Lesson 206 - Senior
Memory Verse
“JEHOVA nānapu madu ihe, nēme kwa ka aburu ọgaranya: Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu” (I Samuel 2:7).Cross References
I Nguzosike nke Alaeze Sọl na Gilgal
1. Ejighị otù obi nábata Sọl dịka eze na Mizpa, I Samuel 10:26, 27
2. Mmeri ya nke mbụ jikọtara Ndị Israel n’otù ịnọ n’okpuru ya, I Samuel 11:1-11
3. Chineke pụrụ iji ya lụọọlụ na mbụ n’ihi ezi mmụọ nke dị nime ya, I Samuel 1:11-13; 15:17
4. Ijiobi chụgharịa àjà mgbe niile na otuto naeweta ọñụ mgbe ọ bụla, I Samuel 11:14, 15; Abù Ọma 50:14, 15, 23
II Samuel Wepụtara Onwe ya N’iru Israel Ka Ha Kpee Ya Ikpé
1. Chineke mezuru arịrịọ nke Israel rịọrọ maka inwe eze, I Samuel 12:1; 8:4-6, 19-22
2. Samuel kpachara anya nyefee ụmụ ya abụọ ndị náeme ajọomume ka Israel kpee ha ikpé, I Samuel 12:2
3. Agwara Israel ka ha gbaa àmà megide Samuel ma ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ọ bụla o si mejọọ ha, I Samuel 12:3; 2 Timọti 4:6-8
4. Israel gọpụrụ na Samuel emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, I Samuel 12:4, 5; 2 Ndi Kọrint 4:1, 2; Taitọs 1:7-9
III Samuel Wegaara Israel N’ikpé N’iru Chineke
1. Samuel chètaara ha na mbuli elu naesi n’aka Chineke, I Samuel 12:6; Abù Ọma 75:6, 7; Ndi Rom 13:1-7
2. Ngọpụ agọpụrụ Samuel pụtara na Israel ka ikpé márá, I Samuel 12:7
3. O kwupụtasịrị nnapụta niile nke Israel n’oge garaaga, I Samuel 12:8-11
4. Náagbanyeghị nlekọta ọma Chineke, Israel jụrụ Chineke ịbụ Eze ha, náachọ inwe eze dịka mba ndị ọzọ, I Samuel 12:12, 13
IV Ebere na Ikpé Ziriezi
1. Akana emekwara ha ebere náagbanyeghị ọjụjụ ha jụrụ Ya, I Samuel 12:14; Aisaia 9:12, 17, 21; Abù Ọma 103:17; Maika 7:18; Ndi Rom 10:21; 11:32-36; Taitọs 3:5
2. Ụgwọọlụ niile nke ịnọgide ná nnupụisi ha pụtara ìhè, I Samuel 12:15; Ndi Rom 6:23
3. Eziteere ha ihe ịrịbáàmà naegosi iwe Chineke, I Samuel 12:16-18
4. Nchègharị nke Israel wetaara ha agbamume na mkwagide ifè Chineke òfùfè, I Samuel 12:19-25
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEEze Ọhụụ Ahụ N’ịdị umeala n’obi na omume n’ebe Chineke na mmadụ nọ, Sọl, eze ọhụụ ahụ nke ọtụtụ narị puku kwuru puku nke ndị Israel, chigharịrị ịla ụlọ mgbe Samuel onye amụma tesịrị ya mmanu ịbụ eze na mgbe ihe niile ọzọ nke sochirị nke a n’àzụ ngwa ngwa mesịrị. Náenweghị obiabụọ o jupụtara n’ịtụ na anya námgbagwojuanya n’ihi ọtụtụ ihe ndịa nke náeme ngwangwa nime ụbọchị olen’ole garaaga bụ nke ọ hụrụ onwe ya dịka onye akpọpụtara iche site n’etiti ọtụtụ puku ụmụ okorọbịa ndị ọ dị ya n’obi na ha bụ ndị kwesịrị ekwesị karịa ya onwe ya -- ụmụmmadụ ndị nwere onyinye pụrụ iche nke ịchịisi na ịhaziihe