Ndi-Ikpe 7:9-25; 8:1-35

Lesson 194 - Senior

Memory Verse
“Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?” (Ndi-Rom 8:31).
Cross References

I Mmaagha nke Onyenweanyị na nke Gideon

1. Chineke mere ka egwù nke Gideon naatụ ndị Midian dajụọ site n’ikwenye ka ọ nụ maka egwù ndị Midian nwere n’ebe Chineke nke Gideon nọ, Ndi-Ikpe 7:9-14; Joshua 2:9-11; Jenesis 35:5; Ọpupu 23:27; Deuteronomi 2:25; 11:25

2. Anyaike na ụdị agha pụrụ iche nke Gideon ji buso ndị Midian agha bụ omume nke okwukwe nime Chineke kpaliri, Ndi-Ikpe 7:9-20; Ọnu-ọgugu 10:9; Joshua 6:5; Deuteronomi 32:41, 42; Jeremaia 46:10

3. Gideon ji mbibi dị ukwuu merie ụsụ ndị agha Midian, Ndi-Ikpe 7:15-23; 8:10; I Samuel 14:20; II Ihe Emere 20:22, 23

4. Ndikom nke Efraim sonyere busoo ndị Midian agha, Ndi-Ikpe 7:24, 25

II Nchụso achụsoro Ndị Midian

1. Gideon mere ka ekworo nke ndị Efraim dajuọ site n’inye ha ọzịzá dị nwayọ, Ndi-Ikpe 8:1-3; Ilu 15:1; I Samuel 17:28, 29; Jenesis 4:4-8; 37:4

2. Ndikom Sụkọt na Penuel jụrụ inyere Gideon aka n’ibu agha ya na ndị Midian, Ndi-Ikpe 8:4-9; I Samuel 25:10, 11; Ndi-Ikpe 5:23; Obadaia 10-14; I Jọn 3:16-18

3. Gideon kwere ndị Sụkọt na Penuel mkwà iji ọnụma leta ha, bụ nke emezukwara n’oge naadịghị anya, Ndi-Ikpe 8:9, 13-17

4. Gideon dọtara Zeba na Zalmuna bụ ndịeze Midian n’agha, wee gbue kwa ha n’ihi ọtụtụ ọlụ ọjọọ ha, Ndi-Ikpe 8:10-12, 18-22

5. Udo dịgidere iri arọ anọ rue ọnwụ nke Gideon, Ndi-Ikpe 8:22-35

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịgbaume nke Chineke

rue, n’abali ahu, na JEHOVA siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwu ahu; n’ihi na enyewom ya n’aka-gi. Ma ọ buru na gi onwe-gi atua egwu irida, gi na Pura, bú nwa-okorọbia-gi, ridarue ọmuma-ulo-ikwu ahu: i gānu kwa ihe ha nēkwu; emesia agēme kwa ka aka-gi abua di ike ka i we rida imegide ọmuma-ulo-ikwu ahu.” Okwu ndịa ka Chineke ji gbaa Gideon ume n’ibuso agha ya megide ụsụ agha ndị Midian. Mgbe mbuso agha megide ndị Midian malitere, enweghị nlaghachị azụ rue mgbe mmeri zuruókè.

Chineke chọrọ ịnapụta ndị Israel n’aka ndị naemekpá ha arụ, bụ ndị Midian. Ma aghaghị inwe onyendú nye ndị Israel naebu agha, nwoke nke obi naagaghị alọ mmiri na onye naagaghị ada m̀bà n’ihe ọ bụla nke gaapụta mgbe agha siriike. Ọ bụrụ na emere ka Gideon kwenyesie ike na Chineke n’ezie enyeworị ndị Midian n’aka ndị Israel, ọ gaabụ onye anaadịghị emeriemeri. Otú a Chineke gbara Gideon ume, ime ka ọ dị ike na ịkwagidesi okwukwe ya ike.

