I Samuel 7:1-17

Lesson 202 - Senior

Memory Verse
“Nání tuanu egwù JEHOVA, were obi-unu nile fe Ya òfùfè n’ezi okwu: n’ihi na, Lenu ihe uku O meworo n’ebe unu nọ” (I Samuel 12:24).
Cross References

I Igbé Ọgbụgbandụ Chineke na Kiriat-jearim

1. Ndịkom nke Bet-shemesh, obodo nke ndị nchụàjà, ekwesịghị ekwesị idebe Igbé Jehova ahụ, I Samuel 6:19-21

2. Chineke arapụwo ụlọikwuu ahụ nke dị na Shailo, Abù Ọma 78:60; Jeremaia 7:14

3. Ndịkom nke Kiriat-jearim nabatara ma ṣọpụkwara Igbé ọgbụgbandụ ahụ, I Samuel 7:1

II Ọkpụkpọòkù maka Nchègharị

1. Ụlọ Israel tikuru Chineke, I Samuel 7:2, 3; Jeremaia 3:21, 22; Zekaraia 12:10, 11; Matiu 5:4

2. Ndị Israel wezugara arụsị ha niile, I Samuel 7:4; Hosea 14:8; Matiu 4:10

3. Samuel kpere ekpere banyere ndị ahụ, ndị mesịrị mịpụta mkpụrụ nke kwesịrị nchègharị, I Samuel 7:5, 6; Job 16:20; Matiu 3:7-9

III Agha Na-erù Ka Igwè-ojii

1. Ndị Filistia, mgbe ha nụrụ ihe banyere ọgbakọ ahụ na Mizpa gara ibuso Israel agha, I Samuel 7:7; 2 Ndi Eze 6:15-17

2. Ụmụ Israel rịọrọ Samuel ka o kpee ekpere maka nnápụta, I Samuel 7:8; Aisaia 37:4; Jemes 5:16

3. Samuel chụrụ àjànsure ọkụ ma tikue kwa Chineke maka inye aka, I Samuel 7:9; 10:8; 16:2; Abù Ọma 50:15

IV Mmeri Dị Ebube

1. Chineke meriri ndị Filistia, tigbue kwa ha n’iru ndị Israel, I Samuel 7:10, 11; Zekaraia 4:6; I Ndi Kọrint 10:13

2. Samuel dọbara nkume dịka ihe ncheta maka mmeri ahụ, I Samuel 7:12; Joshua 4:20-24

3. Emeriri ndị Filistia n’oge niile fọdụrụ n’ọchịchị nke Samuel, I Samuel 7:13-17

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndịkom Bet-shemesh, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nchụàjà, ma Chineke tigburu ha mgbe ha lebara anya nime Igbé Ọgbụgbandụ ahụ. Ndị ahụ nke náanwụghị gbalịrị ịhụ na ebupụrụ Igbé ahụ gaa n’ebe ọzọ. Mgbe e jiri Igbé ahụ nke bụ ihe ịrịba àmà na-egosipụta iru Chineke n’etiti ụmụ Ya mee ihe otú o kwesịrị, na-ewetara Ụmụ Israel ngọzi; ma mgbe ha mere Igbé ahụ ihe ihere wee mejọọ ihe nsọ ahụ, Chineke mere ngwa ikpepụta nsọpụrụ Ya.

