Matiu 21:12-32

Lesson 196 - Senior

Memory Verse
“Agākpọ ulom ulo ekpere” (Matiu 21:13).
Cross References

I Ọkpara Chineke Nime Ulo Chineke

1. Mgbe Jisọs hụrụ na ndị ahụ naemebi ụlọ ukwuu Chineke naaga n’iru, O jiri ike chụpụ ndị ahụ nke náemebiiwu, Matiu 21:12, 13; Mak 11:15-17; Aisaia 56:7; Jeremaia 17:11

2. Mgbe O mesịrị nke a Ọ lụkwara ọlụ ọzọ nke Chineke n’ebe ahụ, Matiu 21:14; Luk 19:47, 48; 20:1; 21:37

3. Ndị ndú ahụ nke náekwesịghị ntụkwasịobi nwere mwuta n’ihi mmalite nke ime ka ike Ya pụtaìhè, ha wee náemegide Ya n’ebe ọ pụtara nnọọ ìhè, Matiu 21:15, 16; Mak 11:18; Luk 19:47, 48

4. Jisọs jiri Okwu Chineke zaghachị ha, Matiu 21:16, 17; Abụ Ọma 8:2

II Ihe Mmụta site n’Osisi Fig ahụ nke Náadịghị Amị Mkpụrụ

1. Ebe ọ bụ na agụụ na-agụ Jisọs, O lere anya ịhụ mkpụru fig ma Ọ hụghị, Matiu 21:18, 19; Mak 11:13; Abụ Ọma 1:1-6

2. Osisi ahụ nke náadịghị amị mkpụrụ bụ ụdị Israel náadịghị amị mkpụrụ na kwa ndị okpukpé dị iche iche nke náadịghị amị mkpụrụ, Matiu 13:22; Jọn 15:1-9, 16; Ndi Galatia 5:22, 23

3. Ikpé ahụ bụ maka amịghị mkpụrụ, Matiu 21:19¸ 20; 3:10; Luk 19:20-26; Ndi Rom 11:29

4. Egosirị urù, ike na ịdị mkpà nke okwukwe, Matiu 21:21, 22; Ndi Rom 14:23; Habakuk 2:4; Jọn 6:28, 29; Ndi Efesọs 6:16; Ndi Hibru 11:1, 6; Jemes 1:5, 6

III Nghọta na Amamihe nke Jisọs

1. Ikike nke Kraist, ijéozi Ya nke sitere na Chineke, na Ịbụ Chineke nke Ọ bụ, bụ ihe anaekwugide kwa ọzọ, Matiu 21:23; Jọn 12:44-50; 13:20

2. Ajụjụ Jisọs nke ha náapụghị ịzaghachị bụ eziokwu nke náegosipụta ike Ya, Matiu 21:24, 25

3. Ebe ha náenweghị ike ịzá nkeọma ma bụrụ kwa ndị náaga n’iru ịgọnarị ịbụ Mesaia nke Kraist, ha rapụrụ ịzá ajụjụ ahụ site n’ikwuokwu ụgha, Matiu 21:25-27; Luk 20:5-8

4. Aghụghọ na enweghị eziokwu n’obi mere ka ha ghara ikwu eziokwu, Matiu 21:27; 13:4, 19; 2 Ndi Tesalọnaika 2:10-12

IV Nna ahụ na Ụmụ Ya Ndịkom

1. Nwa nwoke nke mbụ, ọjụjụ ọ jụrụ ma mesịa chègharịa, dị ka onyemmehie nke mesịrị chègharịa n’ikpeàzụ, Matiu 21:48, 29

2. Nwa nwoke nke abụọ, mkwenye nke o kwenyere na nnupụisi nke o nupụrụ n’ikpeazụ, dị ka onye iru abụọ, Matiu 21:30

3. Ejiri nkọwa ahụ tụnyere Israel, ndị Chineke rọpụtara ma ha nupụụrụ Chineke isi, Matiu 21:31, 32; Ọpupu 19:5, 6, 8; Jeremaia 31:31, 32

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Jisọs Ọkpara Chineke

Mbànye ná mmeri nke Kraist banyere nime Jerusalem agabigawo, ya na ụbọchị ahụ mgbe nke a mere. Ndị ahụ enyewo Ya otuto wee fèe kwa Ya òfùfè dịka Nwa Devid, Onye ahụ nke bịara n’aha Onyenweanyị. Ha enyewo Chineke otuto n’ihi ọlụ Ya niile nke dị ukwuu, sị, “Onye-agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi bu” (Luk 19:37, 38). N’ụbọchị nke abụọ nke izú, ụbọchị nke ya na Mọnde nke anyị dakọtara, Jisọs rapụrụ obodo Betani ọzọ ewee hụ Ya na Jerusalem, ebe anyị ghọtara, na Ọ nọrọ ụbọchị ka ukwuu n’izú ahụ.

