I Samuel 8:1-22

Lesson 203 - Senior

Memory Verse
“Unu ekwekwala ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n’ime ka uche unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa ya ezi utọ nke zukwara òkè” (Ndi Rom 12:2).
Cross References

I Ikpé Náezighịezi

1. Samuel rọpụtara ụmụ ya ndịkom n’oge agadi ya ikpé ndị Israel ikpé, I Samuel 8:1, 2; 2 Ihe Emere 19:5-7

2. Ụmụ ndịkom nke Samuel ejeghị ijè n’ịtụ egwù Chineke, I Samuel 8:3; Deuteronomi 16:19; Aisaia 33:14-16; I Timọti 6:10

3. Ndịokenye nke Israel welitere nke a dịka ihe mgbakwasị ụkwụ ịrịọ ka enye ha eze, I Samuel 8:4, 5; Deuteronomi 17:14, 15; Ọlu Ndi ozi 13:20, 21

II Ekpere nke Samuel na Ọzịzá nke Chineke

1. Samuel enweghị ọzịzá nye arịrịọ ahụ náekwesịghị nke ndịokenye, o wee chọọ ndụmọdụ nke Chineke, I Samuel 8:6; Ọpupu 32:30-33; Ezra 9:3-5; Luk 6:12

2. E weghachirị ọzịzá na ndị ahụ ajụwo Chineke, I Samuel 8:7, 8; Ọpupu 16:8; Luk 10:16

3. E nyere Samuel ndụmọdụ ka o mezuere ndị a arịrịọ ha ma dọọ kwa ha akanántị maka ihe niile nke gaesi na ya pụta, I Samuel 8:9; Ezikiel 45:9; 46:18

III Omume nke Eze nke Ụwa

1. Eze nke Eluigwe naeji iruọma náachị: ma onye eze nke ụwa naachị n’akaike, I Samuel 8:10-18; I Ndi Eze 9:22; 12:4, 12-14; 21:7, 15

2. Ndị ahụ jụrụ ịñá Samuel ntị ma nọgidesieike n’ịsị ka enye ha eze, I Samuel 8:19, 20; Abù Ọma 81:11, 12; Jeremaia 44:16; Ezikiel 33:31

3. Chineke kwenyere ka emee dịka arịrịọ nke ndị ahụ si dị, I Samuel 8:21, 22; Hosea 13:9-11

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndị Ikpé

Dịka arọ niile nke Samuel naabịaru n’agadi ya, eleghịanya ọ gana-atụgharị n’obi ya onye ga-anọchị anya ya dịka onye ikpé nke ndị Israel. Samuel maara akụkọ nke ndị Israel na ọtụtụ mgbe ọdị mma nke ime mụọ ha na-adị ala mgbe onye ikpé ọ bụla kwesịrị ntụkwasịobi si n’etiti ha pụọ. Ọtụtụ mgbe Ụmụ Israel na-adaba n’ikpere arụsị rue mgbe nsogbu na ndọta n’agha bịakwasịrị ha; mgbe ahụ ha e wee tikue Chineke maka nnapụta e wee nye ha onye ikpé na onye nnapụta ọhụụ. Nke a metụrụ Samuel n’obi ka ihe dị otú a ghara ịdị mgbe ụbọchị ndụ ya gwụsịrị, ya mere ọ rọpụtara ụmụ ya ndịkom dịka ndị ikpé mgbe ọ ka dị ndụ.

Náenweghị obiabụọ Samuel gaakuziwororị ụmụ ya ihe banyere iwu nkeọma ma chèèkwa na ha gaekpé ndị ahụ ikpé ziriezi. Eleghịanya ha gaanụworị akụkọ ahụ n’ọnụ nna ha maka ọgwụgwụ ahụ jọgburu onwe ya nke bịakwasịrị ụmụ ndịkom Ilaị n’ihi na ha jụrụ ijéijè n’ụzọ niile nke Chineke. Samuel gaenweworị ntụkwasịobi na ụmụ ya ndịkom ahụ gaeme ihe kwesịrị ekwesị na eziokwu. Agwaghị anyị arọ ole ndị a nọrọ na Bịa-sheba dịka ndị ikpé ma n’oge náadịghị anya o were anya na ha adịghị ejéijè n’ụzọ niile nke nna ha nke náasọpụrụ Chineke jere, kama ha wezugara onwe ha wee gbasoo urù naáeweta ihere wee nara ìhe iri ngo, náekpe kwa ikpé ná ezighịezi.