Onyeọbịa Anabatara Nkọma Na Kiriat-jearim

Ọ bụ ezie na ọ dị ka ndị Bet-shemesh naañụri ọñụ ịhụ na ebupụrụ Igbé Jehova n’ebe ha nọ, otù aka ahụ ndị Kiriat-jearim ñụrịrị ọñụ ịnabata ya n’etiti ha. Ndịkom ndị a abụghị ndị nchụàjà, maọbụ ndị Livaị, dịka ihe ndekọta ahụ náegosi; otú ọ dị, ha kwanyere Igbé ahụ ùgwù ma sọpụrụ kwa ya, Chineke wee sọpụkwara ha n’ihi omume ha. Ebuuru Igbé ahụ gaa n’ụlọ Abinadab, eleghịanya ọ bụ nwoke nke nwere nsọpụrụ Chineke n’ụzọ pụrụ iche; eleghịanya ụlọ ya bụ kwa ebe kachasị mma nke obodo ahụ pụrụ inweta. Ndị ahụ wee doo Elieeza nsọ bụ nwa Abinadab, idebe Igbé Jehova. Ọ dị ka ọ masịrị Chineke ịrapụ nwoke a, ilekọta akụ a nke dị ukwuu ma dị kwa nsọ ọ bụ ezie na ọ bụ onye Israel anaakpọghị ihe. Chineke jikeere iji mmadụ a anaamaghị nkeọma bụ onye ji ndụ ya chụọàjà n’ọlụ Chineke lụọọlụ ngwangwa karịa ka Ọ pụrụ iji onyenchụ àjà ma ọ bụ onye Livai bụ onye ajụrajụ n’ihi mmehie ma ọ bụ ịhụ ụwa n’anya.

Mgbe Jisọs naejégharị n’etiti ụmụmmadụ Ọ chọpụtara na ndị ahụ anaakpọ ndị isi nke okpukpé na ndị náejidesi omenala nke Ụlọukwu Chineke ike ekwesịghị ka ejirị ha lụọọlụ nke Alaeze Ya. Jisọs kpọrọ ndị ọlụ Ya ahụ tozuru ókè, bụ ndị náesoụzọ Ya na Ndịozi ahụ site n’etiti ndị anaamaghị nkeọma. “N’ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ digh ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ digh ọtutu ndi-ike, ọ digh ọtutu ndi amazuru aha-ha ka akpọrọ” (I Ndi Kọrint 1:26). Nke a bụ eziokwu nke ka nke n’ihi na ndị amamihe, ndị dị ike, na ọgaranya agaghị ewedata onweha n’ala ịña ntị ọkpụkpọòkù nke Kraist na nke Eluigwe.

Ịlaghachikute Chineke

Igbé Jehova digidere n’ụlọ Abinadab oge ra ka iri arọ abụọ tupu ndị Israel wee kwue okwu banyere ya. Nke a naeme ka anyị ghọta ọnọdụ mmehie nke ha nọ n’oge ahụ, na ikpere arụsị nke náachị isi n’etiti ndị ahụ. Asị na ndị ahụ naefè Chineke òfùfè dịka ha kwesịrị ifè Ya ọ gaewutewo harịị na Igbé Jehova anọghị n’etiti ha. N’ụbọchị Mkpuchịmmehie onye isinchụàjà gaabàworị n’Ebe Nsọ kachasị ebe nsọ niile bụ ebe Chineke bu n’obi na aganáedebe Igbé ahụ, ịchụàjà nke Mkpuchimmehie n’ihi ndị ahụ. N’oge niile nke iri arọ abụọ ndị a ọ ghaghị ịbụ na ọ dịghị mgbe enwere Ụbọchị Mkpuchimmehie. Ndị ahụ nọ nnọọ náefé mmehie òfùfè nke mere na ihe banyere Ụlọikwuu na òfùfè nke Chineke emetụkwaghị ha n’obi ọzọ.

E kwuru ihe ntakịrị banyere Samuel Onye amụma n’oge a, kama e nwereike ikwu na ọ nọ n’ọlụ dị ukwuu nke Chineke nyere ya ime ka obi ndị ahụ laghachịkute ezi Chineke ha. O weere iri arọ abụọ nke mkwusa, ma na mberede e nwere mkpali n’etiti ndị ahụ. Ọ bụghị náánị mmadụ ole n’ole, kama ụlọ Israel niile malitere itiku Chineke. A pụrụ ikwu na nke a bụ otù nime ntute mmụọ nke kachasị ibe ya n’oge ọ bụla.

