Ndi-ikpe 13:1-25; 15:14-20; 16:4-6, 15-31

Lesson 195 - Senior

Memory Verse
“Ma onye ezi omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu: ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adigh nkpuru-obim ezi nma” (Ndi-Hibru 10:38)
Cross References

I Onye ikpe ahụ bụ Samson

1. Israel danyekwara ọzọ ná mmegbu n’ihi mmehie ha, Ndi-ikpe 13:1; 2:3, 11-15

2. N’imezu mkwà Ya, Chineke kpọlitere otù onye idú Ụmụ Israel pụọ n’ọnọdụ nhujuanya ha¸ Ndi-Ikpe 13:2-25; 2:16-19

3. Samson bịara bụrụ onyemgbapụta na onyeikpe n’Israel, Ndi-Ikpe 15;14-20; Ọpupu 3:9, 10

II Nwoke ahụ bụ Samson

1. Elezighịanya ná mkwà dị icheiche o kwere Chineke, na iji mmehie gwue egwu wetaara Samson óké ọnwụnwa, Ndi-Ikpe 16:4-6; Jemes 1:13-15; Jenesis 3:6; Ilu 1:10; 4:14; Matiu 26:41

2. Ọnwụnwa ahụ dịkarịrị ukwuu nye Samson na o mebiri mkwà ya dị icheiche, Ndi-Ikpe 16:15-17; Ọnu-ọgugu 30:2; Deuteronomi 23:21¸ 22; Eklisiastis 5:4-6; Matiu 24:12; II Pita 3:17

3. Náenweghị nkwagide na ike nke Chineke Samson wee bụrụ onye onyeiro ya nwudere n’ụzọ dị mfé, Ndi-Ikpe 16:18-21

4. Nchègharị nke Samson na njigidesiike nke okwukwe na ntụkwasịobi nime Chineke, naagbanyeghị mmehie ya na nhuju anya dị icheiche, weghachịrị Samson ịhụta iruọma nke Chineke, Ndi-Ikpe 16:22-28; Habakuk 2:4; Jọn 3:36; Ndi-Rom 1:17; Ndi-Hibru 11:32-34

5. Samson ahụ eweghachịworo lụrụ ọlụ n’ọnwụ ya, dịka àtụmàtụ Chineke si dị nye ya, karịa otú ọ lụworo nime ndụ ya niile, Ndi-Ikpe 16:29-31

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Okwukwe nime Chineke

Ọ dị Mmụọ Nsọ mma idepụta, n’Agba Ochie¸ akụkọ banyere Samson¸ na kwa imetụ aka n’Agba Ọhụụ otù nime ụdị ịsọpụrụ Chineke dị ná ndụ ya; ma apụghị ikwu na ndụ ya niile bụ ihe agaewere dịka ihenlere anya nime ịdịnsọ na eziomume zuruokè. Anyị naahụ na Samson naeme ihe ike ọtụtụ oge, mgbe ụfọdụ ọ dịghị ihe na akpali ya ma ọ bụghị náánị nganga na iwe; na ọ bụ kwa onye nwere ike nke naenweghị àtụ, ma naagbanyeghị nka ọ bụ onye ọ naadị mfé ndịiro ya ịghọgbu na ịrafu ya dịka nwantakịrị.

Mgbe ahụ gịnị ka anyị chọtara dị mma ná ndụ Samson? Anyị naachọta na o nwere okwukwe nime Chineke, na kwa ụdị okwukwe o nwere bụ nke Chineke naahụta dịka ihe bara óké úrù, naagbanyeghị ihe onye ahụ bụ nke ahụrụ ya nime ya, maọbụ otú okwukwe ahụ si dị ntakịrị (Lee Matiu 8:10; 17:20). Ọ bụ ezie na obi Samson naakpali karị nime ọchịchọ dị icheiche nke ụwa, ọtụtụ ugbò, ma ọ dị kwa ọtụtụ mgbe o gere ntị ịnụ olu Chineke, ọtụtụ mgbe nime oge ahụ niile, ọ bụ onye Chineke kpaliri n’ezie ime ihe ukwuu ahụ niile n’ebe ha dị ukwuu. Ụfọdụ nime ọtụtụ ihe ahụ nke mere n’ebe ọgụgụ niile ahụ n’Akwụkwọnsọ bụ ihenlere anya dị mma nke okwukwe na ịgbaume Samson, nke bụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla obi lọrọ ya mmiri maọbụ daa mbà n’iru ọtụtụ ihe niile ahụ siri ike n’omume nke o zutere. Chineke tokwara ịdịike ya na okwukwe ya n’etiti ọtụtụ ihe nnwapụta pụtaara ya, náegosi ịdịelu ya site n’itinye aha Samson n’usoro aha ndị dike nke okwukwe nke enyere dịka ihe ngosi dị icheiche nke ụwa niile gaatụle ma rita kwa úrù na ha (Ndi-Hibru 11:32-34).

