Deuteronomi 23:21-23; Eklisiastis 5:1-7; Ndi-Ikpe 11:11, 29-35

Lesson 209 - Senior

Memory Verse
“Mgbe i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n’ikwughachi ya; n’ihi na ihe ndi-nzuzu adigh-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya” (Eklisiastis 5:4).
Cross References

I Ndụmọdụ niile Banyere Mkwà

1. Ọ bụ mmehie ịghara idebe mkwà, Deuteronomi 23:21, 23; Ọnụ-ọgugu 30:2; Job 22:27; Abù Ọma 50:14, 15; 66:13, 14

2. Ọ bụghị mmehie ma mmadụ ghara ikwe mkwà, Deuteronomi 23:22

3. Lezie anya ka ịghara ikwe mkwà ọsọsọ, Eklisiastia 5:1-7

II Mkwà nke Jefta

1. Jefta wegaara Chineke nsogbu ya Ndi-Ikpe 11:11

2. Mmụọ nke Onyenwe anyị dakwasịrị ya, Ndi-Ikpe 11:29

3. Jefta kwere mkwà, Ndi-Ikpe 11:30, 31

4. Jehova nyere ya mmeri n’ebe ndịirò ya nọ, Ndi-Ikpe 11:32, 33

5. Jefta kpebiri idebe mkwà ya, Ndi-Ikpe 11:34, 35

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mkwà Nsọ Niile

Mkwà bụ ihe ahụ pụtara ìhè dị nsọ nke ekwupụtara nkeọma nke ekwere Chineke ná mkwà. Iji maatụ, mgbe Hana rịọrọ maka nwa nwoke, o kwere mkwà, “M’gēnye kwa ya JEHOVA ubọchị ndu-ya nile, aguba agagh-aga kwa n’elu isi-ya” (I Samuel 1:11). Nke a bụ mkwà pụtara ìhè ekwupụtara nkeọma nye Chineke, ọ bụghị kwa náánị ijiobichụàjà náejikere inye Onyenwe anyị Samuel ma ọ bụrụ na Ọ gaachọ ya. Mgbe anyị ji ihe anyị niile náachụrụ Chineke àjà, anyị aghaghị inye Ya oge anyị talent maọbụ ijéozi anyị mgbe Ọ naachọ ha. Mgbe anyị naekwe mkwà anyị aghaghị imezu ọnọdụ niile nke mkwà ahụ. Ụfọdụ ekwewo mkwà inye otù áwàà n’ekpere kwa ụbọchị, ịgbaàmà n’oge ụfọdụ, ime maọbụ ịghara ime ihe ụfọdụ. Nke ahụ bụ ịñụiyi pụrụ iche, bụrụ kwa mkwà, onye ahụ kwere ya aghaghị kwa imezu ya. Tutu ekwee mkwà mmadụ aghaghị ịgụkọ ihe ọ gaefu ya ịhụ ma ọ pụrụ imezu mkwà ahụ. Ọ bụ óké ihe nzuzu ikwe mkwà inye karịa ihe mmadụ nwere maọbụ ihe o chere échìchè nkeọma ọ naele anya inweta, n’ihi na ọ bụ mmehie ma akwụghachịghị mkwà ahụ.

N’ọgbọ nke anyị naebi nime ya ụmụmmadụ naewere ikwe mkwà n’ihe náabụghị ihe siriike. N’ebe ọtụtụ nmadụ nọ anaedebezu mkwà ma ọ dị mfé. Ọtụtụ ndị naazụahịa náekwe mkwà ọtụtụ ugbò ma emesịa¸ mgbe emechịrị ahịa ahụ, ha alaa àzụ n’okwu ha. Mgbe ụfọdụ mmadụ gaemebi mkwà ya ma ọ hụ na ego gaefunarị ya nime mkwekọrịta ahụ. Okwu nke ezi onyeKraist dị mma. Mgbe ọ naekwe mkwà Chineke naachọ ka o debe ya, ma ekwere ya nye Chineke maọbụ mmadụ ibe ya. Nke anaachọsike karịa bụ mkwà ekwere Chineke. “Mgbe i gēkwe JEHOVA, bú Chineke-gi, nkwà, alala azu n’ikwughachi ya; n’ihi na JEHOVA, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n’aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi” (Deuteronomi 23:21).

