Lesson 200 - Senior
Memory Verse
“N’ihi na ọ huwom n’anya si-ike, M’gēme kwa ka ọ gbaputa: M’gēme ka ọ nọ n’ebe di elu, n’ihi na ọ mawo aham” (Abù Ọma 91:14).Cross References
I Abụ nke Ekele
1. Ekpere nke Hana bụ abụ nke otuto na ekele nye Chineke, I Samuel 2:1-5; 1:6, 20; Abù Ọma 113:9; Aisaia 54:1
2. Hana kpere ekpere náebu amụma banyere ebere ahụ nke Chineke gaemere ụwa n’ọdịniru, I Samuel 2:6-9; Abù Ọma 75:4-7; 113:7, 8; Luk 1:52
3. Hana ebuwo amụma n’okwu ya banyere ọbịbịa nke otù Onye nzọpụta, I Samuel 2:10; Abù Ọma 89:19-29; Luk 1:46-55¸ 67-75
II Ọkpụkpọ òkù nke Chineke
1. Ọ dịghị ọhụ nke Chineke pụtara ìhè n’ụbọchị niile nke ọlụ nchụàjà Ilai, I Samuel 3:1; Emos 8:11; Ezikiel 7:26; Ilu 29:18
2. Anya nke Ilai naahụzi inyogho inyogho nke mere na ọ pụghị ịhụ na oriọna nke Chineke naachọ ịnyụ anyụ, I Samuel 3:2, 3; 4:15; Ọpupu 27:20, 21; Levitikọs 24:2, 3; 2 Ihe Emere 13:11
3. Anya imemmụọ nke Ilai ka ekpuchirị site n’ịnagide mmehie ya, I Samuel 3:2, 13; 2:12-17, 27-36; I Ndi Eze 1:6; Levitikọs 10:1-3; Ọpupu 19:22
4. Ilaị aghọtaghị na mbụ na Chineke naakpọ Samuel, I Samuel 3:4-9; Matiu 6:22, 23; 15:14; Jeremaia 5:21-24; Ndi Rom 2:1-4, 17-24
5. Samuel, n’ihi ịbụ nwata na enweghị ntozu nke imemmụọ, aghọtaghị na Chineke naakpọ ya, I Samuel 3:7; Ọlu Ndi-ozi 18:24-26; 19:23; Jọn 20:14; 21:4-7
6. N’ikpeazụ Ilaị matara na Chineke naakpọ Samuel, o wee dụọ ya ọdụ ịzá òkù Chineke, I Samuel 3:8-10; Abù Ọma 85:8; Aisaia 6:8; Daniel 10:19; Ọlu Ndi-ozi 9:5, 6
III Onye amụma nke Chineke
1. Chineke gwara Samuel banyere ikpé ahụ nke gaabịakwasị Ilaị na èzín’uloya, I Samuel 3:11-14; Aisaia 29:13-16; Emos 3:1-8; Habakuk 1:5
2. Ilaị rugidere Samuel ka ọ gwa ya ozi nke Chineke, I Samuel 3:16; Abù Ọma 141:5; Daniel 4:
3. Chineke nọnyere Samuel, Jehova wee mee ka ahụ kwa Ya anya ọzọ n’ime Shailo, I Samuel 3:19-21; 4:1; 9:6; Aisaia 44:26
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEAbụ nke Otuto
Akụkọ banyere ekpere Hana na iji obi chụaàjà ya nye Jehova ka o wee nye ya otù nwa-nwoke bụ ihe mara mma na-emetukwa n’obi. Enyere Hana otù nwa nwoke n’ịzá ekpere ya -- otù nwa-nwoke onye akawororị akàrà ịbụ otù n’ime ndị-amụma kachasị ukuu na otù nwoke onye ndụ ya bụ ihe nlere-anya na mkpalite obi nye mmadụ dum. Lee nnọọ ógó kachasị elu kwesịrị ekwesị nye akụkọ banyere ekpere nke otuto na ekele ya nye Chineke! Inye Ya otuto n’abụ na ekpere bụ mpụtahè mara mma nke obi ahụ jupụtara n’ekele n’ihi ịhụnanya na ebere nke Chineke.
