I Samuel 9:1-27; 10:1-27

Lesson 205 - Senior

Memory Verse
“Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara; ka Ọ we me ka ihere me ndi mara ihe: ọ bu kwa ihe nādigh ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka Ọ we me ka ihere me ihe di ike” (I Ndi Kọrint 1:27).
Cross References

I Njekuru Sọl Jekuuru Samuel

1. Sol, nwa onye bụ dike nke bụ dimkpà, nwere ụdị arụ ebube, I Samuel 9:1, 2

2. Nna ya zipụrụ ya ịchọta anụ ụlọ furuefu, I Samuel 9:3-5; Emos 7:14, 15

3. Chineke duuru Sọl jekuru Samuel, I Samuel 9:6-17

4. Samuel naasọpụrụ Sọl n’ememe ahụ, I Samuel 9:18-27

5. Sọl naegosipụta obi dị umeala, I Samuel 9:21; 10:22; Ilu 15:33; 22:4; Aisaia 57:15; Jemes 4:6

II Ité Sọl Mmanụ

1. Samuel naeté Sọl mmanụ ma náenye kwa ihe ịrịba àmà atọ, I Samuel 10:1-8

2. Azọpụtara Sọl, I Samuel 10:9-13

3. Arọpụtara ya ịbụ eze site n’ifé nzà, I Samuel 10:14-27

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Sọl, Mmadụ Dị Mma N’ile Anya

Mgbe Chineke rọpụtara Sọl ịbụ onye ọchịchị nke ndị Israel, Ọ rọpụtara nwoke nke ụdị ya dị ebube n’ile ya anya. Ọ bụ nwoke “kwesiri” ma ọ bụ nwoke maramma, onye kachasị mma nke apụrụ ịchọta n’Israel. Ọ bụ nwoke toro ogologo, ma dị kwa garagara, eleghịanya ogologo ya ra ihe dị ka fit asaa, nke mere ka ọ bụrụ nwoke tozuruòkè idú ndị agha ha n’anya ndị Israel. Nna ya, bụ Kish bụ “dike nke bu dimkpa” -- náarụghịụka ọ bụ nwoke nwere akụ na nsọpụrụ n’etiti ndị ahụ.

Ezigara Ya Ijekuru Samuel

Ọ gaadị ka ọ bụ ihe ndapụta na Sọl bịakutere Samuel mgbe ọ naachọ anụ ụlọ furuefu nke nna ya. Ma Chineke gwara Samuel, “dika mgbe a echi M’gēzitere gi otù nwoke sitere n’ala Benjamin.” Chineke sịrị “M’ga-ezite …” Ọtụtụ mgbe ọ naadị ka ọ bụ ihe mberede na mmadụ nụrụ ihe banyere Oziọma ahụ, ma ọ bụghị na mberede -- ọ bụ ntụziaka nke Chineke. Ọ bụrụ na agụụ eziokwu ahụ naagụ mmadụ, Chineke gaeduru ya gafee ala na óké osimiri, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà, ka o wee nụ eziokwu ahụ ma nwere kwa onweya. Sọl chọgharịchara (anụ ụlọ nna ya) n’ala Shalisha, Shalim, Benjamin na Zuf tupu ọ bịakute onye nke Chineke -- maọbụ Chineke kpọtara ya n’ebe ahụ.

Omume Ọma Dị Icheiche

Otù nime omume ọma nke Sọl nwere ná mmalite ndụ ya bụ obi-umeala. Mgbe Samuel tụpụtara arò na ya onwe (Sọl) bụ onye Chineke rọpụtara ịbụ eze nke ndị Israel, Sọl zaghachirị sị “Ọ bugh onye Benjamin ka m’bu, sitere n’ebo Israel nke dikarisiri ntà? Agburum ò pekarisigh mpe n’etiti agburu nile nke ebo Benjamin? N’ihi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?” Ọ bụ obi umeala a mere ka o zobe onweya n’etiti ìgwè mmadụ ahụ mgbe oge ruru ka asọpụrụ ya n’etiti ndị ahụ. Chineke hụrụ obi umeala n’anya ma kpọọ kwa mpako asị.

