I Samuel 13:5-14; 15:1-35

Lesson 207 - Senior

Memory Verse
“Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ JEHOVA utọ dika ige nti olu JEHOVA? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iña nti di nma kari abuba ebulu” (I Samuel 15:22).
Cross References

I Otù Oge nke Óké Nsogbu

1. Ndị Filistia weere ìgwè ndị agha ịgwọtaọchụ bịa imegide Israel, I Samuel 13:3-5; Jenesis 34:30; Ọpupu 5:21

2. Ndị Israel enweghị iheagha niile zuruòkè maka ibu agha, nke a mere ka obi daa ha mbà nke ukwuu, I Samuel 13:6-8, 19-22; Ọpupu 14:10-12

II Otù Àjà Ejiri Obi Nganga Chụọ na Iwe Nke Chineke

1. Sọl jiri obi nchekasị na enweghị ntachiobi náechere Samuel ụbọchị asaa, I Samuel 13:18; Ndi Rom 5:3, 4; Jemes 1:4

2. Sọl site náenweghị ezi uche nyere iwu ka a chụọàjà nsure ọkụ, I Samuel 13:9, 10; Ọnu-ọgugu 16:1, 3, 40; 2 Ihe Emere 26:16-20; Ndi Hibru 5:1

3. Samuel bịaruru n’ebe ahụ agaje ime ihe n’oge ahụ ekwere ná mkwà, jụọ kwa Sọl ajụjụ banyere omume ya niile nke o mere, I Samuel 13:10-12; Jenesis 3:13; 4:10; Joshua 7:19

4. Sọl kwenyeere Samuel na ya enupuworo akọnauche ya isi; I Samuel 13:12; Abù Ọma 50:16-21; Ndi Rom 1:32

5. Samuel gwara Sọl na ekewapụwo alaeze ahụ n’aka ya, nye kwa ya onye ọzọ, I Samuel 13:13, 14; 30; 15:28; Abù Ọma 78:70; Ọlu Ndi-ozi 13:21-23

III Mkpụrụ Dị Icheiche nke Uche Ajụrụajụ

1. Jehova gwara Sọl ka o bibie ihe niile náekuume ndụ nke ndị Amalek, nke ọ náemeghị, I Samuel 15:1-9; Jeremaia 22:21; Taitọs 3:3

2. Chineke kpugheere Samuel na Sọl edebeghị ihe O nyere n’iwu, I Samuel 15:10-13; Ọlu Ndi-ozi 5:3; 2 Samuel 12:7-9

3. Ajụrụ ya ajụjụ banyere nnupuisi ya ma Sọl jụrụ ikwenye ịbụ onye ikpé márá, ma náanọgide náenweghị nchègharị, I Samuel 15:14-21; Jenesis 3:12; 4:9; Jọn 8:44

4. Samuel gwara Sọl na “ige nti di nma kari ichu-àjà”, na n’ihi na ọ jụrụ okwu Jehova na ajụwo kwa ya, I Samuel 15:22-29; Ndi Rom 1:28; Jeremaia 6:30; Aisaia 1:22

5. Samuel gburu Egag, ma si kwa n’ebe Sọl nọ wezuga onweya náahụkwaghị ya anya ọzọ, I Samuel 15:30-35

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Obi Ndị Náatụ Egwù

Sọl achịwo dịka eze náánị arọ abụọ mgbe Jonathan, nwa ya nwoke, tigburu ọmụma ụlọikwu nke ndị Filistia, ma site kwa n’ụzọ a gbochie ngwangwa ibu agha nke ndị Filistia megide ndị Israel n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ bụ ezie na ndị Israel n’enweghị ngwàagha, karịa anyụ ike na mbazu igwè ha dị icheiche, Sọl fụrụ opi ike wee kpọkọta ndịkom niile nke Israel maka agha nke náabịa. Ọbụná otú a, Sọl wee hụ onweya dịka onye ji náánị narị ndịkom isii bụ ndị dị ya nso náechè ọtụtụ puku nke ndị Filistia iru.

Áwà nke Mkpebi

Oge ahụhụ naabụkarị oge mnwapụta nke omume ọma mmadụ ma ụdị nsogbu a nwara omume Sọl rue ná nsọtụ. Ọ bụ ọchịagha náenweghị ọtụtụ ndị agha n’okpuru ya, bụrụ kwa onye ọtụtụ nsogbu chéré iru bụ nke náegosipụta na mbibi nke anaapụghị kwa ịgbanarị naabịa ngwangwa. Ihe chéré ya iru bụ oge náadịghị anya na ọ gaadịrị ndị Filistia mfé ibuso ya agha n’ụzọ nke anaapụghị iguzogide, Sọl hụrụ na ọnọdụ a chọrọ ihe gaenye aka agaeme wee gbochie ya ma ọ bụghị otú a agaetufu ihe ahụ ebu n’uche.

