Ndi-ikpe 7:1-8

Lesson 193 - Senior

Memory Verse
“Ọ digh onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n’ihe nke ibi-obi a mgbe ọ nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n’akwukwọ dika onye-agha” (II Timọti 2:4).
Cross References

I Ndịagha ahụ Ajụrụajụ

1. Gideon na ndị ahụ niile biliri n’isi ụtụtụ ijikere maka agha, Ndi-Ikpe 7:1; Joshua 3:1; 6:12

2. Chineke jụrụ ọtụtụ nime ndị agha Gideon, ka ha ghara ịnyaisi n’ihi ike ha, Ndi-Ikpe 7:2; I Samuel 14:6; II Ihe-Emere 14:11; I Ndi Kọrint 1:27-29; II Ndi Kọrint 4:7

3. Ndị ahụ niile naatụ egwù naámá kwa jijiji laghachirị ụlọ, Ndi-Ikpe 7:3; Deuteronomi 20:8; Nkpughe 21:8

II Òtù Ndị Chineke Arọpụtara

1. Chineke sịrị na puku iri (10,000) ndịagha nke fọdụrụ ka dị kwa ọtụtụ, Ndi-Ikpe 7:4; I Samuel 16:7; Abù Ọma 33:16

2. Chineke kpara ókè n’etiti ndịagha ahụ, Ndi-Ikpe 7:5-6

3. Ekwere mkwà mmeri site n’aka ndikom ahụ dị nari atọ (300), Ndi-Ikpe 7:7; Aisaia 41:14-16

4. Ùsù ndị ahụ dị narị atọ (300) jikeere onwe ha maka ibu agha, Ndi-Ikpe 7:8; Ọnu-ọgugu 10:9

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndikom Puku Iri Atọ na Abụọ

Mmụọ nke Chineke abịakwasịwo Gideon, o wee fụọ opiike nke agha ahụ ka ndị Israel wee chịkọta onwe ha n’ebe ọ nọ imegide ndị agha nke Midian. Ụmụ Israel atawo ahụhụ dị ukwuu n’aka ndị iro a, ma ọ dị kwa ka ọtụtụ mmadụ jikeere ịza òkù Gideon naakpọ. Ndịagha ahụ dị puku iriatọnaabụọ (32,000) wee zukọọ ha na onyeisi ọchịagha ha na ụlọ ikwu ha nke amara n’akụkụ olùlù mmiri Harod, ọnọdụ a debere ha n’ala dị elu, ebe ha pụrụ isi huzue ùsù niile nke ndị Midian anya bụ ndị mara ụlọ ikwu ha na ndagwurugwu. Ma otú ọ dị, o nwere ihe dị njọ n’omụma ụlọ ikwu nke Gideon. Chineke matara ya ngwangwa, ma naenweghị obi abụọ Gideon matakwara nka otù aka ahụ: egwù dị ukwu dị nime obi ọtụtụ nime ndị ahụ, ma Chineke matara na ọtụtụ nime ndịagha ahụ ga anya isi n’ike nke onweha megide Ya. Olùlùmmiri nke Harod ahụ, aha nke pụtara ịmajijiji maọbụ iheegwù, ma eleghịanya enwetara aha a site n’ọnọdụ óké egwù nke dị n’obi Ụmụ Israel n’ebe ahụ.

Egwù adịghị anọgide mgbe ọ bụla n’obi ndikom ahụ kpọrọ onwe ha ndịagha nke Chineke. Ọlụ nke Chineke naachọ inwe okwukwe na Chineke na irubere Ya isi. Okwukwe nime Chineke dị óké ọnụahịa nime mkpụrụobi mmadụ karị àkụ niile, udé, iheọmụma¸ maọbụ ike nke ụwa pụrụ inye. Egwù bụ nnọọ ihe naanọdụ ma ewezuga okwukwe; ya mere aghaghị iwepụ egwù n’ụzọ. Ọ bụrụ na mmadụ apụghị iwepụ egwù n’obi ya site n’inyeaka nke Chineke mgbe ahụ mmadụ ahụ gaachọpụta onweya n’onye achụpụrụ n’ọlụ nke Chineke. Egwù naakpọchị ọnụụzọ obi nke mmadụ, ka ọ gaabụ mgbe Chineke gaachọ ịlụ ọlụ O wee hụ na otù ụzọ ahụ nke Ọ pụrụ isite na ya lụa ọlụ nime mmadụ abụrụwo ihe emechibidoro. Otú egwù nke dị nime mmadụ si dị ukwuu, otú ahụ kwa ka esi akpọchisị ọnụụzọ nke okwukwe ike nime obi mmadụ ahụ karịa nye Chineke.

