I Samuel 4:1-18; 5:1-5; 6:1-3, 7-15, 19, 20

Lesson 201 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA nọ n’ulo uku Ya di nsọ: dere du n’iru Ya, gi uwa nile” (Habakuk 2:20).
Cross References

I Ikpé dakwasịrị Israel

1. Ndị Filistia tigburu puku ndịkom anọ (4,000) mgbe Ụmụ Israel nwara ikopụ agbụ nke ịbụ orù, I Samuel 4:1, 2; Joshua 7:4, 5; Abù Ọma 44:9, 10

2. Ndị okenye nke Israel jụrụ àsè ihe wetara ntigbu ahụ, I Samuel 4:3; Joshua 7:6-12

3. Ebubatara Igbe ọgbụgbandụ Jehova n’ọmụma ụlọikwuu, I Samuel 4:4, 5

4. Ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha wee tigbue kwa Israel ọzọ, I Samuel 4:6-10

II Óké Ntụfu n’Israel

1. Anapụrụ Igbé nke Chineke, ụmụ ndịkom Ilai ka etigbukwara, I Samuel 4:11; Abù Ọma 78:59-64

2. Ewetara akụkọ banyere óké ntigbu ọjọọ ahụ na shailo, I Samuel 4:12, 13

3. Mgbe Ilai nụrụ na ewerewo Igbe Chineke o si n’oche ya dapụ wee nwụọ, I Samuel 4:14-18

III Nchébe nke Chineke nye Igbé ahụ, na Nweghachị Ya

1. Arụsị ndị Filistia dara n’ala n’iru Igbé ọgbụgbandụ Chineke ahụ, I Samuel 5:1-5; Aisaia 19:1

2. Mgbe ọnwa asaa nke óké iheotiti gasịrị, ndị Filistia wee kpebie izighachịrị Israel Igbé ahụ, I Samuel 6:1-3

3. Emere nchọpụta ịmata ma aka Chineke ọ dị n’iheotiti ahụ nke dakwasịrị ndị Filistia, I Samuel 6:7-12

4. Ndị Israel nabatara Igbé ọgbụgbandụ ha n’ọñụ, I Samuel 6:13:15

5. Ndịkom nke Bet-shemesh lere anya nime Igbé ahụ Jehova wee tie ha ihe otiti, I Samuel 6:19, 20; 2 Samuel 6:6, 7

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ọnọdụ ịbụorù na ihe Náakpata Ya

“Okwu Samuel we rue Israel nile nti.” Okwu ndị a ma eleghịanya bụ mkpughe sitere na Chineke nye Samuel na a gaekpé ụlọ Ilaị ikpé n’ihi na mmehie na ajọomume ka achọtara n’ebe ahụ (I Samuel 3:11-14). Họfnai na Finehas, ụmụ ndịkom Ilaị, ndị náalụọlụ dịka ndị nchụàjà n’ọnọdụ nna ha, amaghị Jehova; wee mee onwe ha iheihere. Jehova wee kwue na Ya gaeweta mgbanwe n’ọlụ nchụàjà ahụ (I Samuel 2:35), ihe wee gaa kwa ngwangwa iweta mgbanwe ahụ.

Ụmụ Israel anọworị ogologo oge n’okpuru ọchịchị nke ndị Filistia. Ná arụghịụkà agbụ nke ịnọ dịka orù naegbu mgbu, n’ihi na ndị Filistia kwetara n’otù ụzọ na ọchịchị ha nye Israel bụ n’aka ike (I Samuel 4:9). Otú ọ dị, ndị agha nke Ụmụ Israel nwara ịkwatu ọchịchị ndị Filistia n’ala ha. Edoro agha ahụ n’usoro náenwe kwa olileanya dị ukwuu, ma na nwamgbe ntà ndị Israel wee hụta onwe ha n’ọnọdụ ọjọọ n’iru ndị iro ha. Puku mmadụ anọ nime ndịkom ha ka emere ka ha nwụnyụa anya n’ọgbọ agha ahụ. Ajụjụ a ka ajụrụ n’uhuruchi ahụ n’ọmụma ụlọ ikwuu Israel “N’ihi gini ka JEHOVA tigbuworo ayi ta n’iru ndi Filistia?” Ọ dị ihe kpatara ya: Jehova esiwo n’ebe Ụmụ Israel nọ wezuga onwe Ya n’ihi na ha emehiewo megide Ya.

