Matiu 22:1-14

Lesson 198 - Senior

Memory Verse
“Ya mere, gānu n’agbata uzọ nile, ka ha ra kwa, bú ndi unu gāhu, kpọ ha bia n’oriri ọlulu-nwunye nkem” (Matiu 22:9).
Cross References

I Oriri Ọlụlụ nwunye ahụ na Ndị ahụ Náenweghị Mmasị

1. Otù eze mere oriri ọlụlụ nwunye nye nwa ya nwoke, Matiu 22:1, 2; Luk 14:16; Nkpughe 19:7-9

2. Ndị orù ahụ gbalịrị n’efu ịkpọ ndị akpọrọrị ịbịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ, Matiu 22:3; Mak 6:12; Luk 14:17-20

3. Ezipụrụ ndị orù ọzọ, Matiu 22:4-6; Ilu 9:2-6; Aisaia 25:6; Ndi Hibru 2:3

4. Iwe eze ahụ mere ya ịla ndị ogbu mmadụ ahụ n’iyi, Matiu 22:7; Luk 14:24; 19:27; Daniel 9:26

II Oriri Ọlụlụ nwunye ahụ na Ndị Ọbịa ahụ Nwere Mmasị

1. Eze ahụ kpọrọ ndị niile apụrụ ịchọta, Matiu 22:8, 9; Luk 14:21; Ọlu Ndi-ozi 13:46

2. Ulo ahụ ana alụ nwunye wee jupụta ná ndị nọdụrụ ná nri n’ikpeazụ, Matiu 22:10; Luk 14:22, 23

III Onye Ọbịa ahụ Náekwesịghị nke Nọdụrụ ná Nri

1. Ahụrụ otù onye nọdụrụ ná nri nke ná eyighị uwe ọlụlụ nwunye, Matiu 22:11, 12; Nkpughe 3:4; 16:15; Zefanaia 1:7, 8

2. Ékèrè ya agbụ tụpụ ya n’ọchịchịrị nke ezi, Matiu 22:13; 8:12

3. “Ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na-ole,” Matiu 22:14; 20:16

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ihe eji tụa ilu nke a bụ izi ezi okwu ụfọdụ banyere Alaeze Eluigwe, na-ewere ihe-onyinyo nke ndị nọdụrụ ná nri n’oriri ọlụlụ nwunye, na-egosị mkpà nke uwe ọlụlụ nwunye ahụ dị, nke bụ mkwadobe dị mkpà nye ndị niile ga abịa n’oriri ahụ.

Oriri Ọlụlụ Nwunye Ahụ

N’ilu a Chineke naatụ aka n’oriri nke Oziọma bụ nke akpọrọ mmadụ niile. Ndị Ju enwewo ezi nghọta n’ihe niile edere n’Agba Ochie, nke gosịpụtara njikọ dịnsọ n’etiti Chineke na ndị Ya arọpụtara, n’ihi na ezirị ha eziokwu ahụ ọtụtụ ugbò. Jisọs sịrị, “Eji ala-eze Chineke tunyere otù nwoke bú eze, nke siri oriri ọlúlú-nwunye nye nwa ya nwoke.” N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ịhụ eziokwu nke anaakụzi n’ebe a, na Chineke ezipụwo ndị orù Ya ịkpọ ndị ahụ akpọworo n’ọlụlụ nwunye ahụ. Ma ilu ahụ naagwa anyị na ha achọghị ịbịa; anyị aghaghị ileba anya náánị nime akụkọ dịnsọ nke mgbe ochie ịhụ ka nke a si mezuworị n’ọtụtụ ụzọ nke iheàtù dị ukwuu.

Ndị amụma so ná ndị orù mbụ ndịa bụ ndị ezipụrụ ikwusa Oziọma na ịkpọ ndị mmadụ ịbịa n’oriri ahụ. Aisaia sịrị: “N’ugwu a ka JEHOVA nke ùsù nile nke ndi-agha gēmere ndi nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abuba jupụtara n’umi, nke manya-vine doro edo azara nke ọma” (Aisaia 25:6). Anaagwa anyị: “N’ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: Ma okwu nke ha nuru abaragh ha urù n’ihi na ejigh okwukwe tigwa ha ná ndi nuru n’ezie” (Ndi Hibru 4:2).