Gideon, mgbe ọ naeme dịka okwu Chineke si dị, ọ gara rue ụlọikwu ndị Midian wee gee ntị n’ụkà ha naakparịta. Ịnụ ka onyeagha naakọrọ ibe ya nrọ, ọ matara na óké egwù dị n’ebe obibi ha n’ihi ndị nke Chineke. Nka abụghị nke mbụ mba ndị naekpere arụsị tụrụ egwù (maọbụ nwere mmetụta) Chineke. Ndị Kenean, ndị nwererị mmetụta mbụ nke ike ndịagha Israel oge ha batara nime Kenean site n’ọzara na site kwa n’Ijipt, matara nke ọma ihe ikpe dị egwù Chineke pụtara. Náarụghị ụkà, ọtụtụ nime ihencheta ndịa ka dị n’obodo ndị ahụ, ọ bụkwaghị ihe siri ike nye Chineke ịkpalite ha ịdị ndụ ọzọ.

Mkpu nke Agha

“Ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka o we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādigh ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka ọ we me ka ihere me ihe di ike; ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bu ihe nke nādigh, ka o we me ka ihe nke nādi ghara idi ire” (I Ndi Kọrint 1:27, 28). Ibu agha nke Gideon megide ndị Midian bụ nnọọ ngosipụta pụtara ìhè nke akụkụ Akwụkwọnsọ a. Lee ka o si dị iche bụ ụzọ Chineke karịa nke mmadụ, lee kwa ka o si dị ire! Ụzọ gbagwọjuru anya Gideon siri bu agha egbochighi ịdị ìrè ya. Site na mkpali nke Onyenweanyị Gideon kewara ndikom ya ụsụ atọ nye kwa nwoke ọ bụla opiike, na ite nke ọwa dị nime ya.

N’ịgba ogige ndị Midian gburugburu n’abalị, Gideon nyere usoro nke ibu agha: “Lenum anya, me-kwa-nu otú a: ma, le, mgbe mu onwem nāba na nsọtu ọmụma-ulo-ikwu-ha, ọ geru kwa na, dịka m’nēme, otú a ka unu gēme.” N’iji ezi mmụọ nke ọchịchị Gideon bu ụzọ baa n’ọgbọ agha wee nye ndikom ya iwu ka ha soro naabịa. Otú a kwa ka Pọl Onyeozi gwara ndị naeso ya sị “Ghọnu ndi nēñomim, dika mu onwem bu kwa onye nēñomi Kraist” (I Ndi Kọrint 11:1). Ọ gaghị adị mmeri agaemeri onye naeso Onyeisi agha ukwuu anyị, Jisọs Kraist n’azụ. (Lee Ndi Hibru 13:20; I Pita 5:3, 4).

N’ịfụ opiike ha, n’itiwasị ite ha na ijide ọkụọwa ha, ndikom Gideon tiri mkpu n’otù olu sị “Mma-agha diri Jehova dikwara Gideon.” Iti mkpu nke ndikom Gideon, itiwa ite ha, ịfụ opiike na ìhè nke ọtụtụ ọwa nke naenwupụ ná mberede, ha niile gosirị ndikom Midian na ụsụ ndị Israel abịakwasịwo ha. Nime ọgbaaghara dị otú a nwoke ọ bụla nime ha wee chee na onyeagbata obi ya bụ onyeiro; ha wee tụkwasị mmaagha onye ọ bụla n’arụ ibe ya, nke pụtara na egburu otù narị puku na iriabụọ ndị Midian n’agha. Otú a ka Chineke si bido inye Gideon mmeri n’arụ ndị Midian.

Gideon n’ịchụso ndị Midian emeriri emeri, zigara ndịozi n’Efraim ka ebibie ndị Midian mgbe ha gaeruta ofe Jọdan. Nka ka ndị Efraim mere, ebe ndikom Naftali, Asha, na Manase chụsoro ndị Midian n’ụzọ nke ọzọ. Ndikom nke Efraim dọtara ndịeze abụọ nke ndị Midian n’agha, bụ Oreb na Zeeb, ndị ha tigburu. Okwukwe na nrubeisi nke Gideon nye Chineke wetaara ndị Israel óké mmeri.

Obi Ekworo

Ugbu a ndikom Efraim nwere agụụ iketa ókè nime mmeri nke ha nyere ntakịrị aka ka emerie. Ọ bụrụ na ha nwere ezi agụụ nke ibu agha megide Midian, ha gaeweliworị obi ha nye Chineke naarịọ kwa inyeaka dịka Gideon naeme n’ezie mgbe mmụọozi nke Chineke kpọrọ ya ka ọ napụta Israel. Nkwuwa okwu nke ndikom Efraim bịara na mberede arafughị Gideon ma ọlị, Gideon gosikwara onweya ezi nwa Chineke site n’ọzịzá o nyere ha.

