Abù Ọma 50:1-23

Lesson 204 - Senior

Memory Verse
“Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya ka m’gēme ka ọ hu nzọputa Chineke” (Abù Ọma 50:23).
Cross References

I Ịdịukwuu nke Chineke

1. Chineke nwe ụwa niile, Abù Ọma 50:1

2. Iwu Ya naesite na Zaiọn pụta ìhè, Abù Ọma 50:2

3. Chineke bụ ọkụ náerechapụ, Abù Ọma 50:3

4. Anaakpọ ndị nsọ nke Eluigwe na ụwa òkù ịgbáàmà megide Israel, Abù Ọma 50:4-7

II Esemokwu nke Chineke na Ndị Israel

1. Àjà nke achụrụ náánị n’imezu iwu ezughị, Abù Ọma 50:8-13

2. Inye ekele, ikwe mkwà, na ekpere nke sitere n’ezi obi bụ ihe náatọ Chineke ụtọ, Abù Ọma 50:14, 15

III Ikpé nke Ajọomume

1. Amara iru abụọ ikpé, Abù Ọma 50:16, 17

2. Ikpé nke izuori, ịkwàiko na ikwuokwu àzụ mara ndị iru abụọ ahụ, Abù Ọma 50:18-20

3. Ikpé nke emere ka ọ nọọ ọdụ apụtaghị mkwagide nke Chineke, Abù Ọma 50:21, 22

IV Uche nke Chineke

1. Ekele naasọpụrụ Chineke, Abù Ọma 50:23

2. Mkparịta ụkà anyị, maọbụ ịga ijè anyị, aghaghị ịbụ nke ziriezi, Abù Ọma 50:23

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịdị ukwuu nke Chineke

“Chineke Nke Kachasi chi nile, bú JEHOVA, ekwuwo.” Chineke nke ndị Israel adịghị ka chi niile nke ndị mbaọzọ ndị dị ha gburugburu. Ọ bụ Chineke nke ụwa niile, Onye kèrè ihe niile, “Ònye tuworo miri nile n’ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tuputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mgbé, si ugwu nile n’ihe-osisi tùa ugwu ntà nile n’ihe-ọtụtụ?” “Welienu anya-unu elu, hu: ọ bu Onye kere ihe ndia? ọ bu Onye ahu Nke nēme ka usu-ha puta n’ọnu-ọgugu: ha nile n’aha-ha ka Ọ nākpọ; site n’iba-uba nke ike-Ya, na n’ihi na Ọ nwere ume n’ike, ọ digh ihe fọduru anāgugh. … Ì magh? ì nugh? Chineke nke mgbe ebigh-ebi ka JEHOVA, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ digh-ada m̀bà, ike adigh-agwu kwa Ya, ọ digh ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya” (Aisaia 40:12, 26, 28).

Chineke a nke ụwa niile bụ otù Chineke ahụ onye rọpụtaworo Israel ma were kwa Zaiọn mee isi obodo-Ya. “Site na Zaiọn, bú ebe mazuru nma, ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.” Ndị Israel chọtara amara karịa mba niile nke ụwa, site n’inwe Chineke ukuu dịka Chineke ha. Ịdị-ukuu Ya pụtara ìhè n’etiti ha mgbe O nyere ha Iwu ahụ n’Ugwu Sainai. “Ma n’ile ebube JEHOVA anya, ọ di ka ọkụ nērechapu n’elu ugwu ahu n’anya Ụmụ Israel” (Ọpupu 24:17). “Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n’ihi na JEHOVA ridakwasiri ya n’ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile wee ma jijiji nke-uku” (Ọpupu 19:18).

