kraist ka “egbuworo site n’oge itọ ntọ-ala nke uwa,” ma n’ihi na emere mkwà nke Ọgbụgbandụ ahụ ka ọ dịrị “agburu nile nke uwa,” anaenwe mgbe nile ndi nke nabatara nrọpụta ahụ na ndi azọpụtara n’ezie site ná mmehie niile ha. Ọ naghị abụ ọnụọgụgụ dị ukwuu n’oge ọ bụla -- n’ihi na Kraist chetaara anyị na ọ bụ náánị “igwè aturu nta” ka Chineke naakwadobere otù Ebe obibi ebighịebi -- ma ọtụtụ mmadụ n’otù n’otù, na mgbe gara aga, bụ ndị jiri obi ha niile soro Chineke. Eziomume a nke Chineke tinyere nime ndị nsọ Ya nke Agba Ochie juru eju ma baa kwa óké úrù, otú a ka ịdịnsọ nke Chineke, nke Ọ kụrụ n’obi ha si dị kwa ebube, nke mere na Mmụọ Nsọ naechetara anyị na ọ bụ òkè na ọlụ dịrị anyị isoro ndị ahụ nke mejupụtara óké “igwè ndi-àmà” dị otú a.
Nwoke -- Ka ọ bụ Nwanyị?
Ọbụná n’oge ahụ gbara ọchịchịrị nke nhụju anya nke Ụmụ Israel enwekwara olenaole ndị kpebiri iguzoro Chineke kpebie kwa ijidesi ihe banyere Ya ike. Chineke adịghị akpá òkè onye bụ nwoke maọbụ nwayị dịka ọtụtụ nke mmadụ si dị n’ihe banyere ikike maọbụ ihe mmadụ pụrụ ime. N’oge nhụju anya a obi ụmụ mmadụ gaadaworị m̀bà n’ihi egwù na nsogbu nke bịakwasịrị ha. Ma Chineke bụ ihe niile, dị kwa nime ihe niile! Anyị bụ náánị ihe ọlụ n’aka Ya. Ma ọ bụ otù onye maọbụ anyị niile bụ ihe naabaghị n’ihe n’onweanyị. Ikike niile nke anyị pụrụ inwe bụ nke Chineke naenye. Ọ dịghị ihe ọ bụla anyị nwere ma ọ bụghị nke anyị natara n’aka Ya. Chineke nwere ike iji nwayị lụọ ọlụ ọbụná dịka Ọ pụrụ iji nwoke -- otú a ka O mekwara n’oge a. Ọ dịghị ịkpá ókè ọ bụla dị n’ebe Ọ nọ.
Enwekwara ọtụtụ oge n’akụkọ banyere ụmụ mmadụ mgbe obi ụmụ nwoke dara m̀bà ma otù nwayị kwesịrị ntụkwasịobi ewee guzo ná ntipu ahụ ịbụ Oriọna nke Eziokwu na nke Inwere onwe ahụ elu nye ụwa nke naasọgharị isi n’ọchịchịrị nke naenweghị kwa olileanya n’ihe nke mmụọ. Anyị nwere Oziọma ahụ taa n’ihi mmụọ dị ike nke ọtụtụ ndinyom ndị naatụ egwù Chineke ndị, n’otù ọgbọ maọbụ abụọ garaaga guzosiwororị ike n’Oziọma ahụ, ma kwesị kwa ntụkwasịobi n’ihe ahụ nke enyeworo ha n’aka ime. Ohere adịrịghị anyị n’ebe a ikwu ihe banyere ndịa, dịka Susana Wesley, nne nke Jọn na Charles Wesley, Evangeline Booth, Frances Havergal, Fanny J. Crosby, Mary Slessor na ọtụtụ ndịọzọ ndị kwesịrị ntụkwasịobi n’ijé ozi ha nye Chineke. Ma anyị onwe anyị ndị sitere na Apostolic Faith bụ nnọọ ndị o were anya nke ọma na Chineke naeji ndinyom alụ ọlụ Ya, ebe anyị hụworo n’onweanyị ndụ ahụ nke naenweghị àtụ n’ijéozi nke óké nwayị ahụ bụ onye nke Chineke, Reverend Florence L. Crawford, onye tọrọ ntọala nzukọ anyị. Site n’ikwesị ntụkwasịobi nke Nne anyị Crawford n’ebe Chineke nọ, site kwa na mmetụta ya n’ebe ezi ndị kwere ekwe dị nime ụwa, ozízí nke odudonsọ zuruòkè dịka ọlụ amara nke dị iche, nke naesochita ịgụ mmadụ n’onye eziomume bụrụ kwa nke naebụ Baptizim nke Mmụọ Nsọ na ọkụ ụzọ, ka nọ kwa nime ụwa. Site kwa n’ihi nka ka anaenweta ezigbo Baptizim nke Mmụọ Nsọ na ọkụ taa, ọ bụ ezie na onyeiro nke mkpụrụobi enyewo ọtụtụ mmadụ ihe na abụghị ezigbo ya.