Mgbe onye mmehie na-abịa na-achọ nzọpụta, ọ na-eji obi chụa àjà nye Chineke inye Onyenwe anyị ndụ ya n’ijé ozi. Ijiobi chụa àjà ahụ nwere ike bụrụ nke ana-ekwusịghị ike, ma otú ọ dị, ọ bụ ijiobi chụa àjà. Chineke na-achọ ka o debe ya. Ọtụtụ ugbò, idozi-ụzọ na-agbakwudo na ya. Chineke na-ekwere n’okwu ahụ mmadụ kwuru ịhazi mmekọrịta niile ahụ nke na-ezighị ezi nke ya na mmadụ ibe ya mekọworo. Mgbe ụfọdụ ana-azọpụta mmadụ o wee nwee ịda mba wee laa àzụ, ná-ajụ imezu nkwà ya niile mgbe o nwere nkwupụta mmehie siri ike nke chéré ya n’iru, wee tụfue mmeri ahụ. O kwewo Chineke nkwà o jikereghị kwa ịkwụghachị ya. Mgbe Chineke kpughere ụgwọ ahụ aga-akwụ, aghaghị ịkwụ ya -- ọdịghị ụzọ ọzọ ịga ya n’akụkụ.

Ọtụtụ mgbe NdịKraist na-ekwe ọtụtụ nkwà n’oge ahụhụ maọbụ ọnwụnwa. Ha na-ekwe ọtụtụ nkwà mgbe ha nwere ọchịchọ siri ike inwetakarị ike nke Chineke nime ndụ ha. Mgbe ana-ekwe nkwà n’ụdị oge niile ahụ ha na-abụ ihe emesịrị ike nke ana-aghaghị kwa idebezu n’otù aka ahụ dịka ijiobi chụa àjà ọ bụla nke Chineke pụrụ ịchọ n’aka ha.

“Ma mgbe i ghara ikwe nkwa ọgagh-abu nmehie nime gi. Ihe nke nēsi n’egbugbere-ọnụ gi puta ka i gēdebe, me kwa; dịka i kweworo JEHOVA, bú Chineke-gi, nkwa, ọbu onyinye-afọ-ofufo, nke ikwuworo n’ọnu-gi” (Deuteronomi 23:22, 23). Ọ bụrụ na anyị kwere Chineke onyinye afọ-ofufo ná nkwà, anyị aghaghị inye Ya onyinye afọ-ofufo ahụ. Ọ bụghị kwa anyị ọzọ inye maọbụ ịjụ inye dịka o si dị anyị mma, kama ọbụ nkwà nye Onyenwe anyị. Ọ bụrụ, n’aka nke ọzọ, na anyị ekweghị nkwà inye Onyenwe anyị onyinye, anyị emehieghị. “Ọ di nma ka i ghara ikwe nkwa, karia ikwe nkwa ma i digh-akwughachi” (Eklisiastis 5:5).

Mkwà Niile Ekwere Ọsọsọ

Adụrụ anyị ọdụ ka anyị ghara ime óké ngwangwa maọbụ ọsọsọ n’okwu ọnụ anyị niile. “Olu onye-nzuzu (ka ana-amara) kwa n’otutu okwu.” Ka Chineke nyere anyị aka ka anyị ghara ịbụ ndị nzuzu, kama ka anyị tụọ okwu anyị niile n’iheọtụtụ wee kwu ha n’amamihe! “Mgbe i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n’ikwughachi ya; n’ihi na ihe ndi-nzuzu adigh-atọ Ya utọ; ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.” Ihe ndị nzuzu adịghị atọ Chineke utọ. Ọ naele anya ka edebe mkwà, ma ekwere ya n’ụzọ nzuzu maọbụ n’ụzọ ọzọ.