Ọ dị mma ka anyị ghọta na ọ bụ otù Chineke ahụ ka anyị naefè taa. Ka anyị náatụgharị uche n’ihe banyere ma náagbalị inyoba anya n’ihe banyere ịdịukwuu na ike Ya. Na Onye ahụ nke kwuru okwu ụwa wee dị gaaña ntị n’itimkpu anyị ma zá kwa arịrịọ anyị ọbụná ma asị na ọ dị ntà karịsịa, gaemejupụta anyị n’obiumeala na ịhụnanya n’ebe Ọ nọ. O mere ka ịhụnanya ukwuu Ya pụta ìhè n’ihi na O zitere Ọkpara Ya ịnwụ ka anyị wee bụrụ ndị adọpụtara site n’ụzọ niile nke mmehie anyị. Ọ bụ na anyị ejighị Ya ụgwọ otuto ebighịebi na ikele ekele?

Otù Ọgbụgba ndụ N’elu Àjà

Onye dere Abù Ọma na-esepụta onyinyo nke Chineke ukuu ahụ ebe ọ na-akpọ ndị nsọ bi n’Eluigwe na n’ụwa ịgbá àmà ikwupụta ikpé ezi omume Ya megide Israel. “Chikọtaranum ndi-eberem; bú ndi Mu na ha gbara ndu n’elu àjà.” Ndị bụ ndị nsọ Ya n’ezie bụ ndị ahụ nke ha na Ya nwere ọgbụgba ndụ n’elu àjà. Mgbe mmadụ ghọtara ịdị óké ọnụ nke ndụ ebighị ebi, ọ dịghị ọnụ ahịa dị óké elu iji wee zụta ya. Òlee ịchụ àjà nke ga-adị karị ukuu bụ nke ga-eme ka mmadụ laghachị àzụ ma ọ bụrụ na Chineke achọọ ya? Ndè kwuru ndè nke ndi nwụrụ n’ihi okwukwe ha agụghị ndụ ha n’ihe dịkarịrị óké ọnụ nye onwe ha ka ha wee bụrụ ndị kwesịrị n’ụzọ nke ijé ozi Kraist. Ọbara ha ọ gaghị abụ ihe àmà megide ndị ahụ nke jụrụ iche arụ ha dịka àjà dị ndụ nye Chineke na n’ọlụ ya? Chineke chọrọ ka anyị jikere ịrapụ nne, nna, nwanne nwanyị, maọbụ nwanne nwoke, ma tụfue kwa ndụ nke onwe anyị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà, ka anyị wee bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi n’eziokwu nye Onye ahụ nke kpọrọ anyị. Jisọs sịrị, “Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n’azụ, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam” (Matiu 16:24).

Otù nwoke bịakutere Jisọs na-ekwu okwu ndị a: “M’gēso gi Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m buru ụzọ….” Ọzịzá Jisọs nyere bụ, “Ọ digh onye ọ bula nke nēle anya n’azu, mgbe o tinyesiri aka-ya n’ọgù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke” (Luk 9:62). Ụfọdụ jikeere ifè Chineke ma ọ bụrụ na ha gaebu ụzọ mee ihe ndị ahụ ha naachọ. Chineke naakpọ ndị niile gaefè Ya òfùfè ka ha na Ya gbaa ndụ n’elu àjà. Ha aghaghị ijikere inye ihe ahụ nke gaefu ha ihe dịka Devid mgbe ochie onye náachọghị ịchụrụ Chineke àjà nke náefughi ya ihe ọ bụla.

Ikpé ahụ Ámárá Israel

Chineke mere ka o doo Israel anya na ọ bụghị n’ihi na Ya chọrọ àjà ha mere O ji eweta Israel n’ikpé. “Ọburu na agu aguam, M’gagh-agwa gi: n’ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.” Chineke adịghị abara ha mbá n’ihi na ha jụrụ ịchụ àjà nsureọkụ -- ọ bụ ezie na nke ahụ bụ ihe kwesịrị ahụhụ. Ikpé ahụ ámárá ha bụ na ha akwụghachịghị nkwà niile ha ma bụrụ kwa ndị na-enweghị obi ekele n’ebe Chineke nọ.

