Lesson 199 - Senior
Memory Verse
“Aturu ọzọ ka M’nwe-kwa-ra, ndi nēsitegh n’ogige-aturu nka: aghaghm iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù igwe-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu” (Jọn 10:16).Cross References
I Nlata nke Naomi
1. Naomi zubere ịlaghachị n’ala Israel mgbe ọ nụru na Onyenweanyị eletawo ndị Ya ọzọ, Rut 1:6; Abù Ọma 111:5; Jọn 6:31-35; I Timọti 6:8
2. Ndị Nwunye nwa abụọ nke Naomi kpebiri isoro nne-di ha, Rut 1:7
3. Naomi nwara mkpebi nke ndị nwunye nwa ya abụọ maka ịbà n’ala ahụ ha ná amaghị, Rut 1:8
II Nguzosiike nke Obi
1. Ọpa sutụrụ nne-di ya ọnụ wee laghachị n’ala Moab, Rut 1:14; Ọpupu 18:27; Matiu 19:22; 2 Timọti 4:10
2. Rut rapaara n’arụ Naomi, ọ bụ ezie na Naomi gbalịrị ịgwá ya ka ọ laghachị azụ, Rut 1:15; Deuteronomi 4:4; Ilu 18:24; Jọn 6:66-69
3. Rut zaghachirị site n’okwu ikwesị ntụkwasịobi pụtara ìhè n’ebe Naomi na Chineke ya nọ, Rut 1:16, 17; 2 Ndi Eze 2:2-6; Ọlu Ndi-ozi 21:12-14
4. Mgbe Naomi hụrụ na Rut gbara obi ya ume iso ya jee o wee rapụ ịgwá ya okwu banyere nke ahụ ọzọ, Rut 1:18
III Nnabata Ahụ na Betlehem
1. O juru ndị obodo niile anya mgbe ndị ijè ahụ latara, Rut 1:19; Matiu 21:10, 11
2. Naomi gụpụtara ọtụtụ ihe nke dakwasịrị ya mgbe ọ nọ na Moab, Rut 1:20, 21; Abù Ọma 119:67; Ndi Hibru 12:9-11
3. Obibi ọkà barley ka na amalite mgbe Naomi na Rut batara na Betlehem, Rut 1:22
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE“N’ezie anāmaghọta na Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru: kama nime mba ọ bula onye nātu egwu Ya, onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke-ọma” (Ọlu Ndi-ozi 10:34, 35). Ndị a bụ okwu ndị ahụ Pita gwara èzínaulo Kọnilios, Onye Mbaọzọ; ma a pụrụ ikwu ha rị n’eziokwu banyere Rut, nwanyị Moab, n’ihe karịrị puku arọ tupu mkwupụta nke Pita. Chineke hụrụ agụụ nke imemụọ nke obi Rut n’ala Moab, n’ebe dị anya site n’ebe ndị Chineke nọ; ma achọtara ụzọ nke ọ pụrụ iji nụ akụkọ banyere Chineke nke Israel; a pụrụ ịzụ mkpụrụobi ya site “n’ezi nri ahu nke sitere n’elu-igwe” (Jọn 6:32). Mgbe Rut nụrụ banyere ụzọ ahụ a gaeji fèe ezi Chineke ahụ dị ndụ, ọ naara ya site n’obi nke nwere mkwenye wee rapụ ụzọ niile nke aka ya na ndị nke ya iso ezi Chineke ahụ. N’ụzọ dị otú a Rut ghọrọ otù ụdị Nwunye ọhụụ nke Kraist sitere ná Ndị Mbaọzọ nke mgbe dị anya.