Samuel pụtara ngwa ngwa n’iru ha ugbu a, ma gwa ndị ahụ n’ebe o doro anya ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na ha tụrụ anya na Chineke nke Eluigwe ga-anabata nlaghachị ha. Aghaghị itikpọsị arụsị niile nke ndị ala ọzọ ma jụkwa ha; aghaghị ijikere obi ndị ahụ maka ifè náánị Chineke òfùfè. Ndụmọdụ nke Samuel lụpụtara ihe, n’ihi na ndị ahụ mere dịka enyere ha n’iwu ma feè kwa náánị Chineke òfùfè.

Ndị Israel na Mizpa

Mgbe Samuel hụrụ na ndị ahụ ji obi ha niile náalaghachịkute Chineke, ọ kpọrọ òkù ka mkpọkọta nke Israel niile bịakute ya na Mizpa. Urù nke dị ná ọgbakọ nke ọra ndị Kraist abụghị ihe agaelelị anya. Ndị nke náakpachapụ anya náewepụ onweha ná mmekọrịta nke ndị Chineke gaetufu ọtụtụ ihe. “Ka ayi nātugharita kwa uche n’aru ibe-ayi ikpasu ihu-n’anya na ọlụ ọma di iche iche; ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n’ụzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso” (Ndi Hibru 10:24, 25). Ọ dị agbamume a naerite n’urù site n’ezi ihe nlereanya, a naenweta kwa ike site n’ịdị n’otù. Nwoke ahụ nke náagbalị ịga n’ụzọ nke Eluigwe náánị ya naezute ọtụtụ ihe isi ike n’ụzọ ya, ma ọñụ nke dị n’isonye n’òtù ndị Kraist bụ akụ nke dị óké ọnụahịa.

Samuel bụ ezi onyeamụma nke Chineke onye ná ekwupụta ihe Chineke chọrọ. N’oge a Samuel naalụọlụ nke onye náarịọchitara ndịọzọ arịrịọ n’otù aka ahụ, n’ihi na ọnọdụ ndị nchụàjà na usoro nke ịchụàjà ka ewezugara nwaoge. Onye amụma ahụ kpeere ndị ahụ ekpere; ndị ahụ wee ghọta ịdị ukwuu nke mmehie ha, wee mee ihe kwesịrị ekwesị iji dozie ọnọdụ ahụ. Ha wee sere miri wụsa kwa ya n’ala n’iru Chineke; ha buru ọnụ n’ụbọchị ahụ, wee sị, “Ayi emehiewo megide JEHOVA.” Otù ụkọchukwu ejikọtawo ihe banyere inweta nzọpụta site ná mkpụrụ okwu atọ, “Bịa, kpọọ, ma kwupụta.” Otú ahụ ka Ụmụ Israel mere. Chineke nụrụ arịrịọ ndị ahụ dịka enwereike ịhụ n’ihe dị icheiche nke mere n’oge náadịghị anya.

Ezi Nchègharị

Isere mmiri na iwụsa ya n’ala n’iru Chineke dị ka ihe náegosi nchègharị dị omimi na nweda n’ala nke Ụmụ Israel. Eleghịanya ha hụtara onwe ha dịka “miri nke anāwusi n’ala, nke anāgagh-achikọta” (2 Samuel 14:14) ma ọ bụghị ma Chineke gaenyere ha aka. Otù aka ahụ kwa, ọ pụrụ igosi ekpere ahụ naesi n’obi ha apụta nke a naawụsị kwa n’iru Chineke ha. Hana kpesịrị ekpere ike n’obi ya nye Chineke; náánị egbugbere ọnụ ya na eme ụkpọrọ ma anụghị olu ya. Otú ọ dị, mgbe ọ naakọwara Ilaị ihe banyere omume ya, ọ sịrị “awusirim” nkpuru-obim n’iru Jehova (I Samuel 1:15).