Chineke ezipụwo ndịozi ọzọ n’otù aka ahụ ịga n’ụwa nke ndị mmehie ka o wee weta ha niile nso onweYa. Lee ụdị ọkpụkpọòkù zuruòkè nke Chineke kpọrọ! Asị na ọ bụ-rị, ịbịa n’ọlụlụnwunye nke eze nke ụwa ọ dịghị onye gaajụwo yarị, ma ha jụrụ ihe ahụ nke dị óké ukwuu karịa -- nke bụ ọkpụkpọòkù ịbịa n’oriri nke Oziọma.

Ọkpụkpọòkù Ajụrụ

Anyị gụrụ na ndị ahụ akpọrọ n’oriri ahụ lefuuru ya anya wee jee ụzọ nke ha. Ụfọdụ chọrọ ịnọpụ iche n’ubi ná achọghịkwa ka ewere óké ememe ahụ nye ha nsogbu. Ndị ọzọ enweghị ohere ọ bụla n’ihi ịzụ ahịa ha, ha enweghị kwa oge ọ bụla ịbịa. Nchegbu niile nke ndụ a gbochikwara ọtụtụ ịnara ọkpụkpọòkù ahụ; ma n’ebe ụfọdụ nọ ọjụjụ ha ịbịa bụ site ná nlefuruanya nke ha, ejighị ihe kpọrọ ihe, maọbụ enweghị mmasị ha. N’aka nke ọzọ, anyị naahụ na ụfọdụ nwere ajọ obi ọbụná kpagbue ndị orù ahụ bụ ndị wetaara ha òkù ahụ. Ndị niile jụrụ ọkpụkpọòkù ahụ nyere ihengọpụ niile ha nke mere na ha agaghị abịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ. Ha niile rọọrọ ihe-niile nke ụwa karịa ngọzi niile nke Eluigwe.

Iwe nke Eze Ahụ

Ilu ahụ naakọwa na mgbe eze ahụ nụrụ banyere ọjụjụ niile nke ndị ahụ akpọworo, iwe were ya o wee zigaa ụsụ ndị agha ya niile wee laa ha n’iyi ma rechapụ kwa obodo ha ọkụ. Ka náánị arọ ole na ole gasịrị mgbe Jisọs tụsịrị ilu a nke a mezuru n’ụzọ pụtara ìhè, dịka o si metụta Ndị Ju. Taitọs na ndị agha Rom, n’arọ iriasaa (70 A.D) site n’ọmụmụ Kraist, lara Jerusalem na ọtụtụ Ndị Ju n’iyi. Akpọrọ ha, ma ha ekwesịghị. Òlee otú ha pụrụ isi kwesị, ebe ha ledaworo Eze nke Eluigwe anya site ná mmeso ha n’ebe ọkpụkpọòkù Ya dị ngọzi dị.

Mgbe ahụ Eze ahụ nyere ndị orù ya iwu ịga n’agbata ụzọ niile ịkpọ ka ha ra kwa bụ ndị ha gaahụ ịbịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ. Ndị orù ahụ gara kwusaa ọkpụkpọòkù ahụ nye onye ọ bụla. Ha akpaghị ókè ọ bụla n’ebe ndị nwere omume ọma na ndị ajọomume ha pụtara ìhè dị. Ọlụlụ nwunye ahụ wee jupụta ná ndị nọdụrụ ná nri. Chineke agwawo anyị ime otù aka ahụ, n’ihi na Ọ sịrị, “Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekèrè-èkè ozi-ọma nkem” (Mak 16:15). “Mọ Nsọ na nwayi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n’efu” (Nkpughe 22:17).

Uwe Ọlụlụ Nwunye Ahụ

N’etiti ndị mba ọwụwaanyanwụ, uwe nwụda dị ọcha ka anaeyi n’ememe nke dịrị ọra mmadụ, ndị náeyiri uwe ọzọ dị iche abịa n’ememe dị otú ahụ ka anaagụ ná ndị kwesịrị inye ahụhụ. Onye ahụ kpọrọ ndị nọdụrụ ná nri doziri uwe nwụda niile ahụ; anaenye ha ndị niile ahụ akpọrọ ná nri ma ha jụọ ha n’aka onyeisi nke oriri ahụ.

Mgbe eze ahụ batara ịhụ ndị nọdụrụ ná nri, ọ hụrụ n’ebe ahụ otù nwoke nke náeyighị uwe ọlụlụ nwunye. Nke a na ezi anyị na agaenwe nnyocha nke onye ọ bụla nọdụrụ n’oriri. Eze ahụ sịrị, “Eyim, isi aña bata n’ebe a nēyigh uwe ọlulu-nwunye.” Nwoke ahụ kpuchiri ọnụ ya, ebe ọ mara onweya ikpé. Ọ nweghị ihe ọ bụla ọ gaekwu iji gọpụ onweya n’ihi nlefuruanya ya. Akwadobere uwe, ma ọ jụghị àsè ya ma ọ bụ yiri ya. Omume ya bụ nlelị (maọbụ mkparị) n’ụzọ kachasị elu.