N’oge ọrịa maọbụ nsogbu ánáeduba anyị nime inyocha obi anyị na ime ka mkwà niile anyị na ijiobichụọàjà niile anyị dị ọhụụ. Apụrụ inye anyị ohere ịnwa anyị ka ijiobichụọàjà niile wee gaa omimi karịa. Chineke naakpọ anyị ịga n’ijiobichụọàjà niile dị omimi n’ụdị oge ahụ, ma mgbe anyị nwere mmeri anyị aghaghị ịdị ka Devid nke mgbe ochie onye kwuru, “M’gākwughachi Gi nkwam nile m’kwere Gi, nke egbugbere-ọnum abua ji saghepu, nke ọnụm kwu-kwa-ra, mgbe nkpa dirim” (Abù Ọma 66:13, 14).

Arịrịọ nke Jefta

Jefta bụ otù nwoke nke nwere óké ibu arọ n’obi. Agwawo ya ka o duru ndị bi na Gilead bue agha megide ụmụ Amọn. Ọ matara na ọ gaachọ ike nke karịrị nke ya idú ndị a chụpụworo ya na mbụ, na inweta mmeri n’agha megide Amọn. “Jefta we kwue okwu-ya nile n’iru JEHOVA nime Mizpa” (Ndi-Ikpe 11:11). O wegaara Chineke nsogbu ya n’ekpere.

“Mọ nke JEHOVA we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpe nke Gilead, si na Mizpe nke Gilead gabiga rue umu Amọn” (Ndi-Ikpe 11:29). N’ụzọ pụtara ìhè ọ naewe ndị agha ka ọ naagabiga n’òkè ala ahụ niile. Ọ bụ ihe pụrụ iche ụzọ Mmụọ nke Onyenwe anyị naesi abịakwasị ndịkom ndị a dị ike nke Chineke n’oge mgbe ochie, náejikere ha maka agha. Ewezuga Mmụọ ahụ ha adịghị njikere ịga lụọ agha. Ọ dị ka ọ burị ụdị Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, náánị n’ọgbọ anyị ka Mmụọ nke Chineke naabịa ịnọgide rue mgbe ebighịebi. N’ebe a ọ bụ náánị mmeju pụrụ ịche banyere ọlụ dị mkpà enyere ha. Otú ahụ ka ọ dịrị Samson. Mmụọ nke Onyenwe anyị naabịakwasị ndị-ikpe niile chịrị achị, wee nye ha amamihe idú ndị Israel.

Otù Oge nke dị Mkpà

Mgbe Jefta hụrụ na agha ahụ bụ nke anaapụghị ịgbanarị O kwere Onyenwe anyị mkwà. Ọnọdụ nke Israel siriike; ihe dị egwù chere mba ahụ n’iru. Akpọwo Jefta n’ọnọdụ nke ịlụọlụ, ọ chọkwara ịhụ mmeri n’ihe ọ bụla ọ pụrụ iwè (maọbụ ifu) ya.

Mgbe mmadụ hụrụ mkpà nke inwe inyeaka Chineke n’ihe ọ bụla ọ naeme, mgbe ahụ mkpà ahụ naamalite iwere ọnọdụ mbụ n’ebe ihe ọ bụla ọzọ dị. Ọ bụrụ na o nwere ezi obi nke náachọsi ihe ike ọ gaje ịga omimi nke ukwuu ijiobichụọàjà niile na mkwà niile ahụ ọ naekwe Onyenwe anyị. Nke ahụ bụ ọnọdụ nke Jefta nọ na ya. Ọ bụ oge siriike. Ọ dị ebe ọ bụla anyị pụrụ ịkpá ókè ma ọbịa n’ịchọ mnwapụta site n’ebe Chineke nọ -- dịka n’ịma àtụ, ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ? Usoro niile na ezughịòkè niile ka anaatụda n’ala. Anyị aghaghị iru n’ebe ahụ nke anyị gaekwu, “Agamakwụ ụgwọ ahu; m’ga-agabiga n’ihe nile ọ bụla ọ ga-efu.” Ọ bara urù iru n’ebe ahụ iji nweta Mmụọ Nsọ ahụ. Ọ naewe ijiobichụọàjà dị omimi. Jefta ruru ebe ahụ nkeọma mgbe o kwere mkwà nke pụtara ihè nye Onyenwe anyị.

