Matiu 20:1-16

Lesson 183 - Junior

Memory Verse
“Ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na-ole” (Matiu 20:16).
Notes

Ndị Ọlụ Maka Ubi Vine Ahụ

Ilu nka Jisọs kuziri bụ banyere Alaeze Eluigwe. Náagbaghị agụgọ Onyenweayị Onweya ka nwoke ahụ chọrọ ndịọlụ maka ubi vine ya naanọchi anya ya. Chineke naeji ndikom na ndinyom, ụmụokorọbịa na ụmụ agbọghọbịa alụ ọlụ ịgbasa Oziọma, ịgwa ndị ọzọ akụkọ nke nzọpụta site n’Ọbara nke Jisọs. Chineke pụrụrị iji ndị mmụọozi maọbụ site n’ụzọ ọzọ lụọ ọlụ ahụ, ma O nyere ndị nke Ya ohere ahụ. Ọ ka naachọ ndịọlụ. Ọnọdụ dị n’ụbi vine Ya nye onye ọ bụla nke gaaza òkù Ya.

N’ilu ahụ, nwoke ahụ pụrụ n’isi ụtụtụ igota ndịọlụ. Ya na ụfọdụ ndịọlụ kwekọrịtara na ọ gaakwụ ha otù penny otù ụbọchị. Agwara anyị na otù penny bụrị kobo asaa na ọkara kobo n’ego nke anyị, anyị maara nke ọma, na ọ bụ kwa ụgwọọlụ zuruòkè dị kwa mma na mgbe ochie. Mgbe ha kwubiri ọnụ ego agaakwụ, ndịọlụ ahụ bàra n’ubi vine ahụ.

Iguzoro Náenweghị Ihe Anaalụ

Nna nweụlọ ahụ pụkwara ọzọ igo ndịọlụ karịa. N’oge hour nke atọ (elekere iteghete nke ụtụtụ) ọ hụrụ ndịọzọ guzo náenweghị ihe ha naalụ n’ọmaahịa. Ọ kpọrọ ha ka ha lụọ n’ubi vine ya, náekwe mkwà ịkwụ ha ụgwọ kwesịrị ekwesị.

N’oge hour nke isii na nke iteghete (n’elekere nke irinaabụọ na elekere atọ nke ehihie) ọ pụkwara ọzọ. Ọ hụkwara ndịọzọ guzo náenweghị ihe ha naalụ, ndị ọ sịkwara ka ha jee lụọrọ ya ọlụ. N’oge hour nke irinaotù, ntakịrị oge tutu ọlụ nke ụbọchị agwụsịa, ọ pụkwara otù ugbò ọzọ. Ndị náenweghị onye kpọrọ ha n’ọlụ ka ọ sịrị ka ha jee n’ubi vine ya dịka ndịọlụ. O kwere mkwà ịkwụ ha ụgwọ kwesịrị ekwesị.

Nye Ndị Ju na Mbụ na Ndị Mbaọzọ kwa

Ọkpụkpọòkù nke Chineke maka ndịọlụ na apụ kemgbe ọtụtụ arọ. Eleghịanya òkù nke isi ụtụtụ dị ka nke akpọrọ ndị Ju, ndị bụ ndị mbụ Onyenweanyị kpọrọ. Jisọs bịakutere ndị Ju na mbụ. Mgbe Jisọs zipụrụ ndị naeso ụzọ Ya irinaabụọ ijé kwusaa Oziọma (Iheọmụmụ 81), ịdọakanántị Ya nye ha bụ, “Unu ejela n’ụzọ ndi mba ọzọ.” Ha gaekwusara ndị Ju (Matiu 10:5, 6).

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Ju ka eburu ụzọ kpọọ, ọ bụghị náánị ha bụ ndị Chineke kpọrọ. Mgbe emesịrị òkù ahụ rukwara Ndị Mbaọzọ. N’isi irinaotù nke Ọlu Ndi-ozi, Pita kwuru banyere ihe ọ nwapụtara na Chineke zigara ya ikwusara èzínaụlọ Kọniliọs, ọchịagha naachị otù narị ndịagha nke Ndị Mbaọzọ, na Sisaria. Pita sịrị: “N’ezie anamaghọta na Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru: kama nime mba ọ bula onye nātu egwu Ya, onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye ọ nānara nke-ọma” (Ọlu Ndi-ozi 10:34, 35). Mgbe ha nụsịrị akụkọ banyere nnwapụta nke Pita, ndị naeso ụzọ ahụ sịrị, “Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēduba na ndu” (Ọlu Ndi-ozi 11:18).