Sọl náenweghị obi abụọ ghọtara mkpà ọ dị bụ inyeaka nke sitere na Chineke, ma Samuel, bụ onye amụma nke Chineke, anọghị n’ebe ahụ. Tupu nke a Samuel agwaworị Sọl ihe banyere ụbọchị a, gwa kwa ya ka o cheré ụbọchị asaa. Samuel kwekwara Sọl mkwà na ya gaabịa mgbe ahụ, wee chụọàjà dị icheiche na àjà nsureọkụ n’ịrịọ Chineke arịrịọ ka Chineke wee nyere ha aka, mgbe ahụ ka agaagwa Sọl ihe ọ gaeme. Ma Samuel ákàabịarughi! Ụbọchị nke asaa ahụ eruwo, ma onye amụma ahụ anọghị n’ebe ahụ.

Omume nke Amamihe Náadịghị

Site n’ijupụta n’obi ọlụlọ mmiri naenweghị ntachị obi n’ihi na Samuel abịarughị n’oge dịka mkwà ya si dị, Sọl kpebiri n’onwe ya ihe ọ gaeme wee pụọ ná nsogbu ya niile. O wee nye iwu ka ewetara ya àjà nsureọkụ dị icheiche, o wee chụọ ha iji rịọ Chineke arịrịọ.

Sọl nwere amamihe zuruezu banyere ike nke Chineke nke mere o ji tụọ egwù ịga n’iru agha náenweghị inye aka Chineke n’akụkụ ya. Ma otú ọ dị, omume nganga ahụ nke Sọl mere n’ịchụàjà dị icheiche mgbe Samuel náanọghị ya, bụ onye ahụ nke Chineke rọpụtara n’ihi ụdị ọlụ dị otú a, bụ omume nke dị óké ngwangwa bụrụkwa ihe dị ọjọọ ime. Tinyere nke a, ọ bụ kwa ihe nleli nye ịdịnsọ na ịdịukwuu nke Chineke, nke Chineke agaghị elefuru anya.

Ijéozi nke onyinye na ịchụàjà dị icheiche bụ ọlụ nke dịrị náánị ndị ahụ arọpụtara ịlụ ya, ma ndị ọ bụla ọzọ nke nwara ịlụ ya dabara na amamikpé nke ọnwụ pụrụ iche, nke mmezu ya naesonye náetufughị oge, (Lee Ọnu-ọgugu 18:7; Levitikọs 17:3-9). Agba Ọhụụ naekwu kwa ihe banyere okwu a: “n’ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, ebe esi n’etiti madu weputa ya, ọ bu n’ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n’ihe diri Chineke ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n’ihi nmehie n’iru Chineke” (Ndi Hibru 5:1).

Tutu oge Sọl, enwere ndị náeme nke a nye ná mbibi nke ha onwe ha. Kora, Datan, na Abairam kwosara Moses ekworo, wee nwaa kwa ịjụ ya ajụjụ banyere ike ahụ nke Chineke nyere ya ijéozi nke òfùfè Chineke. Chineke gosipụtara Moses dịka onye Ọ rọpụtara site n’imeghe ala wee lomie kwa ndị ahụ ná ndụ bụ ndị náebo ya ebubo. Ọkụ sitekwara n’ebe Chineke nọ wee ripịa ndị isi nke ndị Israel ndị ọnụọgụgụ ha dị narị abụọ na iriise (250), n’ihi na ha nwere ọmiko n’arụ ndị ahụ. Otú a ka ihe Sọl mere si dị ọjọọ (Lee Ọnu-ọgugu 16:1-50 maọbụ Iheọmụmụ nke 105).

Akọnauche E nupụụrụ isi

Ọ dịghị anya Sọl chụsịrị àjà nsureọkụ ahụ Samuel ewee bịa jụọ kwa Sọl ajụjụ ka ọ kọwaa ihe banyere omume niile o mere. Nzaghachị nke Sọl bụ mkwupụta nke akọnauche nwere amamikpé “M’we jisie onwem ike, we sure àjà-nsure-ọku ahu.”

Sọl échègharịghị site n’omume a nke enweghị nsọpụrụ, n’agbaghị agụgọ, nke a bụ ebe mmalite na nnupuisi n’ebe iwu Chineke dị n’oge niile. Samuel jiri maka enweghị nchègharị nke dị nime Sọl, gwa ya na o mewo ihe nzuzu, na alaeze ya agaghị eguzosi kwa ike, ma Chineke gaachọpụta kwa onye ọzọ ịbụ onyendú nke ndịYa onye gaje ịdị ka obiYa si chọọ (I Samuel 13:13, 14).