nkeọma -- n’ihi na èzínaụlọ ya bụ otù nime ndị dịkarịsịrị ntà n’Israel. Eleghịanya ọ naatụle ihe gaabụ nzọụkwụ ya ọzọ, ebe ọ bụ Chineke rọpụtara ya ugbu a ma bụrụ kwa onye ọtụtụ mmadụ n’Israel nábatara dịka eze ha. Anyị nwere ihe niile ọ bụla iji kwenye na ọ lara n’ụlọ ya ichere maka ọlụ Onyenwe anyị na iwu Ya. Sọl dị ntakịrị n’anya ya onwe ya. O chèrè na ike ya niile ezughị òkè maka mkpebi niile nke chéré ya n’iru na ịchịisi nke ọ náaghaghị ịhụ ihe banyere ya. Chineke pụrụ iji mmadụ ndị nwere ụdị obi na échìchè dị otú ahụ lụọọlụ. Chineke agaghị eji onye ọ bụla onwe ya zuuru, na onye onwe ya juru afọ, maọbụ omenuche nke aka ya lụọọlụ. Ọ dịghị otite mmanụ gaadịrị onye dị otú a. Ọ bụ náánị onye ahụ nke jikeere iwedata onwe ya n’okpuru Chineke na Mmụọ Nsọ, na kwa inyefe uche ya na ọchịchọ ya niile, àtụmààtụ ya na nzube ya niile, ọganiru ya niile na ibu arọ niile nye Chineke na Mmụọ Nsọ, bụ náánị onye gaanata otite mmanụ ahụ nke si n’ebe Chineke nọ bụ nke dị óké mkpà n’ọganiru nke ihe nke imemmụọ. Ịdịn’otù, bụ Otù Ịdịmma nke Kachasị Elu Dị kwa Mkpà Òtù dị ntà nke ndị kwesịrị ntụkwasịobi zárá òkù nke Chineke wee soro Sọl jee n’obodo nke aka ya. Ma ọ dị ụfọdụ ndị nupụrụisi megide ịchịisi nke eze ọhụụ ahụ. Enwere ndịkom jọgburu onweha, ndịkom nke mmehie na ihe efu; ha amaghị kwa ha enweghị kwa mmasị n’ebe uche Chineke dị n’okwu a maọbụ n’ebe ihe ọzọ dị. Ha nwereike dị olenole, n’ọnụọgụgụ, ma ọnụnọ ha pụtara na Israel enweghị ịdị n’otù zuruòkè. Agwara anyị ma ọdịkarịa ntà ugbò abụọ nime Akwụkwọnsọ na “ihe iko achicha di ntà nēko ogbe utú ọka agwọrọ agwọ dum” (I Ndi Kọrint 5:6; Ndi Galetia 5:9). Mmehie ahụ nke anaechè na ọ “dị ntà” gaeweta nkewapụ zuruòkè n’ebe Chineke nọ. “Nkita ọhia nta” nwereike imebi osisi vine nwere ezi ndụ nime ya nke náamị kwa mkpụrụ nkeọma, ma ọ bụrụ na arapụ ha ka ha náatabisi ya náenweghị ihe ọ bụla gbochiri ha. Mmerụ arụ ntà nke dị n’arụ mkpụrụ osisi dị ụtọ pụrụ ime ya ka ọ bụrụ ihe náabaghị kwa urù n’oge áwàà olenaole ma ọ bụrụ na ewepụghị ya. Ma Sọl, n’onwe ya, egosipụtaghị enweghị ntachiobi n’oge a, ka ọ ghara ibutere Chineke ụzọ n’ihe ọ bụla ọ gaeme imegide omume a nke ịjụ Chineke na ya onwe ya nke ndịkom ndị a mere. O wee dere duu. Ọ bụ ezie na Chineke gaemeso ndị ahụ nke náehie ụzọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị nwereike ime iji debe ụzọ ahụ nke O si alụọlụ ka ọ ghara ịdị ihe ọ bụla gaanọchị ya site n’omume nke mmadụ. Chineke hụrụ ndị nke Ya n’anya, ma nwee kwa ike ime ihe ọ bụla O nwereike ime ijikere ha maka Eluigwe ahụ nke Ọ naedozirị ha. N’otù oge ahụ, Chineke gaekwuru ndị Ya ọnụ ha ọbụná mgbe