Nlata n’Israel
Èzínaulo Elimelek gbapụrụ n’ala Israel n’ihi na óké ụnwụ abịakwasịwo ala ahụ. Ha bịara n’ala Moab ịnọ dịka ọbịa; ma n’arọ olenaole, Naomi, nwunye Elimelek, chọpụtara na arapụwo náánị ya. N’oge náadịghị anya ka ọnwụ di ya gasịrị, ụmụ ndịkom abụọ nke Naomi alụtawo ụmụ ndịnyom Moab na nwunye; ma ụmụ ndịkom ahụ anọchịghị anya nna ha ọtụtụ arọ. Obodo a nke èzínaulo Elimelek nweworo agụụ ịbụ ebe izùike aghọwo na mberede ebe òlìlì ozú nye ha.Naomi bụ n’eziokwu ìhè ahụ náenwuenwu n’èzínaulo Elimelek. Ọ bụ ezie na ọ nọ n’ala ọzọ, ma o jidere izùókè ya na ntụkwasịobi ya n’ebe Chineke nọ. Náenweghị obi abụọ, ọ kọọrọ ndị nwunye abụọ nke ụmụ ya akụkọ banyere Ụmụ Israel nke náakpali obi, na óké ọlụ niile nke Chineke lụworo nye ndị Ya. Òkù nke Mmụọ Nsọ ka écherè n’obi ụmụ nwanyị abụọ ndịa, na mgbe Naomi kpebiri ịlaghachị n’ala nke aka ya, ha zipụtara mkwenye na ịnụọkụ n’obi ịga n’ala Israel na iso n’òfùfè nke Chineke Israel nime ịzá òkù ahụ.
N’ịzá òkù nke Chineke n’obi ya, Rut so ná ndị mbụ sitere ná Ndị Mbaọzọ bịakute Chineke. N’ụbọchị taa enyere ndịụkọ n’ọnọdụ Kraist iwu ịga n’ụwa niile wee kwusaa Oziọma ahụ náagbakwa àmà nye eziokwu nke Okwu Chineke dị nsọ. Ọ dịghị mba maọbụ agbụrụ ọ bụla egbochiri n’ebe Chineke nọ; mmadụ niile pụrụ ịbịakute Ya, n’ihi na Jisọs “kwada-kwa-ra mgbidi etiti nke ngige” n’etiti Ndị-Ju na Ndị Mbaọzọ (Ndi Efesọs 2:11-22). Mmadụ niile ndị dị ndụ, n’ebe ọ bụla, ka anaakpọ ịbụ ndị òtù nke Nwunye-Ọhụụ nke Kraist, ma, ọ bụ ihe mwuta ikwu na ọ bụghị ọtụtụ na-aña ntị n’òkù ahụ dị ebube. Azọpụtara Rut n’ihi na o kwenyere ịrapụ ihe niile ọzọ ka o wee nweta Kraist.
Okporoụzọ nke Onyeijè Ahụ
Ka ụmụ nwanyị ndịa na-aga n’ụzọ ha ná-eché iru n’ala nke Naomi, Naomi malitere ịtụle ihe niile nrọrọ nke ndị nwunye abụọ nke ụmụya náeme gaeweta. Ha bụ ndị Moab; àgaanabatakwa ha nkeọma n’ala ya? Naomi enweghị iheonwunwe nke ọ gaeji náenyere ha aka; ọ gaghị adị mfé nye ha ịchọta nri na ebeobibi n’ala nke aka ha? Naomi mere ka ndị nwunye abụọ nke ụmụ ya mara ihe niile ndịa n’ụzọ dị nwayọ, wee rịọsie ha ike ịlaghachị n’ebe nke aka ha. Ha abụọ kwughachịrị nzube ha iso Naomi gaa n’ala Israel, ma Naomi mere ka ha mara ihe ndị ọzọ nke anaekwupụtaghị na mbụ. Ọpa, nwunye nke Kilion, kpebiri na ala Israel enyeghị ihe niile ahụ nke o lere anya ya; o wee laghachị n’ala ya laghachịkuru kwa ndị ya. Otú ọ dị, Rut nwere mmụọ dị iche, apụghị kwa ime ka o kwenye ịlaghachị azụ. Nwunye Ọhụụ nke Kraist apụghịkwa ịbụ onye agaeme ka ọ laa azụ site n’ebe niile siriike nke náadị nwaoge o zutere maọbụ site n’ihe niile nke dị ka ha naarara mmadụ maọbụ nkasiobi nke ụwa nke náadị nwaoge.