Ka ha ra bụ mmasị niile nke Sọl nwere n’oge garaaga ifè Chineke nime mmụọ na n’eziokwu, dị ka ha esiwo n’ebe ọ nọ pụọ n’oge mkpebi a. Ọchịchọ mmehie wee ghọọ ihe mbụ n’obi ya, o wee malite kwa ibi ndụ dịka onye nganga, onye na-achọ ka okwu bie náánị n’olu ya, onye na-eme ihe dị ya mma náéchèghị uche, naonye náenweghị kwa nsọpụrụ n’ebe ihe nke Chineke dị. Ọdịniru gbara ọchịchịrị naechère onye ọ bụla nke gaekwe ka ụdị ụma ọjọọ ndịa gbebata n’obi ya ịchị ya ná ndụ ya niile; Sọl wee malite kwa ibi ndụ mmehie na nke nnupuisi karịsịa.

Nnupu-isi nke Náaga N’iru

Okwu Jehova wee rue Sọl ntị na ọ gaje ibibi ihe niile náeku ume ndụ nke ndị Amalek ma mmadụ na anụmanụ -- náemereghị ihe ọ bụla ebere. Sọl chịkọtara ndịagha ya busoo kwa Ndị Amalek agha, tigbue ndị ahụ niile ma ewezuga eze ahụ, tigbue kwa anụ niile ma rapụ kwa ndị ahụ kachasị mma.

Jehova wee kpugheere Samuel nnupuisi nke Sọl, sị kwa ya, “Echeghariwom na emewom Sọl eze: n’ihi na o siwo n’isom n’àzú laghachi ma o megh ka okwum guzosie ike” (I Samuel 15:11). Mgbe o zutere Samuel, Sọl sịrị na ya emewo ihe niile dịka okwu ọnụ Chineke si dị.

Omume nnupuisi nke abụọ nke Sọl mere bụ ihe akpachapụrụ anya mee, ma bụrụ kwa ihe emere dịka apụrụ ịhụ ya náenweghị mmetuta n’ebe ịdịmma maọbụ ịdị njọ ya dị.

Sọl etufughị oge n’ịta ndị ya ụta banyere mmebiiwu ọ bụla nke emebiworo, ọ dịghị kwa ihe ọ bụla o nwere ikwu ma ọ bụghị inwe ihengọpụ dị icheiche nke iji gụọ onweya n’onye eziomume n’ebe nnupuisi ya nọ.

Nzaghachị nke Samuel nye ngọpụ dị icheiche nke Sọl bụ ọzịzá nke Chineke n’onweYa nye ụdị okwu niile dị otú a nke ịnọgide ná nnupụisi na ịkpacharaanya wee nupụisi: “Nmehie nke iju-ase n’aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa.” Chineke gakwaara n’iru ịgwa Sọl site n’ọnụ onye amụma bụ Samuel, “N’ihi na i juwo okwu JEHOVA, O juwo kwa gi ka i ghara ibu eze” (I Samuel 15:23).

Ọlụ Ekwesịrị Ịlụrụ Chineke

Ịnọgide náenweghị nrubeisi nke Sọl n’ebe okwu Chineke dị, bụ ihe naegosi na mmehie dị n’obi Sọl dị ka ọnyá náabawanye n’arụ mmadụ. Omume ndị a nwereike ịdị ka ihe náadịghị ukwuu ma ihe ha naalụpụta dị ukwuu. “Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n’ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n’óké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n’ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n’óké ihe” (Luk 16:10). Otú a ka ọ dịrị Sọl; Ọ pụghị ịhụ mkpà dị n’ikwesị ntụkwasịobi n’ihe ndị dịkarịsịrị ntà n’aghọtaghị na ọ bụ ọtụtụ ihe dịkarịsịrị ntà nke anaapụghị ịgụta ọnụ mejupụtara ihe ndị ahụ dị ukwuu.

Ndị nchọpụta (scientists) nke oge a anwapụtawo na ọbụná ihe ndị dị ukwu n’ile ha anya bụ ihe eji ọtụtụ ihe dịkarịrị ntà nke anaapụghị ịgụta ọnụ (atoms) mee. Ihe niile ekèrè éké nke ụwa ka ndị nchọpụta a (scientists) naakọwa na eji ụmụ irighiri ihe nke naadịghị mfé ịghọta wee mee, nke ọ bụla nime ha ka edoziri n’akụkụ na dịka n’ọnọdụ nke ya si dị. Ọ bụrụ na ihe ukwuu ndị a nke Chineke kèrè naerubeisi nye àtụmààtụ nke Onye òkìkè ahụ kèrè ha n’ụdị O mere ha, n’ezie ụmụmmadụ bụ ndị ekèrè n’oyiyi Chineke aghaghị irubeisi n’iwu nke Chineke ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịnata iruọma nke Chineke.