ọ dị ka ike niile nke ọkụalammụọ ọ naebili imegide ha site n’ebubo ụgha dị icheiche. O kwuru nime Okwu Ya sị na ọ bụrụ na, mgbe unu naeme ezi ihe, hụ kwa ahụhụ unu atachi obi na ya, nke a bụ ihe ekele n’ebe Chineke nọ (I Pita 2:19, 20). Eboro Jisọs ebubo ụgha, nụpụkwara Ya isi, ma jụ kwa Ya; ma O weere ntachiobi nara ya. Chineke náenye anyị iwu ka anyị náaga ijé na nzọụkwụ nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị, nke a ka anyị náaghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị gaabụ ndị mnwekọ nke ebube Ya (I Pita 2:21-23; 2 Timọti 2:11, 12). Chineke gaewepụ kwa ihe ọ bụla ná ndụ anyị nke gaegbochi anyị n’ijé ozi anyị nye Ya ma ọ bụrụ na anyị ekwenye n’ụzọ Ya nke anaapụghị igbochi egbochi ná ndụ anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ekwesie olu ike ịga n’ụzọ nke onwe anyị náekwenyere onweanyị iwere mmụọ nke nnụpụisi nke akpachara anya megide Ya dịka oge naaga anyị gaahụ na anyị emechibidowo onweanyị ụzọ wee bụrụ ndị náabụghị kwa nke Ya. Ịdịnotù dị mkpà n’ihe niile ọ bụla nke anyị naeme n’ihi nsọpụrụ na otuto nke Chineke. Chineke dị nsọ. Ma ỊbụIsi nke Chineke bụ ihe nwere ịdị n’otù zuruòkè. O nyewo kwa anyị iwu ka anyị bụrụ kwa ndị dịnsọ ma bata kwa nime ịdịnotù nke náánị Ya pụrụ ime ka ọ dị irè site n’Ọbara idonsọ ahụ nke Nwaatụrụ Chineke (Matiu 5:48; Levitikọs 20:7; Ndi Hibru 2:11; 12:14). Anụ arụ bụ ihe na-akpata nkewa dị iche iche n’etiti ndị nke Chineke; ndị naeme ha maọbụ ndị náekwenyere ha ka ọ naaga n’iru adịghị ejé ijè dịka Chineke chọrọ ka ha náejé, kama ha naejéìjè dịka mmadụ anụarụ (I Ndi Kọrint 1:10; 3:3; 11:17, 18). “Nkita ọhia nile di nta” nke nkewa n’oge naadịghị anya gaeto wee ghọọ ọlụ anụarụ dị icheiche nke naáebibi mkpụrụobi: esemokwu maọbụ adịghị n’otù; nkewa maọbụ okwu nnụpụisi; ịrọòtù maọbụ òzízí ụgha; na ndọrọ ndọrọ (Ndi Galetia 5:19-21). Enweghị ịdị n’otù gaebute ọdịda ụfọdụ n’ebe ụdị ọlụ ọ bụla nke achọrọ ịlụ n’ihi otuto nke Chineke, maọbụ nke imemmụọ maọbụ nke ihe náadị nwa oge. Anyị aghaghị inwe ịdịn’otù nime obi na ná mkpụrụobi ma ọ bụrụ na anyị gaenwe ọga’iru. Ntụpụta nke Samuel nke Sitere na Chineke Ọchịchọ nke onye nke Chineke, bụ Samuel, bụ náánị nime otù nzube, nzọpụta na ịdịmma nke imemmụọ nke Ụmụ Israel. O kpewo ha ikpé ogologo oge, náefè Chineke na kwa ndị ahụ òfùfè n’ikwesị ntụkwasịobi ụbọchị ndụ ya niile. Ọ kpọwo obodo ahụ niile ọ dịkarịa ntà otù ugbò n’oge a ikpé ekpere na nchègharị n’ihi ajọomume ha na ikpere arụsị. Nke a dị ka ọ bụ ihe dịkarịrị mkpà nime ndụ ya -- ka ewee zọpụta Israel. Ọtụtụ ndịọzọ bụ ndị nke Chineke enwewokwa otù ụdị ọhụụ ahụ banyere ndị mmehie