Ụlọ Meri, Mata na Lazarọs dị na Betani. Ọtụtụ mgbe Jisọs naejé n’ebe ahụ, n’ihi na Ọ hụrụ ezi mmekọrịta na ịhụn’anya nke ndị nke Kraist n’ụlọ ezi ndị náesoụzọ Ya ndịa. Betani bụ obodo ntà nke dị n’akụkụ Ugwu Olive, otù ebe dị jụụ, ebe O nwereike izu ike wee nọpụ iche n’etiti ìgwè mmadụ ndị nọ nime obodo Jerusalem nke dị ukwuu.

Na nso mmalite nke ijéozi Ya, Jisọs abàworị nime Ụlọ Ukwuu Chineke wee chụpụsịa ndị náagbanwe ego na ndị naere ehi, atụrụ, na nduru. Mmerụ a nke Ụlọ Chineke bụ, náenweghị obiabụọ, ihe nke anabataworo, maọbụ eleghịanya ọbụná nke ndị isi Ndị Juu nke oge ahụ tọworo ntọala ya dịka agasị na ọ dị mkpà maka ọdịmma nke ndị sitere n’ebe dị anya wee bịa ifè òfùfè nime Ụlọ Chineke.

Iwu Moses kwenyere ka ndị sitere n’ebe dị anya nwereike ịgbanwe onyinye ha ka ọ bụrụ ego ka o wee dịrị ha mfé iweta onyinye ahụ bịa na Jerusalem (Deuteronomi 14:24-26). Mgbe ha ruru na Jerusalem ha gaazụrụ ihe niile dị mkpà nke kwesịrị ka ha jiri fèè òfùfè, Chineke gaanara kwa ihe ndị ahụ. Ma Chineke ekweghị na Ụlọ Ya gaabụ ebe ịzụahịa. Ụlọ Ya kwesịrị ịbụ ebe ekpere ma óké ọchịchọ mere ka ndị náere ihe ndịa bịa nọdụ nso n’etiti ebe ahụ nke kwesịrịrị ịbụ ebe obibi nke Chineke, ka ha wee nweta urù site n’ire anụ na nduru dị icheiche.

Ọ bụ ihe pụtara ìhè na Jisọs, ná mmalite nke ijéozi Ya n’elu ụwa nke a na kwa mgbe Ọ naaga ijézu ozi Ya, mere omume nke gosịrị na Ọ nabataghị mmerụ a nke Ụlọ Chineke. O kwuru okwu dị ike n’oge nke ihe mbụ ahụ mere (Jọn 2:13-17), ma O kwuru okwu nke dị ike karịa n’oge nke ikpéazụ a. Ijéozi Ya niile site ná mmalite rue n’ikpéazụ bụ na Chineke -- ọ bụghị ọlụ nke mmadụ -- gaabụ onye anaeto; na Ụlọ nke Chineke gaabụ kwa ebe dị nsọ, ebe agaanọ náekpe ekpere ma wee náanụ Okwu Chineke dị ọcha, o kwesịghị ka ọ bụrụ “ọgbà ndi nāpunara madu ihe” -- ebe nzobe nye ndị náeme ajọ ihe.

O nwereike ịgbara onweYa àmà. Ọ bụ Chineke Ọkpara, Ya na Chineke Nna na Chineke Mmụọ Nsọ ranrata. Ọ nọrị site ná mmalite! Ebe ọ bụ na Ụlọ a bụ ụlọ nke Chineke, Jisọs bụ nnọọ Onyeisi n’ebe ọ dị. Ọ dịghị onye nwereike ịjụ ajụjụ ma ọ bụ iguzogide ike Ya; ndị niile nke náajụ ajụjụ megide Ya naagọnarị ịbụ Chineke Ya, ịbụ Mesaịa Ya, ikike Ya na ọlụ Ya. N’ime nke a, ndịa náekwesịghị ntụkwasịobi náagọnarị Chineke onweYa na okwu niile nke ndị amụma nke Chineke site ná mmalite. Ọ dị ọtụtụ iheàmà pụtara ìhè n’ihe dị icheiche nke ha hụrụ n’arọ niile nke ijéozi Ya, nime okwu niile nke ndị amụma nke kwuruokwu banyere ọbịbịa Ya, na Mmụọ Nsọ nke rịdatara gosi Onwe Ya n’ebe ọ pụtara ìhè, ịji gosi ha n’ezie na Ọ bụ Ọkpara Chineke. Ma ha gọnarịrị Ya. N’ihi nke ahụ, anyị nwereike ikwu na ha bụ ndị malitere na ndị mbụ nime ndị náesoụzọ nke Onye ahụ náemegide Kraist nke gaeme ka ike ya pụta ìhè n’oge Óké Mkpagbu ahụ (I Jọn 2:18, 22; 4:2, 3).

