Ndi-ikpe 5:1-31

Lesson 191 - Senior

Memory Verse
“Mu onwem gābùku JEHOVA abù, ọbuná mu onwem; m’gābùku JEHOVA¸ bú Chineke nke Israel, abù ọma” (Ndi-ikpe 5:3).
Cross References

I Okwu Butere Abụ Nke Debora Na Berak Ụzọ

1. Enyere Chineke otuto maka nnapụta Ya, Ndi-ikpe 5:1-3

2. Ebube Chineke, ịdịukwuu¸ na ike, nke egosipụtara n’ihi Israel ka agụgharịrị, Ndi-ikpe 5:4, 5; Deuteronomi 33:2; Abù Ọma 68:7, 8; Habakuk 3:3, 4

3. Edepụtara ọnọdụ ihere nke ndị Israel, n’ihi ikpere arụsị, Ndi-ikpe 5:6-8

4. Enyere ndịisi Israel kwesịrị ntụkwasịobi otuto, Ndi-ikpe 5:9

5. Ekpughere ọchịchị nke udo, eziomume na ikwesị ntụkwasịobi nke ndị Israel n’ọdịn’iru -- naekwu kwa, ma eleghịanya maka ọchịchị udo nke Puku arọ, Ndi-ikpe 5:10, 11; Aisaia 2:1-4, 10-21

II Ọjịjá Maka Ijéozi n’Afọofufo; Ịbasi Mbá Ike n’ihi Umengwu

1. Akpọkwara òkù ahụ ọzọ maka ịbụ onyendú na ijeozi, Ndi-ikpe 5:12, 13

2. Étoro ijéozi afọofufo nke Efraim, Benjamin, Manase (Makia), Zebulun, Isaka na Naftali, Ndi-ikpe 5:14, 15, 18

3. Abara mbá megide ọchịchọ nke onweonye na umengwu nke Ruben, Gad (Gilead) Dan na Asha, Ndi-ikpe 5:15-17; Jenesis 49:3, 4

4. Chineke bụrụ ndị Miroz ọnụ maka enweghị mmetụta n’obi na umengwu ha, Ndi-ikpe 5:23

III Usoro nke Agha Ahụ na Ihe Ọ Lụpụtara

1. Agwara ndị Israel na ebo ndị ahụ nke zara òkù ahụ mere nka n’afọofufo, naachọghị úrù ọ bụla nke ego, Ndi-ikpe 5:19

2. Echetakwaara ha na Chineke bụ onye buuru ha agha ahụ ma merie kwa, Ndi-ikpe 5:20-22; 4:9, 14, 15, 23

3. Ikwesị ntụkwasịobi nke Jael nye ijé ozi nke Chineke, naagbanyeghị ọgbụgbandụ ya na onye naamaghị Chineke ahụ ka etoro, Ndi-ikpe 5:24-27; 4:11, 12, 17-21

4. Ebe nchebe anụarụ nke onye naamaghị Chineke, na abaghị úrù ya ka emere ka ndị Israel mara, Ndi-ikpe 5:28-30

5. Ngọzi ukwuu ikpeazụ nke naemetụ n’obi ka enyere, Ndi-ikpe 5:31; Ndi-Hibru 11:32-34, 39

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Abụ nke Otuto

N’ụzọ pụtara ìhè nke ọma, Ndịikpe isi nke ise niile jupụtara náánị n’abụ nke Debora na Berak bụrụ mgbe agha ha na ndịagha Kenean bịaruru n’ọgwụgwụ ya. Ahịrị okwu ya ọ bụla naekpughe ụfọdụ iheomimi na ihe kachasị mma nye obi nke naachọ eziokwu nke bakwara úrù ná ndụ anaadị taa, ọ bụ ezie na edepụtararị abụ ahụ wee bụọ kwa ya ihe karịrị arọ puku atọ garaaga.