Nke a bụ iheọmụmụ nke náakọwa ezi nchègharị. Nzọụkwụ mbụ bụ nteta n’ụra nke onyemmehie ahụ ịmata na ọ dị ihe ọ chọrọ karịa nke o nwererị. “Ulo Israel nile we kwaso JEHOVA.” Nzọụkwụ ọzọ bụ onyemmehie ahụ isi n’ụzọ ochie ya pụta, na inwe mkpebi ifè Chineke òfùfè. “Umu Israel we wezuga Belim na Ashtarọt, fè nání JEHOVA òfùfè.” Ikpé ekpere nye Chineke na mkwupụta mmehie bụ nzọụkwụ ọzọ kwesịrị isonye. Samuel sịrị, “M’gēkpe-kwa-ra JEHOVA ekpere banyere unu.” Ụmụ Israel wee sị, “Ayi emehiewo megide JEHOVA;” ma náenweghị obi abụọ ha sooro Samuel náekpe ekpere.

Nguzogide

Ngwangwa mmadụ rapụrụ ụzọ niile nke mmehie ya ma jikere iso Chineke na ịga n’Eluigwe, ekwensu gaanọ nso mgbe niile ibuagha megide ọganiru ọ bụla. Ụmụ Israel chọpụtara na nke a bụ eziokwu mgbe ha siri n’okwukwe nke ndị bụ nna ha daghachị azụ. Ndị Filistia ejighị ndị agha ha bata n’ala ndị Israel rue ihe ra ka iriarọabụọ; ma ngwangwa ndị ahụ zukọtara na Mizpa ikpeekpere, nke a kpalitere onyeiro ahụ ibuso Ụmụ Israel agha.

Ka onye ọ bụla nke jikeere ifè Chineke òfùfè mara na ọ ghaghị izute onye iro nke mkpụrụ obi ya n’agha. Ekwensu na-ebo onye nke Kraist ọ bụla ebubo ụgha n’iru Chineke; ma Chineke maara obi ụmụ-Ya, ma mmeri bụ ihe nke ha náaghaghị inwe site n’Ọbara nke Nwaatụrụ ahụ. “N’ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n’iru Chineke-ayi ehihie na abalị. Ndi ahu we merie ya n’ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n’ihi okwu àmà-ha; ha ahugh kwa ndu-ha n’anya rue ọnwu” (Nkpughe 12:10, 11). Jisọs meriri ekwensu na ọnwụnwa site n’Okwu nke Chineke, otú a kwa ka anyị gaeme. “Mgbe onye-nkpagbu gābata dika miri-iyi, Mọ nke JEHOVA ganēbuli ọkọlọtọ imegide ya” (Aisaia 59:19).

Ekpere niile nke Azara

Ọnọdụ Ụmụ Israel dị mma ụgbu a n’ihe nke imemmụọ, nke mere na ha pụrụ iguzogide onyeiro ahụ ná mmeri. Ọ bụ ezie na Ụmụ Israel gara na Mizpa ikpé ekpere ma eleghịanya ha rapụrụ ngwá agha ha n’ulo, náagbanyeghị nke a, ha busoro onyeiro ahụ agha rue ná mmeri. Nke a mere ka ha na Chineke nweeike ịkparịta ụkà, ma ọ dịghị ngwa agha ọ bụla akpụworo nke siri ike karịa ekpere. Ekpere, nke ékperè n’ụzọ ziriezi, naakwalite Ogwe aka dị ike nke Chineke. Ụmụ Israel kpere ekpere ha wee sị Samuel, “Agbala nkiti bayere ayi n’itiku JEHOVA, bú Chineke-ayi, mkpu, ka O we zọputa ayi n’aka ndi Filistia.”

Samuel hụrụ n’otù mgbe ahụ otú ọnọdụ ahụ si sieike. Ọ chọpụtara, ma eleghịanya, egwù nke dị n’obi ndị ahụ, otù aka ahụ ọ chọpụtakwara okwukwe na njikere nke dị n’obi ha ịtụkwasị Chineke obi, Onye ha na Ya nwere ọgbụgbandụ ọhụụ. Samuel matakwara na aghaghị ịchụrụ Chineke àjà, ya mere, o were nwa atụrụ chụọ àjà nsureọkụ. Chineke sọpụụrụ àjà ahụ. Ọ na-asọpụrụ kwa obi etiwara etiwa na nke náatụkwasị Ya obi ebe ọ bụla a hụrụ ya.