O nweghị ebe ọzọ n’Akwụkwọnsọ edere ụdị ịkpáike nke naenweghị àtụ dịka ndị ahụ ahụrụ nime ndụ Samson. Ebumn’obi niile Samson n’ịlụso Ndị Filistia ọgụ ezuchaghị ókè¸ ọ bụ eziọkwu; ma otú ọ dị, ọ bụ ụche Chineke ka alaa Ndị Filistia n’iyi n’ihi ọjụjụ ha jụrụ Ya na o kpukpé Ya, bụ nke ha jiri omume dị ala nke ikpere arụsị gbanwere. Okwu ikpé nke Chineke ka emezuru, n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ, Akwụkwọnsọ naagba kwa àmà mkpochapụ Samson kpochapụrụ ndị ukwuu ma ndị ntà nke Ndị Filistia.

Rue ihere ebighịebi nke ndị mba nke aka ya, bụ ndị Israel, anyị gụtara na ha enweghị ọchịchọ inyere ya aka, kama nke ahụ ha jiri ụdọ ọhụụ kee ya agbụ wee tụpụ ya nye n’aka ndị Filistia ka ha wee mekpaa ya arụ ma gbue kwa ya. Ọ bụ ihe úrù dị ntà nye ndị bi n’ụwa na mgbe ụfọdụ Chineke naewere ndikom na ndiyom, ike na onyinye (maọbụ talent) ha nwere nsọtụ iji lụzue ọchịchọ Ya dị icheiche nime ụwa. Ndị ọnọdụ ha dị elu, ndị nwere akụ riri nne, na ndị nwere onyinye pụrụ iche bụ ndị anaadịghị ahụkarị n’etiti ndịagha Chineke¸ n’ihi na obi ha naejupụta ná mpako na iheefu ha naagụ kwa ya na ọ dị ala nye ọnọdụ ha nime ndụ irulata ala n’ịlụ ọlụ Chineke, (I Ndi Kọrint 1:20-29). Ma onye dere Abù Ọma naasị: “Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu” (Abù Ọma 111:3).

Eguzosighịike Dị Icheiche

Erughịeru nke Samson dị ọtụtụ karịsịa. Egusosighị ike dị icheiche nke naadị kwamgbe kwamgbe ná ndụ ya bụụrụ ya onweya na ndị niile nọ ya gburugburu iheịman’ọnyà. Ma otú ọ dị, o nwere obi na mmụọ nke naadị ná njikere. Chineke nwere ike iji obi dị njikere otú a lụọ ọlụ. Ụdị ọchịchọ nke obi dị otú a, ezi okwukwe nke gaatụkwasị Chineke obi naagbanyeghị otú ihe ahụ jiri sie ike megide onye, na nkwuwaokwu dị nsọ nke naamaghị egwù nke ìgwè dị ọtụtụ nke naatụghị kwa ụjọ iru nke mmadụ¸ bụ ọtụtụ ngwá agha nke Chineke nwere ike iji, ganaeji kwa, mee ihe maka otuto Ya na kwa ịgbasa Alaeze Ya.

Nye ihe anaahụ anya, ọtụtụ ihe nke chere Samson n’iru mgbe ndị Filistia bịara ịnwụde ya bụ ihe ọ naapụghị inwe mmeri na ha. Ndị obodo nke aka ya gbanyere ya azụ. Ndị Filistia dị ọtụtụ puku, ọ dị ka ọ gaewe ụsụ ndịagha jurueju ịnapụta Samson site n’aka ike ha.