Mmadụ ole maliteworo ịga n’ụzọ nke NdịKraist, ná ntiwapụta mbụ nke ịnụọkụ n’obi ha agaworị ebe dị anya ijéru Eluigwe. Dịka otù kpakpando wapụtara n’igweojii abalị, ha naagba óké ọsọ, náenwu nke ukwuu náarapụkwa óké ahịrị nke ìhè ná mpụta ha; ma ha gabigara ngwangwa. Kpakpando ndịa naerechapụ onweha ọsọsọ; mmadụ ndị náatụkwasịobi n’ihe niile ha pụrụ ime, kama n’ike na ịdịike nke Chineke, náachọpụta n’oge náadịghị anya na ha bụ ndị “erechapụrụ” -- n’enweghịike maọbụ ọchịchọ ịnọgide n’ụzọ nke Oziọma ahụ.
Dịka Naomi gosipụtara ihe niile ahụ jọkarịrị njọ nke nwunye abụọ nke ụmụ ya pụrụ ịhụ n’ala Israel, n’otù aka ahụ Jisọs gaachọ ka ndị niile náesoụzọ Ya were ezi nleruanya tulee ihe niile ahụ siriike nke ha pụrụ izute n’ụzọ ahụ nke ịdịnsọ, wee jikere izute ihe ndị ahụ. Ibu ụzọ bụrụ onye adọrọ akanántị naapụta ibuụzọ jikere.
Ọnwụ maọbụ Ndụ
Okwu ahụ nke zilagara Ọpa azụ n’ebe ndị ya na chi ya nọ mere ka mkpebi nke dị n’obi Rut sieike ịga ụzọ niile rue ala Israel na n’òfùfè nke ezi Chineke ahụ bụ Onye ọ mụworo ihe banyere Ya site n’okwu na omume niile nke nne di ya. Okwu ahụ nke ghọrọ “ọnwụ rue n’ọnwụ” nye Ọpa, bụ “ndụ ba ná ndụ” nye Rut, onye náagụghị ihe niile nke ndụ a n’ihe dị óké ọnụ nye onweya; ma site ná mkwenye ịrapụ ihe niile iji rita ịhụnanya nke Chineke Israel n’urù, ọ chọtara ndụ nke dị óké ọnụ n’ụwa; n’ọgwụgwụ ndụ nke ebe a, ọ chọtara ndụ ebighịebi n’ofè ọzọ. Ezi ọhụ ahụ nke Obodo Ọma ahụ na ụgwọ ọlụ niile nke Nwunye Ọhụụ nke Kraist naeme ya ka ọ dịrị Onye Kraist mfé isoro Pọl kwue, na ihe niile nke ndụ a bụ ihe “nādighị ike nēnwegh kwa ihe ọ bula.”
Ntụgharị uche na ịhụnanya akọghịkwa n’ebe Ọpa nọ nye nne di ya. O weliri olu ya elu kwaa ákwá mgbe o chètara banyere nkewa ha; o suturu nne di ya ọnụ n’ịhụnanya; ma ọ gụghị ya n’ihe dị óké ọnụ ahịa bụ eziokpukpé ahụ ịrapụ ụzọ ụgha niile ahụ nke ndịikwu ya bụ ndị Moab, ndị enyi na chi ya niile. O chère échìchè náánị banyere ọdịniru nke dị nso, wee gharakwa ịtụle ọgwụgwụ nke ndụ maọlị.
