Jọn 1:1-14

Lesson 208 - Senior

Memory Verse
“Ma mọ ọ bula nke nādigh-ekwuputa na Jisus (Kraist abiawo n’anu-aru), o sigh na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahụ nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n’oge di ugbu a ka ọ nọ n’uwa” (I Jọn 4:3).
Cross References

I Kraist Ahụ Nke Burị Ụzọ Dịrị Na Mbụ

1. Jisọs, Ya na Chineke ra bụrụ kwa otù nime Atọ nime otù ahụ, bụ Ọkpara Chineke ebighịebi ahụ, Jọn 1:1, 2, 15; 8:58; 17:5, 11, 21, 24; Aisaia 9:6; Nkpughe 22:13; I Jọn 1:1, 2

2. Jisọs, n’ịdị n’otù zuruòkè nke ịlụọlụ na kwa nke nzube n’ebe Chineke Nna na Mmụọ Nsọ nọ, kèrè ụwa, Jọn 1:3, 10; Ndi Kọlọsi 1:15-17; Ndi Hibru 1:3; I Ndi Kọrint 8:6; Ndi Efesọs 3:9

3. Ọlụ Ya kasị mkpà bụ iwetara mmadụ niile ndụ ebighịebi, Jọn 1:4, 5; 10:10; 11:25; 14:6; Ndi Rom 5; 21; 2 Timọti 1:10; I Jọn 1:6; 5:12

II Jisọs Kraist, Ìhè nke Ụwa

1. Jọn Onyeọwụmmiri ka ezitere dịka onye náedoziri Kraist ụzọ, ikwusa ọbịbịa nke Mesaia ahụ, Jọn 1:6-8, 15,19-34; Aịsaia 40:3; Malakai 3:1; Matiu 3:1-17; 11:10

2. Jisọs bụ Ìhè nke ụwa, Jọn 1:9; 8:12; Aisaia 9:2; 42:6; Matiu 4:16; Luk 1:79; Ndi Efesọs 5:14; I Jọn 1:7; 2:8; Nkpughe 21:23

3. Jisọs bịara ịnapụta ndị mmehie ma Ndị Juu na Ndị Mbaọzọ jụrụ Ya otù aka ahụ, Jọn 1:10, 11; 12:48; Matiu 1:21-23; Abù Ọma 2:2-4; Ọlu Ndi-ozi 4:27

4. Ọnọdụ ahụ dị ebube nke ịbụ ụmụ Chineke ka agbasara nye mmadụ niile ndị ga-anara Jisọs dịka Kraist ahụ, Jọn 1:12, 13, 16, 17; Ndi Rom 8:14; Ndi Galetia 4:7; Ndi Filipai 2:15; I Jọn 3:1

5. Jisọs bụ Okwu Chineke ghọrọ anụarụ, Jọn 1:14, 18; I Timọti 3:16; I Jọn 5:7; Nkpughe 19:13

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

“Ònye bụ Jisọs?”

Ọtụtụ ajụjụ yiri nke ahụ edepụtara nkeọma na isiokwu mkwagide anyị ka ajụworo ọtụtụ ugbò na puku arọ abụọ garaaga Jisọs jụkwara ndịnáesoụzọ Ya, “Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu?” Ajụjụ a bụ nke dị mkpà ịtụle n’ihi na ọnọdụ anyị ebighịebi ka apụrụ ịmara site n’ọzịzá anyị nyere.

Akwụkwọnsọ emewo ka ọ pụtara anyị ìhè na Onyenwe anyị Jisọs Kraist abụghị onye amụma efù, onyeozi náasọpụrụ Chineke, maọbụ otù onye nke nwere onyinye nke ike ịlụọlụ ebube dị icheiche. O kwuwo ọtụtụ ugbò na Ọ bụ Ọkpara Chineke na Ọ nọworị mgbe niile náabụ Ọkpara Chineke. O nweghị mmalite Ya n’oge ahụ mgbe amụrụ Ya na Betlehem. Ọ malitere ịdịadị Ya dịka Nwa nke mmadụ na Betlehem, ma Ọ nọworị dịka Ọkpara Chineke site “na mbu.”

