Matiu 21:33-46

Lesson 197 - Senior

Memory Verse
“Nkume nke ndi nēwu ulo juru aghọwo isi nkuku ulo. Ọ bu n’aka JEHOVA ka nka sitere; nke ahu bu óké ọlu n’anya ayi” (Abù Ọma 118: 22, 23).
Cross References

I Ubivine Ahụ

1. Otù nnanweụlọ kụrụ otù ubivine, wee tinye ya n’aka ndị ọlụ ubi, wee jee n’ala ọzọ dị anya, Matiu 21:33; Aisaia 5:1-7; Abù Ọma 80:8

2. O zipụrụ ndị orù ya ka ha jee nata mkpụrụ nke ubivine ahụ, Matiu 21:34

3. Ndị ọlụ ubi ahụ pịara otù onye nime ndị orù ahụ ihe, gbue nke ọzọ, tụọ kwa nke ọzọ nkume, Matiu 21:35; Jeremaia 37:15; 38:6; 26:23

4. O zitere ndị orù ọzọ, ndị ọlụ ubi ahụ wee mee kwa ha dịka ha mere ndị mbụ, Matiu 21:36; 2 Ihe Emere 36:15, 16; Nehemaia 9:26

5. N’ikpeazụ, ndị ọlụ ubi ahụ gburu ọkpara ahụ, wee chèè na ha gaenweta ihe nketa ya, Matiu 21:37-39; Jenesis 37:18-20; Jọn 11:53; Ọlu Ndi-ozi 2:23

6. Agaata ndị ọlụ ubi ọjọọ ahụ ahụhụ, Matiu 21:40, 41; Ọlu Ndi-ozi 13:46; 18:6; 28:28

II Nkume Ahụ A Jụrụajụ

1. Nkume ahụ a jụrụajụ aghọwo isi nkuku ụlọ, Matiu 21:42; Abù Ọma 118:22; Aisaia 28:16; Daniel 2:34; Ọlu Ndi-ozi 4:11

2. A gaetiwasị ndị niile gaadakwasị Nkume a, ma ọ gaegwerị ndị ọ bụla nke ọ gaadakwasị dịka ntụ, Matiu 21:44; I Pita 2:7, 8

3. Jisọs kwupụtara ikpé gaadakwasị Israel, Matiu 21:43-46

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ilu a nke pụtara ìhè nkeọma bụ nke ekwuru banyere mba Ndị Ju, ka ekwuru iji gosi ha na Onyenweanyị arọpụtawo ha ịbụ ndị nke Ya, na ha emejọwo Chineke ma jụ kwa ndị amụma Ya, na agaanapụ ha ubivine ahụ were kwa ya nye ndị ọzọ.

Otù Vine Kachasị Mma

Aisaia Onye amụma nyere anyị nkọwa ọma nke ubivine ahụ nke Onyenweanyị kụrụ, na kwa ugwu ahụ nke bụ ala ọma nke ihe akụrụ na ya naamị mkpụrụ nke bụ kwa ebe o kwesịrị ime nkeọma (Aisaia 5:1-7). Kenean, bụ Ala Mkwà ahụ, bụ ihe enyere ndị Israel, ọ bụ kwa ala nke agọzirị agọzi n’ụzọ ọ bụla. Akwụkwọnsọ gwara anyị na ọ bụ ala miri ara ehi na mmanụ añụ naeru n’ime ya, mkpụrụ vine nke Eshkol buruibu nke ukwuu. Ọtụtụ ubivine dị nke ndị Israel náakụghị, ubi olive nke náamị mkpụrụ ha, na obodo dị icheiche nke ha náejighị aka ha wue.

Ọ bụ kwa n’ala ahụ ka esi chịkọpụta nkume niile. Anyị ghọtara site na nke a na Onyenweanyị mere ka ọ pụtaìhè na Ọ dị nnọọ njikere ịchụpụ ndị Kenean -- ndị náefè arụsị, ndị náajụ kwa Chineke, bụ ndị bi n’ala ahụ. N’ebe Chineke nọ nke a ka emeworo, náachọ náánị nrubeisi nke Ụmụ Israel iji mee ka ọ bụrụ ihe zuruòkè.

Chineke kụrụ vine kachasị mma n’ala ahụ, èzínaụlọ nke ndị náatụ egwù Chineke. Onye isi nke èzínaụlọ a bụ onye náelefere obodo dị icheiche na àkụ nke ụwa nke a wee náeleanya obodo nke nwere ntọala, nke Chineke bụ Onyeọkà ya na Onye lụrụ ya (Ndi Hibru 11:10). Otù onye ahụ arọpụtara bụ Abraham, nwoke ahụ nke bụ onye okwukwe, onye kwere ma rubekwara Chineke isi; ọ bụ kwa mkpụrụ Abraham ka Chineke kụrụ n’ubivine nke a. Abraham bụ onye kwesịrị iji wee lụọọlụ ahụ! Gịnị bụ ihe ọzọ nke kwesịrị ka emee banyere ubivine nke Chineke?