Ùsù Ndịagha ahụ Ajụrụajụ

Ọ bụghị ihe iju anya ntà na Chineke gaeduzi Gideon n’oge ahụ ikwu okwu a ná ntị ndi ahụ, “Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? Ya laghachi, si n’ugwu Gilead gbalaga.” Nkwupụta a bụ dịka iwu Moses si dị; “Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? Ya je laghachi n’ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya” (Deuteronomi 20:8). Egwù, ịmajijiji, obi ịlọmmiri naadị ka ọrịa naefe èfè n’etiti ndịagha nke Kraist dịka ha dị kwa n’ijè ọ bụla ọzọ nke ndụ a; ma, ọ bụrụ na ọ bụghị n’ihi nzube ọzọ, Chineke gaeropụ ha. Onyeagha nke Kraist, etinyela onwe gi n’ihe ndịa nke naemebi mkpụrụobi.

Ihe ọzọ mere Chineke ji wezuga ndikom ndịa bụ ka egbochie ha iwere otuto nke nmeri ahụ Chineke gaje inye, nye onweha. Ndikom ndị naenweghị agbamume nke imemmụọ iguzogide onyeiro ahụ n’agha agaghị enwe anya ike ikwu na ọ bụ site n’aka ha ka esi nwee mmeri mgbe alụzusịrị agha ahụ nke ọma. Chineke chọrọ ka edebere náánị Ya otuto niile nke gaesite n’agha a, ka ụwa wee mara ma sọpụkwara Ya; ya mere O ji wezuga ndị ahụ naagaghị enye Ya otuto n’etiti ndịagha ahụ. Mpako na ịgụnye onweonye n’ihe bụ ihearụ n’ebe Chineke nọ, O nweghị ike, Ọ pụghị kwa iji mmadụ bụ onye nwere mpako na ojujuafọ nke onwe onye lụọ ọlụ.

Mmeri niile nke Okwukwe

Ndị iro niile nke naemegide okpukpé NdịKraist ejiwo ihe agha nke egwù ọtụtụ mgbe n’oge ochie, ha naeji kwa ya n’ụbọchị taa, ịnwa na ịkwatù okwukwe nke dị nime ndụ ụmụ Chineke. Ọtụtụ nime ndịagha nke Obe adawo n’ihi obi jupụtara n’egwù; ma n’ibé akwụkwọ dị icheiche nke edere akụkọ banyere ndụ Ndị Kraist ka akọwapụtakwara ihe banyere mmeri ahụ niile dị ebube nke ndịọzọ nwetawokwara site n’iguzosiike n’okwukwe ha n’ebe Chineke nọ. Onye Kraist nwere Onyeisi agha nke naadịghị ada n’ọgụ mgbe ọ bụla, n’ebe ọ bụla, n’oge ọ bụla; ma n’oge niile Ọ naekpugharị àtụmàtụ nke onye naemebi iwu iru n’iru ndị Ya.