Hana eledaghị ịdị óké ọnụahịa nke onyinye ahụ ọ natara n’aka Chineke anya. Ọ nọghị kwa na-amaghị na ọ bụ ihe ana-apụghị ime bụ inweta otù nwa-nwoke ma ewezuga na Chineke nyere ya ọchịchọ nke obi ya; n’ihi na “Le, ihe nketa nke nēsi n’aka Jehova bia ka umu bu” (Abù Ọma 127:3). Ma otú ọ dị, Hana atụfughị ọbụná otù nsọpụrụ ya nye Onyenwe ayị iji mee ka obi tọọ nwa ya nwoke ụtọ. N’akụkụ nke ọzọ, ịhụnanya na nsọpụrụ nke ya nye Onyenwe anyị miri emi n’ihi óké ịdị mma na ebere Ya nye ya. Hana matara site na nnwapụta nke onwe ya na “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru òkè nke enyere enye si n’elu bia, ebe o si n’aka Nna nke Ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bụla nāpugh idi n’ebe Ọ nọ, ma-ọbụ onyinyo nke nchighari nēweta” (Jemes 1:17).
Ọtụtụ mgbe Chineke na-adị ụmụ mmadụ mkpà náánị oge ha nọ n’óké nsogbu ma ọ bụ iruuju, ma ọbụkwanu oge ọnọdụ ọjọọ na abịakwasị ha. Mgbe ajọ ọnọdụ gabịgasịrị, maọbụ mgbe ha natasịrị arịrịọ ha rịọrọ n’aka Chineke, ha échèfue Ya maọbụ mee ka ọnọdụ ịhụnanya ha nye Ya dị ala nke ukwuu. Ọ dịghị otú a n’ebe Hana nọ, n’ihi na o sitere n’abụ nke ekpere na otuto naasụpụta site n’obi ya nye Chineke.
Abụ otuto ya malitere site n’otù isiokwu nke ekele nye Chineke n’ihi ịdị mma Ya nye ya, ma si otú a ghọọ otù òzízí dị omimi dị kwa óké mkpà -- Jisọs Kraist, Onye Chineke Etere mmanu, na Eze anyị nke gaje ịbịa
Hana, site na mkpali nke Mmụọ Nsọ, kwuru banyere Jisọs Kraist onye agaesite na Ya gọzie agbụrụ niile nke ụwa; kwu kwa okwu amụma banyere ndị mmehie ahụ ndị aga-eweli rue otù ebe dị nsọpụrụ site n’otù ebere ahụ nke emere ka o rue ya arụ. Ogbenye ka aga-ebuli elu mee ka ọnọdụ n’etiti ụmụeze wee keta kwa ocheeze nke ebube ahụ, ma a gaetipịa ndị iro nke Jehova¸ mgbe Jisọs ga-abịa ịbụ Eze náachị achị n’eluụwa niile. Nke ahụ bụ abụ nke otuto Hana, otù okwu amụma mara mma banyere Jisọs Kraist onye gaachị ọchịchị nke udo na ikpé.
Ọ dị ọtụtụ ebe ọzọ dị iche iche nime Baịbụl nke nwere otù ụdị mkpali nke Mmụọ Nsọ na nlụpụta banye n’ibu amụma dị icheiche banyere Kraist. Abụ nke Moses naekwu banyere Kraist dị ka “Óké Nkume ahụ”, otú a ka Hana kwekwara (I Samuel 2:2). (Lee Deuteronomi 32:15, 18). Otù aka ahụ kwa Mmụọ Nsọ ahụ, site na Meri nne nke Jisọs, guzokwara n’isi okwu ahụ nke Hana na a gaeweda ndị dị ike pụọ n’ocheeze ha, welie kwa elu ndị ọnọdụ ha dị ala -- nke a bụ site n’Ọkpara ahụ onye a ga-amụpụta n’ụzọ dị ebube. (Lee Luk 1:52).
