Matiu 20:20-28

Lesson 184 - Junior

Memory Verse
“Onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n’etiti unu, ọ gābu orù-unu” (Matiu 20:27).
Notes

Ọkpụkpọ nke Jemes na Jọn

N’etiti mmadụ irinaabụọ naesoụzọ Jisọs ka enwere ụmụ nne abụọ aha ha bụ Jemes na Jọn. Jisọs akpọwo harị ka ha soo Ya otù ụbọchị mgbe Ọ gafere ebe ha nọ naedozi ụgbụ ha ji egbu azụ. Ha rapụrụ ọlụ ha naalụ wee ghọọ ndịọkụ na akụta nmadụ.

N’ihe ra ka arọ atọ Jemes na Jọn ejiwo ịnụọkụ n’obi soo Jisọs. Ọ kpọrọ ha ụmụ nke egbe eluigwe, eleghịanya n’ihi enweghị egwù ha ịgbachị ihe ọ bụla ha hụrụ dịka iheọjọọ naabịa ịdakwasị Ya. Ha achọwo ịkpọdata ọkụ site n’Eluigwe irechapụ ụfọdụ ndị Sameria ndị ledara Jisọs anya otù mgbe. Mgbe ha hụkwara otù nwoke naachụpụ ndị mmụọọjọọ n’aha Jisọs, ma ọ dịghị eso ha, ha gwara Jisọs ka ọbaara ya mbá.

Jisọs maara na Jemes na Jọn hụrụ Ya n’anya nke ukwuu naeme kwa ihe ha chere na o ziriezi ime ka obi dị Ya ụtọ na inyere Ya aka; ma Jisọs adịghị eme ihe n’ụzọ mmadụ si eme. Ọ kọwara na Ya enweghị obi ilu n’ebe ndị Sameria ahụ nọ, na Ya bịakwara igosi ha ụzọ agaesi zọpụta ha karịa ịla ha n’iyi. Ọ tụgharịkwara uche na nwoke ahụ onye naachụpụ ndị mmụọọjọ aghaghị ịdịnyere ha ọ bụrụ na ọ dịghị emegide ha.

Ndị Naanọ Ya Nso Karịa

Jisọs hụrụ Jemes na Jọn n’anya, ha na Pita bụ ndị mejupụtara òtù ahụ apụrụ ịkpọ “ndi na-anọ Ya nso karịa.” Ha na Jisọs naeje ijè karịa ndị niile ọzọ naesoụzọ Ya. Ha na Ya anọworị n’Ugwu Nnwogha, mgbe ekpubere Ya ebube; ha nụkwara ka Moses na Elaija naekwusara Jisọs okwu.

Mgbe ụfọdụ Jisọs naakpọrọ náánị Pita, Jemes na Jọn mgbe Ọ naaga ịlụ ọlụ ebube dị ukwuu. Otù mgbe akpọwo Ya ka ọbịa gwọọ otù nwaagbọghọ ntà nwụrụanwụ. Ọ chụpụrụ onye ọ bụla ọzọ n’ezi, ma Pita, Jemes na Jọn bụ náánị ndị hụrụ Ya ka O kwuru okwu nwa ahụ wee dị ndụ ọzọ.

Karịa nke ahụ, akpọrọ Jọn Onye naesoụzọ Ahụrụ n’anya. Ọ gaenyewo yarị obiụtọ nke ukwuu inweta iruọma dị otú a site n’ịhụn’anya a pụrụ iche n’ebe Jisọs nọ.

Alaeze ahụ nime Obi

Náagbanyeghị ihe niile a, Jemes na Jọn amụtabeghị ihe Jisọs naele anya dịka ezi ịdịukwuu. Ha aghọtaghị na Alaeze Ya aghaghị ibu ụzọ malite n’obi ha ebe o nweghị onye ọzọ pụrụ ịhụ ya, na ọ gaghị abụ kwa alaeze dị ka nke Sisa. Ha chere na n’ezie Jisọs gaabụ onye ukwu, eze dị ike mgbe Ọ gaeweli ocheeze Ya, na Ọ gaachọ kwa ndị nlekọta na ndị ọchịagha gaenyere Ya aka ịchị -- ndị gaeketa kwa òkè na nsọpụrụ Ya. Ha wee tụlee ya n’obi ha sị, kèdụ onye ọzọ ma ọbụghị ha onweha nwere ezi ohere dị otú a ịnata iruọma n’ebe Jisọs nọ?