Onyinye Anyị nye Chineke

N’ụbọchị taa Chineke achọghị ihe onwunwe anyị; Ọ chọghị kwa akụnaụba anyị; Ọ chọghị ehi anyị; ma ọbụ ihe ọ bụla ọzọ n’ihe onwunwe anyị niile nke ndụ a. O, ma lee otú Chineke dị anyị óké mkpà! Ọ naenye anyị ike ikpokọta àkụ niile nke ụwa a; n’ihi nke a, ndabere anyị niile bụ n’ebe Ọ nọ n’ihe ọ bụla anyị naenweta, ma ọ bụ ngọzi niile nke imemụọ ma ọ bụ nke ihe anaahụ anya. Ọ bụrụ na Ọ chọrọ ehi, Ọ pụrụ ịrịdata n’elu puku ugwu niile wee were ha.

“Ya mere” ị na-asị, “ọ bụrụ na Chineke achọghị ihe onwunwem, ogem, na talent nkem, gịnị mere m’ji enye ya ha? Gịnị mere m’naeji obi achụ ọtutu àjà nye Ya?” Ha niile bụ nke Ya. Ọ bụrụ na anyị nwere talent, ike ma ọ bụ ume, o sitere na Chineke. “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru ókè nke enyere enye si n’elu bia, ebe o si n’aka Nna nke ìhè ridata” (Jemes 1:17). Anyị bụ náánị ndi nlekọta nke ihe onwunwe na onyinye niile ahụ nke Chineke nyeworo anyị; obi ekele ọ gaghị arụgide anyị inyeghachị Ya onyinye ndị ahụ site n’iji ha wee lụara Ya ọlụ? N’ezie anyị achọghị ịnụ ka okwu amamikpe ahụ daara anyị. “Tupu-kwa-nu orù a nke nābagh n’ihe n’ọchichiri nke èzi.”

Onye ọ bụla nime anyị ga-akọ akụkọ banyere onwe ya otù ụbọchị n’iru Chineke otú anyị ji were ihe niile enyere anyị, wee jee ozi. N’ụbọchị taa Ozi ọma ahụ ji nwayọ na-aga n’iru. Ị naeketa òkè n’ọlụ ahụ? Ị naenye aka ime ka ibu ahụ dịrị ndị nọ n’iru ọgụ ahụ mfé? Ị na-eji onyinye ndị ahụ, talent ndị ahụ na ihe ndị ahụ Chineke nyere gị jee ozi dịka àtụmàtụ Ya si dị? Ọ bụrụ na ọ bụghị otú a Ozi ọma ahụ gana-aga kwa n’iru; ma eleghị anya otù mkpụrụ obi nke nọ n’aka nri na nke nọ gị n’aka ekpe agaghị anụ ozi nke nzọpụta ahụ n’ihi na ị lụghị ọlụ nke dịrị gị. Ọ dịghị mgbe mkpaà inwe ndị ọlụ dị ukuu karịa otú ọ dị taa; ubi nke owuwe ihe ubi ahụ achawo, ma Chineke naajụ, “Onye ka M’gēziga? Ị nọ n’etiti ndị na-ekwu, “ka m buru uzọ …”? Ọ ga-abụ ihe mbụ ná ndụ-gị. Ọkpụkpọòkù ikpeàzụ maka ndị ọlụ ka náaga n’iru. Záá òkù ahụ taa.

Otù Onye Nnapụta

“Kpọkukwam n’ubọchi nkpagbu; M’gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.” Ọtụtụ mgbe ọ naabụ omume ọjọọ nke mmadụ naeduba ya ná nsogbu. Náagbanyeghị nke a, Chineke kwere mkwà na ọ bụrụ na anyị akpọkue Ya n’ụbọchị nsogbu na Ọ gaanapụta anyị. Obi anyị aghaghị ijupụta n’ekele nye Chineke dị otú a.