Mgbe anaeji abụ a tụnyere abụ ndịọzọ dị nime Akwụkwọnsọ, mmadụ nwereike ịhụ ihe yiri ibe ya ná mpaghara mbụ ha maọbụ mmalite nke abụ otuto dị icheiche. Abụ nke Moses ná ngabiga nke osimiri uhie (Ọpupu 15:1-21) na kwa abụ ikpeazụ nke ọ bụrụ n’ọgwụgwụ ndụ ya (Deuteronomi 32:1-43), malitere ná nkwupụta nke otuto nye Chineke na ịgbaàmà nke ịdịukwuu Ya. Ekele ahụ nke Hana nyere (I Samuel 2:1-10), ọtụtụ nime Abụ Ọma, abụ ekele nke Aisaia (Aisaia 12:1-6), abụ nke Meri, nne nke Jisọs (Luk 1:46-66), obubuamụma nke Zekaraia, nna nke Jọn Baptist (Luk 1:67-79), na abụ nke ndị agbapụtara ndị nọ gburugburu ocheeze nke Chineke (Nkpụghe 5:9-14; 7:12-17; 15:3, 4) ha niile ka amalitere site n’ịkọwa ịdịukwuu nke Chineke na otuto nye Onye ahụ nke pụrụ ime ihe niile. Ekpere ahụ nke Jisọs nyere dịka usoro esi ekpe ekpere, bụ nke amaara dịka Ekpere nke Onyenweanyị ka amalitekwara n’otù ụdị ahụ (Matiu 6:9-13). Ya mere, iheọmụmụ nke mbụ agaamụta n’abụ nke Debora a bụ mkpà ọ dị ịbịakute Chineke n’ụdị kwesịrị -- n’òfùfè na otuto.

Nnapụta Dị Icheiche Nke Chineke

Onyinye nke Iwu ahụ n’Ugwu Sainai bụ ọkọlọtọ dị elu n’akụkọ ụwa nke Ụmụ Israel. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Chineke na ndị Israel gbara ndụ -- ọgbụgbandụ doro anya -- nke dị iche n’ọgbụgbandụ nke Ya na Abraham, Aisak na Jekob gbara. Ọ bụ kwa n’ebe ahụ ka ndị Israel laghachịrị àzụ site n’ọlụ dị icheiche enyere ha nime ọgbụgbandụ ahụ. Chineke n’ebube na ike Ya, ka emere ka Ọ pụta ìhè nye ha n’Ugwu Sainai ka ha naanụ olu Ya mgbe Ọ naekwupụtara ha iwu Ya na ihe niile achọrọ n’ọgbụgbandụ Ya. Ihe ọ bụla nke mere n’akụkọ nke mba ahụ na mgbe ochie, ma kwa nke emeere mmadụ ọ bụla nime ha, nke gosiri ogbugbo nke Aka Nsọ dị ike nke Chineke n’ihi ha, chetakwaara ha ọzọ ihe banyere Sainai na kwa ebube na ike ahụ nke ha hụrụ emere ebe ahụ.

Chineke buuru ndị Israel agha megide ndị agha nke Jebin, eze ndị Kenean. Ọ bụghị n’ike nke iheagha nke Ụmụ Israel nyere mmeri, n’ihi na n’etiti ọnụọgụgụ mmadụ nke dị puku irianọ (40,000) ndị Israel ọ dịghị otù onye ahụrụ ji ọta maọbụ ubè. Anyị ahụwo n’iheọmụmụ anyị nke mbụ na anaakpagbu ha nnọọ n’ebe ọ dị ukwuu nime arọ iriabụọ garaaga. Ma mgbe ha tikuru Chineke maka enyemaka Ọ nụrụ olu ha wee napụta ha.

Agwaghị anyị kpọmkwem ụzọ Chineke ji chụsaa ma bibie kwa ndi Kenean, kama na mmiri bufuru ọtụtụ nime ha rue ọnwụ na kwa Eluigwe onweya na ike niile nke ihe èkèrè èkè jikọtara ọnụ megide ndịa naamaghị Chineke. Ọ bụ site n’ogweaka nke Chineke ka enyere ha mmeri ahụ, n’ihi na ndị Israel rubereisi n’iwu niile nke Chineke wee nye kwa onwe ha n’afọofufo n’ihi ijéozi nke Chineke. N’ihi mmeri a, obi Debora jupụtara n’ọñụ na mbuli nke mmụọ bụ nke naesokarị mmeri.