Ọ bụrụ na Samson bụrị onye nwere onyinye pụrụ iche maọbụ ike nke akọnauche dị elu ọ gaachọpụta ụzọ aghụghọ ọzọ ịgbanarị ndị Filistia n’ịnwụde ya. O nweghị àkụ, maọbụ na ọ ka egotaworị ndị agha gaenyere ya aka ibu agha megide ndịiro nke Israel. Ọ bụghị onye nwere ike n’ọchịchị nke obodo ebe ha naenweghị eze maọbụ onye ọchịchị maọbụ na ọ ka enyeworị ndị ya iwu ka ha niile bilie ibuso Ndị Filistia agha. Ma Samson nwere otù ihe karịrị ihe ndịa niile. O nwere okwukwe na Chineke; site kwa n’iji okwukwe ahụ nime Chineke ya na ọkpụkpụ àgbà nke ịnyịnyaibu Samson gburu otù puku ndị Filistia. Ka ndị niile naenye ihengọpụ n’ifè Chineke site n’ikwu na ha enweghị onyinye pụrụ iche maọbụ ike tụlee ngwá agha nke dị n’aka Samson. O jiri ngwá agha dị ya n’aka mee ihe, site kwa n’inyeaka nke Chineke ọ lụpụtara óké mmeri.

Moses rịọrọ ka arapụ ya otù mgbe site n’ịga lụa ọlụ Chineke nyere yarị ka ọ lụọ, naatụ egwù na ndị ahụ Chineke naezigara ya agaghị ekweta na ike ya bụ ihe sitere na Chineke. Chineke jụrụ ya ihe o ji n’aka ya. Moses gwara Chineke na ọ bụ mkpán’aka ka o ji n’aka ya. Chineke ji mkpán’aka ahụ lụọ óké ọlụ ebube igosi Moses, na ndị Israel na ndị Ijipt, na o nwere ike zuruezu na ike ijéozi nke sitere na Chineke iji lụọ ihe Chineke nyere ya n’iwu (Ọpupu 4:1-5). Ọ bụrụ náánị na anyị gaatụkwasị Chineke obi, ka O nwee ụzọ Ya n’ebe anyị nọ, anyị nwere ike ịlụ óké ọlụ ebube maọbụ óké mmeri dị icheiche maka ịgbasa Alaeze Chineke n’ihi otuto Chineke, site n’ihe anyị ji n’aka.

Mkpà Dị Samson Maka Inyeaka

Adịghị ike Samson n’inyere onweya aka mere ya ka o lekwasị Chineke anya maka enyemaka, nka bụ kwa ihe Chineke chọrọ. O nweghị nsọtụ bụ ihe Chineke pụrụ ime nye mkpụrụobi ahụ nke naadaberesi ike n’ogweaka Chineke maka inyeaka n’oge mkpà. Chineke naachọ igosi onwe Ya nye ụmụ mmadụ, ma ọ dị Ya mkpà inweta obi nke naekwere na nke naarapụ kwa onweya dịka ngwáọlụ nke ngosipụta ahụ ka O wee gosi karịa Onweya na ezi nzọpụta Ya. Otù nime ihe mmekpu ukwuu kachasị njọ nke Chineke nwere megide mba Israel, ndị nke Ya arọpụtara, bụ na ha lelịrị Ya anya (ha ekwereghị n’okwu Ya “Ha we chigharia, we nwa Chineke, ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe” (Abù Ọma 78:41). Ọ bụghị otú a ka Samson dị. Ọ dị nnọọ ka ọ dịghị ihe siri ike n’omume nke gaeme Samson ka o nwee obiabụọ banyere ike Chineke inye ya mmeri.