Omume ahụ nke o mere iji nwaatụrụ ahụ chụọàjà nsureọkụ mezuru ọlụ nke nchègharị nke ndị ahụ. “Ọ buru kwa na nwusi Ọbara adigh mgbaghara nmehie adigh” (Ndi Hibru 9:22). “Mgbe M’huru ọbara ahu, M’gāgabiga unu” (Ọpupu 12:13). Chineke hụrụ ọbara ahụ wee nábata kwa ekpere nke Ụmụ Israel, na ekpere nke Samuel. Chineke weere óké olu makwasị ndị Filistia égbè Eluigwe wee tigbue ha n’iru ndị Israel. Chineke na Ụmụ Israel n’oge a mere ka ndị Filistia gbasasịa nke mere na ha abatakwaghị n’ala Israel ụbọchị niile nke Samuel.

“Ebeneza”

Eguzobere ihe ncheta n’ihi mmeri a dị ukwuu nke Chineke nyere. Aha ahụ nke bụ Ebeneza nke enyere ihe ncheta a, nwere ihe dị mkpà ọ pụtara, “JEHOVA enyeworo ayi aka rue ugbu a.” Eguzobeghị ihe ncheta a maka otuto nke mmadụ, n’ihi na o nweghị óké ihe mmadụ mere ná mmeri ahụ nke e nwere. Náánị otù aha ka ebuliri elu -- aha Chineke nke Israel. Nke a bụ nkume nke inyeaka. O mere ka echeta ngọzi niile nke oge garaaga, tinyekwara abụ ákwá na iruuju bụ nke mere ka Ụmụ Israel laghachịkute Chineke, nke a metụtakwara ọñụ ha ugbu a ná mmeri ha. Ọ dị ka o jupụtara n’okwukwe maka ọ dịn’iru. Na Chineke enyeworo anyị aka “ugbu a”, bụ ihe ndabere nke e nwereike ịdabere na Ya na ọ gaaga n’iru náenye aka ma ọ bụrụ na okwukwe ahụ na ịtụkwasị Ya obi naadịgide.

Onye nke Kraist naachọpụtakwa na ihe ncheta nke dị ka nke a nke eguzobeworo ọtọ nime obi ya nye Chineke naegosipụta ngọzi nke dị ukwuu. Mnwapụta ọ bula nke e nwetara n’ebe Chineke nọ bụ “nkume nke inye-aka.” Apụrụ iguzobe nkume nchete n’oge ọ bụla e nwetara ngọzi site n’Eluigwe; emesịa, mgbe ọ bụla ifúfé nke nhujuanya gaefé mmadụ ahụ nwereike icheta n’oge ahụ na n’ebe ahụ, wee sị, “JEHOVA enyeworo ayi aka rue ugbu a.” Ihe ncheta ndị a nke inye aka agaghị adị ebe dị anya na ndụ onye nke Kraist ọ bụla.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere e jiri bupụ Igbé ọgbụgbandụ Chineke na Bet-shemesh?
  2. Òge ra añaa ka o were Ụmụ Israel iji lọghachịkute Chineke?
  3. Gịnị bụ ihe ịrịbaàmà mbụ nke náegosi nlọghachị ha?
  4. Òlee otú Samuel si gbaá ndị Israel ume ná nchègharị ha?
  5. Ndị Israel hà mere ihe Samuel nyere n’iwu?
  6. Gịnị mere ndị Filistia jiri bịa n’ala Israel n’oge a?
  7. Gịnị ka ndị Israel mere banyere agha a ebusoro ha?
  8. Ònye meriri n’agha ahụ?
  9. Kọọ ihe okwu ahụ nke bụ “Ebeneza” pụtara.