Chineke kpọrọ Florence Crawford n’ụzọ pụrụ ichè karịsịa, o wee rapụ òtù dị icheiche na ozízí niile nke ekweghị ekwe wee ghọọ ezi onye Kraist. N’oge naadịghị anya o wee chọsie ohere nke ọ gaeji jeere Chineke ozi ike, bụ Chineke ahụ Onye ọ chọrọ ịhụ n’anya nke ukwu, o wee chọta kwa ohere ahụ site n’ịmalite ịlụ ọlụ ntà dị icheiche nke dị ya nso. Anyị anụwo mgbe ọ naakọ akụkọ na ya naakpọkọta ụmụntakịrị site n’ámá dị icheiche gaa n’ụlọ ya ịsacha ha ọnyá nke dị ha n’ụkwụ, ọ naeme nke ahụ n’Aha Onyenweya. O wee malite ileta ndị mkpọrọ na ịgba kwa ha ume na ikpere ha ekpere. Chineke nyere ya ọtụtụ mkpụrụobi ndị naechègharị n’akụkụ nke ọlụ ahụ, ọbụná n’ụzọ nke ya onweya naapụghị ịghọta na mgbe ahụ, nke ahụ duuru ya site n’ozi Alaeze ahụ wee nye ya ọlụ pụrụ ichè nke ịbụ onyendú n’Oziọma ahụ.
Ọ malitere nnọọ akụkụ nke ọlụ ya ahụ site n’okwukwe, n’irubeisi n’ọkpụkpọòkù nke Chineke. Onyenweanyị mere ka ubi nke ijéozi ya baa ụba, ma dịka ọ naekpe ekpere, naakụzi ihe, naekwu kwa okwu Chineke naadụ kwa ndị nọ n’okpuru ya ọdụ, Chineke nyere ya owuwe ihe ubi riri nne n’oge nke ịghọ mkpụrụ ya. Mmegide bịara, n’ihi na enwere ọtụtụ mmadụ ndi siteworo ná mmalite ma n’oge na adịghị anya ha malitere iwepụsị ụkpụrụ ahụ dị nsọ nke Chineke tọrọ -- iwere ụzọ dị mfé dochie -- ná ntụfù nke mkpụrụobi ha na mkpụrụobi nke ọtụtụ mmadụ ahụ anaapụghị ịgụta ọnụ bụ ndị sooro ha. Ma ya onweya guzosịrị ike; otù nwayị guzogidere ọtụtụ ndikom ndị obi ha dawororị m̀bà n’ihi isite “n’uzọ nke mgbe ochie” ahụ pụọ. O jidesịrị ijéozi nke nzukọ Apostolic Faith ike site n’ozízí ahụ nke naenye ezi ndụ nke dị na Baịbụl wee tọọ kwa ntọala nke naeguzosi ike rue ụbọchị taa nke ganaeguzo kwa rue mgbe Jisọs gaabịa. Lee otú obi anyị si jupụta n’ekele maka ndi bụ Deborah nke ọgbọ niile!
Chineke nwere ọlụ nye mmadụ niile -- nwoke na nwayị, ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ, ụmụ ntakịrị nwoke na ụmụ ntakịrị nwayị. Dịka ọtụtụ mmadụ si dị anaele ụfọdụ anya dịka ndị naadịghị ike maọbụ ndị naezughịòkè, ma ọ dịghị onye ọ bụla nke nyebigara onweya ókè n’ebe Chineke nọ Ọ naagụ na o rughịeru. O nwere ike iji ihe naadịghị ike lụọ ọlụ zuruòkè, ma ọ bụrụ na ha enyebiga onwe ha ókè n’àtụmàtụ Ya na nime uche Ya. Ọ bụrụ na ọ dịghị otú a, olee otú agaesiteworị mezue Àtụmàtụ Ya n’ụzọ ọ bụla? Ọ dịghị onye ọ bụla nime anyị ọbụná tinyere ndị dike n’ihe nke mmụọ n’oge ochie nke zuworo òkè n’onweya. Anyị niile bụ ndị orù naabaghị n’ihe -- ihe ọlụ naezughị òkè -- ndị dabere nnọọ kpamkpam na Ya.