Ọ bụ kwa otù Chineke ahụ nke kwuru okwu n’Ugwu Sainai bụ Onye bukwara agha megide Sisera na ndị agha Kenean. Ọ bụ kwa otù Chineke ahụ onye chịkọtara mmiri niile nke Osimiri Uhie na Osimiri Jọdan ime ka Ụmụ Israel wee gabiga dịka n’ala akọrọ. Ọ bụ otù Chineke ahụ onye ziteere ha nnụnụ quail ka ha rie, onye rọputakwaara ha manna, otù aka ahụ, abalị isii nime ụbọchị asaa rue iri arọ anọ. Ọ bụ kwa otù Chineke ahụ onye mere ka mmiri si na nkume ahụ dị elu gbapụta; onye tinyere ndịiro ha n’ọnọdụ ihere, onye zipụrụ ebu ịnapụta ha; onye jiri ogidi igweojii kpuchie ha n’ehihie pụọ n’okpomọkụ nke anyanwụ n’ọzara ahụ; onye jikwara ogidi ọkụ due ha n’abalị. Ọ bụ kwa otù Chineke ahụ onye pụtara ìhè n’elu Oche Ebere nke ebe Nsọ kachasị ebe Nsọ niile; onye meghepụrụ ala wee lodaa ndị nupụụrụ iwu nsọ Ya isi; onye kwaturu mgbidi niile nke Jeriko; onye zitere ihe otiti dị icheiche n’arụ ndị Ijipt ma napụta ndị Israel site ná mbibi dị ukwuu nke ihe otiti ahụ.

Ọ bụ ihe dị ezi mma ileghachị anya n’àzụ ịhụ nnapụta dị icheiche nke Chineke nyeworo anyị site ná nsogbu, mmehie na ajọ ihe. Ọ dị mma ime nka n’oge nsogbu Ọ dị kwa mma karịa ime otú a mgbe mmụọ anyị naejupụta n’échìchè nke mmeri Chineke nyeworo. “Ọ bụ ezi ihe ikele JEHOVA ekele, na ibuku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu” (Abù Ọma 93:1).

Okpụkpọòkù, Ọjịjá Niile na Ịbámbá Niile

Iheọmụmụ anyị nke garaaga gosiri anyị omume niile nke Debora na Berak dịka egosipụtara ya nye anyị site n’ọzịzá nke ọkpụkpọòkù ha na ikwesị ntụkwasịobi ha nye Chineke. Ma, ọ bụ ihe nwuta na ndị Israel niile adịghị ka ndị orù nke Chineke abụọ ndịa.

Ọ bụ náánị ebo iri ka akpọtụrụ aha n’ahịrị niile nke abụ a. Simeon na Juda esoghi. Eleghịanya, ịdịanya nke ebe obibi Simeon na Juda site n’ọgbọ agha ahụ bụ ihe kpatara ka aghara ịhụ ha n’ebe ebo Israel ndịọzọ nọ n’iru agha. Nkera nke ebo Manase nke biri n’ọwụwa anyanwụ nke Jọdan so kwa ná ndị ahụ abasiiri mbá ike bụ “Gilead” dịka anaakpọ akụkụ a niile nke ala ahụ nke ndịa bi nime ya.

Berak chịkọtara ndị agha ya dị puku iri (10,000) n’ọnụọgụgụ site ná ndị bi nso ụlọ ya nke bụ ókè ala ebe ebo Zebulun na Naftali naebi. Ha sitere n'akụkụ ndịda ugwu n’ịgaru ugwu Teboa ma n’oge ntakịrị ha wee busoo ndị iro ahụ agha, n’ihi na Heba adụwo ndị Kenean ọdụ, ndị ha na Jebin meworo udo mgbe garaaga, na ndị Israel naachịkọta onwe ha n’ugwu ahụ. Ébé anọ lụọ ọgụ a bụ ebe ebo Isaka na nkera ebo nke Manase naebi bụ ndị nke gabigaworo Jọdan inweta ihe nketa ha n’ala Kenean. Na ndịdaugwu nke ọgbọagha a ka Efraim na Benjamin ketara ebe obibi ha, ha sonyekwara n’agha ahụ, eleghịanya ha pụtara ibu agha n’ọgwụgwụ nke agha ahụ.