Arịrịọ Amamihe Naadịghị Nime Ya

Nne Jemes na Jọn aghaghị ijupụtaworị na nganga na Jisọs akpọwo ụmụ ya ịga Ya ezi nso; naagbaghị kwa agụgọ o chere na arịrịọ ya bara úrù mgbe ọ sịrị Ya: “Kwue ka umum ndikom abua ndia nọdu, otù n’aka-nri-Gi, otù n’aka-ekpe-Gi, n’ala-eze-Gi.”

Jisọs hụtara na ha aghọtaghị ihe ha naarịọ. N’uche ha niile ha pụrụ ịhụ alaeze niile nke ụwa nke naasọpụrụ mmadu dịka eze, naasọpụrụ kwa mmadụ ndịọzọ ndị bụ ndị ọchịagha na ndị naenyere eze aka. Mmadụ anụarụ naachọ otuto na ilekwasị ya anya. Ma Jisọs chọrọ mmụọ dị iche nime obi ndị naesoụzọ Ya. Ọ chọrọ igosi site na ndụ Ya otú O lere anya na ha gaesi bie ndụ.

Otù Orù

Jisọs sịrị na Ya nọ n’etiti ha dịka onye naejere ndịọzọ ozi -- maọbụ dịka orù. Ọ bịara ime ndịọzọ mma ọ bụghị ile anya ka ha jeere Ya ozi. Ndị niile gaachọ ịdịukwuu n’Alaeze Ya biri kwa Ya nso gaeme otú ahụ O si mee. Ọ sịrị: “Ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n’etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi” (Mak 9:35).

Ndị naesoụzọ Ya chere dịka mụ na gị pụrụ ichè, na mmadụ ịbụ onye ukwuu ọ ghaghị ime ihe ukwuu n’ụwa, eleghịanya bụrụ onyeisi ndị mmadụ. N’alaeze niile nke ụwa onyeisi ọchịagha lụworo ọtụtụ agha wee lụgbue nye obodo ya naenwe nsọpụrụ; na onye ọ bụla meworo nchọpụta nke ọtụtụ ihe banyere iheọmụma, maọbụ onye nwere àkụ ri nne site n’ọlụ dị mma. Ụwa na elekwasị onye dị otú ahụ anya; ma olenaole nime anyị pụrụ inweta iruọma n’ụzọ dị otú ahụ.

Lee obiụtọ anyị nwere na Jisọs sịrị: “Ngọzi nādiri ndi bu ogbenye nime mọ ha: n’ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu.” “Ngọzi nādiri ndi esogbuworo n’ihi ezi omume; n’ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu” (Matiu 5:3, 10). Anyị adịghị echegbu onwe anyị banyere ihe ụwa naeche banyere anyị, ọ bụrụ náánị na anyị pụrụ ibi ndụ gaadị Jisọs mma. Ọ gaakwụ anyị ụgwọọlụ n’iheọma ntà ọ bụla anyị gaeme ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasịobi n’ihe Ọ kpọrọ anyị ka anyị mee. “Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ñua n’aha onye nēso uzọm, n’ezie asim unu, ọ gagh-etufu ugwọ-ọlụ-ya ma-ọli” (Matiu 10:42).

Ọ gaejuworị ndị naesoụzọ Ya anya nke ukwuu mgbe Jisọs kuuru otù nwatakịrị n’ụkwụ Ya wee sị: “Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n’ala-eze elu-igwe” (Matiu 18:4).

Ndị naesoụzọ Ya iri fọdụrụ n’ụzọ pụtara ìhè nwekwara ụdị nghọta ahụ banyere Alaeze nke Kraist dịka Jemes na Jọn nwere. Ha enweghị obiụtọ n’ebe mmadụ abụọ ahụ nọ, n’ihi na ọ dị ka ha naagbalị ịgan’iru karịa mmadụ iri ndịọzọ ịrọpụtara onweha ọnọdụ kachasị mma.

Ikwesị Ntụkwasịobi n’ihe Ntà Dị Icheiche

N’otù ilu Jisọs tụrụ, onyenwe orù ahụ sịrị orù ya, “I mere nke-ọma, ezi orù: n’ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n’ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri” (Luk 19:17). Chee échìchè ihe dị iche! O kwesịwo ntụkwasịobi n’ihe dịkarịsịrị ntà, ugbu a kwa enyere ya ike ịchị obodo iri.

Ikwenye Ịhụrụ Kraist Ahụhụ

Ndịozi nke Jisọs ahụtaghị na ha naarịọ ihe naezighị ezi, mgbe Jisọs jụkwara ha ma ha jikeere iso Ya hụọ ahụhụ ka ha wee nwee ike inweta ihe ahụ nke ha naachọ, ha kwenyere ngwangwa na ha gaeme ya.