Osisi Fig ahụ nke Náamịghị Mkpụrụ na Ndịozi

Náadịghị Amị Mkpụrụ

N’ụzọ sitere Betani ná-aga Jerusalem, agụụ gụrụ Jisọs. Nke a abụghị oge fig ji na-acha, n’ikwu nnọọ nke ọma; ma mgbe Ọ nọ n’ebe dị anya Ọ hụrụ otù osisi nke tozuru nnọọ n’ebe o kwesịrị ka mkpụrụ ya bụrụ ihe charaacha. Ma mgbe O lere anya na Ọ gaahụ mkpụrụ n’elu ya, ọ dịghị nke Ọ hụrụ. Agwara anyị na ọ dị ọtụtụ ụdị osisi fig dị icheiche, na ha niile n’otù n’otù naamị mkpụrụ ọtụtụ ugbò n’arọ. Otù ihe pụrụ iche eji mara otú osisi fig si amị mkpụrụ bụ na mkpụrụ ya naebu ụzọ pụta tutu akwụkwọ ya. Mgbe ọ bụla akwụkwọ ya juru n’elu osisi ahụ, mkpụrụ ya bụ ihe náadị njikere ka aghọrọ ya. Ebe ọ bụ na Kraist hụrụ osisi ahụ mgbe Ọ nọ n’ebe dị anya, nke a naeme ka anyị mata na osisi ndị ọzọ enweghị akwụkwọ nke ukwuu dịka nke ahụ; ọ bụghị oge owuwe mkpụrụ fig. Ma ebe otù osisi a jupụtaworo n’akwụkwọ ndụ anyị matara na ọ bụ nke mere ọsọsọ karịa ibe ya, n’ihi nke a Kraist mere nkeọma n’ile ma Ọ gaahụ mkpụrụ n’elu ya.

Chineke anaghị achọ ihe ọ bụla nke náezighị ezi n’aka anyị. Ọ nághị atụanya ihe nke náabaghị urù, ma ọ bụ ihe nke náagaghị ekwe omume. Ekwuwo ya sị na “Iwu nke Chineke bụ ihe Ọ na-enye ike ka emee.” Kraist abịaghị n’osisi fig a wee náachọ mkpụrụ olive, date, ma ọ bụ grape. Ọ bịara wee chọọ mkpụrụ fig, ọ bụ kwa ihe ziriezi ka O mee otú ahụ ebe ọ bụ na akwụkwọ nke juru n’elu osisi ahụ bụ ihe náegosi na mkpụrụ ya kwesịrị ịbụ ihe charaacha.

Chineke achọghị ka anyị bụrụ ndị náeñomi onye ọzọ. Tutu anyị ewee bụrụ ndị Chineke gaanabata, anyị gaabụ ndị nọgidere n’ọkpụkpọ ahụ akpọrọ anyị (I Ndi Kọrint 7:20); ebe ọ bụ na “nchèghari adigh n’onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke” (Ndi Rom 11:29). Chineke naachọ ka anyị náamị náánị mkpụrụ nke anyị onwe anyị; ma Ọ chọrọ ka anyị náamị mkpụrụ ahụ. Anyị gaabụ ndị gaazá ajụjụ n’iru Ya n’ihi ọlụ ahụ.