Site na mgbe ahụ rue ugbu a, Chineke naezipụ ọkpụkpọòkù maka ịlụọlụ n’ubi vine Ya. Ndị naara ya, ha “buru ibu arọ nke ụbọchi ta, ya na ifufe di ọkụ” ime ka Oziọma ahụ guzosie ike mgbe óké mmegide dị. Ha alụwo ọlụ kpee kwa ekpere ịgbasa ozízí nke Kraist rue ebe niile ụwa sọtụrụ.

Agwara anyị na anyị naebi n’oge ikpeazụ nke owuweiheubi. Náagbaghị agụgọ ọkpụkpọòkù nke taa maka ndịọlụ dị ka òkù nke oge hour nke irinaotù. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka owuweiheubi gwụsịa ma ohere ka fọdụrụ ịza òkù nke Chineke.

Ndịọlụ Ọ Bụghị Ndi Naanọ n’efu

Chineke adịghị amanye mmadụ ọ bụla ịlụ ọlụ n’ubi vine Ya. Ọ naego ndịọlụ Ọ gaakwụ ụgwọ, ịnapụta ha site n’ịda ogbenye nke imemmụọ. Nrọrọ bụ ihe onye ọ bụla gaeme n’onweya. Otù ụbọchị mmadụ ọ bụla gaeguzo n’iru Chineke ịza ajụjụ banyere ndụ ya (Ndi Rom 14:12) na ihe niile o meworo, ma ọ bụ iheọma maọbụ iheọjọ. Ị naeguzo n’efu ụbọchị niile, naalụghị ọlụ ọ bụla gaabara Chineke uru naemeghi ihe ọ bụla nwere isi?

Ụdị Ọlụ Dị Icheiche

Chineke naego ndịọlụ n’ihi otù ihe -- ịlụ ọlụ n’ubi vine Ya. Ọ dịghị ohere dịrị ndị naagaghị alụọlụ, ọ dịghị ọnọdụ dịrị ndị naachọ ịnọ n’efu. Egoghị ndịọlụ ekwuru banyere ha n’ilu a n’ihi otù ọlụ pụrụ iche dịka ịkụ ihe, igbubipụ alaka naadịghị mma, ịkọ alaubi, maọbụ iweiheubi. Chineke, kwa, chọrọ mmadụ ndị gaalụ ọlụ Ọ chọrọ ka alụọ.

N’ubi vine ọtụtụ ọlụ dị icheiche dị agaalụ tutu ewee mkpụrụ akụrụ n’ubi. Na mbụ, agaakụ mkpụrụ vine, n’oge ya kwa agaakọ ala ubi ahụ, gbaa ya miri, gbubipụ alaka naadịghị mma, bọchasịa ahịhịa, gbaa ọgwụ naegbu ụmụ arụrụ dị icheiche, na ịwụsara ya ihe dị ka nsị anụ. Anaeme ihe niile a ka ewee lụpụta owuweiheubi. N’ubi vine Onyenweanyị kwa, enwere akụkụ ọlụ dị icheiche, nke dị kwa ná mgbasa nke Oziọma ahụ na nzọpụta nke ọtụtụ mkpụrụobi. Mmadụ nile zara òkù nke Chineke apụghị ịbụ ndịozi (minista) maọbụ onye ọlụ naenye ndị naachọ nzọpụta okwu ndụmọdụ. Òlee ụdị nzukọ agaenwe ọ bụrụ na ndị naabụ abụ akpọghị ụbọ maọbụ fụọ opi ha, ọ bụrụ na ọ dịghị onye bụrụ abụ nke ọra mmadụ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye gbara àmà, na ọ dịghị kwa onye kpere ekpere? Òlee ụdị ụlọọlụ gaadị n’isi nzukọ anyị ọ bụrụ na ọ dịghị onye naagụ akwụkwọozi, ọ bụrụ na ọ dịghị onye naazaghachị akwụkwọozi, ọ bụrụ na igwè eji ebi akwụkwọ tọgbọrọ n’efu, ọ bụrụ na ọ dịghị onye naezipu akwụkwọ Oziọma, ọ bụrụ na ọ dịghị onye naazacha ala maọbụ naehicha oche dị icheiche, ọ bụrụ na enyeghi okwu agbamume na ndụmọdụ, na ọ dịghị kwa onye ọ bụla naekpe ekpere?