O mere onweya na ihe ukwu niile o mere ka ha dị ala ma ewere ha tụnyere ihe ukwuu niile nke ha meworo ebe ha dọtararị ndị isi abụọ nke Midian na’agha. “Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ: Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie” (Ilu 19:11). Nka bụ omume Gideon. Ọ gaekwuwori ọtụtụ okwu nye ndị Efraim n’ihi nkwuwa okwu mberede ha, kama ọ rapụrụ ha nye Chineke Onye matara obi mmadụ niile nke gaeweta kwa ọlụ niile n’ikpé, maọbụ nke ọma maọbụ nke ọjọọ. Ndị Efraim gosipụtara ndị ha bụ naatụfughị oge. Anyị agụtaghị ebe ọ bụla edere na Efraim maọbụ ebo ọzọ n’Israel soro Gideon jee agha mgbe ọ naachụso ndị Midian fọdụrụ ya na narị atọ ndikom ahụ kwesịrị ntụkwasịobi ndị Chineke rọpụtaara ya.

Ndịagbataobi Naenweghị Ịhụn’anya

Ndikom Gideon abụrụwo ndị dara m̀bà site n’agụụ dịka ha naaga n’iru ịchụso ndị Midian. Gideon rịọrọ ndị Sụkọt na Penuel ka ha nye ndikom ya iheoriri ka ha wee nwee ike ịga n’iru n’ibu agha ha. Arịrịọ a maka inyeaka ka ajụrụ, ha kwakwara ịgbá mbọ Gideon emò site n’ikwu sị: “Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, ha di n’aka gi ugbu a, ayị gēnye ùsù-ndi-agha-gi nri?”

Ọ pụtara ìhè site ná nzaghachị dị otú a na ndikom Sụkọt na Penuel enweghị okwukwe na Gideon maọbụ Chineke nke ọ naefè. Obi ha bụ obi anụarụ naachị nke jupụtara n’ekweghịekwe, ma ha atụghị egwù ịjụ inyere onye naalụso ndiiro ha ọgụ aka na onye bụ kwa onye obodo ha, ike kwe onye àgbụrụ ha.

Ọ bụ ezie na ndikom Sụkọt na Penuel ekwereghị ya maọbụ aka nke Zeba na Zalmuna dị kwa nnọọ n’aka Gideon n’ihi na Chineke eburuworị ụzọ nye Gideon na ndikom ya mmeri. “Okwukwe bú ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhugh anya” (Ndi-Hibru 11:1). Gideon rịọrọ inyeaka n’aka ụmụnna ma ajụrụ ya, ma nka egbochighị ya maọbụ mee ka okwukwe ya ghara ịdị ike, n’ihi na ntụkwasịobi ya naeguzosi ike n’ebe Chineke nọ.

Gideon na ndikom ya gara n’iru nwee mmeri n’ihi Chineke na Israel. Ma Gideon kwere mkwà ịlaghachị ịta ndikom Sụkọt na Penuel ahụhụ n’ihi ọjụjụ ha jụrụ inyere ya aka. Mkwà a ka emezuru naatụfughị oge dịka Gideon kwururị. Otú a ka ọtụtụ ụgwọọlụ nke ajọomume naadị.

Ịdịndụ n’anụarụ na ekweghịekwe abụworị onyeiro nke okwukwe na ezi omume. Ọ bụrụ na ike nke ajọ omume adịghị eji anyaike guzogide ọlụ Chineke na ndị Ya, ha naeme ihe niile ha nwereike igbochị na ịkwụsị ọlụ Chineke, dịka ọ dị n’ọnọdụ ahụ nke Gideon nọ nime ya. Ndikom Sụkọt na Penuel, mgbe ha jụrụ inyeaka, ha ajụghị náánị Gideon kama ha jụrụ Chineke; n’ihi na ịjụ onyeozi bụ kwa ịjụ Onye zitere ya. (Lee I Samuel 8:7; Matiu 25:41-46).