Deborah na Berak
Deborah bụ ihe ọlụ nke Chineke. Ọ bụ onyeamụma nwayị nke pụtara na o wetaara ndị ahụ okwu nke si n’ọnụ Chineke pụta, bụrụ kwa ihe ndị niile maara ya matara nke ọma, n’ihi na ha niile -- ma nwoke ma nwayị -- bịakutere ya. Anyị ekwesighị ịtụ egwù erughị eru anyị ma ọ bụrụ na anyị naeje ijè n’etiti (nime) uche nke Chineke. Anyị nwere ike bụrụ ndị anaele anya na anyị erughị eru dịka olileanya mmadụ si dị ịbụ ndịozi nke Chineke, ma nke ahụ apụtaghị na Chineke enweghị ike iji anyị lụọ ọlụ ma ọ bụrụ na anyị enyebiga Ya ndụ anyị ókè.
Chineke naachọ ụmụokorọbịa! Ọ naachọ kwa ụmụ agbọghọbịa, n’otù aka ahụ! Ọnọdụ dịrị ha niile n’ubi vine Ya; na mmadụ bụ nwayị n’ọmụmụ ya apụtaghị na nke ahụ ebilatawo mmetụta maọbụ ụdị ọlụ nke ọ gaalụrụ Chineke. Ọtụtụ ndị nke akpọrọ ijere Chineke ozi chigharịrị naejere náánị mmadụ ozi -- mgbe ụfọdụ náánị ọchịchọ nke aka ha ka ha naejere ozi! Ọ bụrụ na Chineke akpọwo anyị ịbụ ndị orù Ya, anyị agaghị atụgharị wee bụrụ eze! Ebe ijéozi ya kachasị ala n’ubi vine nke Chineke karịrị ọnọdụ maọbụ ọkwa dị elu ahụ nke mmadụ, mbà maọbụ ọtụtụ mba ejikọtara ọnụ pụrụ inye.
Berak ghọtara ọkpụkpọòkù nke Chineke kpọrọ Debora. Ọ dịghị mgbe ọ malitere ịkọwa onweya, maọbụ ịkọwa ịdị mkpà nke ya onweya, n’ụzọ ọ bụla. Ọ ghọtara onweya, na ikpé nke ya onweya, ghọta kwa onweya dịka ihe naadịghị óké ọnụ n’ụzọ ọ bụla karịa ihe ọ bụla nke sitere n’aka Chineke na ihe Chineke onweya kwadoworo. Dịka Moses, onye naachọghị iduru Ụmụ Israel baa n’Ala ahụ Ekwere ná Mkwà ma ọ bụrụ na Iru Chineke esoghị ha jee, Berak jụrụ iduru ndị agha Israel ahụ gaa n’ọgụ nke ha na ndị Kenean ma ọ bụrụ na onyeozi nke Chineke esoghị n’ebe ahụ iduzi ha ụzọ mgbe niile.
Lee ụdị iheọmụmụ nke anyị pụrụ ịmụta site n’ebe onye nke Chineke a nọ! O nwere obi umeala, ma nke ahụ apụtaghị na ọ dịghị ike n’omume ya maọbụ na ọ bụ onye naadịghị ike n’okwu banyere inwe mkpebi. O nwere obiike. O nwere ume. O nwere ùgwù site n’ebe ndị agha nke ndị Israel nọ. Ma o nwekwara ihe karịrị nke ahụ. O nwere nkwenye dị omimi nke mere na ọ gụrụ ihe niile o nwere n’ihe efu. Ọ chọrọ inyeaka nke Chineke, o matakwara nka. O nwere mmụọ nke naagaghị atụfụ oge n’ịnabata erughị eru ya, wee gbaso izuókè nke sitere na Chineke ma nabata kwa ya mgbe ọ bịara, naagbanyeghị otú Chineke si chọọ iwere ya nye ya.
leghịanya, ndị Kenean, gaecheworị na ọ bụ onye nzuzu ma ọ bụrụ na ha nụrụ mkparịta ụkà ahụ nke ha kparịtara. Ha gaakpọwo yarị onye naadịghị ike iduru ndị agha nke naalụ ọgụ gaa n’ọgbọ agha, ebe ọbara ụmụ mmadụ ganaasụ dịka mmiriiyi na ọbụná onye ahụ nke kachasị ike n’ile ya anya gaasụ ngọngọ mgbe ọ ga ahụ ihe dị óké egwù nke ga abụ kwa náánị ihe naagbawa obi n’ọgwụgwụ nke ụbọchị mbụ nke agha ahụ. Òlee ụdị inyeaka nke gaesi n’aka nwayị bịa n’oge dị otú a?