Ọ naewere okwukwe nke onye ọ bụla n’otù n’otù iji merie agha nke dị ná ndụ gi, ma Chineke naachọsi ike ịkụnye okwukwe ahụ ná ndụ gị naeme kwa ka ọ dịwanye ike dịka ụbọchị naaga. Agụkọtawo ya n’ihe ra ka mmadụ ọnụọgụgụ ha dị Nde iriise (50 million) bụ ndị egbuwororị n’ihi okwukwe ha nime Kraist karịa ha gaagọnarị okwukwe ha na Ya. Okwukwe ha naekwusi okwu ike ime ka ekwenye n’izuókè ahụ nke Oziọma ahụ pụrụ itinye n’obi mmadụ n’otù aka ahụ ọ naekwusi okwu ike ime ka ihere mee ndị ahụ ndị rapụworo Ụlọ ikwu nke ndị Agbapụtara tupu agha ahụ amalite maọbụkwanụ tutu ha anụ ụzụ agha ahụ ná ntị ha. Agbala ọsọ, kama lụọ ọgụ; n’íhi na ọ bụ náánị ụzọ apụrụ isi nwee mmeri. Bịakute Chineke ka ewee nwoghaa ike gi, ume, olileanya, na okwukwe gi. O kwewo mkwà na Ọ gaghị ezilaga onye agụ naagụ n’aka efu.

Ha Ka Dị Kwa Ọtụtụ

Mgbe Gideon hụrụ ndị agha dị puku iriabụọ na abụọ (22,000) ka ha naatọgbọ ihe agha ha n’ala naalaghachị n’ụlọ, eleghịanya o chere na ndịagha ahụ nke fọdụrụ puku iri (10,000) dị ntà. Obi ya adaghị mbà. Otú ọ dị èmeghị ka Berak na Debora napụta Ụmụ Israel n’aka Sisera site n’iji ọnụọgụgụ ndi agha ra ka nka (Ndi-Ikpe 4:14). Dịka Gideon naenyocha ihe ahụ nke merenụ, Chineke wee sị na ndị ahụ ka dị kwa ọtụtụ. Chineke wee nye Gideon iwu ka ọ kpọrọ ndị agha ahụ bịarue na mmiri, ka O wee jiri aka Ya rọpụta ndị ahụ ndị gaeje n’ọgbọ agha ahụ. •kpụrụ nke Chineke dị óké elu.

Iheàmà nke Chineke nyere Gideon iji mara onye gaeje na onye gaanọdụ n’ụlọ abụghị ihe nnwapụta efu. “Onye ọ bụla nke ji ire-ya ra miri, dika nkita nāra, onye ahu ka i gēdo n’onwe-ya iche; onye ọ bula kwa nke nēruru n’ikperè-ya abụa iñu miri” (Ndi-Ikpe 7:5). Ọnụọgụgụ ndikom ahụ ji ire ha raa mmiri dịka nkịta n’itinye aka ha n’ọnụ ha, dị narị atọ (300). Jehova wee gwa Gideon na site n’aka ndikom a dị narị atọ (300) ka Ya gaenye ndị Midian n’aka ndị Israel.

Ọnụọgụgụ Dị Ntà

Ọtụtụ mgbe ọ naabụkarị ihe dị ntà n’egosipụta ihe dị iche n’etiti ụmụ mmadụ. Pọl Onye ozi kwagidere ndị Efesọs sị: “Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari ọ digh ka ndi nāmagh ihe, kama dika ndi mara ihe; nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n’ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ” (Ndi Efesọs 5:15, 16). Ọ bụghị mgbe niile ka Chineke naachọkarị iwere ọnụọgụgụ dị ukwuu lụọ ọlụ Ya, kama Ọ naachọsi ike ka ndị ahụ Ọ gaeji lụọ ọlụ bụrụ ndị tozuru ókè nime mmụọ. Jọn Wesley sịrị: “Nyem otù narị ndi nkwusa ndi na-adịghị atụ egwù ihe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị mmehie, ndi na-achọghị kwa ihe ọ bụla ma ọ bụghị nánị Chineke, atụghịm egwù ihe ọ bụla ma ha bụ ndi ụkọ-Chukwu ma-ọbụ na ha bụ madụ efu; nánị ndi ahụ purụ ime ka ọnụ-ụzọ ọkụ ala mụọ mee mkpatụ ma wukwasị kwa Ala-eze Elu-igwe n’elu ụwa.”