Jisọs Kraist, n’ọnọdụ ọlụ Ya n’ụwa, hụrụ ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị naekweghị ekwe. Ndiiro Ya gọnarịrị Ịbụ Chineke nke Ọ bụ na ike ọlụebube Ya dị icheiche ma n’ikpeazụ ha mere Ya ọtụtụ ihe ọchị mgbe O koro n’elu obe. “Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n’obe ridata” (Matiu 27:40).

Ọbọ ka ezitere n’arụ ndiiro Gideon, agaezite kwa ya n’arụ onyeiro nke nwa Chineke ọ bụla. Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya sị “Ọ bu ihe nāghagh ime na ihe di iche iche nēme ka madu ma n’ọnyà gābia: ma ahuhu, gādiri onye ahu, nke ha nēsite n’aka ya bia. Ọ gābara ya-ri úrù ma akwuba ya nkume-igwe-nri n’olu, tuba kwa ya n’óké osimiri, kari na ọ gēme ka otù onye nime ndi ntà ndia ma n’ọnyà” (Luk 17:1, 2).

Mkpụrụ nke Mmeri

Ndikom Israel chọrọ ka Gideon na ụmụ ya naachị ha ma ọ jụrụajụ. Gideon matara ebe inye aka ya siri bịa. Ọ bụghị site n’ịdịike maọbụ ike nke ya ka Israel nwererị nnapụta n’aka mmegbu nke ndị Midian. Chineke egosipụtaworị otù ugbò ọzọ aha ukwuu Ya na ịdị ike nke ike Ya n’ihi ọdịmma nke ndị Ya. Gideon gwara Israel sị “JEHOVA gāchi unu”; ma Chineke chịrị ha iri arọ anọ dị n’iru site ná ntuziaka nke Gideon. “Ala we di ju ọgụ arọ abua.”

Mmeri nke Chineke nyere Israel n’arụ ndị Midian bụ otù mmeri ukwuu nime ọtụtụ mmeri ndịọzọ. Anyị naahụ ná nkénké, site n’ọtụtụ ihe odide ọzọ nke edeworo n’Akwụkwọnsọ mgbe ụbọchị ndịọzọ gasịrị, mmetụta nke Israel nwere banyere óké nnapụta a. Ekpere nke Esaf megide ndịiro Israel ndị naebili ọzọ imegide ka edeworo nye anyị n’Abù Ọma iri asatọ na atọ (83). Nime Abù Ọma ahụ, Esaf naekpe ekpere ka Chineke “Me ha otú I mere Midian … Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb na dika Zeeb; Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmụna: ndi siri, ka ayi nwetara onwe-ayi ebe obibi nile nke Chineke” (Abù Ọma 83:9-12).

Anyị naamụta site n’ekpere a na Midian, ọ bụghị náánị na ha gbachibidoro Israel n’ịlụ agha nke imeri na ịkwata ihe nkwata n’agha, kama ha anwaworị ịmà Chineke aka n’iru site n’ime nka. Ha ekwerewo na ụlọ ndịa bụ nke Chineke, ma ha nwararị izunarị ha Chineke. Nke ahụ bụ ihe kpatara Chineke ji bilie imegide ha. Esaf kpekwara ekpere ka enye ụdị mmeri a n’ihi na o chetara nnapụta dị ebube Chineke nyererị mgbe garaaga n’ọnọdụ dị ka ndịa.

Aha nke Oreb pụtara “Nnụnụ nke na-eri ibè ya, ma aha nke Zeeb “agụ na-adọgbu atụrụ.” Ma anụ mbibi ndịa abụghị ihe ọ bụla n’ebe Chineke nọ mgbe Ọ chọrọ ịkwatu ha. Ndịisi niile nke Midian zutere mbibi ihere. Aisaia, n’amụma dị icheiche o buru nye Israel, naatụkwa Midian aka dịka ndị ha meriri site n’aka Chineke (Lee Aisaia 10:26; 9:4).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Chineke si kwagide Gideon ịlụso ndị Midian ọgụ?
  2. Kọwaa ụzọ Gideon si bue agha.
  3. Gịnị mere ndị Efraim ji meere Gideon anya ụfụ?
  4. Olee otú Gideon si mee ka iwe ha dajụọ?
  5. Gịnị bụ mmehie nke ndikom Sụkọt na Penuel?
  6. N’ụdị dị añaa ka Jisọs Kraist hụrụ ahụhụ dịka ndị eleliri anya?