Ebo abụọ na ọkara ahụ ndị bi n’ọwụwaanyanwụ nke Jọdan ebighị n’ebe dị anya site n’ọgbọ agha ahụ isoro bue agha ahụ. Ọ bụrụ na ha echee si na ebe ha bi dị anya irù n’ọgbọ agha ahụ, ọ bụ site ná nrọrọ nke ha kpatara nka. Ebe ha sitere n’ọchịchọ nke onwe ha rọrọ ebe ahụ, ha kwesịrị iji obi ha dum nara nsogbu ọ bụla nke pụrụ ịdapụtara ha n’ijekuru ndị Israel n’iru agha ka ha wee lụgbue maka ọdịmma nke mba ahụ niile. Asị na obi ha niile ziriezi n’ebe Chineke nọ ha gaemeworị nka naajụghị ajụjụ maọbụ isi agụgọ ọ bụla.

Ma ndị Reuben nọgidere n’ogige atụrụ ha, naenwe mmasị n’ihe nke aka ha karịa n’ihe nke Chineke. Ha adịghị atụkwasị obi ha n’ihe nke dị n’elu kama ha naachụso ihe nke ndụ a nke naadị nwaoge. Ndị Gad kwa, na nkera ebo Manase ndị bi n’ofè Jọdan bụ ndị jụrụ isoro ụmụnne ha ịbànye n’Ala Mkwà ahụ n’ọtụtụ arọ garaaga, gosikwara ọzọ umengwu na enweghị mmasị ha n’ọlụ nke Chineke.

Asha nọ kwa n’ọnụ-miri ya -- ọ bu ezie na ha pụrụ ijeru n’ọgbọ agha ahụ ma ha arapụghị ókè ala ha. Ha nọgidere n’ebe ha ewusiri ike maọbụ etipuruetipu. Ha bụ ndị ikpé màrà, ọ bụghị náánị na ha lefuuru ọkpụkpọòkù nke Chineke anya ma karịa nka ha enweghị mmasị n’ebe ọdịmma nke ụmụnna ha dị.O metụghị ha n’obi ọbụná nke ntakịrị ma ọ bụrụ na emeriri, bibie kwa ebo ndị ọzọ niile. Ha chere na o zuworo ha iche nche n’ebe obibi ha. Lee, ka ha siri tụfue mmụọ ọkpụkpọòkù nke Chineke nyere Israel niile, mgbe Ọ chọrọ ka ha bụrụ ndịozi nke Ọgbụgbandụ ahụ nye elu ụwa dum mmadụ bi, iweta akụkọ nke udo; nchebe, na nzọpụta tinyekwasị ngọzi niile nke ọgbugbandụ ahụ nye ha dum! Agbụrụ Asha ka ikpé màrà ọ bụghị náánị na ha jụrụ ịnara ọlụ dị icheiche nke ọgbụgbandụ nye Ndị Mbaọzọ, kama ikpé nke óké nlefuanya na enweghi mmetụta nke ha kpachara anya mee n’ebe ndị nke aka ha nọ mara ha -- bụ Mba Israel arọpụtara! Nka bụ kwa ọnọdụ nke naeso mgbe ọ bụla mmadụ malitere ịkpado àkụ ya n’ụwa kama n’Eluigwe.