Ọ bụghị ihe dị ukwuu gosipụtara ịkpáókè nke dị n’etiti ọnụọgụgụ ahụ dị narị atọ (300) na ndị ahụ dị puku iteghete na narị asaa (9,700) bụ ndị ajụrụ ajụ. Enwere ihe ịkpá ókè dị ukwuu nke dị n’etiti puku iri-abụa na abụọ (22,000) ndikom ahụ bụ ndị naatụ egwù naámá kwa jijiji, na ndikom ahụ dị puku iri (10,000) bụ ndị gafere n’ule nke mbụ ahụ. Ọ pụrụ ịdị ka agasị na Chineke wezugara ọchịchọ nke mmadụ ná nkewapụ nke mmadụ narị atọ (300) ahụ site n’ọnụọgụgụ mmadụ ndị ahụ dị puku iri (10,000) n’ileba ya anya nkeọma anyị ga arịbaámá na ọ ka bụ kwa ihe banyere mkpebi nke onweonye n’ebe mmadụ niile ahụ ndị ọ gbasara nọ. Mgbe ụfọdụ ọ gaadị ụmụ irighiri omume dị nime mmadụ, nke dị ka ihe naadịghị emerụ arụ n’onweya, nke pụrụ ime mmadụ ka ọ bụrụ onye ekewapụrụ site ná ndị ahụ nke Chineke rọpụtara. Ọ dịghị ihe dị ka ịsị na enwekarị ezi nleruanya n’omume na akparamagwa niile nke onye ọ bụla naegosi n’iru Chineke.

Ọnụọgụgụ mmadụ ra ka puku iteghete na narị asaa (9,700) bịaruru na mmiri ahụ wee gbue ikpere ha n’ala ịñụmmiri. Onyeiro ahụ naeche nnọọ iru ya n’ebe ndịagha nke ndị Israel nọ, ma otú ọ dị, ndịagha a pụrụ ichefu ihe niile dịrị ha n’oge ahụ ka ha wee tụrụ ndụ. Ọ bụghị otú a ka ọ dịrị ndikom ahụ ọnụọgụgụ ha dị narị atọ (300) ndị rara mmiri dịka nkịta. Ha echefubeghị arọ ndị ahụ niile nke ha hụworo ahụhụ n’aka ndị Midian. N’ebe a ka ha nwekwara ohere maka mgbapụta, ha wee nwee kwa obi naanụ ọkụ maka ijezu ozi ahụ. Ọ dịghị oge dịrị ha iji were nwayọ ñụọ mmiri dịka o si agụ ha; ha tinyere aka ha na mmiri ahụ wee ñụọ otú ọ bụla ha nwere ike ịñụ n’ọnọdụ a, site n’oge ahụ niile ha naedebe anya ha na uche ha n’ọlụ nke ha gaje ịba nime ya mgbe naadịghị anya. Chineke sịrị na site n’aka ndikom a ọnụọgụgụ ha dị narị atọ (300) ndị nọ ná njikere ndị nwere mkpebi, ndị nwere nleru anya ka Ya gaanapụta ndị Israel.

Mgbochi nke Onweonye

Enwere ọtụtụ ihe n’ụwa nke ziriezi n’iwu ka nwa Chineke were ha nyere onweya aka, ma inwebiga mmasị ókè n’iji ihe ọ bụla mee ihe gaeweta iwe Chineke. Akụziri iheọmụmụ a n’ụzọ o doro anya nke ọma na ndụ ndịagha Gideon. Ọ dịghị onye ọ bụla gaasị na ịñụ mmiri bụ mmehie, ma otú ndikom a dị puku iteghete na narị asaa (9,700) ji were oge ha na obi ha ruru ala ñụa mmiri gosịrị ọnọdụ nke ime mmụọ ha wee bụrụ kwa ihe kpatara ejiri chụpụ ha n’ụsụ ndị ahụ Chineke rọpụtara.

