Ndi-ikpe 6:1-40

Lesson 192 - Senior

Memory Verse
“Webatanu otù uzọ n’uzọ iri nile n’ulo-àkù nkem, ka ihe-oriri we di n’ulom, biko, nwanum na nka, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha siri, ma M’gagh-emeghere unu window nile nke elu-igwe, wusara unu ngọzi, rue mgbe ọnọdụ agagh-ezu ịnagide ya” (Malakai 3:10).
Cross References

I Ọnọdụ Nhụjuanya nke Ndị Mmehie

1. Israel mehiere; Ndị Midian wee merie ha wee rapụ ha n’ọnọdụ nke enweghị ihe ọ bụla, Ndi-ikpe 6:1-6; Abụ Ọma 106:41-43

2. Ụmụ Israel tikuru Chineke O wee zitere ha otù onyeamụma ichetara ha mmehie ha niile, Ndi-ikpe 6:7-10; Abụ Ọma 106:44; Hosea 5:15

II Ozi nke Mmụọozi ahụ Ziri Gideon

1. Ka Gideon naeticha ọkà wheat, Mmụọozi ahụ wetaara ya ozi sitere n’ebe Chineke nọ, Ndi-ikpe 6:11, 12

2. Gideon nwere mgbagwoju anya n’ọkpụkpọòkù ahụ dị nsọ, Ndi-ikpe 6:13-16; Ọpupu 3:11; II Samuel 7:18-20; Jeremaia 1:6-9

3. Ejiri iheịrịbaàmà kwagide ike nke enyere Mmụọozi ahụ; Ndi-ikpe 6:17-24; Levitikọs 9:24; I Ndi-Eze 18:38; II Ihe-Emere 7:1

III Mbibi Gideon Bibiri Beal

1. Iwu mbụ nke Chineke nyere Gideon bụ ịkwatu ikpere arụsị ma wukwaara Chineke ebe ịchụàjà, Ndi-ikpe 6:25-27; Matiu 6:24; II Ndi Kọrint 6:15-17

2. Ndikom nke obodo ahụ chọrọ igbu Gideon, Ndi-ikpe 6:28-30; Jeremaia 26:11; Jọn 16:2; Ọlu Ndi-Ozi 9:1, 2; 26:9-11

3. Nna Gideon nọnyeere Gideon iguzogide ndị obodo ahụ, Ndi-ikpe 6:31, 32; II Timọti 4:16, 17

4. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Gideon mgbe ndị Midian chikọtara onweha ibu agha, Ndi-ikpe 6:33-35; 15:14-16; Ndi-Efesọs 6:10-12

IV Ikwesị Ntụkwasịobi nke Chineke

1. Gideon rịọrọ ihe ịrịbaàmà nke gaegosi na akpọwo ya ịbụ onye ndú nke ndị Israel, Ndi-ikpe 6:36-38; Ọpupu 4:1-9

2. Gideon chọkwara ihengosi nke abụọ, Chineke wee mezue arịrịọ ya, Ndi-ikpe 6:39, 40

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ụbọchị Nsogbu

Onye naeme mmehie aghaghị ịtụanya ịghọrọ mkpụrụ nke ihe ọjọọ ahụ. Israel mere ihe jọrọ njọ n’anya Chineke, ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ n’otù ntabi anya ahụ ka Chineke wepụrụ aka nchebe Ya ná ndụ ha ma n’ala ha niile. N’oge a Chineke kwenyere ka ndị Midian, bụ ndị Ụmụ Israel meriworo na mbụ, bata n’ala ahụ tinye kwa ha nime nsogbu. Onye meriworo emeri wee ghọọ onye anaemeri emeri. Mmehie anapụwo ndịagha ahụ nke ndị Israel ji eme ọnụ na mbụ ike ha na inwe mmasị ịlụ agha, rue ugbu a ha bụ ndị naagba ọsọ kama ibuso ndị iro ha agha. Ọnụ na ọgbà dị icheiche wee ghọọrọ Israel ebe izobe onwe ha. Ndị Midian bịakwara n’ìgwè, dịka ụkpala, we bibie ihe omume niile nke ala ahụ rue mgbe Israel naenweghị kwa ike na ihe nnweta.