Ya mere amaara Onyenwe anyị Jisọs Kraist dịka Chineke Ọkpara. Ya na Chineke Nna na Chineke Mmụọ Nsọ nọrị tutu ekèè ụwa. O so nime otù Chineke ebighịebi ahụ, ra kwa nrata náenwe kwa ịdịn’otù zuruòkè n’ebe Chineke Nna na Chineke Mmụọ Nsọ nọ. Ịdịmma na omume niile ahụ nke dị nime Chineke Nna na Chineke Mmụọ Nsọ ka ahụrụ nime Jisọs Kraist, Ọkpara Chineke, na otù ụdị omume ahụ na-enweghị nsọtụ na ịdị ukuu dịka ana-ahụ ha nime ndị ọzọ a nke otù Chineke ebighịebi ahụ; n’ihi na Baịbụl naakọwa, banyere Kraist, na “nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu” (Ndi Kọlọsi 2:9).

Ọtụtụ ituaha, na nkọwa niile banyere Kraist dị nime Okwu Chineke. Ma ha niile daraada n’ịkọwa n’ozuzuòkè omume ahụ náenweghị nsọtụ nke dịkwa ebighịebi nke Onye ahụ “Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n’udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gugh ya n’ihe Ọ gējidesi ike, bú ira ka Chineke, kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka ọdi ka madu n’oyiyi, Ọ weda-kwa-ra Onwe-ya, we buru Onye nāña nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.” Mmụọ Nsọ ahụ gakwara n’iru kwue banyere Kraist, n’ihe banyere okwu ya, wee sị, “N’ihi nke a Chineke weli-kwa-ra Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahụ nke kariri aha nile ọ bula elu; ka ọ gābu n’aha Jisus ka ikpèrè nile we gbue n’ala, … ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Krist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke bú Nna, otuto” (Ndi Filipai 2:6-11).

Jisọs bụ Ọkpara Chineke! Jisọs bụ Kraist ahụ -- Onye ahụ Étéré mmanụ, Mesaia ahụ! Jisọs bụ olileanya nke onye ọ bụla nke náachọsiike ka emee ka ọ dị nsọ, ka ọ bụrụ onye eziomume, na onye Nna ahụ gaanara n’ihi na Ọ bụ onye náekwu ọnụ anyị, Onye náanọchị anya anyị, Mkpụrụ mbụ ahụ nke Mbiliten’ọnwụ anyị, na Eze anyị nke náabịa!

“Ginị Ka M’ga-eji Jisọs mee?”

N’oge a nime arọ échìchè anyị naagaghachi nnọọ àzụ n’ọbịbịa mbụ nke Kraist n’ụwa nke a, n’ọnọdụ dị ala ma dị kwa ebube, mgbe amụrụ Ya na Betlehem wee tụkwasị Ya n’ihe ana-etinye nri anụụlọ n’ihi na ọnọdụ adịghị nye Ya n’ụlọ ndịijè. Enwere ọtụtụ ndị anaakpọ ndị naekpere Chineke n’ụbọchị ndị ahụ ndị maara na Kraist gaje ịbịa, ndị maará otú Ọ gaesi bịa bụrụ kwa ndị nwere ụzọ niile iji mara na ọbịbịa Ya dị ezi nso. Ma ndị ka n’ọnụọgụgụ n’etiti ndị a agaghịrịị ewere Jisọs dịka Kraist ahụ maọbụ nara Ya dịka Onye nzọpụta.

Anyị pụrụ iji échìchè anyị hụ ngwangwa olenole ahụ ndị kwere ma nara kwa Ya n’ọmụmụ Ya. Anyị naèchèta akụkọ nke ndị naazụ atụrụ bụ mmadụ olenole ahụ ndị nụrụ abụ ndị mmụọozi ka ha naekwusa ọmụmụ Ya, bụ ndị bịakwara ịsọpụrụ Onyenzọpụta nke mmadụ dum. Anyị niile maara akụkọ niile ahụ nke ndị amamihe ahụ si n’Ọwụwaanyanwụ bịa, nke Simeon, nke Anna ndị fèrè Chineke òfùfè n’Ụlọukwuu Chineke, na ụzọ ahụ nke Mmụọ Chineke duuru ha nyekwara ha aka ịmata ụdị Chineke ahụ nime Nwa ọhụụ ahụ nke ọtụtụ puku ndịkom na ndịnyom náapụghị ịhụ n’oge niile ahụ nke ijéozi Ya n’ụwa. Olenaole ndị a hụrụ ezi ihe ịrịbaàmà ahụ nke Nwa ọhụụ ahụ dị nsọ. Ha eleghị Ya anya dịka nwatakịrị efù. Ha kpọrọ isiala nye Ya n’ihi na ha maara Ya dịka Ọkpara Chineke, olileanya ahụ elere anya ya ogologo oge nke mmadụ.