Ndị Dan kwa n’otù aka ahụ nwere ọchịchọ nke onweonye. Ha nọdụrụ n’ụgbọ mmiri ha, naaga kwa n’iru n’ịzurịta ahịa ha na mba ndịọzọ. Omume ha nka, bụ nnọọ mmadụ enweghị nlepụanya; n’ihi na òlee úrù ọdọ ụgbọmmiri na ọzụzụ ahịa gaabara ha ma ndị eyi ha ndị bi n’ọnụmmiri anọghị ya? Ọ bụrụ na ekpochapụrụ ndị Israel niile, òlee ụdị ebere na ịzụ ahịa ndị Dan naenwe olileanya ya site n’aka ndị naanwa ike ha imeri ha? Eji ha atụnyere ọtụtụ mmadụ ndị naadịghị echè échìchè maka ọbịbịa nke Onyenweanyị, ndị naemejupụta ụbọchị ha niile site n’ime ka obi dị ha onweha ụtọ, iji rọpụtara onwe ha ihe ime obi ụtọ na akụ nime ọgwụgwụ arọ niile nke ndụ ha ka ha wee mezue ọchịchọ niile nke obi ha.

Ma ekwuru okwu dị ike megide ndị bi na Miroz karịa. Mmụọozi nke Onyenweanyị kwupụtara ọbụbụọnụ megide ha, n’ihi na ha kwenyere ka ohere ijéozi funarị ha naejighị ya mee ihe ọ bụla. Ikpé amaghị ha n’ihi na ha nupuurụ ndị Israel isi. Edepụtaghị na ihe kpatara nlefuanya ha bụ na ha nọ naaga n’iru n’ọlụ nke onweha dịka ọ dịịrị ndị Reuben, Asha, na Dan. Ndị niile bi nime Miroz emeghị nnọọ ihe ọ bụla; ma mmehie nke ịgbankịtị a wetaara ha ịbá mbà siri ike ọbụná karịa nke ndịọzọ.

Miroz ọ nọ n’ọnọdụ dị mkpà ma bụrụ kwa ndị bara nnọọ úrù nye ọgbọ agha ahụ nke na asị na ha enyeghị aka agaghị enwe mmeri n’agha ahụ? É-è, n’ihi na Chineke pụrụ ịga n’iru n’àtụmàtụ Ya niile ka ewee nwee ọgwụgwụ dị mma naenweghị enyemaka site n’onye ọ bụla nime anyị n’otù n’otù. Ọ dịghị onye ọ bụla nime anyị dịkarịrị mkpà karịa nke na Chineke agaghị alụ ọlụ Ya ma onye ahụ anọghị ya. Anyị amataghị ma ndị Miroz nọ nso ọgbọ agha ahụ, maọbụ na obodo ha bụ otù ụzọ mgbalaga nye ndịiro, n’ihi nka ha gaahụworị ezi enyemaka n’ịlụ ọlụ dị mkpà nye ndị Israel niile. Ihe anyị maara bụ na ha nọ n’ọnọdụ nke ha pụrụ ịlụ ọlụ nke Chineke ma ha emeghị ya. Ha emeghị ihe ọ bụla.

Ọbụbụọnụ abụrụ Miroz ka emezuru kpamkpam ka esi kwue ya nke mere na ọ dịghị ihe ncheta banyere ndị ya maọbụ otù ihe mbibi nke arapụrụ n’ebe obibi ha nke ageji cheta ha. Ebibiri ya kpamkpam. Ihe mmụta dị ukwuu nye anyị ná mbibi ebibiri ndịa bụ na abụrụ ha ọnụ n’ihi na ndị bi nime ya gbara nkịtị naemeghị ihe ọ bụla; nke naechetakwara anyị otù nime okwu niile nke Onyenweanyị: “Orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozigh, o megh kwa dika ọ chọrọ, agapia ya ọtutu utari” (Luk 12:47).

Ngọzi nke Chineke dakwasịrị ebo isii ahụ ndị pụtara bue agha dịka dike na n’ikwesị ntụkwasịobi megide ndịiro ha. Ha pụtara wee bue agha n’ịdịike niile, ha anaraghị kwa úrù nke ego ịbụ ihe nkwughachị ụgwọ nye ha maka oge niile ha tụfuru iji lụọ ọlụ nke aka ha. “Ọ digh onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n’ihi ala-eze Chineke, nke nāgagh-anata kari ọtutu ihe n’oge a, nata kwa ndu ebigh-ebi n’oge nke nābia” (Luk 18:29, 30). Ọ dị mfé ịhụta ihe bụ ụgwọọlụ nke naechere ndịa, ndị ji ikwesị ntụkwasịobi jee ozi nye Chineke, bụrụ kwa ndi rubeisi n’iwu Ya nile. Ha “nyebigara ndu ha rue ọnwu n’ebe nile di elu nke ọhia” ma ha natakwara ụgwọọlụ nke ndụ ebighịebi site n’ime nka!