“Kpọkukwam n’ubọchi nkpagbu; M’gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram” (Abù Ọma 50:15). Israel wee tikue Chineke, mgbe arọ asaa nke mkpagbu site n’aka ndị Midian gasịrị. Ọ bụ ihe iju anya na mmadụ naatụfu oge itiku Onye ahụ náánị Ya pụrụ ịnapụta ha n’ahụhụ ha. Chineke gosipụtara onwe Ya onye jikeere nwee kwa mmasị ịza ekpere ndị ahụ; otú ọ dị, tutu Ya ezipụta onye nnapụta, O zipụrụ onye amụma ichetara ndị ahụ mmehie ha niile na mkpà ọ dị ịchegharị. Náagbaghị agụgọ ozi nke onyeamụma ahụ nwere mmetụta, n’ihi na ngwangwa mgbe emesịrị Mmụọozi nke Chineke zutere otù nwoke onye Chineke rọpụtara idú ùsù ndịagha ahụ naemeri emeri megide ndị iro ahụ.

Otù Nwoke bụ Dike nke bụ Dimkpà

Mmụọozi nke Chineke chọtara Gideon n’ebe ọ naazọcha ọkà wheat n’ebe nzọcha mkpụrụ vine -- bụ ebe ikpeazụ nke ndị Midian gaatụ anya inweta iheoriri. “JEHOVA nọnyere gi, gi dike bụ dinkpa” bụ ekele nke mmụọozi ahụ. Gideon wee sị ya, “Ọ buru na JEHOVA nọnyere ayi, n’ihi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi?” N’ebe a Gideon dị ka ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa -- ọ ghọtaghị na Chineke kwenyere ka iheotiti ahụ bịa n’ihi ime ka ndị ahụ laghachikuta Ya. Onye dere Abù Ọma sịrị “Ọ dim nma na ewedawom n’ala; ka m’we muta ukpuru-Gi nile” (Abù Ọma 119:71). Ọkụ nke mkpagbu ka anaanwapụta karịa na ọ naabụ ihe nnụcha kachasị ukwuu ná ndụ nke ụmụ Chineke.

Mgbe Gideon nụrụ ọkpụkpọòkù nke Chineke ịnapụta Ụmụ Israel n’aka ndị Midian, O mere otù ụdị omume ahụ nke anaahụta ná ndụ ọtụtụ ndị nke Chineke jiworo mee ngwáọlụ. Gideon nwere obiumeala n’ezie. N’ịzaghachị okwu ahụ site n’ikwupụta na ọ gaazọpụta Israel, Gideon wee sị: “M’gēji gini zọputa Israel? Le, usu nnu ndikom abua na ọgụ iri nkem bu nke nēnwegh ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n’ulo nnam” (Ndi-ikpe 6:15). Ezi obiumeala bụ ngwáọlụ dị ebube n’aka Chineke. Ekwuwo ya na obiumeala bụ náánị ubube nke agaeji rue inwe nsọpụrụ n’alaeze nke Chineke. Òle nime ndị dike nke Chineke gosipụtaworo erughịeru ha n’otù ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ mgbe Chineke kpọrọ ha n’ọlụ Ya. Moses sịrị, “Ònye ka m̀bu?” mgbe Chineke gwara ya ka ọ gaa n’Ijipt ịnapụta Ụmụ Israel n’orù nke ndị naakpagbu ha. Moses gara n’iru ifè Chineke n’obiumeala ná ndụ ya niile, otú a ka Baịbụl kwupụtara. “Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n’obi nke uku, kari-madu nile ndi nọ n’elu-ala” (Ọnu-ọgugu 12:3). Iheàtụ nke ndụ na ọlụ nke Moses nye Chineke guzo dịka ihe nlere anya rue taa. Ihe dịkarịsịrị ụwa mkpà taa bụ ọtụtụ ndị dike ndi jikeere ịsị: “Ònye ka m’bu?” na ndị jikekwara ka Chineke ji ha lụa ọlụ dịka Ọ chọrọ.