Ikpé nke Chineke bụ ikpé ziriezi. Ọ naatụ anya na anyị gaamị mkpụrụ dịka ọtụtụ nke Oziọma anyị nátara si dị. Ụfọdụ mmadụ nwere ohere dị ukwuu, ya mere achọkwara ọtụtụ ihe n’aka ha. Ụfọdụ nwere nnukwu ohere, ha gaabụ kwa ndị gaaza ajụjụ ma ọ bụrụ na ha ejighị ohere ahụ dị icheiche dị kwa ebube nke Chineke nyere ha lụọọlụ. Osisi fig ahụ dị n’akụkụ ụzọ, n’ebe o nwereike ịnọ wee bụrụ ngọzi nye ọtụtụ mmadụ -- ma ọ mịghị mkpụrụ! Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa bụ ndị nọ “n’akụkụ ụzọ” nke ndụ, ndị nwekwara ohere nke ọ na-adịghị ihe aga-eji tụnyere ya iji jeere Chineke ozi na ịmịrị Ya mkpụrụ, ma ha anaghị eme otú ahụ. Ndị Israel bụ ihe ịmaàtụ nke ihe ndịa, ebe ọ bụ àtụmààtụ nke Chineke na ha gaabụ ndị náejéozi nke Ọgbụgbandụ ahụ, ndị nlekọta nke ihe Nsọ, na mba ahụ ebe Mesaia gaesi bịa. Ma anyị amụworị na ha laghachịrị azụ n’ebe Ọgbụgbandụ ahụ nke ha na Chineke gbara dị, dịka otù mba kwa, ha bụ ndị mịrị náánị ntakịrị mkpụrụ nye Chineke. Ohere niile nke Ọgbụgbandụ ahụ dị nsọ bụ ihe ụfọdụ mmadụ n’otù n’otù mejupụtara -- ma Onye Ju ma Onye Mbaọzọ -- ndi, n’oge niile nke Oziọma, abụrụwo ndị mezuru ihe niile achọrọ n’Ọgbụgbandụ ahụ.

Lee ka o si bụrụ ihe pụtaraìhè na Mmụọ Nsọ debeere anyị ndụmọdụ nke ihe anaahụ anya nke bụ otù nime mkpụrụ kachasị mkpà nke kwesịrị ka ánáámị -- ikpere ndị ọzọ ekpere. Ọ dị ọtụtụ ụzọ nke esi ejéozi ma otù nime ụzọ kachasị bụ ekpere. Ọ dịghị ihe ọ bụla nke agaemere Chineke o wee gaa nkeọma ma ọ bụrụ na esiteghị na ya. Ekpere onwe ya, kwa, abaghị urù ọ bụla ma ọ bụrụ na ekpeghị ya dịka uche na mkwà nke Chineke si dị. Ma otú ọ bụla ijéozi ọ bụla gaesi dị ebube, ọ bụ ihe nke ike náadịghị na ya, ma ọ bụrụ na ejighị okwukwe tigwaa ya ime ka uche Chineke pụtaìhè. Ezi okwukwe naeme ka enweta ngọzi ahụ nke anaachọ. Onyenwe anyị jiri ihe ịrịbáàmà nke a mee ka okwukwe nke ndị náesoụzọ Ya bụrụ ihe emere ka o sieike ma dị kwa ukwuu -- na nke anyị onweanyị kwa -- na kwa iji wee mee ka mkpụrụ nke anyị niile náamị bụrụ ihe dị ukwuu.

Ichéakamgbá Ahụ nke Kwalitere Ichéakamgbá nke a

Ndị isi nchụàjà na ndị okenye nke ndị ahụ náachọrị ụzọ nke ha gaesi kwatue Jisọs. Mmalite nke Ọ malitere inwe ike n’ebe Ulo Ukwuu Chineke dị, n’ịchụpụ ndị náemerụ Ụlọ Chineke, n’ikuzi okwu Chineke n’ebe ahụ, na n’ịlụ ọtụtụ ọlụ ịrịbaàmà nke náagbara ịbụ Chineke Ya na ịbụ Mesaia Ya àmà, mere ka ha malite imegide Ya. Ebe ha chọrọ ime ka Ọ máá n’ọnyà, ha jụrụ Ya ajụjụ nke iché Ya akamgbá: “Ọ bu n’aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a?” Ha naachọ inweta ike ịlụ ọlụ ha site n’aka mmadụ; n’ebe ha nọ kwa, ọ dịghị ọlụ ọzọ nke dị mma karịa. Ike na ijéozi nke Jisọs sitere n’ebe Chineke nọ, ma ọ dịghị ihe eziokwu a bụ nye ndị iruabụọ ndịa nke tụkwasịrị onwe ha obi náenye kwa onwe ha otuto.