Samson ka edenyere n’usoro ndị dike nke okwukwe, n’ihi na o gosipụtara okwukwe ahụ. Eleghịanya Samson nwere ụfọdụ n’otù mmụọ ahụ Devid nwere mgbe, ọ bụ náánị nwatakịrị naazụ atụrụ¸ o ji anyaike baara ùsù ndịagha Israel mba maka obiịlọmmiri ha ma ọ pụtara izute dike ahụ bụ Golaiat náejighị ihe ọ bụla ma ọ bụghị èbè ya na nkume ise. Devid kweere Chineke, o nwere okwukwe ịtụkwasị Chineke obi n’oge dị óké egwù, wee nwapụta ya site n’igbu Golaiat naeji náánị otù nkume nke atụpụrụ site n’èbè ya. N’ọtụtụ arọ nke naesoni, Pita na Jọn, kwa, ka akpagburu wee yie kwa egwù n’ihi ọgbụgbaàmà ha n’ihi Kraist, ma ha jekukwaara ụmụnna ha wee kpeere Chineke ka O “nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa okwu nile kwue okwu gi” (Ọlu Ndi-ozi 4:29).

Nkewapụ Ịsọpụrụ Chineke

Anyị agaghị aghọtahie eziokwu niile nke ndụ Samson ma kwere kwa na Chineke naara otuto nime Samson náagbanyeghị ndahie niile ya maọbụ mmehie niile ya. Ka oge ra mgbe Samson naedebe ọgbụgbandụ niile nke ya na Chineke, wee naedebezu kwa nzọpụta ya, enyere Chineke otuto; ma mgbe o lefuru ọdịmma nke mkpụrụobi ya anya, wee ghara ịkwụghachị Chineke mkwà ya niile Samson ghọrọ ihenkọcha n’ebe Chineke nọ Chineke enweghị kwa obi ụtọ n’ebe ọ nọ.

Mkparịkọta nzuzu niile nke Samson na ndị Filistia wetara ndụ nke inwe onwe ya na njedebe nke ihere. Adọtara ya n’agha; aghụpusịrị anya ya abụọ; emekwara ka ọ naegwe nri n’ụlọ mkpọrọ dị na Geza. Ọ ghọrọ onye ịkwaemo nke ime iheọchị niile nke ndị Filistia dakwasịrị. Mkparịkọta niile nke Samson na ndị Filistia bụ ihe okwu Chinke megidere. Ma Akwụkwọnsọ nyere anyị ndụmọdụ dị icheiche pụtara ìhè nke arịbakwara ámá, dị ma n’Agba ochie ma n’Agba Ọhụụ na agaghị enwe mmekọrịta, ọlụlụ dinanwunye dị icheiche, maọbụ mkparịta naadịghị mkpà anyị na ndị naadịghị asọpụrụ Chineke, maọbụ Ọkpara Ya Jisọs Kraist.

Ọlụ nke ịzụ na ire ihe dị icheiche nke dị mkpà eji enyere ndụ aka butere na anyị na ụwa aghaghị inwe mmekọrịta. Otú ọ dị, mmekọrịta dị icheiche ndịa gaakwụsị náánị n’ọlụ nke ịzụ na ire ihe, ndụ anyị gaadị naenweghị mmekọrịta dị icheiche nke gaegbochi ijé ozi anyị nye Chineke. Anyị gaatụpụ mkpakọrịta ndị ahụ niile na omume dị icheiche nke omenaala na ụdị pụrụ ịche nke ụwa kpọrọ ihe dị mkpà ma ọ bụrụ na ha gaemebi mmasị anyị n’ebe Chineke nọ, iwere oge anyị maọbụ iwepụ ige ntị anyị n’ebe Chineke nọ, maọbụ iweta nkọcha nye ọnọdụ Okwu Chineke na ndị Ya; anyị agaghị kwa enwe mmekọ ihe ọ bụla n’ebe ha dị (Gụọ I Ndi-Kọrint 5:9, 10; Jemes 4:4; II Ndi-Kọrint 6:14-18). Israel wetara ọtụtụ nsogbu nye onweha site n’inupụisi n’iwu Chineke megide ịlụ dinanwunye nke ndị na ekweghịekwé.