Otù eze mpako n’otù oge mere omume mpako ya, “Ọ bugh nka bu Babilọn uku a, nke mu onwe wuworo ibu ulo ala-eze, site n’ike nke àkùm, na n’ihi ebube nke ima nmam?” (Daniel 4:30). Mgbe okwu ndị a ka dị n’ọnụ ya Chineke wee weda ya n’ala site n’ịnapụ ya alaeze ya; é ọ bụghị náánị ala-eze ya, kama nghọta ya kwa. O kwesịrị ka mmadụ mata na ọ dịghị ihe o nwere ma ọ bụghị nke Chineke nyere ya ohere ka o nweta. Ọ bụrụ na ị nwere àkụnaụba, “I gēcheta JEHOVA, bú Chineke gi, n’ihi na Ya onwe-ya bu onye nēnye gi ike imeta akù” (Deuteronomi 8:18). “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru ókè nke enyere enye si n’elu bia, ebe o si n’aka Nna nke ìhè ridata” (Jemes 1:17).

Obi umeala

Okwu niile nke Sọl bụ, “Ọ bugh onye Banjamin ka m’bu, sitere n’ebo Israel nke dikarisiri ntà? Agburum ò pekarisigh mpe n’etiti agburu nile nke ebo Benjamin … ?” Mgbe Chineke kpọrọ Gideon, nzaghachị ya bụ, “Biko Onye-nwe-ayi, m’gēji gini zọputa Israel? Le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnwegh ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n’ulo nnam” (Ndi Ikpe 6:15). Chineke naarọpụta ndị dị obi umeala ka O wee gosipụta ike ukwuu Ya.

Mgbe Chineke gwara Moses na Ya gaezigara ya Fero, Moses sịrị, “Ònye ka m’bu, na m’gējekuru Fero, na m’gēme kwa ka Ụmụ Israel si n’Ijipt puta?” (Ọpupu 3:11). “Ònye ka m’bu?” Ònye ka onye ọ bụla nime anyị bụ na Chineke gaegosi anyị ike ukwuu Ya? Ọ bụ náánị nke a: “Ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādigh ike nke uwa ka Chineke rọputara ka O we me ka ihere me ihe di ike; ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādigh, ka O wee me ka ihe nke nādi ghara idi irè; ka anu aru nile, bú madu, we ghara inya isi n’iru Chineke.” Pọl Onye ozi ukwuu ahụ nke enyere ndị Mbaọzọ sịrị, “N’ihi na mu onwem dikarisiri ntà n’etiti ndi ozi, ebe m’nērugh ka akpọm onye-ozi” (I Ndi Kọrint 15:9). Ndị dike nke Chineke bụ ndị dị umeala n’obi. Ọbụná n’etiti ndị náekweghị ekwe anaekwu ya ọtụtụ mgbe na, “Ndi di ike n’ezie bụ ndi dị umeala n’obi.”

Amamihe

Emere ka amamihe nke Sọl nwere pụta ìhè mgbe ụmụ nke Belial kwuru n’ụzọ ịkwáemo, “Onye a, ọ gēsi aña zọputa ayi?” Sọl wee gba nkịtị. Solomon dere, sị, “Ma onye nēgbochi egbugbere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche. Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya, Nedebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n’ahuhu nile” (Ilu 10:19; 21:23). Site n’ọnụ Jemes anyị, mụtara na okpukpé Chineke anyị bụ ihe efu ma ọ bụghị na anyị, kwàrà ire anyị ngá. O juru Pailet anya na Onyenwe anyị, gbara nkịtị mgbe a naekwutọ Ya. Ì gosịrị amamihe gị site n’ikpuchi ọnụ gị?

Ụgwọọlụ Dị Ukwuu

Mgbe onye náejere Sọl ozi tụpụtara ka ha jekuru onye nke Chineke ịjụ ase banyere ụzọ ahụ, Sọl sịrị “Ma le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahụ? N’ihi na achicha alapuwo n’ihe ayi, ọ digh kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n’aka ayi?” Nwokorọbịa ahụ zara sị “Le, achọtawo n’akam otù uzọ n’ụzọ anọ nke shekel ọla-ọcha: m’gēnye kwa ya onye nke Chineke, ka ọ we gosi ayi uzọ ayi.” “Gini ka ayi nwere?” Sọl bịakutere onye nke Chineke náejide arịa nke ihe náadịghị nime ya ịjụta ase maka ụzọ ahụ. Ọ bịara n’ebe kwesịrị ekwesị. Onye nke Chineke gosikwara ụzọ ahụ. Ọ bịara n’aka efu ma were kwa okpueze pụọ. Ọ bịara, dịka onye náazụ atụrụ; ma laa dịka eze. Ee, ọbụná karịa eze! Ọ bịara dịka onye mmehie ma laa dịka nwa Chineke.