n’ụwa niile. N’ezie, ịnụọkụ n’obi dị otú a naadị n’obi nwoke maọbụ nwanyị ọ bụla nke amụrụ ọhụụ n’ezie. Anyị, niile bụ ndị ụkọ n’ọnọdụ Kraist. Anyị niile bụ akwụkwọ ozi dị ndụ nye Ya. Anyị niile bụ ìhè nime ụwa nke gbara ọchịchịrị. Ya mere iji ezi ohere nke ọnọdụ ya n’oge a mee ihe bụ mgbe ndị Israel naabànye n’ibi obi ọhụụ nke obodo ha, Samuel mere ihe ọ bụla o nwereike ime ịdọrọ ha bịakute Chineke. Ma ihe edere n’Akwụkwọnsọ naakọrọ anyị n’ebe o doro anya otú o si nwee ọgan’iru. Ekpere nke onye eziomume naalụsi ọlụ ike. Arịrịọ nke ndị hụwororị ụwa nke ndị mmehie ebe ha naemikpu nime ọkụalammụọ alụpụtawo ihe karịrị nzọpụta nke otù onyemmehie, ọ bụ ezie na onye ahụ naarịọ arịrịọ amaghị ndị ahụ ọ naekpere ekpere. Samuel kwesịrị ntụkwasịobi n’ijéozi ya nye Israel. Samuel debere onwe ya n’ọnọdụ dị ike, n’ikwuokwu n’ezi ntụpụta, site n’imeghere ndị ya obi ya na inye ha ohere nke ibo ya ebubo n’ebe ọ naemeghị nkeọma maọbụ ịgwá ya otù oge nke o mejọrọ ha n’ụzọ ọ bụla. Ha gbara àmà na ọ bụ onye ikpé náamaghị. Ọ bụ ihe amaara nkeọma na Chineke anọghị n’etiti ndị Israel na mgbe ahụ, dịka ọ dị na mgbe garaaga. Igbé ọgbụgbandụ adịghị kwa n’Ụlọ ukwuu Chineke ahụ. Shekina ahụ adịghị kwa n’Ebe Nsọ kachasi Ebe Nsọ niile ahụ. Ọ ghaghị ịdị, ma eleghịanya, otù nwoke n’etiti ha onye ka dị ndụ, onye aha ya bụ Ikabod, akpọrọ ya aha ahụ n’ihi na ebube Chineke esiwo n’Israel pụọ n’oge amụrụ ya. Gịnị bụ nsogbu ahụ? Gịnị mere Chineke anọghị kwa n’ebe ahụ? Ọ bụ n’ihi agazighị agazi nke onye ọchịchị imemmụọ ha? Nzaghachị nke ndị Israel zaghachịrị Samuel mere ka ịtá ụta ahụ dị n’ebe o kwesịrị ịdị. Ọ dịghị ikpé ihe ọjọọ ọ bụla mara Samuel n’ebe ha nọ. O fèwo Chineke òfùfè n’ikwesị ntụkwasịobi, ọ dịghị mgbe ọ naara ha ihe ọ bụla n’ụzọ n’ekwesịghị ekwesị site n’ike nke ọnọdụ ya, maọbụ nara ha ihe n’ụzọ n’ezighịezi. O kpewo ikpé eziomume ma gbalịa kwa ịdọrọ ndị obodo ahụ nye Chineke. Agazighị agazi ahụ sitere n’aka ha. Site ná mkwenye a siri ike nke ndị Israel kwenyere dịka ntọ ala ebe ọ gagbakwasị ụkwụ ịtá ha ụta, ọ malitere igosi ha otú Chineke si rọpụtara ha ihe n’ụzọ dị ebube n’oge garaaga; na Ọ napụtara ha n’aka ndị Ijipt, na n’aka ndị Midia, na n’aka ụmụ Amon, na kwa n’aka ndị Filistia. N’oge a Chineke abụworị Eze ha. N’ebe a Samuel gakwara n’iru igosi Ụmụ Israel omume ọjọọ ha n’ịjụ Chineke dịka eze ha ma náarịọ kwa ka enye ha eze dịka mba ndị ọzọ gbara ha gburugburu kama Chineke. Ma ugbu a, ọ dịghị kwa ụzọ ha nwere iji dozie omume nzuzu ha maọbụ gbanwee nrọrọ nke onwe ha. Emewo mkpebi ahụ; etewo kwa eze ha mmanụ. Ha achọwo eze ahụ ma ugbu a ha gaje ịta ahụhụ nke dị nime ya.