Mgbe ahụ eze ahụ sịrị ndị náejere ya ozi: “Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n’ọchichiri nke èzí; n’ebe ahu ka ikwá-ákwá na ita ikekere-eze ahu gādi.” Nke ahụ bụ ọnọdụ nke ndị ahụ ná achọghị iyiri uwe ọlụlụ nwunye ahụ.

Chee ihe ọ gaabụrụ nwoke a mgbe ọ hụsịrị ìhè niile ahụ na enwu enwu nke oriri ọlụlụ nwunye ahụ, nụ kwa abụ ọñụ ahụ hụ kwa ìgwè ndị ahụ náañụrị ọñụ, ịbụ onye achụpụrụ n’ọchịchịrị nke èzi! Ọ gaghị enwe oge maọbụ ọnọdụ na mgbe ahụ ichègharị. O kwesịrị ijiworị ụzọ ahụ arọpụtara mee ihe n’ihi ọdị mma ya mgbe o nwere ohere.

Chineke ekwuwo: “Ka ayi ñuria ọñu, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlúlú-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye Ya edoziwo kwa onwe-ya. Ewe kwenyere ya ka o gbokwasi onwe-ya ezi ákwà ọcha nēnwu enwu, nke dị kwa ọcha: n’ihi na ezi ákwà ọcha ahụ bụ ezi-omume nile nke ndi nsọ” (Nkpughe 19:7, 8). Anyị naahụ n’ebe a na ezi uwe ọlụlụ nwunye ahụ bụ eziomume niile nke ndịnsọ. Uwe ọlụlụ nwunye ahụ ka Chineke naenye n’onwe Ya, site n’ọnwụ nke Ọkpara Ya n’elu obe. Lee ihe nzuzu ọ bụ ịjụ ịnara uwe ọlụlụ nwunye ahụ nke enyere anyị! Ọ bụ n’efu, n’ejighị ego ma ọ bụ ịrụ ọnụahịa. Anyị gụtakwara na Baịbụl: “Dere du n’iru Onye-nwe-ayi Jehova: n’ihi na ubọchi JEHOVA di nso: n’ihi na JEHOVA edoziwo àjà, O dowo ndi Ọ kpọrọ oriri nsọ. Ọ gēru kwa, n’ubọchi àjà JEHOVA, na M’gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha” (Zefanaia 1:7, 8).

“Ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na-ole.” Òkù ahụ dịrị onye ọ bụla. Ndị orù ahụ ka ezipụrụ ịpụ gaa n’agbataụzọ niile ịkpọ ndị niile ha pụrụ ịhụ, ma ajọ mmadụ ma ezi mmadụ, ịbịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ. Ndị niile zara òkù ahụ ka enyere uwe ọlụlụ nwunye. Ọ bụ ọjụjụ ahụ ịnara ihe Chineke doziri nye anyị naeweta ịkwá ákwá na iti mkpu na mgbe ikpeazụ. Baịbụl dọrọ akanántị banyere ihe egwù ahụ nke ná echere ndị ná elefuru óké nzọpụta ahụ anya. A naarọpụta gị mgbe ị naara òkù nke Kraist ịbịa n’oriri ọlụlụ nwunye ahụ. Ị zawo òkù ahụ?

“Ihe dum zur’ókè; bịa n’oriri!

Bịa, edoziwo’Ih’oriri;

Gi ony’agụ, n’ony’ike gwụrụ

I gēriju’afọ n’ezi nri.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee oriri ọlụlụ nwunye nke ilu a nọchirị anya ya?
  2. Òlee ndị orù mbụ ezipụrụ?
  3. Ọ bụ onye kpọrọ òkù ahụ? Ọ bụ náánị ndị ezi mmadụ ka akpọrọ?
  4. Òlee otú ndị mmadụ ji zaa òkù ahụ?
  5. Mgbe eze ahụ batara, òlee otú o si chọpụta otù nwoke?
  6. Òlee ụdị uwe ọlụlụ nwunye eze ahụ kwadobere?
  7. Gịnị ka e ji rọpụta ole na ole?