Lee ụdị ihe ebube nke a bụ! Anyị naabịakute Chineke dịka ndị mebiriemebi, ná abaghị urù ọ bụla, ná erughị eru; anyị naewere óké ọñụ laa. Anyị naegbu ikpere n’iru Ya dịka onye mmehie, ikpé mara, onye amara ikpé ọnwụ; anyị naanata mgbaghara mmehie nke zuruòkè. Anyị ndị bụrịị ndị orù nke Ekwensu abụrụwo ugbu a ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraist naekekọ ihe. “Lenu aha ihu-n’anya nka bụ nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke?” (I Jọn 3:1).

Onye Ekèrè Ọhụụ

Ọ bụghị ihe isiagụgọ na Sọl nwere onyinye amara pụrụ iche nke nzọpụta. Samuel gwara ya, “Mọ nke JEHOVA gādakwasi gi n’ike, i gēsoro kwa ha bu amuma, i gāgbanwe kwa ghọ nwoke ọzọ” Agwara anyị na “Ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekere ọhu” (2 Ndi Kọrint 5:17), nke bụ ụzọ ọzọ ikwu na “ọ bụ madụ ọzọ” Egosipụtakwara otù ihe ahụ mgbe Jisọs sịrị “Aghagh imu unu ọzọ.”

Mgbe azọpụtara anyị, ọ bụghị náánị naagbaghaara anyị mmehie anyị kama anaagbanwe anyị. Anaalụ ọlụ ebube nke naagbanwe anyị site n’ịbụ ụmụ nke ụwa wee baa n’ịbụ ụmụ Chineke. “Ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.” Anyị bụ ndị nwụrụ n’ebe ajọomume na mmehie dị, náadị ndụ n’ijégharị ná ndụ ọhụụ. Chineke nyere Sọl “obi ọzọ” “Mụọ nke Chineke we dakwasi ya n’ike, o we bu amuma.” Lee ụdị mgbanwe nke a bụ ná ndụ Sọl! N’ezie ọ dịghị onye gaenwe obi abụọ na azọpụtara Sọl. Ndị niile maara ya na mbụ naajụ ná mgbagwoju anya, “Gịnị bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ di kwa n’etiti ndi amuma?” Ojuju anya ndị ahụ nwere dị ukwuu nke mere na ọ ghọrọ ilu maọbụ amamihe n’etiti ha, “Sọl, ọ di kwa n’etiti ndi amuma?”

Ezi Mmalite -- Ọgwụgwụ Dị Njọ

Lee mmalite dị ebube nye nwoke ahụ Chineke rọpụtara ịchị ndị Israel! Ma ọ bụ ihe mwuta na ọ gaghị n’iru ịnọgidesiike n’ụzọ ahụ nke Chineke dubara ya. Ọ bụ ihe ịdọakanántị nye onye ọ bụla taa na ọ bụ ihe di mfé ịnata “nnwaputa nke ọmúmú ọhuụ” wee bụrụ kwa nwa Chineke, ma emesịa ọ bụrụ onye daghachirị àzụ wee laa n’iyi ebighịebi. Sọl n’otù oge maara nnwekọ na ịdịmma nke Chineke, ma oge ruru mgbe mmụọ nke Chineke siri n’ebe ọ nọ pụọ “ma JEHOVA azagh ya” (I Samuel 28:6).

Ìlì nke onye gburu onweya na ọkụalammụọ nke ekwensu wee ghọọ òkè nke nwoke ahụ onye ndị mmadụ jụrụ ajụjụ ihe banyere ya na mbụ sị “Sọl ọ di kwa n’etiti ndi amuma?” Jisọs sịrị, “Ma onye were ntachi obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22). Ọ dịrị onye ahụ mma nke maliteworo n’ụzọ ahụ ka “o lerue anya ka ọ ghara ida.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú i chère na ogologo Sọl ra?
  2. Òlee ebo Israel nke o si na ya pụta?
  3. Òlee otú anyị si mara na Sọl ijekuru Samuel abụghị na mberede?
  4. Òlee omume ntozu ọma ahụ nke Sọl gosipụtara?
  5. Òlee otú anyị, si mara na agbanwere ndụ Sọl?
  6. Nye ihe ịma àtụ site n’Akwụkwọ Nsọ na ọ bụ ihe dị mfé inwe nzọpụta ma emesịa bụrụ onye daghachịrị àzụ wee laa n’iyi ebighịebi.
  7. Òlee mkwà dị icheiche nke Chineke kwere ndị dị umeala n’obi?
  8. Òlee ụzọ Sọl si gosipụta amamihe?
  9. Òlee ihe ego anyị bụ n’otù ụzọ n’ụzọ anọ nke Shekel?
  10. Òlee ihe ịrịbaámá dị icheiche nke Samuel nyere Sọl iji gosi na Chineke nọnyeere ya?