Usoro Ná ezighịezi

Ndịokenye nke Israel tụrụ àtụmààtụ ihe agaeme maka ntigbu ha, ndị mmadụ dị kwa ka ha nyere àtụmààtụ ahụ ezi mkwado “ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi igbe ọgbugba-ndu JEHOVA, ka o wee bata n’etiti ayi, zọputa ayi n’ọbu-aka ndi iro ayi.” Ndị ahụ maara na Jehova anaghị alụrụ ha ọgụ, na Ọ rapụwo ha ka ndị iro ha tigbue ha. Ma otú ọ dị, ha achọghị ya n’ụzọ ziriezi inweta kwa iruọma Ya ọzọ. Ndịokenye nke Israel dị ka ha naèchè na ọ bụrụ na ha ji ọkọlọtọ nke Chineke ahụ n’onwe ha; ha amarawo na Chineke nọ n’etiti ha, ebe mmehie nke ndị nchụàjà na ndị mmadụ ahụ mere ka Chineke wezuga onwe Ya kpamkpam. Mgbe Chineke nụrụ banyere ekwesịghị ntụkwasịobi ha, “Ọ we webiga iwe òkè, jusie Israel ike: Ọ we rapu ebe-obibi nke Shailo, bú ulo-ikwu nke O mere ka o biri n’etiti madu” (Abù Ọma 78:59, 60).

Ọ dị náánị otù ihe, mmehie, bụ ihe náeme Chineke ka o wepụ iru Ya n’ebe ndị Ya nọ. Náánị otù ụzọ ahụ agaeji nweta amara nke Chineke, otù mgbe ahụ emere mmehie, bụ ìchègharị site ná mmehie ahụ wee laghachikute kwa Chineke, náarịọ kwa ebere Ya. Nke a bụ nzọụkwụ ahụ nke Ụmụ Israel gaesoworị mgbe ha hụtara onwe ha ndị emeriri emeri n’iru ndịiro ha. Ha nwere otù ihe nlereanya isoro n’ihe Joshua mere mgbe emeriri ndị Israel na Ai. Ọ dara n’ala kpue iru ya ná nweda onwe ya n’ala n’iru Jehova rue mgbe ekpughere ihe wetara nsogbu ahụ. Ngwangwa ewepụrụ ihe mmekpu ahụ na mmehie site n’ọmụma ụlọikwu ahụ, Chineke wee zute kwa ndị Ya ọzọ nye ha mmeri. N’oge dum, Chineke naenwe obi ebere nye ndị ná abịakute Ya n’obi ntiwa na nchèghari, ma Ọ gaekpe ndị náanọgide ná mmehie ha megide Ya ikpé.

Ike Adịghị n’Ọkọlọtọ dị icheiche

Ụmụ Israel n’oge a dị mma ntakịrị karịa ndị náefè arụsị gbara ha gburugburu. Ha dị ka ha chèrerị na ihe nsọ niile nke Chineke ka apụrụ iwere dịka ọgwụ maọbụ mgbasị iji rugide Chineke inyere ha aka, ọbụná dịka ndị náefè arụsị naeji chi dị icheiche ha na ọgwụ n’ụzọ mgbaasị ịrịọta iruọma nke arụsị ha maka enyemaka. Na ebubatara Igbéọgbụgbandụ nke Chineke n’ọmụma ụlọikwuu apụtaghị na Chineke ga elefuru mmehie ndị ahụ anya wee soro Igbé ahụ bata. N’akụkụ nke ọzọ, ndị ahụ náeji ihe nsọ nke Chineke na Oziọma n’ụzọ náezighịezi náebokwasị onwe ha amamikpé dị egwù.