Ụdị nke Nsọpụrụ Chineke

N’ebe ndị ahụ nọ nke na-aga n’usoro òfùfè nke omenala -- na-ebu ọgbụgba-ndụ Ya n’ọnụ ha ma na-ekwupụta kwa ụkpụrụ Ya -- Chineke gosipụtara ihe bụ mmehie ha. Ha na onye ori na-ekekọ òkè; eleghị anya ha na-azụ ihe ndị o zutere n’ori. Ikpé nke ịkwá-iko márá ha, bụ mmehie nke ana-anabata n’etiti ụfọdụ okpukpé n’ụbọchị taa. Jọn Baptist ka ebipụrụ isi n’ihi na ọ gwawara Herod n’ụzọ pụtara ìhè na ọ bụ ihe ná ezighị ezi n’iwu iwere nwunye nwanne ya na nwunye. Ikpé nke ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha márá ha. Ha na-ekwu ihe banyere nwanna ha n’ụzọ nkwutọ. Ihe niile ndị a na-aga n’iru, ma ha chèrè na ha pụrụ “igbanarị” Chineke site n’iwetara Ya onyinye náenweghị ezi nchègharị.

Ikpé nke Náabịghị Ọsọọ sọ

“N’ihi na emegh ihe ekpere n’ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n’ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ” (Eklisiastis 8:11). “Ihe ndia ka i meworo, M’we gba nkiti” (Abù Ọma 50:21). Chineke site n’ebere Ya na-enye mmadụ ohere ka ọ bịarue nchègharị; ma ọ bụrụ na ọ na-aga n’iru na-ajụ ichègharị, ikpé aghaghị ịdị. Israel chère na Chineke dị otú ha dị. Ha chère na adịghị achọpụta mmehie ha na Chineke agaghị enye onye na-emebi iwu ahụhụ. Chineke gwara Israel na ikpé ga-abịa, na ha ga-ahụ kwa ya. “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abughi Onye anēleli: n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7). Chineke dọsirị Israel aka ná ntị ike n’ihi òfùfè nke enweghị nleru anya nke ha na-efè na ibi ndụ otú ọ masịrị ha. “Biko, ghọtanu nka, unu ndi na-echèzọ Chineke, ka m’we ghara idọka unu, ọ digh kwa onye nnaputa diri unu.” Na-agbanyeghi ịdọ aka ná ntị a nke siri ike enwekwara ebere nke egosiri; “Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya ka m’gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.”

Ndụ nke Náenweghị Mmehie

Ihe banyere ebere na atọ Chineke ụtọ Ọ naahụ kwa inye-ekele n’anya, kama ọ dịghị ihe gaewere ọnọdụ nke ijé ijè n’izu-òkè. Ọ dịghị ihe aga-eji dochie ndụ nke mmehie na-adịghị. Ọ dịghị onye pụrụ inye Chineke ekele dịka onye ahụ nke asachaworo nime Ọbara nke Nwa atụrụ ahụ onye ndụ ya náenweghị ihe ịta ụta ọ bụla. Ka ndị agbapụtara nke Chineke nye Ya otuto ma náenwe kwa obi ekele n’ihi nzọpụta Ya dị ukwuu.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka ọ pụtara bụ ịgbá-ndụ n’elu àjà?
  2. Chọpụta amaokwu dị iche iche n’Akwụkwọnsọ nke na-akọwa ịdịukwuu nke Chineke.
  3. Gịnị bụ eziokwu dị n’ikpé ahụ nke ámárá Israel?
  4. Òlee mkwà dị icheiche ekwere n’ihi iheọgụgụ a?
  5. Òlee ọnọdụ dị icheiche edebere banyere mkwà ndịa niile?
  6. Òlee ihe okwu a pụtara “nkparita uka” n’amaokwu nke 23?
  7. Òlee otù nime Iwu Iri ahụ nke Chineke sịrị na onye ajọomume ahụ emebiwo?
  8. Gịnị ka Chineke chọrọ ka Israel mee?