Nnenanna Náarapụ Ụmụ Ha Ime otú Masịrị Ha
Dịka Hana kwere Jehova ná mkwà, nwantà ahụ bụ Samuel malitere ijéré Chineke ozi n’Ụlọikwuu, n’okpuru ntụzi aka nke Ilai, onyeisi nchụàjà. Onyeisi nchụàjà naahụ maka ọdị mma nke mkpụrụobi ụmụ Chineke ya na nhazi nke ijéozi nke ifé Chineke. Lee nnọọ ka Ilaị si daruo ala n’ụzọ kwesịrị ọmiko n’ebe ihe etinyere ya n’aka na ọlụ ya dị!
Àgbà Ọhụụ kọwara ihe niile achọrọ n’aka onye náelekọta nzukọ Kraist: “Onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n’okpuru ya n’ikwesi-nsọpuru nile; (ma ọ buru na onye ọ bula amatagh otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gēsi aña le nzukọ Chineke anya nke ọma?” (I Timọti 3:4, 5).
“Ma Umu ndikom Ilai bu ndi jọgburu onwe-ha; ha amagh JEHOVA” (I Samuel 2:12). Ha bụ ndịkom náebikarị ndụ nke mmehie, nke mere na n’ihi mmekpu ha “ndikom ahu nēleli onyinye-inata-iru-ọma nke JEHOVA” (I Samuel 2:17).
Ilaị, dịka nna nke náenye ụmụ ya ohere ime ihe náamasị ha, mere ka ụmụ ndịkom ya mata otù mgbe, mwute ọ naenwe n’ihi mmehie niile ahụ jọgburu onwe ha nke ha naeme, ma ọ dịghị ihe ọzọ o mere banyere ya. Ị nọdụ náenweghị ihe o mere i ji gbochie ụmụ ya ị ga n’iru ná mmehie ma ewezuga ịbá mbá náánị otù ugbò aghọwo mmehie megide mkpụrụ obi ya na kwa nke ụmụ ya. Ihe ọjọọ ahụ nke ewebataworo n’ụwa site ná ndị nnenanna náelefuru ọdịmma nke ụmụ ha anya ma ghara ịdọsi ha akanántị ike bụ ihe anaapụghị ịkọ otú ọ ra. Ị nabata mmehie bụ otù ọkụ nke gaje ịgbá ọkpụkpụ nke ụmụmmadụ, ọ gaama kwa ndị niile náetinye aka ná mmehie ikpé iduba ha nime óké ọkụ nke náere rue ebighị ebi.
Ọ bụ ezie na mmehie Ilaị n’ilefuru ajọomume nke ụmụ ya ndịkom anya dị ukwuu nke ukwu nime èzínulo ya, ma mmehie karịrị nke ahụ, ka emere n’ihi na o nyere ụmụ ya ndịkom ohere iweta óké nlelị n’ulo Chineke. Ha naenye aka n’ilekọta ijéozi nke òfùfè nime Ụlọikwuu, ma n’ọlụ ahụ kwa wee ghọọ ihe isu ngọngọ nye ndị niile nwere mmasị ifè Chineke.
Ifè Chineke naachọ ịdịnsọ mgbe niile. Achọkarịrị nke a n’aka ndị ná ejéozi. Òzízí na ụkpụrụ nke mmadụ iwezuga onwe ya pụọ ná mmehie na ajọomume niile mgbe dum mere ka Oziọma nke Jisọs Kraist bụrụ ihe dị iche site n’ebe okpukpé na óké mmụta ọzọ niile dị. Ọbụná otú a, Ilaị, onye ọkwá ya bụ nke onye nche nke okwukwe, nwere óké nlefuruanya n’ebe ọchịchọ Chineke banyere ịdịnsọ na izù òkè dị nke na ọ dịghị ihe o mere igbochi mmehie n’ulo nke aka ya, ma ọ bụ n’ụlọ nke Chineke.