N’ụsụ ndịagha nke Naijirịa enwere iwu nke náachị ndị ahụ nke mere na ha aghaghi ibu ụzọ mụta irubeisi n’iwu, tupu ha enwee ike inye ndị ọzọ iwu ahụ. Nke a bụ náánị ụzọ apụrụ isi kwue ihe ahụ nke Samuel jiri mkwuwaokwu gwa Sọl, “Ige nti di nma kari ichu àjà, iña nti di nma karị abuba ebulu” (I Samuel 15:22).

Ọ dịghị ọnọdụ dịrị ndị nnupuisi n’alaeze Chineke. Sọl gosipụtara onwe ya dịka onye nnupuisi, ma ihe nke a lụpụtara bụ na Samuel dọwara ọnụ ọnụ uwe nwụda ya iji gosi otú Chineke gaesi dọwapụ alaeze ahụ n’aka ya. Chineke nyere Devid alaeze ahụ bụ nwoke dị dịka obi Ya si chọọ. Devid sọpụụrụ okwu ọnụ nke Chineke na ihe niile O nyere n’iwu, rube kwa isi na ha, ọ bụ ezie na o furu ya iji onwe ya chụọàjà nke dị ukwuu.

Ọtụtụ ndị mmadụ apụghị ịbà n’alaeze Chineke n’ihi ịnọgide ná nnupụisi n’okwu nke Chineke n’ihe ndị ha chèrè na ha dị ntà nke náenweghị ike ịlụpụta ihe ọ bụla. Chineke adịghị ekwuokwu efu. Ihe Ọ naekwu bụ ihe anaapụghị ịgụkọ ọnụahịa ya, n’ihi ihe mgbakwasị ụkwụ ahụ dị mfé na Ya onweya bụ Chineke nke pụrụ ime ihe niile na ọ dịghị kwa chi ọzọ dị ma ewezuga Ya. Ya mere, mmadụ iwere akụkụ ọ bụla nke ihe Chineke kwuru maọbụ ihe O kpughere n’ihe náadịghị mkpà bụ ime ka ihe niile Chineke kwuru maọbụ ihe nke O mere dị ala.

Ụwa jupụtara n’okpukpé na ịhụ amamihe n’anya, na àtụmààtụ dị icheiche nke ụmụmmadụ ndị náewere akụkụ ụfọdụ na Baịbụl dịka ihe mgbakwasị ụkwụ ha iji kwagide na ihe ha naekwu bụ eziokwu. Ha naewezuga okwu Chineke ndị ọzọ fọdụrụ n’akụkụ dịka ihe náabaghị ezi urù; maọbụ ha asị na ọ bụ ihe dịrị ndị mgbe ochie bụrụ kwa ihe náabaghị urù nye ụmụmmadụ n’oge dị ugbu a. N’ebe ndị dị otú a nọ Chineke ekwuwo sị: “Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n’akwukwọ a: Ọ buru kwa na onye ọ bụla gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amụma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n’osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n’obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n’akwukwọ a” (Nkpụghe 22:18, 19). (Lee kwa anya na Deuteronomi 4:1, 2).

Sọl wepụrụ ihe n’okwu Jehova, Chineke wee wepụ aha ya site n’Akwụkwọ nke Ndụ, ma were alaeze ahụ nye onye ọzọ. Enweghị nchègharị n’obi ya wetara ụbọchị owuweiheubi nke ya -- owuweiheubi nke iruuju -- ma, n’ikpeàzụ, ọnwụ nke onye gburu onwe ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. N’ụzọ dị añaa ka Sọl ji nnupụisi n’iwu nke Chineke na mbụ?
  2. Ònye kwesịrị ịbụ onye gaachụwori àjànsure ọkụ nye Chineke?
  3. Gịnị bụ omume nnupụisi nke abụọ nke Sọl mere?
  4. Òlee otú Samuel si mara ihe banyere omume nnupụisi a?
  5. Gịnị bụ ihe ngọpụ dị icheiche nke Sọl nyere maka nnupụisi ya?
  6. Gịnị ka Chineke kwuru banyere nke a?
  7. Gịnị gaeme ndị niile naenupụrụ Chineke isi?