Jisọs matara obi ha, wee sị: “Ikom ka unu gāñu n’ezie … ma inọdu n’aka-nrim, na n’aka-ekpem, abugh nkem inye, kama ọ diri ndi Nnam doziworo ya.” Ịnwụ n’ihi iso ụzọ nke Kraist agaghị azụtara ha ọnọdụ n’Eluigwe ọ bụrụ na ejighị Ọbara sachaa obi ha ka ọ dị ọcha. Aghaghị ibu ụzọ zọpụta onye ọ bụla, tutu ọlụ ya niile enwe ụgwọ n’Eluigwe.

Jemes wee bụrụ onye mbụ egburu n’ihi okwukwe ya n’etiti mmadụ irinaabụa ahụ. Ya onweya, na Ndịozi fọdụrụ, mezuru iwu Kraist ijé ebe niile náekwusa na Jisọs anwụwo ikpuchi mmehie ha na O siwo kwa n’ọnwụ bilie ọzọ. Ozízí a mere ka ọtụtụ mmadụ wee iwe nke ukwuu n’ihi na ha achọghị ikwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke n’ezie na O biliwo kwa n’ọnwụ. Eze Herod chọrọ ime ihe naatọ Ndị Ju kpọrọ Jisọs asị ụtọ, o wee kpọrọ Jemes were mmaagha bipụ ya isi. Jemes ekwuworị na ya jikeere ịhụ ahụhụ n’ihi Kraist; mgbe ule ahụ bịakwara n’ụzọ ya, ọ laghachịghị azụ.

Jọn, n’onweya kwa, mụtara iheọmụmụ Jisọs kuziri n’oge a. Ọ bụ ya bụ Onyeozi nke achụpụrụ gaa n’Agweetiti Patmọs náánị ya n’ihi nkwusa ya. N’ebe ahụ Chineke sọpụụrụ ikwesị ntụkwasịobi ya site n’inye ya nnyobaanya n’ihe nke dị n’iru. Jọn hụrụ Jerusalem ọhụụ, na aha nke ya onweya n’etiti aha Ndịozi irinaabụọ ahụ n’elu nkume eji tọọ ntọala obodo ahụ. N’oge ahụ o nweghị mmetụta ibuli onweya elu, ọ ghaghị iwedaworị onweya ala nke-ukwuu mgbe ọ hụrụ nsọpụrụ nke Chineke gaje ịwụkwasị ya. Jọn dere ihe niile ọ hụrụ, ọ dị kwa nime Baịbụl dịka Akwụkwọ Nkpughe.

Ijéozi n’Afọofufo

Anyị niile pụrụ inwe mmụọ ahụ jikeere ijere ndịọzọ ozi karịa inweta ihe niile nye onweanyị. Mgbe azọpụtasịrị anyị, anyị aghaghị ịgan’iru n’ikpe ekpere na ịmụ Okwu Chineke. Ka anyị naaga n’iru iji ndụ anyị chụaàjà nye Jisọs, ka ọ naadịrị anyị mfé karịa iwere afọofufo mee ihe ọ bụla Jisọs chọrọ ka anyị mee, ọbụná asị na anyị achọghị ime ihe ahụ na mbụ. Anyị pụrụ ịhụ ndịenyi anyị ka ha naenweta iheonwunwe nke ụwa nka karịa anyị; ha pụrụ ịbụ ndi anaelekwasị anya mgbe ọ dịghị onye naahụta anyị. Ma Jisọs naahụ obi anyị, ọ bụrụ kwa na anyị naalụ ọlụ ka obi dị Ya ụtọ n’ọnụahịa ọ bụla Ọ gaasị anyị na mgbe ikpe ahụ: “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n’ọñu nke onye-nwe-gi” (Matiu 25:23).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka ndị naesoụzọ ahụ chere banyere Alaeze nke Kraist?
  2. Òlee ndị bụ Jemes na Jọn?
  3. Gịnị ka Jemes na Jọn chọrọ?
  4. Gịnị, n’iheọmụmụ a, ka Jisọs kpọrọ Onweya, onyenwe kaọbụ orù?
  5. N’ọnọdụ dị añaa ka Jisọs chọrọ ka ndị naesoụzọ Ya debe onweha?
  6. Gịnị ka ndị naesoụzọ Ya sịrị na ha jikeere ime n’ihi Jisọs?
  7. Òlee otú Jemes si gosipụta na ya gaenye ihe niile n’ihi Jisọs?
  8. Òlee ụdị ahụhụ Jọn natara n’ihi ikwusa banyere Jisọs?
  9. Ụgwọọlụ dị añaa ka Jọn hụrụ agaenye ya mgbe ọ hụrụ Jerusalem Ọhụụ ahụ?
  10. Òlee otú Onyenweanyị gaesi kwụghachị ndị niile soro Ya n’ezi omume ụgwọọlụ?