Ọtụtụ ugbò ole ka omume a naabụ ihe anaahụ n’ụzọ ụfọdụ, ọbụná n’ụbọchị taa. Ọ dị ọtụtụ ndị naabịa n’Uloukwuu Ya n’egbugbereọnụ ifè Ya òfùfè, ndị ọdịghị mgbe achọtara ha n’etiti ezi ndị náesoụzọ ahụ ndị náeso Ya rue n’obe! Ọ dị ọtụtụ ndị náeso Ya n’egbugbereọnụ náagaghị ejéijè na nzọụkwụ Ya niile n’ezie! Ọ dị ọtụtụ ndị jụrụ ịhụ Ya dịka Ọkpara Chineke, n’ihi na Ọ bụụrụ ha náánị onyeòzízí, onyeamụma, maọbụ otù ezi Onye ilere anya. Ma ọ ka dịkwa “ndi ọzuzu aturu” ahụ, “ndi amam-ihe” ahụ, na ndị orù ahụ kwesịrị ntụkwasịobi ndị Mmụọ Chineke naedu, ndị náahụ Ya dịka Ọ dị -- Ọkpara Chineke ahụ, Onyenzọpụta nke mmadụ.

“Gịnị ka Jisọs Mere?”

Mmụọ Nsọ, site n’Onyeozi ahụ, agwawo anyị na Jisọs bịakutere ihe nke aka Ya ma ha anabataghị Ya. Jisọs bịara iweta nnapụta pụọ ná mmehie. Ọ bịara ịgwọ ndị ọrịa na ịkpọte ndị nwụrụ anwụ. Ọ bịara ịkwụ ụgwọ mgbapụta anyị na imeghe ụzọ ahụ nke anyị na Chineke gaesi dị n’udo. Ọ bịara izi anyị otú esi adị ndụ, igosi anyị nkọwa zuruezù nke iwu Chineke. Ma ndị ahụ náanara Ya, ka Ọ naenye ike ịghọ ụmụ Chineke na ndị ha na Kraist naenwekọ ngọzi ebighịebi ahụ.

Kraist bịara iweta Ìhè. Anaakpọ Ya “Ihè nke ụwa.” Ìhè ahụ O wetara naenye ndụ ebighịebi na ịdị n’udo zuruòkè mmadụ ya na Chineke. Ọ dịghị ihemgbochi ọ bụla O tinyere na ya, ma ọ bụghị anyị ịnara Ya dịka Onyenzọpụta, Onyenwe anyị, na Eze site n’ezi okwukwe nke dị ntà na mkwà niile nke Chineke. Mmadụ ndị si ná mba ọ bụla, àgwà, ọkwà, maọbụ oge ọ bụla nwere òkè n’Ìhè ahụ na urù ya niile. Ebere na ikpé Chineke dozirị nnọọ n’usoro Àtụmààtụ nke Nzọpụta ahụ nke na onye ọ bụla pụrụ ịnweta ìhè ahụ n’ọtụtụ nke gaezu inye ya nzọpụta ebighịebi ma ọ bụrụ na ọ gaanata nzọpụta ahụ náaga ijè n’ìhè ahụ emere ka ọ pụtara ya ìhè. Ma ugbu a, dịka n’oge nke ụdị Chineke n’anụarụ Ya, Jisọs naabịa ma adịghị anara Ya; Ọ naekwu okwu ma adịghị anụ; Ọ naarịọ adịghị aza; Ọ naakpọ ma anaajụ Ya mgbe niile.