Ụbọchị ndị a nke anyị na ebi nime ha ka anaakpọ ụbọchị nke óké amamihe, ma ọtụtụ ndè mmadụ agabeghị n’iru karị échìchè ụgha niile ndị a. Mmadụ ndị anaapụghị ịgụta ọnụ nwere onye ọ bụla otù Baịbụl n’ụlọ ya dịka nwa ọgwụ naeweta chi ọma. Ha dị ka ha naechè na idebe otù akwụkwọ nke Okwu Chineke gaachụpụ ajọọ ihe. Enwere ike were Baịbụl tọgbọ n’elu uko maọbụ ọ bụrụ ihe ahapụrụ ma chezọ kwa; ma ha adịghị ahụta nke ahụ na o mere ka ihe dị iche. Ndị ọzọ naéchè na ijé òfùfè nke ụbọchị ụkọ otù ugbò maọbụ ugbò abụọ n’otù arọ gaeme ka obi Chineke nke ụwa niile jụrụ. Ụbọchị ndị ọzọ nke fọdụrụ nime arọ ahụ ka ha naeme dịka ajọ obi ha naatụrụ ha ụkà. Ọzọ kwa, ndị ọzọ ganaejekwarị ụkọ iji mee ka ọnọdụ ịtụ mgbere ha náaga n’iru ma ọ bụ iji mee ka ha bụrụ ndị amaara nkeọma n’obodo. Chineke adịghị elekwasị ndị náefè ụdị òfùfè a anya ọma ọ bụla. Ọ naachọ ụdị mmadụ ndị gaefè Ya nime mmụọ na eziokwu.

Mmá Na Njọ

Mgbe ebubatara Igbé ọgbụgbandụ ahụ n’ọmụma ụlọikwuu, ndị agha nke Israel tiri óké mkpu, nke bụ na ụwa mere mkpatụ ọzọ. Ọ gaabụworị itimkpu nke akpaliworo site ná ndị agha egwù ji, ndị naachọ ụzọ ịgbà onwe ha ume, karịa itimkpu nke mmeri ahụ nke ndị agha ahụ nke okwukwe na ntụkwasịobi ha nime Chineke zuru òkè. Ọ dịworị oge ebutere Igbé ahụ n’ọgbọ agha, ma ọ bụghị n’ụzọ Ụmụ Israel si chọọ iji ya n’oge nke a. N’oge agha, nke Jeriko Igbé ahụ eduworị ndị agha ahụ mgbe ha naagba mgbidi niile ahụ gburugburu ụbọchị ìsii; ma n’ụbọchị nke asaa ọ nọ kwa n’iru ahịrị ahụ n’ịgba mgbidi ahụ gburugburu ugbò asaa. Otú ọ dị, ọ dịghị iti mkpu etiri n’agha ahụ ma ọ bụghị n’ụbọchị nke ikpeazụ. Otú a kwa, ewerewo nlezianya kwadobe Igbé ahụ maka ọlụ ya; afụchikwara ya nime ihe ịfụchi nke Ụlọikwuu, ka mmadụ ọ bụla ghara ilebanye anya n’ụdị ya. Náánị onyeisi nchụàjà gaaba ebe Igbé nsọ ahụ dị, ma nke ahụ bụ náánị otù ugbò n’otù arọ -- n’Ụbọchị nke Mkpuchimmehie; ma n’ebe a ndị agha niile nke Israel guzoro ma legide ya anya. Kama iti mkpu ha kwesịrị iruuju n’ihi otú ihe si dị!

Jidesie ike

Ndị ahụ naeleda ngọzi niile nke Chineke anya ka agaewepụ ngọzi ahụ niile site ná ndụ ha n’oge náadịghị anya. Ndị agha nke Israel agaghị n’iru inwe Igbé Chineke ogologo oge, otù mgbe ahụ ha hapụrụ inye ya ọnọdụ kwesịrị ya. Ndị Filistia nụrụ óké ụzụ nke itimkpu nke Ụmụ Israel mere; ha jikwara ndị agha ha niile maka ọgụ ahụ siriike nke dị n’iru, wee nwee kwa mmeri. Ha napụrụ Igbé ahụ dịka ihe nlụta n’agha gbue kwa puku iriatọ (30,000) ndịkom agha nke Israel. Họfnai na Finehas, ụmụ ndịkom Ilaị, nwụkwara, dịka okwu nke onye amụma si dị. Ndị agha Israel rapụrụ ọgbọ agha n’óké iru ihere, nwoke ọ bụla naagbapụ ọsọ maka ndụ ya. Ọ bụrị ụbọchị iru uju nye ndị ahụ kpọrọ onwe ha ụmụ Chineke, ma ọ bụ onwe ha ka ha gaataụta. Israel eburuwo ụzọ mata ihe mmehie pụrụ iweta. “JEHOVA gēme ka etigbue gi n’iru ndi-iro-gi: n’otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n’uzọ asa ka i gāgbalaga n’iru ha” (Deuteronomi 28:25).

“Jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara okpu-eze-gi” (Nkpughe 3:11). Chineke naeleanya ma náachọ kwa ka ndị mmadụ náejizi ihe nke Chineke etinyere ha n’aka idebe nkeọma, ma ọ bụghị otú a Chineke gaewepụ ihe ndị ahụ. Jisọs gosipụtara eziokwu a site n’ilu nke orù ahụ nke natara otù talent, nke weere ego onyenwe ya lie n’ala. Orù ahụ maara ihe o kwesịrị iji ego ahụ mee ma umengwu ji ya iwere ike ya lụọọlụ. Mgbe onyenweulo si n’ijè lata wee chọpụta na eledara talent ya anya ghara kwa ijizi ya nkeọma, iwu ahụ nke enyere bụ, “Napunu ya talent ahu” (Matiu 25:28). Ọ bụghị náánị na ọ tụfuru talent ahụ, kama ọ tufukwara ụgwọọlụ ya niile na ndụ ya.

Okwu Chineke dị nime Igbé ọgbụgbandụ ahụ. Mgbe Ụmụ Israel ejizighị Igbé ahụ, ha tara ahụhụ ụsụ ya. Baịbụl n’ụbọchị taa bụ akwụkwọmbipụta kachasị mma náere onweya dị n’ụwa, ma lee nnọọ ụzọ jọgburu onwe ha eji emetọsị ma náejihie kwa Okwu Chineke! Ụmụmmadụ aghaghị ịkpachapụ anya, n’ihi na Okwu ahụ naakọwa na ụbọchị gaabịa mgbe agaewepụ Okwu ahụ n’ụwa. “Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi JEHOVA puta), mgbe M’gēzite óké unwu n’ala, ọ bugh óké unwu nke nri, ọ bugh kwa akpiri-ikpọ-nku nke miri, kama ọ bụ nke inu okwu nile nke JEHOVA. Ha gāñaghari kwa site n’otù óké osimiri rue óké osimiri ọzọ, site kwa n’Ugwu we rue n’Ọwuwa-anyanwu; ha gāgbaghari iru na azu ichọ okwu JEHOVA, ma ha agagh-achọta ya” (Emos 8:11, 12).

Ozi nke Mbibi

Ozi banyere óké ntigbu ahụ ruru n’obodo Shailo n’oge náadịghị anya. Ilaị naanọkwasị n’oche ya n’akụkụ ụzọ, náechere ịnụ banyere ihe náeme n’ọgbọagha, n’ihi na obi ya naámá jijiji n’ihi Igbé Chineke. Onye náeweta ozi ahụ dị ka ọ gabigara n’akụkụ onye nchụàjà ochie ahụ, eleghịanya, ka ọ ghara ịkọ akụkọ mwute ahụ nke náechere ya. Mgbe nwoke ahụ batara n’obodo wee kọọ akụkọ ahụ banyere ntigbu ihere, ndị obodo ahụ tiri mkpu. Ilaị wee nụ olu itimkpu ahụ wee jụọ asè ịmata ihe kpatara ya. Onye náeweta ozi ahụ wee bịakụte Ilaị ngwangwa, wee kọwaa otú ụbọchị si dị. Ozi ahụ dị mkpirisi, kama ahịrịokwu ọ bụla nime ya naatụkwasị ihe mgbu na mwute nime obi onye náanụ ya, nke ọ bụla naeme ka nhụjuanya naarị ibe ya elu. Ilaị jisirị nnọọ ike náedi akụkọ ahụ, tinyere ọnwụ nke ụmụ ya ndịkom abụọ, rue mgbe etiwara ozi nke ikpeàzụ, “Ewerewo kwa Igbe Chineke”; n’oge ahụ, ike wee gwụ ya. O si n’oche ya dalaa àzụ; n’ihi na o mewo agadi bụrụkwa nwoke dị arọ, olu ya wee gbajie, o wee nwụọ.