Onye ahụ nke bụ Onye nwe Ụlọ Chineke zaghachịrị okwu nke ichéakamgbá ha site n’okwu nke ichéakamgbá nke ha achọghị ịzà. Ha nwereike ịzá ya. Ha matara otú ha gaesiworị záá ya nkeọma. Ma ime nke a gaabụ ikpughe iruabụọ na mmehie ha.

Okwu Chineke nke Jọn naekwu bụ ihe banyere Jisọs. Ihe niile ọ bụla nke ijéozi ya naatụ aka bụ n’ebe Nwaatụrụ Chineke nọ. Ọ bụrụ na ha nábatara ozi nke Jọn ha gaanarawokwarị Jisọs. Ma, n’ime ka ọ pụtaìhè, ọ bụ n’oge ọwụwụmmiri nke Jisọs ka Chineke Nna kwuru okwu, site n’Eluigwe, “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma” (Matiu 3:17). Ọ bụ n’ebe ahụ ka Mmụọ Nsọ rịdakwasịrị Nwa nke Mmadụ dịnsọ, nke anaemerụghị kwa emerụ dịka onye àmà nye ikike Ya. Ọzịzá nke ajụjụ ha dị nime ajụjụ ahụ nke Jisọs jụrụ ha. Ike Ya esiteghị n’ebe mmadụ nọ; o sitere n’ebe Chineke nọ, ya mere, ọ karịrị ike nke mmadụ naenye.

Ụmụ Ndịkom Náadịghị Njikere

Nime ụbọchị ụfọdụ nke izù Jisọs ziri ihe nime Ụlọ Chineke, O wee gwa ndị gbakọrọ n’ebe ahụ ihe banyere otù nwoke onye nwere ụmụ ndịkom abụọ ndị akpọrọ ịlụ ọlụ n’otù ubivine. Ọ bụrụ na anyị kwenyere n’ụdị ihe ịmaatụ nke Baịbụl nke náewere ubivine tụnyere ubi ebe Chineke naewe ihe ubi, anyị gaahụ nnukwu eziokwu n’ebe a.

Otù nwa ya nwoke yiri otù onyemmehie onye Mmụọ nke Chineke kpọrọ ịbànye n’Alaeze, onye kwuru sị na ya agaghịeje, ma mesịa chègharịa wee jee ịlụrụ Nna ya ọlụ. Onye nke ọzọ yiri mbà Ndị Ju ndị sịrị na ha gaeje, ma emesịa ha emeghị otú ahụ. Onye ahụ nke jere bụ onye mere ihe Nna naachọ.

Ọ bụ ihe dị mfé ikwu na Kraist bụ Onye amụma, ewee ghara ịnabata òzízí Ya niile. Ọ dị mfé ikwu na Ọ bụ Eze, ewee ghara irubere Ya isi. Mmadụ pụrụ ịmata ịdị ike Ya, ma onye ahụ ewee bụrụ onye náadịghị ejere Ya ozi n’ikwesị ntụkwasịobi. Ọ dị mfé ọbụná ikwenye na Ọ bụ Ọkpara Chineke ma ghara ifé Ya òfùfè. Ọ dị kwa ụfọdụ mmadụ, ọ bụ ihe mwuta ikwu ya, ndị kwenyere na Ọ bụ náánị Ya bụ Onye nzọpụta, ma ha anabataghị Ya dịka Onye nzọpụta ha. Onye nke mere ihe Nna naachọ bụ onye nke zara ọkpụkpọ òkù Ya!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ óké ihe nke mere tutu iheọmụmụ anyị nke a?
  2. Gịnị bụ ihe ndị ahụ mere nime Ụlọ Chineke nke gosirị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
  3. Gịnị bụ ihe ụmụntakịrị mere nime Ụlọ Ukwuu Chineke?
  4. Òlee ebe Jisọs nọ nwee izuike nke oge ole na ole Ya nime izú nke ikpeazụ a?
  5. Kọọ akụkọ banyere osisi fig ahụ nke náamịghị mkpụrụ.
  6. Gịnị bụ óké ihemmụta nke Jisọs nyere anyị site n’ihe a nke mere?
  7. Kwue óké mkwà ahụ nke dị na Matiu 21:22
  8. Gịnị mere ndị isi nchụàjà na ndịokenye ji kwueokwu megide ike nke Jisọs?
  9. Gịnị bụ ihe Ọ zaghachịrị?
  10. Were akụkọ banyere nwoke ahụ na ụmụ ya ndịkom abụọ tụnyere àtụmàtụ Ọgbụgbandụ nke Chineke.