Amara nke Naagbapụta

Agịrịisi ogologo nke Samson bụ ụdị ọgbụgbandụ (maọbụ mkwà) ya dị icheiche n’ebe Chineke nọ. Ike ya rapụrụ ya mgbe o mebiri mkwà o kwere Chineke, o wee bụrụ onye naadịghị ike n’aka ndịiro ya. Nwuta dị ukwuu gaejupụtaworị obi Samson n’ihi ihe ihere o wetaara onweya, ndị ya, ma nke kachasị ha niile njọ, megide Chineke nke ọ naefè. Otú ọ dị, ụlọ mkpọrọ nke ndiiro bụ ezigbo ebe nye Samson ibido ichè échìchè banyere ọtụtụ ohere fuworoefu n’ihi iji fee Chineke. Samson chègharịrị n’ikpeazụ n’ihi ịtaụta o wetaara aha Chineke, Chineke nyeghachịkwara ya ike ya dị ebube ọzọ ka ọ bụrụ otù ohere fọdụrụ iji laa ndịiro nke Israel n’iyi.

Samson gburu ọtụtụ ndị Filistia n’ọnwụ ya karịa mgbe ọ nọ ná ndụ ya niile. Mgbe ndị Filistia naeme óké ememe nke ịsọpụrụ chi ha, Chineke nke náánị Ya bụ ezi Chineke, nyeghachịrị Samson ike ya ọzọ, o were ya dọtue ụlọ ahụ zekwasị ndị Filistia gbue ha niile. Otú a ka Chineke siri bọọrọ Samson ọbọ n’ihi anya ya abụọ furuefu, na ndọta n’agha adọtara ya, na kwa ihe ihere nke ndị Filistia mere ya.

Na Samson pụrụ iwedata onweya ala nke ọma n’ichègharị n’ihi ihe nzuzu nke wetaara ya ọnọdụ ihere dị otú a bụ ihe ịja mma. Nwoke ahụ nke naechere rue mgbe o dinara n’àkwà ndina ọnwụ ya ka o chègharịa site ná mmehie nke ndụ ya niile bụ n’ezie ịtụkwasị obi n’olileanya dịkarịrị nta, n’ịdịkarị mma ya. Ọ bụrụ na mgbe ọ naanagide ụfụ na ndọlị dị icheiche nke ọnwụ, na ọ pụrụ ịtụgharị uche nke ọma ịdị egwù nke izute Chineke nime mmehie nke ndụ ya niile, nke ọ naechègharịghị na nke ọ naapụghị inye ihe nkwụghachị maọbụ imezi, ọ gaewe ihe bụ ezi óké okwukwe na Chineke ikwere na Chineke gaagbaghara ya ma zọpụta kwa mkpụrụobi ya tupu ọnwụ ewere ọnọdụ.

Samson gosipụtara n’ọnwụ ya ihe nlereanya pụtara ìhè nke ezi okwukwe nime Chineke dịka Akwụkwọnsọ naenye. Samson apụghị inye ihengọpụ n’ịbànye n’ọnọdụ jọgburu onweya. O mehieworị, naakwụ kwa ụgwọ mmehie ahụ. Ma otú ọ dị, o kpeere Chineke ọzọ, maka ebere. Ọ natara ebere, Samson wee nwapụta kwa ọzọ, na nke ikpeazụ, ike Chineke. “Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye gēmegide ayi?” Eleghịanya Samson lekwasịrị Chineke anya dịka mkwà Chineke si di: “JEHOVA nēme ka ndi di ume-ala n’obi guzo ọtọ: ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala…. Ihe nātọ JEHOVA ụtọ bu ndi nātu egwu Ya, Ndi nēchere ebere ya” (Abù Ọma 147:6, 11).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kedụ ebe óké ike Samson si pụta?
  2. Gịnị bụ ihe agaamụta nime eziokwu ahụ na Samson ji ọkpụkpụagba ịnyịnyaibu tigbue otù puku ndị Filistia?
  3. Gịnị bụ ịdịmma kachasị nke Samson nwere?
  4. Òlee ihe mere eji depụta aha Samson n’Akwụkwọ Ndị Hibru isi irinaotù?
  5. Ọ bụ ihe ziriezi ichere rue mgbe ọnwụ gaabịa tutu echègharịa site ná mmehie, wee nwee kwa olileanya na Chineke gaagbaghara anyị mmehie niile anyị?
  6. Gịnị mere Samson ji dị ike n’ọnwụ ya karịa na ndụ ya?