Otù Eze

Ọ dị ka a gaasị na ndịokenye Israel naechere ohere a iji webata mgbanwe n’ọchịchị ha. Ha wetara ihe abụọ n’iru Samuel: na ya onweya aghọwo agadi na kwa ụmụ ya ndịkom adịghị ejé ijè n’ụzọ ya niile. Ọ dịghị ntụpọ ha chọtara ná ndụ Samuel. Omume ya bụ ihe dị nnọọ ezi mma ọ bụ kwa ihe nlereanya nke ndị Israel gaenweworị obi ụtọ ịgbaso. Ọ bụrụ na ọ bụ agadi, ò mewo agadi n’ijere Chineke na mmadụ ozi; ọ bụrụ na ime agadi ya naegbochi ya ijégharị n’obodo ahụ niile dịka ọ naeme na mbụ, otù ọnọdụ agadi ahụ gaenweworị ọtụtụ mnwapụta na amamihe dị ukwuu nke a náagaghị achọta ebe ọzọ n’ala ahụ. Samuel gbara ihe dịka arọ iriisii (60) n’oge a -- arọ nke a náagaghị asị na ọ dịkarịrị ukwuu igbochi ya ịbụ onye apụrụ iji lụọọlụ.

Ndịokenye Israel bịakutere Samuel náarịọ ka o meere ha eze. Ha adịghị ka ndị tinyebigara ya ókè n’obi ha na ụmụ ndịkom Samuel naanara ihe iringo ná ekpekwa ikpé náezighị ezi. Ọ bụrụ na ha jisịrị ebubo a ike dịka náánị agụụ obi ha, onye ọ bụla gaenweworị mmetụ n’obi siri ike na Samuel gaebilataworị ikike ahụ nke dị n’aka ụmụ ya ndịkom. Ndị okenye ahụ wepụtara ebubo ndị a n’ihi otù ihe -- ihe ngọpụ nke ịrịọ ka emeere ha eze. Onye amụma ochie ahụ, ná mkparịtaụkà nke ya na Chineke nke Eluigwe, bụrụ kwa onye ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti Ụmụ Israel naasọpụrụ n’ebe ọ dị ukwuu, ọ bụghị kwa onye anaachọsike ugbu a n’etiti ndịokenye nke ndị ahụ. Ha chọrọ eze. Ha ekwupụtazighị na ha chọrọ eze eziomume onye gaachị ha nkeọma karịa otú ụmụ ndịkom nke Samuel siri chịa ha; kama ha kwuru ya nnọọ, “Ugbu a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile.” N’ụzọ iru abụọ iji mee dịka ndị náachọ iwebata ezi ihe n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Ndị Israel n’ezie jiri ihe ọjọọ gbanwere ihe ọma. Èzínaulo nke ụmụmmadụ ganaeme nke a oge niile mgbe arapụrụ ha ná ntụpụta nke aka ha na mgbe ha naagbasokwa ndụmọdụ nke onwe ha. “JEHOVA, amawom na ọ bugh n’aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bugh onye ọ bula nke na-eje ijè nwe ime ka nzọ-ukwu ya gozosie-ike.” (Jeremaia 10:23). N’ụzọ nke ọzọ, “site n’aka JEHOVA ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie-ike; ụzọ ya nātọ kwa Ya utọ” (Abù Ọma 37:23).

Nrọrọ Náezighịezi

Samuel pụrụ ịhụ ihe ọjọọ nke dị n’ọchịchọ obi nke ndị ahụ, ọ bụ ezie na ọ mataghị ebe ihe ọjọọ ahụ ruru rue mgbe o jekuuru Chineke n’ekpere. Ọchịchọ nke inwe eze pụtara na ndị ahụ naarịọ mkwụsị nke ọchịchị ahụ nke Chineke bụ onyeisi ya bụ nke ha biworo n’ime ya. Samuel chèrè na ndị ahụ naajụ ya, na ike ikpé ikpé ya agwụwo ha: ma Chineke kwupụtara na ihe bụ eziokwu dị na ya bụ na ọ bụ Ya onwe Ya ka ha naajụ. Gịnị gaeme ka Ụmụ Israel chèe échìchè iwezuga onwe ha n’okpuru ọchịchị nke Chineke? N’ihi na ha enweghịike ime ka ọ mara ha arụ bụ ichè échìchè banyere Eze ukwuu ahụ nke anaadịghị ahụ anya, ọ bụ ezie na ọtụtụ mgbe O gosiwo onwe Ya onye dịike n’ebe ha nọ. Ụmụ Israel jikeere iwere ọchịchị nke eze ụwa onye ha pụrụ ịhụ anya gbanwere ọchịchị nke Chineke -- mgbanwe nke náekwesịghị. Ha chọrọ eze nke gaaga n’iru ha ma soro ha náalụ agha ha niile. Hà echezọwo ọtụtụ mgbe Chineke buuru ha na ndị bụ nna ha agha, ma náánị ihe ha pụrụ ime bụ “guzonu onwe unu n’ebe a, hu nzọputa JEHOVA?”