“N’ihi na itukwasi uche n’anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo” (Ndi Rom 8:6). Nwunye Ọhụụ nke Kraist aghaghị ịbụ onye gaenwe uche nke Kraist (I Ndi Kọrint 2:16; I Pita 4:1). Jisọs nwere ihe nke dịkarịsịrị ntà n’ebe ụwa dị, wee náakpọ Nwunye Ọhụụ Ya ka o kewapụta onwe ya n’ebe ụwa dị. Ụgwọ ahụ agaakwụ ịjụ ndị enyi nke ụwa, ihe ụtọ dị icheiche nke ụwa, na óké ọchịchọ niile nke ụwa pụrụ ịbụ ihe dị elu nye mmadụ ụfọdụ, náánị n’ihi na ekwensu mere ka ha kpuìsì site n’ụgha ya niile na iheefu ya niile nke maramma. Ekwensu apụghị imepụta ihe bụ ezie; ụgwọ ọlụ nke mmehie bụ ọnwụ.
Mkwupụta nke Ikwesị Ntụkwasị obi
Lee ka o si maa mma bụ mkwupụta nke ịhụn’anya na ikwesị ntụkwasịobi nke Rut nye Naomi na Chineke ya. Mmasị mbụ ahụ Rut nwere pụrụ ịbụ site n’omume nke Naomi, ma n’ikpeazụ Rut ghọrọ onye nketa nke ezi omume ahụ nke Chineke ahụ onye Naomi naefè. Ịhụnanya ahụ n’ebe Chineke nọ toruru rue na o kwenyeghị n’échìchè ahụ nke ịlaghachị na Moab na arụsị ya niile, ọ bụ ezie na Naomi tụpụtara ka ọ laghachị azụ. Rut mere ngwa wezuga ọnwụnwa ahụ, ma ọ bụrụ na apụrụ ịkpọ ya otú ahụ n’ezie. Rut gbubirị àkwà mmiri ikpeazụ nke pụrụ ime ka ọ laghachị n’ala nke aka ya, wee site n’ụzọ dị otú a mee ka ịkpá ókè ahụ dị anya bụ nke kewara ọnọdụ ya nke ugbu a n’ebe ihe niile ọ hụrụ n’anya na ndị enyi ya ochie niile nọ. O nweghị échìchè ọ bụla nke ịlaghachị n’ụzọ mbụ ya niile, ọ bụ kwa ihe ịsọ oyi nye ya ịnụ banyere ya. Mkpebi siriike nke Rut yiri imechibido onyeori ụzọ.
Rut, ụdị Nwunye Ọhụụ nke Kraist sitere ná Ndị Mbaọzọ, ñara ntị wee bụrụ onye Mmụọ nke Chineke duworo “N’ihi na ka ha ra, bu ndi Mọ Chineke nēdu, ndi ahu bu umu-ndikom Chineke” (Ndi Rom 8:14). Nwunye Ọhụụ nke Kraist n’ụbọchị taa na erubeisi n’arịrịọ nke Mmụọ Nsọ ná eyikwa ezi ákwá ọcha ná enwuenwu, nke dị kwa ọcha: “n’ihi na ezi ákwá ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ” (Nkpughe 19:8).
Ọtụtụ Mkpụrụ obi nye Chineke
Mgbe Naomi hụrụ na Rut “na-agba obi ya ume” iso ya jee, ọ rapụrụ ịgwá ya okwu banyere ya. Eleghịanya mkwupụta nke a bụ ihe ahụ nke Naomi naachọ site ná mmalite, ma Naomi chọrọ ka Rut gụkọọ nkeọma ihe ọ gaefu ya wee soro ná nrọpụta na mmasị nke onwe ya. Naomi maara na ijéozi nke Israel bụ izisa ozi nke ọgbụgbandụ ha na Chineke nye mba niile gbara ha gburugburu na irita ndị náekwenye site n’iwebata ha n’obodo na ihe nketa nke Israel. Chineke ezubeghị ka èzín’ulo niile nke Israel gbasaa n’etiti ndị náekweghị ekwe dị ka Elimelek mere; ma Chineke zubere na ndị Israel gaenwe ụdị mmekọrịta ahụ dị ụtọ n’ebe Chineke ha nọ nke gaadọrọ ụmụmmadụ nọ n’ụwa ịbata n’ala Israel, wee batakwa n’otù ọgbụgbandụ ahụ ha na Chineke bụ nke Israel naenwe ọñụ nime ya. Irita Rut, Onye Mbaọzọ ahụ n’urù bụ nnọọ ihe dị n’usoro náegosikwa mkwenye nke Chineke ịnara “onye ọ bụla nke kwere”, ọbụná n’oge ahụ dị anya.