Ezi Ule Ahụ

Chineke sọpụụrụ mkwà nke Jefta wee nye ya mmeri. Ọ bụ mgbe ahụ ka ezi ule ahụ bịara. Ọ bụ otú ahụ ka ọ naadịrị anyị ọtụtụ mgbe: ejiwo obi chụọ ọtụtụ àjà; enwewo mmeri: mgbe ahụ Chineke naetinye aka Ya nime ndụ anyị. Ọ naasị, “I kwere ihe a ná nkwa; ì na-eguzosi ike na ya?” Mgbe ụfọdụ mmadụ naamalite ịtụgharị na ịgbagharị n’oge a. Mgbe ụfọdụ ha naamalite ịla àzụ n’ijiobichụọàjà ha niile. Ma nke a adịghị otú ahụ n’ebe Jefta nọ. Okwu ya niile bụ, “Asaghepuworom JEHOVA ọnum, apughkwam ilaghachi azu.” Okwu ndịa naekpughe omume, náegosi kwa ụdị mmadụ dị ukwuu Jefta bụ. Ndịkom dị ukwuu enwetawo ọtụtụ ọnọdụ nke dị ike n’ọgbọ agha, ma nke a bụ otù nwoke onye Chineke pụrụ iji mee ihe ná ntụkwasi obi. “Asaghepuworom JEHOVA ọnum, apughkwam ilaghachi azu.”

Ịla-àzụ Adịghị

Lee ụdị mkpebi nke a naekwu! Ịlaàzụ? Ọ dịghị! “Apughkwam ilaghachị azú.” Nke ahụ bụ ezigbo mmụọ eji alụ agha. Chineke hụrụ ihe nime nwoke agha a nke Eluigwe niile gaakwagide. Ọ bụghị náánị n’ọgbọ agha ka ndịkom naegosi ịgbasiike ha. Mgbe ụfọdụ ezigbo ule ahụ naabịa n’oge ọganiru na nsọpụrụ.

Jisọs naachọ ndị ahụ nwere mkpebi siriike ikwesị ntụkwasịobi rue n’ọgwụgwụ, mgbe Ọ sịrị, “Ọ digh onye ọ bula nke nēle anya n’azu, mgbe o tinyesiri aka-ya n’ọgù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke” (Luk 9:2). Ì kwesịrị alaeze ahụ? Ì kwụghachịwo mkwà niile i kwere? Maọbụ i naele anya n’àzụ? Elaisha nwere nzube isoro Elaija gaa ụzọ ahụ niile. Mgbe agwara ya ka “ọ nọdụ n’ebe a,” ọ zaghachiri “JEHOVA nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gagh-arapu gi ma-ọli” (2 Ndi-Eze 2:2). Elaisha natara uwenwuda Elaija. Ike ahụ abụrụwo nke ya! Gịnị bụ olileanya gị? Nzube gị ọ dị kwa ike otú ahụ?

Rut, nwanyị Moab ahụ, gbara obi ya ume mgbe ọ rịọrọ: “Ariọlam irapu gi, isi n’iso gi laghachi: n’ihi na ebe i gēje ka m gēje; ọ bu kwa ebe i nānọ ọnọdu-abali ka m’gānọ ọnọdụ-abali: ndi gi gābu ndim, Chineke-gi gābu Chinekem: ebe i nwuru ka m’gānwu, ọ bu kwa n’ebe ahu ka agēlim: JEHOVA mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, mgbe ihe nābugh ọnwu onwe-ya gēkewa mu na gi” (Rut 1:16, 17). Ì nwere obi agbara ume? Ị pụrụ iso ndịa, na dịka Jefta, ikwu, “Asaghepuworom JEHOVA ọnum, apughkwam ilaghachi azu”?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ mkwà?
  2. Gịnị naakpali mmadụ ikwe mkwà?
  3. Ọ bụ onye ka eji onye nke náadịghị akwụghachi mkwà ya tụnyere?
  4. Gịnị ka mkwà ekwere ngwangwa náéchèghị uche pụtara?
  5. Ọ bụ onye ka anyị gụtara n’Agba Ọhụụ nke kwere mkwà?
  6. Gịnị bụ omume Jefta n’ebe idebe mkwà ya dị?
  7. Na gịnị ka ehotara aha Jefta na ya n’Agba Ọhụụ?
  8. Òlee ụzọ Chineke ji sọpụrụ mkwà Jefta?