Otù ihe isiike ahụ nke ibindụ kwa ụbọchị na inwe ntụkwasịobi na okwukwe n’ebe Chineke nọ naeche ọtụtụ ndị nke Kraist iru n’ụbọchị taa. Ndị ka n’ọnụọgụgụ n’etiti ụmụmmadụ naechè na ha nwere ezi nchebe mgbe ha nwere akụn’ụba nke ụwa gburugburu ha; ma ha adịghị agụ mkwà niile nke Chineke n’ihe dị óké ọnụ. Ego dị ukwuu nke ha nwere n’ulo àkụ (ọba ego) nke náadị nwaoge dị ha ezimma karịa akwụkwọ ịdọta ego nke okwukwe. Ha naanyàisi ná amamihe ha na nchèkwube nke ha nwere maka ọdịn’iru ha, ebe ihere kwesịrị ime ha n’ihi enweghị ntụkwasịobi ha n’ebe Chineke nọ. “Unu akpadola akù n’uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupu kwa nēzu kwa ori: kama kpadonu akù n’elu-igwe nye onwe unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādigh erichapu, ebe ndi-ori nādigh egwupu kwa, ha adigh ezu kwa ori” (Matiu 6:19, 20).

Ndị DịỌtụtụ maọbụ Ndị Dị Olen’ole

Ihe ọzọ nke mere ka Ụmụ Israel chọọ inwe eze nke ụwa onye ganaachị ha bụ ka ha dị ka mba ọzọ niile ndị gbara ha gburugburu. Onye amụma na onye ikpé nke náejégharị n’uwe dị ọnụala ka anaagaghị eji tụnyere uwe dị ebube nke ndị eze mpako nke ndị mbaọzọ ndị gbara ha gburugburu na eyi nkeọma; ya mere Ụmụ Israel nwere mmetu n’obi na ha apụghị ịnagịde ịnọ náánị ha banyere okwu a. N’ụzọ ụfọdụ o nwereike isiike ịnọ n’etiti ndị náadịghị ọtụtụ ma debe okwukwe gị na Chineke, mgbe ndị ọzọ niile nọ gị gburugburu naadị ka ihe ọ naagara ha nkeọma karịsịa bụ ndị náaga n’ụzọ dị iche; ma onye Kraist kwesịrị ilegide anya ná mkwụghachị nke ụgwọọlụ ikpeàzụ ahụ dị n’iru.

Ọtụtụ ibindụ nke onye Kraist bụ nke náadịghị agbaso ụzọ niile, omume, na ụdị ịchọ mma niile nke ụwa a. Ịhụnanya Kraist nke dị nime obi mmadụ naagbanwe omume na ọchịchọ nke obi ya nke mere na ọ bụghị kwa mmadụ nke oge garaaga; ma ọ ghọwo onye ekèrè ọhụụ “ọ bu onye ekere ọhụ: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu” (2 Ndi Kọrint 5:17). Idebe onwe ya n’ịhụn’anya Chineke, enyere onye nke Kraist ahụ iwu: “Unu ahula uwa ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahu uwa n’anya, ihu-n’anya nke nna-ayi adigh nime ya.” (I Jọn 2:15).