“Gịnị Mere O jiri Bịa”

Ọ dị ihe dị ukwuu nke dị nime Àtụmààtụ Nzọpụta ahụ nke anaaghọtaghị site n’échìchè anụarụ nke mmadụ, n’ihi na anaatụle ihe niile nke Mmụọ Nsọ site náánị na Mmụọ Nsọ. “Gịnị mere Kraist ji bịa?” bụ otù ajụjụ apụrụ ịzá náánị site n’ịtụle ịhụnaanya ahụ náenweghị nsọtụ, ebere, ịdịmma, na ogologo ntachiobi ahụ nke Chineke nke pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mkpà ka anyị nwee ike ịmazu n’ụzọ amamihe ọzịzá niile nke ajụjụ a iji nwee nzọpụta. Ọdị mkpà ka anyị kwere n’ezie na Ọ bịara wee kwụọ ụgwọ n’ihi nzọpụta anyị.

Ndị ahụ náekweghị na Ya, ndị náasị na Ọ bịaghị ná anụarụ, bụ ndị náagụpụ ọlụ ebube niile Ya maọbụ nwee obi abụọ n’òzízí Ya niile, nọ n’òtù nke ndị ahụ ndị gaemecha nọdụ n’okpuru onye ọchịchị ọjọọ ahụ, n’oge Óké Mkpagbu ahụ, onye amaara dịka Onye ahụ nke náemegide Kraist. Ọ dịghị ịnọ n’agbata dị. Anyị apụghị ikwupụta onwe anyị nkeọma ịbụ ndị náenweghị ebe ha kwụ, n’ihi na anyị aghaghị ịnara Kraist dịka Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị náaga kwa ijè n’Ìhè Ya, wee nata onyinye Ya nke ndụ ebighịebi, maọbụ jụ ma gọnarị kwa Ya ịnọdụ nime nguzogide pụtara ìhè megide Ya.

Nye ndị ahụ nke náanara Ya ka Ọ naenye ndụ ebighịebi, ike ịghọ ụmụ Chineke, na ike ịbụ ndị ọlụ n’ubivine Ya n’ebe a n’ụwa. Ndị ahụ jụrụ Ya enweghị nrọrọ ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị ịnọ ebighịebi zuruòkè, ha na ndi niile ọzọ jụrụ Kraist -- ndị náadịghị ọcha, ndịụgha niile ndị ogbu mmadu niile, na ndị ori niile -- na kwa ekwensu na ndị mmụọozi ya.

Lee ka àtụmààtụ ahụ si bụrụ ihe náenweghị nsọtụ! Lee ka usoro ọchịchị ya niile si zueòkè n’ụzọ ọ bụla! Lee ka ihemnweta niile nke si na Ya si bụrụ nke dịrị mmadụ niile! Ọ naesite ná mmalite rue n’ezi ọgwụgwụ nke oge, site ná ndị kachasị elu rue n’ụmụmmadụ ndị kachasị ala, na site kwa n’onye kachasị n’eziomume nke onwe onye rue n’onye ahụ kachasị njọ! Emere ya ka ọ bụrụ ihe apụrụ ime n’ihi na Jisọs wedara onwe Ya ala bịa n’ụwa ibi, ịhụ ahụhụ, ịnwụ, na isi n’ọnwụ bilie ka O wee rigoo n’Elu “Ekele diri Chineke n’ihi onyinye Ya nke anāpugh ịkọ akukọ ya” -- Kraist ahụ, Okwu Chineke ahụ ghọrọ Anụarụ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee akụkụ ịdịndụ zuruòkè nke Kraist nke malitere mgbe amụrụ Ya?
  2. Kraist Ọ nọworị tupu ọmụmụ Ya na Betlehem? Kpọpụta ebe ọgụgụ ụfọdụ n’Akwụkwọnsọ iji kwagide ọzịzá gị.
  3. Kpọọ aha ụfọdụ enyere Kraist, nime Baịbụl.
  4. Ịbụisi nke Chineke ọ bụ otù onye maọbụ karịa otù?
  5. Òlee ihe bụ ọlụ kasị mkpà nke Kraist n’ụwa nke a?
  6. Ònye bụ onye náedozirị Kraist ụzọ?
  7. Gịnị ka eji kpọọ Jisọs “ìhè nke ụwa”?
  8. Òlee ọnọdụ ahụ dị ebube nke enyere ndị niile náara Kraist?
  9. Òlee ndị ka Kraist bịakutere? hà nàara Ya?
  10. Òlee ihemgbochi niile nke etinyere n’òkù ahụ nke ịnara nzọpụta nke Chineke?