Àmà nke Chineke

Ọ dịghị mgbe Chineke naarapụ OnweYa náenweghị iheàmà. Mgbe Ụmụ Israel rapụrụ inye Chineke otuto site ná ndụ ha naebi, Chineke naesite n’akụkụ ọzọ anara otuto. Ndị Filistia naewere Chineke nke Israel dịka náánị chi ọzọ, ma ọ dịghị anya ha wee chọpụta na Ọ bụ Ya bụ Chineke dị ike ahụ nke ụwa dum. Ha buuru Igbé ahụ nke ha nwetara, wee dọba ya n’akụkụ chi ha bụ Degọn, n’ụlọ ya. N’isiụtụtụ n’echi ya, ndị Filistia wee hụ ka Degọn dara kpudo iru ya n’ala n’iru Igbé nke Chineke. N’ichè na nke a bụ ihe mere na mberede, ndị Filistia wee tụtụrụ kwa chi ha tinyeghachị n’ọnọdụ ya; ma n’ileru anya n’isi ụtụtụ nke náesote ya, ha hụ kwa ka o kpudoro iru n’ala ọzọ. Ugbu a náánị mkpirisi ka dị; aka ya abụọ na isi ya ka ebipụworo.

Aka Jehova wee dị arọ n’arụ ndị Filistia. Ebe niile nke ha bubara Igbé ahụ, anaewere iheotiti jọgburu onwe ya tie ndị dum bi ebe ahụ rue mgbe ha malitere itimkpu maka nnápụta. Mgbe ọnwa asaa nke nhụjuanya gasịrị, ndị ahụ wee kpọọ ndị nchụàjà na ndị na ajụ àsè ha ịjụta ihe agaeme iji zilaga Igbé Chineke n’obodo ya. Ewepụtara otù usoro, mee kwa nchọpụta ịmata n’ezie ma ọ bụ Chineke wetaara ha óké ntarama ahụhụ ahụ. “Ma ugbu a, werenu ihe me otù ugbọala ọhu, chiri kwa nne ehi abụa nke nēnye umu ara, nke ọ dịgh mgbe yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n’ugbọ-ala, me ka umu ha si n’iso ha n’azu lata n’ulo: were-kwa-nu igbe Jehova tiyekwasi ya n’ugbọ-ala ahu; … zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la. Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n’uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi óké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigogh otú a, ayi gāma kwa na ọ bugh aka-Ya tigburu ayi; ihe ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi” (I Samuel 6:7-9).

Ehi ahụ jere nnọọ kwem-kwem gaa soro ụzọ ijeru Bet-shemesh, na-eti mkpu dịka ha na-aga. Ha atụgharịghị n’aka-nri maọbụ n’akaekpe. Otú a ka Chineke nke Israel si gosi OnweYa nye ndị Filistia n’ụzọ nke anaagaghị ajụ ajụjụ. Otú a kwa ka Chineke naaghaghị igosi OnweYa nye mmadụ dum, ma ọ burụ na ha gaenye Ya ohere dị mma.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere eji tigbue Ụmụ Israel n’iru ndị Filistia?
  2. Ò kwesịrị ka ebute Igbé Chineke ahụ n’ọgbọ agha?
  3. Gịnị mere mgbe alụrụ agha nke ugbò abụọ ahụ?
  4. Gịnị ka ndị Filistia ji Igbé nke Chineke mee?
  5. Gịnị mere ka ndị Filistia ahụ kwenye izilaga Igbé ahụ rue ala Israel?
  6. Òlee otú esi zilaga Igbé Chineke ahụ?
  7. N’ụzọ dị añaa ka ndị Filistia si chọpụta ma ọ bụ Chineke ka ọ bụghị Ya mere ka ha hụjuo anya?
  8. Ụmụ Israel hà nwere obi ụtọ ịnara kwa Igbé ha?
  9. Gịnị mere Jehova ji chọọ iti ndịkom ụfọdụ nke Bet-shemesh ihe otiti?