N’ihe banyere ọlụ nke mmadụ naalụrụ onweha n’elu ụwa onye ndị ụwa naele anya dịka onye ihe naagara nke ọma karịsịa bụ onye ahụ nke naetinye oge ya niile, talent, na ike ya niile n’ịlụ ọlụ ya. Ọ naebu n’uche na ihe banyere ndụ bụ ihe kachasị mkpà ná mgbalịsịike nke mmadụ, ma ọ naewere oge mgbe ụfọdụ maka izuike. Ọ naachọ iwere ohere niile mee ka ọlụ ya maọbụ ọlụaka ya gaa n’iru, ma mgbe ọ naebu nka n’uche ọlụ ya ewee naaga nke ọma.

Ihe niile ọ bụla enwere ike ikwu banyere ime ka ọlụ nke ụwa gaa nkeọma ka apụrụ iji tụnyere ọkpụkpọ anyị dịka ndị agha nke Kraist. Mmadụ dị otú a aghaghị ibu ụzọ chee uche banyere ịlụ ọlụ tutu ha eche uche ihe banyere izuike n’ikpeazụ, nka bụ ọchịchọ obi nke onye ọ bụla nke naejere Chineke ozi n’eziokwu. Ihe ụtọ ya niile dị nime ime uche na iwu nke Onyeisi agha ya. Izuike na ịlụ ọlụ n’ebe nwa Chineke nọ bụ nnọọ otù ihe ahụ. Dịka ogologo oge ra nke nwoke maọbụ nwanyị ji naejere Chineke ozi otú ahụ kwa ka anaeme ka eziokwu ahụ pụta ìhè karịa. “Ma unu nēme ihe ọ bụla, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto” (I Ndi Kọrint 10:31).

Olenaole ma Ha Dị Ike

Chineke adịghị achọ ìgwè mmadụ iji lụọ ọlụ Ya. Apụrụ iji ìgwè mmadụ ahụ lụọ ọlụ n’ụzọ dị ebube ma ọ bụrụ na obi ha ziriezi n’iru Ya, ma ndị ahụ bụrụ kwa ndị jikeere ime ihe Chineke naachọ. Eziokwu ahụ nke dị nwuta nke naadịgide bụ na Chineke enweghị ike ịchọta ọtụtụ mmadụ ndị jikeere ịrapụ onweha n’aka Chineke ka O wee nyagharịa ha dịka Ọ chọrọ. Ma Chineke achọghị ịma ọnụọgụgụ mmadụ ole naalụ ọlụ n’ubi vine Ya, dịka Ọ naachọsi ike ịma ụdị ngwáọlụ ndị kwesịrị ekwesị nke Ọ gaeji lụọ ọlụ. Ọgan’iru nke anaenwe n’ọtụtụ mgbalị dị icheịche nke ụmụ mmadụ naenwe naadabe karị ná ntozuókè nke mmadụ niile n’otù karịa n’ọnụọgụgụ ndị eweere n’ọlụ. Nka bụ nnọọ eziokwu n’ọlụ nke Chineke.

N’oge ijéozi nke Jisọs n’elu ụwa, Ọkpara Chineke chọtara mmadụ irinaotù ndị Ọ pụrụ ịtụkwasịobi na ndị O nyekwara ijé ozi ahụ n’aka ịga n’ụwa niile wee kwusaa Oziọma nye ihe niile ekere èkè. Mmadụ irinaotù ahụ náánị ikwusa Oziọma ahụ nye ụwa dị ka ọ bụ ihe ụjọ, ma Jisọs kwere ha mkwà na Ọ gaanọnyere ha mgbe niile ọbụná rue ebe ụwa sọtụrụ. Oziọma ahụ ọ dara ada n’ihi na ndị ozi ahụ dị olenaole? Ọ daghị maọlị. O jiri ọsọsọ gbasaa n’ụzọ anaatụghị anya ya n’oge ndị Ozi mbụ ahụ, ọ ka naaga kwa n’iru naachọta ụzọ na ọnọdụ nime ụwa taa. Mmetụta nke Oziọma ahụ nwere n’arụ ụmụ mmadụ enweghị ọtụtụ, ma agwara anyị na ikpé nke Chineke ahụ n’ewe iwe bụ ihe egbochiri náánị site n’ike Ya. Onyeagha nke Kraist aghaghị ịlụọgụ rue n’ọgwụgwụ, ndị bụ ndị iro ya kachasị njọ bụ “ndi-onwe-ụwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n’ebe di n’elu-igwe” (Ndi Efesọs 6:12). Setan naagbalị ihe o nwere ike iwukwasị alaeze ya na ike ya site n’onye ahụ náemegide Kraist, ma Mmụọ nke Chineke nime obi nke ndị ya naejide ike a n’èfèkéèfè. Otù ụbọchị agaewepụ nzukọ ahụ na nzuzo, mgbe ahụ ka ụwa gaanọ n’okpuru ọchịchị nke eze ọjọọ ahụ nke naenweghị obi ebere onye ụdị ya naadịbeghị mgbe ọ bụla n’ụwa.