Ihe ahụ Achọrọ
N’iheọmụmụ a dị icheiche anyị gaahụ ihe niile achọrọ ná nsọpụrụ Chineke nke dị mkpà ma ọ bụrụ na anyị gaabụ ndị Chineke gaeji lụọọlụ n’ihi nsọpụrụ na otuto Ya, “Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ bu kwa gini ka JEHOVA nāchọ n’aka-gi, ma-ọbugh náni ime ihe ekpere n’ikpe, na ihu ebere n’anya, na iji obi ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?” (Maika 6:8). Sọl nwere omume ọma ndịa n’otù mgbe nime ndụ ya. Samuel onye nke Chineke ahụ nwekwara ha n’oge ndụ ya niile. Ndị Israel ñụrịrị ọñụ nime ha ọtụtụ mgbe, ma n’akụkụ nke kachasị ukwuu n’akụkọ banyere ndụ ha, ha nọ n’ebe dị anya n’ịbụ ihe Chineke chọrọ ka ha bụrụ.
N’amaokwu dị icheiche nke mmechi iheọmụmụ anyị, anyị gụrụ ihe banyere nchịkọta nke ihe niile ahụ achọrọ na kwa ihe ndị dị mkpà banyere òfùfè nke Chineke, nke Samuel nyere ndị ahụ. Site n’iso mkwà nke o kwere ikwesị ntụkwasịobi n’ebe Chineke nọ n’ihi ha, n’ikpere ha ekpere, na ikuzirị ha “ezi uzọ ahu di mma” o nyere ha agbamume nke dị okpukpu atọ: Nke mbụ, ọ bụrụ na ha gaeme ihe tọrọ Chineke ụtọ ma bụrụ kwa ndị Ọ gọzirị, ha aghaghị “itu egwù JEHOVA, ma fèe kwa Ya òfùfè n’ezi okwu” site n’obi ha niile. Nke abụọ, ha aghaghị “ichèta ihe uku di iche iche” nke Chineke meere ha na ndị bụ nna nna ha, site n’ime ka ngọzi ukwuu nke Ọgbụgbandụ Ebighịebi ahụ dị irè bụ nke nyere ha olileanya ebighịebi nke nzọpụta ha na kwa Ala ahụ Ekwere ná Mkwà na ngọzi ya niile. Nke atọ, adọkwara ha akanántị na ọ bụrụ na ha esoghị Chineke a gaekpochapụ ha, ma ha ma eze ha
N’ebe a n’ahịrị olenole a anyị nwere okwu dị nkenke nke náakụzi ihe niile Oziọma chọrọ na ihe gaabụ omume anyị n’ebe ozi ya na ọkpụkpọòkù ya dị. Anyị aghaghị ifè Chineke nime mmụọ na n’eziokwu (Jọn 4:24). Anyị aghaghị ikwesị ntụkwasịobi n’inye Ya otuto n’ihi mmeso ọma Ya n’ebe anyị nọ n’ihe nke imemmụọ na ihe nke anaahụ anya (Abù Ọma 103:2; Ndi Galetia 6:15). Enyekwara anyị ndụmọdụ na ọ bụrụ na anyị elefuru òfùfè nke Chineke anya, anyị gaahụ ahụhụ n’ihi enweghị nleruanya maọbụ omume ọjọọ nke akpachara anya mee (Ndi Hibru 2:1-4).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Ndị Israel niile hà nabatara Sọl dịka eze ha mgbe etere ya mmanụ?
- Òlee mkpà ịdị n’otù dị n’ijéozi anyị nye Chineke na òfùfè anyị n’ebe Ọ nọ?
- Tụgharịa uche n’amaokwu ndịa nke sitere n’Akwụkwọnsọ: Emos 3:3; I Ndi Kọrint 14:32, 33, 40; Ndi Efesọs 4:3, 13.
- Gịnị ka Chineke naemere anyị mgbe anyị ji obi anyị chụgharịa àjà ma chụkwara Ya àjà nke otuto?
- Gịnị bụ ihe ọjọọ dị n’arịrịọ ndị Israel rịọrọ banyere inwe eze?
- Ọ dị ikpé ihe ọjọọ nke márá Samuel maọbụ nlefuanya n’ijéozi ya n’ebe Israel nọ?
- Chọpụtasịa amaokwu niile nke Akwụkwọnsọ ebe ị gaachọta ihe banyere ebere.
- Ndị Israel hà chègharịrị ná mmehie ha?
- Gịnị bụ omume Samuel mesoro ha n’ikpeàzụ, dịka egosipụtara n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ a?
- Òlee otú Chineke si gosipụta na Ọ kwadoro ikpé ahụ nke Samuel kpere Israel?