Eleghịanya ị naeche ihe nwatà pụrụ ime. Aghaghị ịkpọ ụmụ mmadụ òkù ịbịa n’Ụlọakwụkwọ Ụbọchị ụkọ na ịbịa na nzukọ anyị niile dị icheiche. Aghaghị ikpé ekpere n’ihi mkpụrụobi ndị naala n’iyi. Aghaghị ịbụabụ na kwa ịgbaàmà. Ọ bụ mmadụ gaekpe ekpere maka nzukọ anaenwe, na n’ihi akwụkwọ eji agbasa Oziọma. Ọ bụ na ihe ndịa abụghị ọlụ nke nwatà ọ bụla nwere nzọpụta pụrụ ịlụ? Ụmụ mmadụ hà chọrọ ka ha naeguzo naalụghị ọlụ mgbe ha pụrụ, site n’ịnata onyinye amara ha niile na ime ka talent ha naeto eto, naedozi onweha nkeọma ka ha bụrụ ezigbo ndịọlụ, ọ bụrụ na Onyenweanyị anọọdụ?

Ọkpụkpọòkù nke Chineke nye Ụmụntakịrị

Mgbe ụfọdụ anaeji ọkpụkpọ òkù isi ụtụtụ tụnyere òkù nke Chineke nye ụmụntakịrị. Ụfọdụ azawo kwa, ka Jisọs naanọ kwa ọdụ, ha anọwo ọtụtụ arọ n’ijere Onyenweanyị ozi. Ndịọzọ anaraghị òkù ahụ mgbe ha bụ ụmụntakịrị. Eleghịanya Chineke ekwesịwo ntụkwasịobi ịkpọ ha ọzọ, na mgbe dị icheiche na ndụ ha, ma ha gaahụ onweha na mgbe ikpeazụ nke ndụ ha, eleghịanya dịka ndị ghọworo agadi naenweghị kwa nzọpụta. Ọ bụ na ha ahụtaghị na oge ha gaeji jeere Onyenweanyị ozi fọdụrụ ntakịrị ka ọ gwụsịa? Lee otú ọ bụ ihe kwesịrị ebere mgbe ụmụ mmadụ naajụ òkù nke Chineke! Lee otú ọ bụ iheụtọ na ihe bara úrù ndụ mmadụ naabu mgbe ha nabatara ọkpụkpọòkù ijéozi nime ubi vine nke Chineke!

N’oge Hour nke Irinaotù

Lee otú egwù naejide obi mgbe mmadụ naahụ ka ụmụokorobịa na ụmụagbọghọbịa naajụ òkù ijere Chineke ozi! Eleghịanya ha naezube ịba nime “ubi-vine” n’oge hour nke atọ, nke isii, maọbụ oge hour nke iteghete. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere ka o doo anya na ha gaaka nká; eleghianya nka bụ oge hour irinaotù nke ndụ ha. Ọtụtụ dị ka ha amataghị na owuweiheubi fọdụrụ ntakịrị ka ọ gwụsịa. Oge hour nke irinaotù naagafe ngwangwa. Chineke naezipụ òkù ka abata n’ubi vine Ya taa. Ònye maara ma nka pụrụ ịbụ òkù ikpeazụ?

Ụgwọọlụ

Akụkụ ọzọ dị n’ilu a nke Jisọs kuziri -- ịkwụ ụgwọọlụ. Mgbe ọ ruru anyasị, akpọrọ ndịọlụ ahụ ka ha nara ụgwọọlụ ha. Ndị lụrụ ọlụ náánị otù hour natara otù ụgwọ ahụ ndị lụrụ ọlụ ọgologo ụbọchị ahụ natara. Ha natara otù penny, ha natakwara ya tutu ndịọzọ. Nka bụ, n’ezie, ụzọ dị iche site n’ụzọ esi akwụ ụgwọ n’ụwa taa. Ọ bụghị otú ụzọ nke Chineke dị ka ụzọ nke mmadụ dị. Ọbụná ọ bụ ezie na onye azọpụtara naalụrụ Chineke ọlụ n’ihi na ọ chọrọ ime otú ahụ, Chineke nwekwara ụgwọọlụ Ọ gaenye ndị kwesịrị ntụkwasịobi.