Berak maara adịghị ike ya -- ebe ike mmadụ ọ bụla pụrụ ịkwụsị kwa. Ọ matakwara ebe agaesi chọta ike nke sitere na Chineke; ọ matakwara onye Chineke kpọrọ ịbụ onye ndú n’ihe banyere Eluigwe. Ọ matakwara na ọ dịghị ihe agaeme nke ọma ma ọ bụrụ na Chineke abụghị onye mmalite na onye ganaarọpụta ihe niile dị na ya. O mere ka mkpebi ya doo anya ma kwupụta kwa ihe bụ nguzo ya. Ma n’ihi na mkpebi ya ahụ ziriezi, Debora wee kwenye na ya ngwangwa, wee soro Ụmụ Israel niile gaa n’ọgbọ agha -- ebe dị iche nke anaagaghị ahụta nwayị n’ihi obi ha nke naesighị ike, nke jupụtara n’egwù, na nke ike ha naezughị ezu karịa ka mmadụ pụrụ ịtụle.
Ụzọ Ahụ Nke Siriike, kaọbụ Ụzọ Dị Mfé?
Ụfọdụ naekwu na ha apụghị ịlụrụ Chineke ọlụ ụfọdụ n’ihi na ha abụghị nwoke; maọbụ n’ihi na ha enweghị ike maọbụ ntozu òkè nke ana ahụ anya, ọbụná asịkwarị na ha bụ nwoke. Debora rapụrụ ịdịụtọ maramma na nchebe nke onweya n’okpurù nkwụ ya, na kwa ọlụ ndi ọzọ dị mkpà nke onye-amụma nwayị na nke onye-ikpé, wee jee ime uche Chineke. Ọ rapụrụ ndụ nke ụmụ nwayị nke oge ya naebi, ọbụná otù ọlụ pụrụ ichè nke ihe mmụọ, wee bànye n’ọlụ Chineke nke dị ukwuu karịa. Ebe niile nke o jere adịghị mfé. Ihe niile nke ọ hụrụ abụghị nke wuliri mmụọ ya. Ma o sogidere Chineke wee rọrọ ụzọ ahụ nke siri ike -- ụzọ nke dị ichè site n’échìchè nke nwayị ọ bụla -- ma ọ chọtara ọñụ nke dị ukwuu na ụgwọọlụ nke sitere na Chineke nke naenweghị nke agaeji tụnyere ya, n’akụkọ ụwa niile. Nkọwa ya banyere ọñụ na otuto bụ nke sitere ná nrubeisi na ntụkwasịobi ya n’ebe Chineke nọ bụ nnọọ ihe jikọtara ọtụtụ ihe ma baa kwa úrù iji kụzie ihe nke mere na edere ya na Baịbụl, ọ bụrụwo kwa isi okwu nke ọtụtụ okwu Chineke anaapụghị ịgụta ọnụ nke ndị nke Chineke kwuru, nke ọtụtụ ndé ụmụ mmadụ jiri nwee nwuli elu ma bụrụ kwa ndi adọrutere nso Chineke.
Debora pụkwararị ikwu na okpuru nkwụ ebe anaanọ ekpe ikpé abụghị ọnọdụ dịrị nwayị. Ọ gaatụleworị n’obi ya na ọnọdụ nke ịbụ ọchịagha ekwesịghịrị Berak na ọ bụrụ na Berak anabata échìchè ahụ, nke ya onwe ya chepụtara, ebe apụrụ ịsị na o nweghị agbamume, na mkpebi. Berak¸ n’otù aka ahụ kwa, pụrụ ịhụworị otù ọjụjụ ahụ nke Debora gaenweworị mmetụta ya n’obi ya.