Ebe Nchụàjà nke Gideon

Dịka Gideon na mmụọozi ahụ nke sitere n’ebe Chineke nọ naekwurịta okwu, eziokwu ahụ wee malite ịpụta ntakịrị ntakịrị na onyeozi a abụghị mmadụ efù. Gideon wee chọọ ka onye-ozi ahụ ghara ịla rue mgbe ọ ga-ewetara ya onyinye. Mmụọozi ahụ wee si na ọ gaechere. Mgbe ewetara onyinye ahụ, Mmụọozi ahụ wee sị ka adọba ya n’elu nkume. Mmụọozi ahụ wee were ọnụọnụ mkpàn’aka ya metu onyinye ahụ, ọkụ wee si na nkume ahụ ripịa onyinye ahụ niile. Mmụọozi ahụ wee laa n’otù mgbe ahụ.

Gideon anụwo ọtụtụ ihe banyere Chineke nke Israel, ma nka dị ka ihe ndepụta mbụ banyere mmekọrịta nke Chineke na Gideon nwere. Ihe mbụ batara n’obi ya bụ na ya aghaghị ịnwụ. Ngwangwa nkwenye ahụ batara n’obi ya ka okwu agbamume ahụ nke sitere n’Eluigwe mere ka ndajụ dị ukwuu dị nime obi ya: “Udo diri gi; atula egwu: i gagh-anwu.”

Gideon nwetara udo dị ukwuu n’ebe Chineke nọ n’otù oge ahụ, n’ihi na anyị gụrụ na Gideon wuru ebe ịchụàjà nye Chineke n’ebe ahụ: Aha ọ kpọrọ ebe ịchụàjà ahụ pụtara nnọọ ìhè “Jehova-Shalom”, nke isi ya bụ “Chineke bụ udo.” Chineke naakpọ Gideon ịbànye n’agha dị óké egwù, otú ọ dị, Gideon guzobere ebe ịchụàjà nke pụtara na “Chineke bụ udo.” Ọ bụghị udo nke Chineke nke sitere n’Onyenweanyị Jisọs Kraist bụ ihe naejikere mmadụ ịgbasi mgbà “ọma nke okwukwe ike”? Ka unu wee pụ iguzogide ihe niile ekwensu naezupụta, imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe, ọ dị nnọọ óké mkpà mmadụ inwe nghọta ahụ n’onweya, site n’ịnwapụta Chineke, na Chineke bụ udo. Chineke chọrọ ka onye ọ bụla nke ghọtara mkpà ọ dị ịbịakute Ya site n’ikpesi ekpere ike nwee nnwapụta ahụ.

Mbibi nke Beal

Ndụmọdụ mbụ nke Chineke nyere Gideon banyere ọlụ ahụ bụ ka ọ kwadà ebe ịchụàjà nke Beal ma gbutu kwa Ashera nke dị n’akụkụ ya, wukwaara Chineke ebe ịchụàjà. Nka abụghị ọlụ dị ntà, n’ihi na obodo ahụ niile naèfè Beal. Gideon arụghị Chineke ụkà n’iwu ahụ, ma n’otù abalị ahụ ọ chịịrị ndikom iri nke sitere ná ndị orù ya wee mee dịka Chineke gwara ya. Nka bụ ihe nzuzo ọzọ nke naegosipụta ijéozi zuruókè nye Chineke -- ime ihe nke O kwuru mgbe o kwesịrị. Ịrụ Chineke ụkà maọbụ ịtụfu mgbe n’irubeisi n’uche Ya, n’ihe niile ọ bụla, naeme ka ọlụ bụrụ ihe dị ike n’omume mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke chọrọ mgbe Ọ naakpọ anyị¸ amara Ya gaadị nso ime ka ọlụ ahụ bụrụ ihe alụzuru nke ọma.