Otù Obodo Dị Anya

Onyenweanyị nọ ọnọdụ n’ebe a dịka otù nnanweụlọ nke náapụ jee n’ala ọzọ dị anya. Ọ rapụrụ ndị ọlụ ubi ndị náelekọta ubivine ahụ. Ọ chọrọ ka ha náelekọta, náakwọsa mmiri, na kwa ka ha náazụ vine ọma ahụ nkeọma bụ nke Ọ kụworo. N’oge owuwe mkpụrụ, O lere anya na Ọ gaewe mkpụrụ. O lere anya, ma lee! ọ dịghị ihe ọ mịpụtara kama ọ bụ náánị grape ọhịa. Ndị ọlụ ubi ahụ emeghị nkeọma maọlị. Vine ọma ahụ aghọwo vine ọjọọ.

Onyenwe ubi vine ahụ emewo ihe kwesịrị ka o mee n’akụkụ nke ya. O nwewo ogologo ntachị obi n’ebe ha nọ, O zitawokwara ha ọtụtụ ndị amụma ka ha gwa ha otú ha gaesi náelekọta ubivine Ya. “M’we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha” (Jeremaia 35:15). Ọ gwara ha na ha emejọwo ndị ezitere ka ha nata ihe si n’ubivine ahụ pụta. Ụfọdụ ka atụrụ nkume, ụfọdụ ka apịara ụtarị, ụfọdụ ka egbukwara egbu. “Ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke agbu na ulo-nkpọrọ: aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha gbue ha: ha jere akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ ná nkpà, anākpagbu ha, anēmejọ ha” (Ndi Hibru 11:36, 37).

Izite Ọkpara Ahụ

N’ikpe-azụ, onyenwe ubivine ahụ ziteere ha ọkpara ya, sị, “Ha gāsọpuru ọkparam.” Ma ka arọ naabịa náagafe ka anaahụ na ihe ọjọọ naaba ụba n’obodo. Ọ dịghị ihe ọma dị nime ya, ọbụ náánị mmerụ arụ na ọnyá na ireuré. Ndị ọlụ ubi ahụ sịrị, “Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi gbue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya.” N’oge ahụ mgbe Jisọs nọ náatụ ilu a, ndị isi nchụ àjà na ndị Farisii nọ náagba izù otú ha gaesi gbue “Ọkpara” ahụ ma tụpụ kwa Ya n’azụ ubivine ahụ.

Otù Ajụjụ Doro Anya

Mgbe Jisọs tụbiri ilu a, Ọ jụrụ ndị náanụ okwu Ya otù ajụjụ, “Ya mere, mgbe ọ bụla Onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahụ?” Ha nyere ọzịzá ndị a. “Ọ gāla ndi ọjọ ahu n’iyi n’uzọ jọrọ njọ, Ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n’aka ndi-ọlu-ubi ọzọ.” N’oge náadịghị anya anyị hụrụ na ewepụrụ mba Ndị Ju wee were kwa Ndị Mbaọzọ dochie n’ọnọdụ ha (Ndi Rom 11).

Enyere Ndị ọzọ Ubivine Ahụ

Site n’ụbọchị niile nke Abraham rue na Kraist, Onyenweanyị naenwe ntachị obi n’ebe ndị Israel nọ. O sitere n’ụzọ dị icheiche iji mee ka ha bụrụ otù ndị nke gaadịrị Ya Onwe Ya. Nke mbụ, O mere ka ihe gaziere ha nkeọma ma gọzie kwa ha n’ihe mnweta dị icheiche, wee mee ka ha bụrụ mba dị ike. Ha wee bulie onwe ha elu wee bụrụ kwa ndị nnupuisi. Mgbe ahụ O mere ka ha dị ala ala, O mekwara ka ha bụrụ ndị adọtara ná agha. Ma emesịa, O zigara Ọkpara Ya -- Ọkpara Ya nke Ọ hụrụ n’anya.

Ma obi ha ka dị kwa njọ. Ha jụrụ Ya kpọgide Ya n’obe, wee tie mkpu sị, “Ọbara-Ya di ayi n’isi di kwa n’isi umu-ayi.” N’otù mgbe ahụ ha kwusịrị okwu ndị ahụ, anapụrụ ha ubivine ahụ were ya nye Ndị Mbaọzọ.