Òtù Ndị Chineke Rọpụtara

Enwere ọtụtụ ndịagha nke okpukpé n’ụwa taa, ma ha niile naekwu na ha bụ otù akụkụ nke ndịagha Chineke. Lee otú ọ gaabụworị ihe ebube ma ọ bụrụ na ndị niile naekwupụta na ha bụ ndịagha Kraist gaadị n’ụdị nke ụsụ ndịagha Gideon! Eziokwu ahụ nke dị nwuta naadịgide kwa nke bụ na ọnụọgụgụ nke ezi ndịagha ndị nwere njikere na inyechasị ihe niile ha nwere n’ihi Kraist naagbanyeghị ihe ọ gaefu ha ma ewere ha tụnyere n’ọnụọgụgụ nke ndị ahụ naatụ egwù naámá kwa jijiji, maọbụ ndị ahụ nke gaarọrọ izuru ike karịa mgbe o kwesịrị ka ha guzogide onye iro ahụ, ka dị kwa otú ahụ ọ dị n’oge Gideon. Otù mmadụ nime otù narị gafere ule ahụ nke Chineke ji rọrọ ha. Ihe iju anya dị añaa ka nka bụ! “Ònye kwa ka apuru izọputa?” nka bụ ihe ndị naesoụzọ Jisọs jụrụ Ya mgbe ha nụrụ bụ nnọọ ụzọ ahụ nke anaaghaghị isi baa n’Alaeze Eluigwe. Ọ ka bụkwarị ihe dịrị mmadụ niile n’otù n’otù ma ị gaenwe nzọpụta maọbụ na ị gaghị enwe. Emewo nrọpụta dị ukwuu ma nke ịnata amara na nke ebube nye onyeijè ọ bụla nke naaga n’ụzọ atụliri atụli nke ịdị nsọ a. “I nwere ike ma ọ bụrụ na ị chọrọ” bụ nnọọ okwu nke Ndị Kraist ji naekwu okwu nime ọtụtụ arọ ndịa nke naakọwa omume ha, nka bụ kwa ezi okwu ná ndụ gị dịka ọ bụ kwa ná ndụ onye ọzọ ahụ nke eburu ụzọ were ya gwa okwu. “Atula egwu, igwè aturu ntà; n’ihi na ọ dị Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya” (Luk 12:32).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ndikom òle zara òkù Gideon ibuso ndị Midian agha?
  2. Gịnị mere Chineke ji gwa Gideon na ndị ahụ dị ọtụtụ?
  3. Gịnị bụ ule elere ndịagha ahụ? mmadụ òle laghachikwara àzụ?
  4. Ònye nwapụtara ndịagha ahụ n’ule na mgbe ọzọ? Gịnị bụ ule ahụ?
  5. Ndikom òle gafere ule nke abụọ ahụ?
  6. Òlee iheọmụmụ dị ukwu nke apụrụ ịmụta site n’ule a nke Chineke lere ndị agha Gideon?
  7. Òlee otú Chineke si anwapụta ndị agha Ya taa?