Ọtụtụ mmadụ naasụ ngọngọ n’ihi nkewapụta a site n’ụwa. Ha gaenweworị ọñụ ịnabata Jisọs nime obi ha ma ọ bụrụ na ha pụrụ ị ga n’iru náenwe mmekọrịta na otuto nke ndị enyi ha n’ụwa, ma ịkwáemò ihere, na ọtụtụ ịtaụta dị ụfụ nke ndị mmehie naeji emeso ụzọ na omume guzoziri eguzozi nke OnyeKraist bụ ihe ụdị mmadụ ndịa náapụghị ịnagide. Dịka ndị okenye nke ndị Israel, ha chọrọ ịdị ka ndị ọzọ ndị nọ nime ụwa. Ma chetakwa, na Chineke adịghị anabata ụzọ nke ndị ụwa. Ọ naachọ ụmụmmadụ ndị jikeere ikewapụta onwe ha site n’ụwa.

Ọzịzá nke Chineke

Samuel enweghị ọzịzá nye Ụmụ Israel na mbụ mgbe ha chèrè arịrịọ ha n’iru ya. Asị na ọ jụrụ arịrịọ ha náemeghị ka Chineke mara ihe banyere ya, ndị ahụ gaekwuworị nkeọma na Samuel enyebigawo onwe ya ike ókè. Ma ọ bụrụ na Samuel kwenyere n’ọchịchọ obi ha náamaghị ihe gaabụ obi Chineke, Samuel gaabụworị onye rere ọnọdụ nke ikwesị ntụkwasị obi ya ma bụrụ kwa onye sooro webata mgbanwe ahụ. Samuel maara nsogbu nke ọ nọ nime ya, ya mere o jekuuru Chineke n’ekpere maka ogbugbo nke mkpà ahụ. Ọzịzá ahụ anọghị ọdụ n’ịbịa. Iwe were Chineke banyere ntụpụta ahụ nke inwe eze nke ụwa, kama Ọ gwara Samuel ka ọ ñaa ntị n’okwu ha, “nání na i gāgbasiri ha amà ike, gosi kwa ha ikpe eze ahu nke gābu eze ha.”

Samuel gosiri Ụmụ Israel ụdị mmadụ eze nke ụwa gaachị ha gaabụ. Kama inwe Eze nke Eluigwe onye a náadịghị ahụ anya onye náenye ezi onyinye na ihe niile zuruòkè, ndị ahụ naachọsiike inwe eze onye gaanara onyinye niile náenyeghị ihe ọ bụla. Samuel gosịrị ha ihe banyere ndị eze mmegide ahụ ndị náachị mba niile nke ọwụwaanyanwụ ndị gbara Palestine gburugburu n’oge ahụ. Ụmụ Israel gaatụ anya na eze ahụ gaewere ụmụ ha ndịkom bụ ndị ha hụrụ n’anya ịbụ ndị nché ya, na ndị agha, na ndị isi; ha ga atụ kwa anya na eze ahụ gaewere ụmụ ha ndịnyom ka ha bụrụ ndị osiite na ndị náeghe achịcha iji kwagide ndị nnọkọ nke óké ihe oriri ya; na eze ahụ gaewere ala ndị kachasị mma nye ndị orù ya; na ọ gaewere kwa otù ụzọ n’ụzọ iri nke ihe onwunwe ha nye onwe ya. Karịa nke ahụ Chineke sịrị na mgbe Ụmụ Israel gaahụ ihe ọjọọ nke si ná nrọrọ ha wee tikue Chineke mkpu banyere ya, Ọ gaghị anụ itimkpu ha. Site n’ịdọ akanántị dị otú a nke sitere n’ebe Chineke nọ, mmadụ nwereike ichè na Ụmụ Israel gaasịworị ngwangwa, “Ayị ga-akwụsị ebe a.”

Ịgbaso Chineke Mgbá

N’ebe a anyị naenwe ihe nlereanya nke omume ọtụtụ mmadụ n’ebe niile ha naenwe ọchịchọ nke megidere uche Chineke. Ha na anọgidesi kwa ike n’ọchịchọ ahụ, náenwe anya ghereoghe nke ná ahụzu ihe niile ọ gaalụpụta, tutu rue n’ikpeàzụ Chineke e wee kwenyere ọchịchọ ahụ wee mezue arịrịọ ha. Na Chineke kwenyere ka e mee ihe, otú ọ dị, abụghị ihe ngosipụta were anya na ihe ahụ bụ dịka uche Ya si dị. Otù ihe nwereike ịbụ ihe megidere uche Chineke; ma ọ bụrụ na Ọ hụ otù mmadụ ma ọ bụ ọtụtụ mmadụ ka ha naachọsi ihe ahụ ike, ọ gaekwenyere ha ka ha gaa n’iru, dịka o mere onye amụma ahụ bụ Belam. Belam legidere anya n’inweta ụgwọ ọlụ ahụ; n’ikpe àzụ Chineke rapụrụ ya ka o jekuru eze Moab, ma ọ dịghị mgbe Belam natara ụgwọ ọlụ ahụ.