Ntozuókè niile na ihe ọtụtụ niile nke anaachọ n’aka anyị n’oge nke Agba Ọhụụ a n’ezie adịghị ntà karịa n’ihe ahụ niile achọrọ n’aka ndị Israel. Ndụ ndịozi abụọ nke Chineke naenweghị egwù naarụkwa aka n’ụdị omume a n’oge nke Agba Ọhụụ a. Onye nke dere Akwụkwọnsọ kwuru sị na ha bụ “ndi raraworo ndu-ha nye n’ihi aha Onye-nwe-ayị Jisus Kraist” (Ọlu Ndi ozi 15:26). Jisọs onwe Ya nyere anyị ezigbo ihe nlere anya mgbe Ọ sịrị “Ọ buru na onye ọ bula abiakutem, ma ọ kpọgh nna nke ya asi, (ịhụ ya n’anya nke ntà karịa), ya na nne nke ya na nwunye nke ya, na umu nke ya, na umunne ndikom nke ya, na umunne ndinyom nke ya, e, ndu nke aka ya kwa, ọ pugh ibu onye nēso uzọm. Onye ọ bụla nke nēbugh obe nke aka ya, sokwam n’azú, ọ pugh ibu onye nēso uzọm.” “Onye ọ bula nime unu nke nāgbakutagh ihe nile o nwere azụ, ọ pugh ibu onye nēso uzọm” (Luk 14:26, 27, 33). Enwere ụgwọọlụ nke naenweghị àtụ n’ụlọàkụ nye ndị niile nke buliri obe ha iso Jisọs, ndị nyebịgara ndụ ha rue ọnwụ “n’ebe nile dị elu nke ọhịa” ndị raraworo ndụ ha nye n’ihi aha Ya. Ma enwekwara ọbụbụọnụ dị egwù, tụkwasị kwa, ịla n’iyi ebighịebi nye ndị niile nke jụrụ ime nka “nānọgide nime ugbọ,” ndị nwere ojujuafọ nye onweha “n’ogige-aturu” nke ọlụ dị icheiche nke ụwa, ndị naanọgide n’ebe obibi nke onweonye wee ghara imezu ije ozi nke ọgbụgbandụ ahụ, maọbụ ndị naebilighi nyere Onyenweanyị aka ma kama, nke ahụ ha naagba nkiti!

Questions
AỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ụdị ejiri meghee abụ nke Debora na Berak?
  2. Kpọọ aha abụ ụfọdụ ọzọ amaara nke ọma n’Akwụkwọnsọ ma kwue kwa ihe nke ọ bụla naekwu ihe banyere ya.
  3. N’ọnọdụ dị añaa ka Israel nọ n’oge akpọrọ Debora ịbụ onye amụma nwanyị?
  4. Gịnị mere ejirii too ebo Zebulun na Naftali?
  5. Gịnị mere eji kwue okwu megide Gad na Reuben?
  6. Kpọọ amaokwu nke Agba Ọhụụ nke naegosi omume anyị n’ịlụ ọlụ Onyenweanyị?
  7. Gịnị mere ejiri bụaa ndị niile bi na Miroz ọnụ?
  8. Òlee otú esi mezue ọbụbụọnụ a kpamkpam?
  9. Enwere ike kwue na nne Sisera nwere ntụkwasịobi nke nchebe banyere ịnọ n’udo nke nwa ya nwoke. Òlee ihe nke mmụọ ya na nka yiri?
  10. Jael, nwunye nke Heba ka enyere ngọzi kachasị ukwuu. Kpọọ aha nwayị ọzọ onye natara ụdị ngọzi a.