Gideon lụrụ ọlụ ahụ n’abalị n’ihi na ọ tụrụ egwù ndị obodo ahụ, ma ọ tụghị egwù rue na ọ lụghị ọlụ ahụ maọlị. O nwere ihe dị iche ririnne. Onyeiro nke mkpụrụobi ụmụ mmadụ gaagbalị itinye egwù n’obi ndị agha nke Chineke ná mmalite nke ọkpụkpọòkù pụrụ iche nke Oziọma ahụ, rue na ha naarapụ ọlụ Chineke wee laghachị n’ụzọ ochie ha niile. Ka anyị guzooro Chineke, ọ bụ ezie na anyị gaatụ egwù ihe ọ gaalụpụta. Nguzosi ike anyị gaakwada ọtụtụ izú onyeozi ọjọọ nke ekwensu. Mgbe Gideon na ndị Midian mesịrị, egwù adịghị kwa n’obi ya. Mkwà Chineke bụ, “ihu-n’anya nke zuru òkè nāchupu egwù n’ezi” (I Jọn 4:18). Mgbe Chineke mere ka ịhụn’anya Ya zue òkè nime anyị egwù niile nke ụmụ mmadụ maọbụ izuzu ha gaagwù.

Inwe Mkpebi

Site ná mmalite nke akụkọ ụwa ụmụ Chineke abụworị ndị ụwa naakpagbukarị. Ngwangwa Gideon chọpụtara na nka bụ eziokwu ná ndụ ya. Mgbe ndikom nke obodo ahụ bilitere n’isi ụtụtụ mgbe ebibisiri ebe ichụàjà nke beal, o wutere ha nke ukwuu, o weghị ha ogologo oge ịchọpụta onye lụrụ ọlụ a. Ndị ụwa naarịba onye naekpere Chineke ámá ọ bụ ezie na mmekọrịta ya na Chineke adịbeghị anya. Ndị obodo ahụ kpebiri na Gideon gaanwụ naatufughị oge n’ihi omume ya megide arụsị ha.

Nguzo kwụrụ chịịm nye Chineke gaeme ka ndịọzọ soro gị. Nna Gideon sooro nwa ya nwoke nwee mkpebi, iguzogide ndị obodo ahụ. “Unu onwe unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? Ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gazọputa ya? … ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n’ihi na akwatụwo ebe-ichu-àjà-ya” (Ndi-Ikpe 6:31). Joash ahụbeghị otù ihe ọma ọ bụla nke beal mere. Ugbu a o jikeere ikwere na Chineke nke Israel, ịhụ ihe Ọ gaeme. Nguzokọ nke mmadụ abụọ ndịa lụrụ ọlụ dị ukwuu n’ihi na mgbe Gideon fụrụ opiike ịchịkọta ndị Israel niile ịbụ òtù ndịagha, ndị Abieza, bụ obodo nke Gideon chịkọtara onweha n’ebe ọ nọ.

Ajịanụ nke Gideon

Gideon rịọrọ maka ihe ịrịbaàmà, ọ bụghị dịka ajọ ọgbọ ahụ nke naakwa kwa iko nke oge Jisọs chọrọ ihe ịrịbaàmà, ma Gideon rịọrọ ya iji mee ka okwukwe ya guzosie ike nime Chineke. Gideon bụ nnọọ onye ndú arọpụtara ọhụụ ma ndịagha nke soro ya bụ ndị ana azụghịàzụ. Ndị Midian nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dịka igurube n’ịba ụba. Ọ bụghị ihe mgbagwojuanya mgbe ahụ na Gideon ghọtara mkpà ọ dị ịtụkwasị Chineke obi karịa.