Mgbe mmadụ naarụgide Chineke maka otù ihe pụrụ iche rue mgbe ekwenyere arịrịọ onye ahụ, onye ahụ agaghị enwe ọñụ ọbụná mgbe ọ natasịrị ihe ahụ. “O we nye ha ihe ha riọrọ; ma o zitara aru ọtita ná nkpuru obi ha” (Abù Ọma 106:15). Ụmụ Israel natara arịrịọ ha banyere inwe eze, ma ọgbọ ahụ nke rụgidere Chineke maka inwe eze ahụ ebighị ogologo ndụ inwe ọñụ n’ebe eze ha ahụ dị. Eze mbụ nke Israel bụ Sọl, onye ogologo arọ irianọ (40) nke ọchịchị ya jupụtara náenweghị obi izuike, esemokwu, nhuju anya, na ibuagha. Ọ bụ náánị n’oge ọchịchị nke Devid ka ala ahụ nwere ọñụ n’ebe eze ya nọ.

Nlekọta na Ọchịchị Zuruòkè nke Chineke

“N’ihi na ọnuma madu gēkele Gi” (Abù Ọma 76:10). Nke a bụ ngosipụta ọzọ otú ike ukwuu nlekọta nke Chineke naesi ewere ọlụ nke ụmụmmadụ, ọ bụ ezie na ọ bụghị dịka uche ya si dị, wee mee ha ngwá ọlụ nke ọlụ Ya. Chineke ejikereghị n’oge a inye ndị Israel eze, ma otú ọ dị Chineke maara na agaenwe otù eze bụ Devid, na kwa site na agbụrụ nke ịchị eze nke Devid ahụ, Jisọs Kraist Onyenwe anyị gaabụ Onye nzọpụta nke ụwa. Asị na ndị Israel jikeere ichere oge nke Chineke, ha gaenwetaworị ọchịchọ obi ha karịa ịdaba n’iwe nke Chineke.

Otù aka ahụ kwa, ụmụmmadụ n’oge nke Jisọs zipụrụ ozi gaa n’àzụ Ọkpara Chineke, sị “Ayi achọgh ka nwoke a buru eze ayi” (Luk 19:14). Ọnụma nke Ndị Juu na ndị Rom duru Jisọs gaa n’elu obe; nke bụ otù ugbò ọzọ kwa ọnụma nke mmadụ toro Chineke n’ihi na n’ụbọchị ahụ, “Isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, banyere nmehie banyekwara ọruru” (Zekaraia 13:1). Lee otú o si bụrụ ihe iru uju nye ndị ahụ ndị náesi otú a alụ ọlụ Chineke! Ha naala n’iyi n’ajọ omume ha; ma ọlụ ha abụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị náánị mmehie ọ bụ ezie na Chineke akwadebewo iji omume ha mezue Okwu Ya. Lee otú o si bụrụ ihe dị ukwuu karịa inye Chineke ọnọdụ mbụ nime obi anyị ka ọlụ niile anyị wee too Ya!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Samuel ji mee ụmụ ya ndịkom Ndị ikpé nke Israel?
  2. Òlee mkpesa nke Ụmụ Israel wetara n’iru Samuel banyere ụmụ ya ndịkom?
  3. Kpọọ ọtụtụ ihe nke mere Ndị Israel ji chọọ inwe eze?
  4. Gịnị bụ omume Samuel mere banyere àtụmààtụ a? Gịnị bụ omume nke Chineke?
  5. Òlee ihe Chineke dụrụ Samuel ọdụ ka o mee?
  6. Israel, hà rubereisi n’olu nke Chineke mgbe Samuel weghachiri ha okwu Ya?
  7. Gịnị mere o ji bụrụ ihe egwù mmadụ ịrụgide Chineke banyere ị ga n’ụzọ nke onwe ya n’agbanyeghị ihe bụ ọchịchọ Chineke?
  8. Ndịokenye Israel hà nwere ọñụ n’ebe eze ha nọ mgbe enyere ha ya?
  9. Òlee eze nke onye Kraist naatụ anya ịhụ n’oge náadịghị anya?