Debora, eleghịanya gaenupụworị isi n’échìchè nke ịga n’ọgbọ agha ebe ọ gaahụ ndị nwụrụanwụ na ndị na anwụ kwa anwụ gburugburu ya, na anụ kwa ákwá na ịsụ ude ka ha naarịọ ka ha nwụọ ka ụfụ ha na ahụhụ ha wee bie. Ọ pụkwararị iche na ndụ gbalụgbalụ nke onyeagha nọ n’ọgbọ agha abụghị ọnọdụ dịrị n’obi dị nrò nke ndinyom. Ma Debora agbasoghị ụzọ ahụ amaara nke ọma. O wee soro Chineke! Ma n’ihi mkpebi ya, na omume nke naeso ya, ọtụtụ puku mmadụ nọ n’Ala nke Otuto n’ụbọchị taa.
Ụfọdụ nime Ụgwọọlụ nke Mmehie
Nnapụta bịaara ndị Israel n’ụzọ nke anaatụghị anya ya. Akwụkwọ Nsọ naakọwa na “kpakpando si n’uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha”; na “JEHOVA we were ọnu-nma-agha chusa Sisera na ugbọ ala ya nile, na ọmuma-ulo-ikwu ya nile”; ọzọ kwa na “Miri-iyi Kaishon bupuru ha.” Jael, nwunye Heba, nyere aka n’imechi ntipu ahụ site n’iwere ohere o nwere gbue Sisera, onye iro nke Ụmụ Israel, bụ onye akaworo akara maka mbibi.
Ndị Kenean nwekwara otù ụdị ohere ahụ ichigharịkute Chineke dịka Rehab. Ha onweha so kwa ná ngọzi nke mkwà ahụ ekwere agbụrụ niile nke ụwa nke dị n’okpuru Ọgbụgbandụ Ebighịebi ahụ. Kama nka, ha jụrụ nzọpụta Chineke wee buso kwa Ya agha. Onyendú ha zobere onweya n’ebe o chere na ọ bụ ebe nzuzo nke udo nke ọ tụpụtara n’onweya ma ọ bụghị otù ebe Mgbaba ahụ siriike nke arọpụtaara mmadụ. Ebibiri ndịagha nke Jebin, eze Kenean. Sisera bụ ọchịagha nke ndịagha ahụ ka ebibikwara. Eze ahụ ka ebibikwara.
Ekwuwo kwa ya sị na mgbe Chineke biliri ibu agha, ọ dịghị onye gaeguzogide Ya; mgbe Ọ naachụso mmadụ ọ dịghị mgbapụ gaadị; ma mgbe Ọ malitere Ọ gaeme kwa ka ọ gwụsịa. “Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu.” Ndịa bụ ndị guzogidere Chineke, nupụrụ Ya isi, natara ntaramahụhụ ahụ nke gaabịakwasị onye ọ bụla nke rọrọ mmehie karịa eziomume, ndị hụkwara asọpụrụghị Chineke n’anya karịa ịdị nsọ ahụ, ndị hụkwara ọnwụ ebighịebi n’anya karịa ndụ ebighịebi. Ọ dịghị mgbapụ nke gaadị site n’ebe ikpé eziomume niile nke Chineke ebighịebi dị.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị bụ ajọ omume ahụ kachasị nke dị n’obi Ụmụ Israel mgbe ahụ ha nọ ná nwagharị ahụ nime ọzara?
- Òlee isi ajọ omume ahụ nke dị n’obi ha mgbe ha malitere ibi na Kenean?
- Òlee iwu niile ahụ ha mebiri site ná mmehie ha mere? Òlee ndị ikpé mara ha nime ha?
- Òlee otú Chineke si jiri ndị Kenean lụọ ọlụ n’àtụmàtụ Ya? Na gịnị ka ejiri ha jee ozi?
- Gụpụta Ndi Rom 6:23 site n’isi.
- Ònye ka Chineke sitere n’ọnụ ya kwue okwu, ime ka uche Ya pụta ìhè n’ebe ndị Israel nọ, n’oge a?
- Kpọọ aha ndịọzọ, ndị ụwa pụrụ ịkpọ ngwaọlụ naadịghị ike ndị Chineke jiri lụọ ọlụ dị ike.
- Òlee ụdị omume Berak mere mgbe akpọrọ ya n’ọlụ ruuru ya?
- Omume ya ò ziriezi? Gịnị bụ ihe naadịkarị mfé ime n’ụdị ihe yiri nka?
- Òlee otú esi nye ndị Israel mmeri?