Ụfọdụ kpesara mkpesa, ma agụghị mkpesa ha n’ihe ziriezi n’iru Chineke. Ejidere ndị ahụ kpesara mkpesa n’ihe ha na onye kpọrọ ha n’ọlụ kwubiri, wee zipụ ha n’ụzọ nke ha. Chineke adịghị enwe obiụtọ n’ebe ndị naeche na ha naalụ ọlụ riri nne, ebe ndịọzọ naalụ nke dịkarịrị ntà nọ, maọbụ na ha naenwe ntakịrị iruọma nke Chineke ebe ndịọzọ naenwe nke ka ukwuu.

Nye Ndi Kwesịrị Ntụkwasịobi

Chineke adịghị enye ndị azọpụtaworo mgbe dị anya garaaga ụgwọọlụ karịa, maọbụ ndị elere anya na ha alụworo Ya ọlụ dị ukwuu. Iheọtụtụ eji ọlụ anyị n’ubi nke Onyenweanyị bụ ụdị ọlụ anyị nyere, ọ bụghị otú ọ ra. Ị gaanata otù “shilling” gị ọ bụrụ na i kwesị ntụkwasịobi n’ọlụ Chineke nyere gị ka ị lụọ, ọ bụrụ na imewo ihe niile ị pụrụ ime n’ihi Jisọs na n’ihi nsọpụrụ na otuto Ya. “Ihe ọ bụla ziri ezi nke ahụ ka unu gānata.”

Ọ bụrụ na ọlụ ị lụrụ nye Chineke abụworị náánị igosipụta onyinye gị karịa igosi ịhụn’anya na ebere nke Chineke, ọ bụrụ na ihe ị lụworo bụ ihe ị lụrụ ná mkpesa karịa “site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi.” Ọ bụrụ na isitewo n’ọchịchọ nke onweonye nara náánị ohere niile ị chọrọ wee ghara inwe ohere maka ọlụ niile dị ala maọbụ ebe agaghị ahụta gị, ì kwesịrị ịnata ụgwọọlụ?

Akpọrọ na Arọpụtara

Ejiri okwu dị otú a mechie ilu ahụ, “Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.” (“n’ihi na ọtutu ka akpọworo ma ole-na-ole ka arọputaworo.”) Ndị azọpụtara n’ikpeazụ, ma ha enyewo Chineke ọlụ ha n’ikwesị ntụkwasịobi, gaanata “ihe ọ bula ziri ezi,” ọbụná dịka ndị ebuworo ụzọ zọpụta.

Ọkpụkpọòkù ịbụ onyeọlụ n’ubi vine nke Onyenweanyị dịịrị mmadụ niile. Ọtụtụ ka akpọworo; ma ọ bụghị mmadụ niile naanara ọkpụkpọòkù ahụ, n’ihi ya adịghị arọrọ ha. Chineke naakpọ òkù ahụ; ma ị bụ onye arọpụtara naadabere na gị. Ị pụrụ ịbụ onye Onyenweanyị rọpụtara dika ị bụ onye akpọworo. Akpọwo gị. Àrọpụtawo gị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. N’ihi gịnị ka eji goo ndị ọlụ ahụ?
  2. Gịnị mere ụfọdụ ji guzo naalụghị ọlụ?
  3. Gịnị ka nwoke ahụ kwenyere ịkwụ?
  4. Òlee ụdị ụgwọọlụ Chineke naakwụ?
  5. Ònye ka Chineke naenye “otù shilling otù ụbọchị”?
  6. N’ụzọ dị añaa ka ndị ikpeazụ gaeji bụrụ ndị mbụ?
  7. Òlee ihe dị iche n’ịbụ onye akpọrọ na ịbụ onye arọpụtara?