Ikpé nke Chineke
Okwu Chineke abụghị ihe anaeji n’aka fekefeke, ma Ilaị nwere obi ike iguzogide ịdịnsọ nke Chineke; ya mere iwe Chineke malitere ịkwụ anwụrụ megide ya (Deuteronomi 29:19, 20). “Ahuhu diri ndi-ọzuzu-aturu nāzu Israel ndi nọworo nāzu onwe-ha!” (Ezikiel 34:2) bụ okwu nke Jehova nye Ezikiel. Okwu ndị a na ọnọdụ Ilaị dakọtara. A gaewepụ Ilaị n’oge náadịghị anya; eriri ụmụ ya ka agaebibi; ọzọ kwa èzínaulo ya agaghị kwa ejé ozi nime òfùfè nke Chineke. Nke ahụ bụ ụgwọ ọlụ nke Ilaị n’ihi nnabata ọ nabatara mmehie.
Mmehie nke Ilaị mere ka o kpue ìsì n’ebe eziokwu niile dị nke na o nweghị kwa ike ịhụ ihe dị icheiche n’ọnọdụ kwesịrị ha. O so n’ọnụọgụgụ ndị ahụ nke Jisọs kwuru banyere ha otù oge, ndị nwere ike ịhụta irighiri ahịhịa nke dị n’anya ndị ọzọ, ma ghara inwe ike hụ ntuhie nke dị n’anya nke ya onwe ya (Luk 6:39-42). Ilaị gakwara n’iru ọbụná ibo nne Samuel ebubo nke ịñụbiga manya ókè n’ụlọukwuu Chineke, mgbe ọ nọ n’ekpere dị omimi nye Chineke n’ezie. N’otù mgbe ahụ ụmụ ndịkom Ilai nọrị náebibi òfùfè nke Chineke site ná mmekpu ha nke na-enweghị mgbochị
Oriọna nke Náanyụ anyụ
Anya Ilaị malitere ịhụ inyogho inyogho nke na o nwekwaghị ike ịhụ na oriọna nke Chineke naanyụ anyụ n’ihi óké nlefuruanya. Lee ihe ngosi nke oriọna a bụ nye òfùfè nke Chineke! Ọ naanọchite anya Okwu Chineke, nke naenwu enwu site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ma ugbu a ọ naanyụ anyụ n’ike n’ike! Akwụkwọnsọ naakọwa banyere oge a n’akụkọ ndị Israel na “Okwu JEHOVA we di oké ọnu na mgbe ahu; ọ digh ọhù ekwusara” (I Samuel 3:1). Itinye okwu a n’ụzọ ọzọ, eziokwu nke Okwu Chineke esiwo n’obi ụmụmmadụ pụọ, ekweghị kwa ka Chineke kpughee onwe Ya nye ndị mmadụ n’ihi ibi ndụ nke mmehie ha. Ọ bụ n’oge a dị mkpà ka Chineke kwuru okwu n’abalị nye Samuel.
“Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, n’imu anya n’akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n’akuku ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ nile” (Ilu 8:34). Nke ahụ bụ ijéozi niile nke Samuel nime Ụlọikwuu. Samuel naefè Chineke kwa ụbọchị nime ụlọ Ya site n’obi ghereoghe, na ịña ntị ya n’ihe nke mmụọ. Mgbe Chineke naakpanyere ya ụkà n’etiti abalị, Samuel dị ngwangwa n’ịzá òkù.