Chineke zara ekpere Gideon, dịka Ọ gaaza ekpere nke onye ọ bụla nke ji obi ya niile naachọ Ya. Gideon gbasara ajịanụ ebiri ebi n’ala wee kpee ekpere sị ka igirigi dịkwasị náánị n’ajịanụ ahụ n’abalị, ma ka ọkpụkpọnkụ dịkwasị n’ala ahụ niile gburugburu. Ọ bụrụ na Chineke emezue arịrịọ a, mgbe ahụ Gideon gaamara kwa na Chineke kwadobere isite n’aka ya zọpụta Israel. Chineke mezuru nnọọ arịrịọ ahụ dịka Gideon rịọrọ -- ọkpụkpọnkụ wee dịkwasị n’ala niile gburugburu, ma Gideon pịkọtara ojuju ọkwa mmiri site n’ajịanụ ahụ. Náagbaghị agụgọ onye ọnwụnwa ahụ nọ kwa nso ịgwa Gideon na ihe a bụ ihe dị mbụ naeme, na ajịanụ naadọta mmiri n’onwe ya site n’ikuku n’oge abalị.

Ọzịzá Abụọ

N’abalị nke abụọ Gideon wee tụgharịa ihe ịrịbaámá ahụ wee sị ka Chineke kwee ka ọkpụkpọnkụ dịkwasị ajịanụ ahụ ka igirigi dịkwasị n’ala nile gburugburu. Ka ewee wepụ ihe mgbagwojuanya ọ bụla n’obi Gideon banyere ọkpụkpọ ya ịnapụta Israel pụọ n’aka ndị Midian, Chineke wedara Onweya n’ala ịza arịrịọ nke abụọ ahụ. Mgbe Gideon biliri n’utụtụ nke naeso ọkpụkpọnkụ dịkwasị náánị n’ajịanụ ahụ, ma ala niile dị gburugburu dere mmiri. Mkpughe doro anya dị mkpà ọtụtụ mgbe n’oge gboo nime mmekọrịta nke Chineke na ụmụ mmadụ.

N’ụbọchị taa anyị naañụrị ọñụ n’ezi ìhè nke Oziọma ahụ, dịka ekpugheworo ya site n’Onyenweanyị Jisọs Kraist nime mgbapụta na odudonsọ; ma nye kwa ndị niile nke naachọ Ya onyinye Mmụọ Nsọ iduba ha n’eziokwu niile. “Mgbe ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi okwu¸ Ọ gēduba unu n’ezi okwu nile: n’ihi na Ọ gagh-ekwu n’Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia. Onye ahu gēto Mu Onwem: n’ihi na Ọ gēwere n’ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya” (Jọn 16:13, 14). Otú ọ dị, ọbụná taa Chineke naaza ekpere n’ụzọ ụfọdụ pụrụ iche ime ka o wee ndị Ya anya na azawo arịrịọ ha. Ọ naachọ kwa ka ndị Ya nwapụta Ya ka o wee gosi Onweya Onye dị ike n’ebe ha nọ. Ànyị nwere mkpà dị icheiche taa? Ka anyị wetara ya Chineke n’ekpere nke eziokwu nke naasị “Ka eme uche Gi,” ma chere Ya, naahụ kwa ka Ọ naalụ ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. N’ụzọ dị añaa ka ọnọdụ nwute nke ndị Israel si jọgbue onwe ya na njọ n’oge a?
  2. Ogologo oge ra añaa ka o were Ụmụ Israel ịghọta na ụzọ mgbapụ dị?
  3. Ònye ka Mmụọ ozi nke Chineke gosiri onwe ya? gịnị bụ kwa ekele o kelere?
  4. Òlee otú Chineke si mara ụdị mmadụ Gideon bụ?
  5. Gịnị bụ omume nke Gideon mere mgbe ọ matara na ọ bu mmụọozi nke Chineke ka ya na ya naekwurịta okwu?
  6. Gịnị bụ ọlụ mbụ Chineke nyere Gideon? Òlee otú o si mee ngwangwa ijé ozi ahụ?
  7. Òlee otú ndị obodo ahụ si nwee nnabata n’ebe ọlụ ahụ dị?
  8. Ụzọ nnwapụta abụọ dị añaa ka Gideon chọrọ iji mata na Chineke rọpụtara ya idú ndị Israel imegide ndị Midian?