Otú Chineke si emeso mba dị icheiche, otú ahụ ka O si emeso onye ọ bụla n’otù n’otù. Ị dị ka ndị ọlụ ubi ọjọọ ahụ? Ị naekwu sị, “Achọghịm ka Jisọs na-achị nime obim?” Ọ bụghị mgbe niile ka Mmụọ Chineke na mmadụ gana agba mgbá. Jisọs naarịọ mmadụ niile; ma ọ bụrụ na anaraghị Ya, mgbe Onyenwe ubivine ahụ gaabịa, gịnị ka Ọ gaeme unu? Ndị Farisii kwuru ihe nke gaadakwasị ha onwe ha mgbe ha sịrị, “Ọ gāla ndi ọjọ ahu n’iyi n’uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n’aka ndi-ọlu-ubi ọzọ.” Ọ dịghị mgbe ha rọtara ya ná nrọ na Oziọma ahụ naesi n’aka Ndị Ju gafee n’aka Ndị Mbaọzọ. “Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpa ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n’aru-unu, nēkpe kwa onwe-unu ndi nēkwesigh ndu ebigh-ebi, le, ayị gaje ichighari gwa Ndi Mba ọzọ okwu” (Ọlu Ndi-ozi 13:46).

Nkume Ahụ Ajụrụajụ

Ekwuru sị na mgbe egwupụtara nkume niile nke ejiri wue Ụlọ ukwuu Chineke site n’ọtụtụ ugwu dị icheiche wee chịrị ha niile bịa n’ebe agaewu ụlọ Chineke, onye isi ndị náewu ụlọ ahụ lere ha anya nkeọma wee jụ otù, sị na ọ dịghị ọnọdụ dịrị ya. Ma mgbe ọ malitere iwu óké ụlọ ahụ ọ hụrụ na nkume a nke ọ jụrụajụ bụ isi nkuku ụlọ. Ma okwu ahụ, ọ bụrụ na otú esiri kwue ya bụ eziokwu n’ụzọ ihe anaahụ anya maọbụ na ọ bụghị, anyị amataghị, ma anyị matara na ọ bụ eziokwu n’ụzọ ihe nke imemmụọ.

“Nkume nke ndi nēwu ulo juru, nke ahụ ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa óké ọlu n’anya-ayi” (Matiu 21:42).

Jisọs bụ isi Nkuku ụlọ ahụ. Ya onwe Ya bụ ntọ ala ahụ nke ihe niile anaewu n’Oziọma naeguzo n’elu ya. Chineke apụghị iwu ụlọ a n’elu mmadụ. Ọ bụrụ na O mere otú ahụ, ọ gaadaworị. Ya mere O zitere Ọkpara Ya nime ụwa nke a ka O wee hụọ ahụhụ nwụọ kwa n’ihi mgbapụta ụwa niile.

Ngwepịa Dịka Uzuzu

Ọ bụrụ na anyị adakwasị Nkume a, agaetiwasị anyị. Mmụọ nke Onyenweanyị gaetiwasị mmụọ nke isiike, na nke nnupụisi anyị, wee nye anyị obi egwepịara egwepịa. Chineke sịrị, “M’gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M’gētiye nime unu: M’gēwezuga kwa obi nkume n’anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru” (Ezikiel 36:26).

Ọ dị nnukwu ihe dị iche n’etiti ịdakwasị Nkume ahụ na kwa ịbụ ndị etiwasịrị, na ikwe ka Nkume ahụ dakwasị gị ị wee bụrụ onye egwepịara dịka uzuzu. Mba ndị Ju adakwasịghị Nkume ahụ. Mgbe náadịghị anya ọ dakwasịrị ha, ewee gwepịaa ha dịka uzuzu, ha wee bụrụ ndị emere ka ha gbasasịa gaa ná mba dị icheiche. Anyị nwereike ịrọrọ taa ịdakwasị Nkume ahụ, maọbụ ikwe ka ọ dakwasị anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee mba ahụ nke anaatụrụ ilu a?
  2. Òlee ndị bụ ndị ọlụ ubi ahụ? Òlee kwa ụzọ ha si meso ndị orù nke nna nweulo ahụ?
  3. Gịnị mere ndị ọlụ ubi ahụ ji ghara ịsọpụrụ Ọkpara ahụ?
  4. Òlee otú ilu ahụ siri metụta ndị isinchụàjà na ndị Farisii?
  5. Ọ bụ onye naara ubivine ahụ mgbe anapụrụ ya ndị Ju?
  6. Gịnị bụ Nkume ahụ nke ndị náewu ulo jụrụ?
  7. Ọ bụ gịnị gaeme ndị dakwasịrị Nkume ahụ?
  8. Ọ bụ gịnị gaeme ndị Nkume ahụ gaadakwasị?