Irita mkpụrụobi n’urù nye Oziọma ahụ ná esokwa nkeọma otù àtụmààtụ ahụ nke Chineke nwere nye Israel. O zubeghị ka Onye Kraist ghọọ otù akụkụ nke ụwa iji wee zọpụta ụfọdụ; Ọ naachọ ka ndị Ya nọgide n’ikewapụta onwe ha n’ebe ụwa dị, na ibi ụdị ndụ nlereanya ahụ nke gaeme ka ndị niile ha na ha naemekọ ghọta na ọ dị Onye nzọpụta nọ n’Eluigwe nke naenye ike ibi ndụ onyeKraist.
Obi Ahụ Nke Akpọtere
Ndị Israel nabatara Rut nkeọma ewee kpọbata ya nime èzín’ulo nke Juda. Ọ ghọrọ nwunye Boaz, agụnyekwara ya n’osusoọmụmụ nke Onyenweanyị Jisọs Kraist (Matiu 1:5). O mere ihe ọ bụla dị mkpà n’akụkụ nke ya imezu ọkpụkpọòkù nke Chineke ahụ échérè ya n’iru. Mmụọ nke Chineke batara n’obi Rut wee nye ya ike ịmị mkpụrụ niile ahụ nke ndụ mmeri nke dị óké mkpà ná ndụ nke Nwunye Ọhụụ nke Kraist: “ihu-n’anya, ọñụ, udo, ogologo-ntachi-obi, obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, idi-nwayọ, imeru-ihe-n’ókè” (Ndi Galatia 5:22, 23).
Rut anataghị mgbanwe a ná ndụ ya site ná ndapụta maọbụ site n’ọtụtụ ihe inwe iruọma nke mere. Emere ka ọ ghọta otú o si bụrụ ihe apụrụ ime ifè Chineke Israel o wee kpebie, náagbanyeghị mkwagide niile nke náachọ ka ọ laa azụ, iso kpakpando ahụ náedu ya rue n’ebe ìhè ahụ si apụta. A pụrụ ikwu banyere Rut na Onye Mbaọzọ ọ bụla nke zara òkù ahụ ịbụ Nwunye Ọhụụ nke Kraist, na, “Ebipuru gi onwe-gi n’osisi olive nke bú nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n’osisi olive ọma” (Ndi Rom 11:24). Osisi olive ọma ahụ bụ Onyenweanyị Jisọs Kraist “Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-Ya bu Onye-nzọputa nke aru. Kraist-ayi hukwara nzukọ-Ya n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ya; ka Ọ we do ya nsọ, mgbe Ọ mesiri ka ọ dị ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke, ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ọ we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta” (Ndi Efesọs 5:25-27).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- N’ihi gịnị ka èzín’ulo Elimelek jiri gaa n’ala Moab?
- Kwue ọtụtụ ihe ndị ahụ nke dakwasịrị èzín’ulo a mgbe ha nọ na Moab?
- Òlee mgbe Naomi ji kpebie ịlaghachị n’ala Israel?
- Ọ bụ onye chọrọ iso Naomi gaa n’ala Israel?
- Naomi ọ gbara ha ume ka o mere ka ha daa m̀bà n’obi iso ya?
- Gịnị bụ ọzịzá Rut nyere n’okwu niile nke Naomi?
- Òlee ụdị nnabata Naomi na Rut natara na Betlehem?
- N’ihi gịnị ka Rut ji guzo dị ka ezi iheàtụ nke Nwunye Ọhụụ nke Kraist sitere ná Ndị Mbaọzọ?
- Òlee ndị anaakpọ ịbụ Nwanye Ọhụụ nke Kraist n’ụbọchị taa?