Ná amataghị otù mgbe ahụ na ọ bụ Chineke naagwa ya okwu, Samuel jekuuru Ilaị. Ilaị dị ka o tụfuwo ike nke ịmata olu Chineke, n’ihi na o zighachirị Samuel n’àkwà ndina ya. Ugbò atọ ka Chineke kpọrọ Samuel òkù, ugbò atọ ka Ilaị zighachikwara ya n’àkwà ndina ya. Nke ugbò atọ ya ka Ilaị matara na Chineke naakpọ Samuel òkù, wee dụọ ya ọdụ ka ọ zaa, ma ọ bụrụ na akpọọ ya òkù ọzọ¸ n’ihi na ọ gaabụ Jehova naakpọ. Chineke kpọkwara Samuel òkù ọzọ, ọ zaa Ya n’okwu ndịa mara mma “Kwue; n’ihi na orù-Gi nānu.” Otú a ka Chineke si kpọọ Samuel ifè òfùfè na ijere Chineke ozi. Ọ bụ ezie na ọ ka bụ nwatà, ma o nwere ntị ịnụ ihe, nwee kwa obi ime ihe Jehova gwara ya ka o mee.
Ikwesị Ntụkwasị Obi N’ịchị Èzínaụlọ
“N’ebe a ihe anāchọ kwa n’aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi” (I Ndi Kọrint 4:2). Ka ndị niile bụ okenye nime ijéozi na òfùfè nke Chineke were ịnụ ọkụ n’obi jigidesie òkè na ọlụ ha ike nime ya. Na anụarụ anyị akaala ñká apụtaghị na ijéozi anyị nye Chineke abakwaghị urù ma ọ bụ na oge ya agafewo. Baịbụl na ekwu, “Okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n’iru n’iru rue mgbe chi bọchara” (Ilu 4:18). Ọzọ kwa, “Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu, N’uzọ ezi omume ka agāhu ya” (Ilu 16:31).
Ntozu chara acha nke okwukwe na ịtụkwasị Chineke obi nke enwetaworo site n’ọtụtụ arọ nke ifè Chineke n’okwukwe bụ otù urù nke ntorọbịa ọ bụla nwereike ilere anya ma chọsikwa ike.
Ọhụ Ekwupụtaworo
Ka ndị niile bụ ntoroọbịa mụta ihe site n’ebe nwata nwoke ahụ bụ Samuel nọ. Ọ gaadị mma ma asị na mmadụ niile gaazá òkù nke Chineke n’ezi njikere dịka Samuel si mee, ya na n’otù ụdị iji obi chụọàjà ahụ na ịnụ ọku n’obi n’ịzá òkù ha! Ọ bụ nwoke Chineke jiri jee ozi nke ukwuu, ma Baịbụl naekwu banyere ya sị, “Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu JEHOVA onye-amuma” Jehova “Ọ kwegh kwa ka okwu da n’ala sitere n’okwu-ya nile” (I Samuel 3:19, 20).
Ndụ nke Samuel dị nnọọ mma baakwa urù n’ụzọ niile kwesịrị nsọpụrụ. Ọ bụ ndụ dị mma n’ihi na ọ ñara Chineke ntị na mgbe okorọbịa ya, wee lezie kwa anya nkeọma n’ihe ọ nụrụ. N’eziokwu Okwu nke Chineke bụ ezie: “Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu: N’ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n’olu-gi; De ha n’elu mbadamba nkume, bú obi-gi: Chọta kwa amara na ezi uche n’anya Chineke na madu” (Ilu 3:1-4).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee ihe ahụ kpatara ekpere nke Hana?
- N’ụzọ dị añaa ka Hana si kwue banyere Jisọs Kraist?
- Gịnị ka ọ pụtara bụ “ọ digh ọhù ekwusara”?
- Òlee ihe kpatara Jehova jiri jụ Ilaị?
- Òlee ihe oriọna nke Chineke naatụ aka?
- Òlee ihe o ji dị mkpà na mmadụ gaabụ onye náachị èzínaulo n’ikwesị ntụkwasịobi?
- Gịnị bụ urù dị n’ifè Chineke n’okorọbịa?