Mak 10:46-62

Lesson 185 - Junior

Memory Verse
“Laba, okwukwe-gi azọputawo gi” (Mak 10:52).
Notes

N’akụkụ Okporoụzọ

Jisọs na ndị naesoụzọ Ya naagabiga n’etiti obodo Jeriko n’ụzọ ha ijeru Jerusalem. Nka bụ ijè ikpeazụ Jisọs gara site na Jeriko, n’ihi na o rubewo oge Ọ ga arara “ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-ngbaputa n’ọnọdu ọtutu madu” (Mak 10:45). Ọtụtụ igwè mmadụ soro Jisọs.

Batimiọs, nwa nwoke Timiọs, bụ onye kpuruisi. Ọ na anọdụ n’akụkụ ụzọ, na arịọ arịrịọ. O nweghị ụzọ ọzọ ọ gaesi nweta ihe ọ gaeji dị ndụ. Ka ọ nụrụ ụzụ nke ìgwè mmadụ ahụ naeso Jisọs ọ jụrụ ajụjụ ihe ọ pụtara. Ngwangwa ọ nụrụ na “ọ bụ Jisus Onye Nazaret,” Bātimiọs malitere ịkpọku Ya.

Otù Ohere

Nwoke ahụ kpuru ísì enweghị ụzọ ọzọ ọ gaesi mata n’ezie na nwoke ahụ bụ Jisọs. O kweere n’akụkọ ahụ; na, nime alaala obi ya, o kweere na Jisọs gaenyere ya aka.

Ọtụtụ mmadụ, anaemekpá arụ n’anụarụ na nime mmụọ, enwewo otù ụdị ohere a nke Bātimiọs nwekwara. Ụfọdụ mmadụ adịghị ekwere na ha chọrọ inyeaka nke Onyenweanyị, ọ bụ ezie na ha enweghị inyeaka n’ụzọ nke anụarụ bụrụ kwa ndị kpuru ísì nye ihe nke ime mmụọ. Ọtụtụ mmadụ anụwo akụkọ na Jisọs Onye Nazaret nọ nso, ma ha ekwereghị. Ndịọzọ ndị matara na ha apụghị inyere onweha aka anụwo kwa akụkọ eziokwu ahụ, otú ọ dị, ha adịghị akpọku Jisọs maka inyeaka. N’ihi nka, ha adịghị enweta inyeaka n’anụarụ maọbụ nime mmụọ. Na Jemes 4:2 anyị naagụ. “Unu enwegh¸ n’ihi unu ariọgh.”

Ọ dị ụfọdụ ndịọzọ naatụ àtụmàtụ ikpé ekpere otù ụbọchị; ha naele anya ikpé ekpere otù oge; “mgbe m’nwere oge,” ka ha naasị (Ọlụ Ndi-ozi 24:25). Iheọmụmụ a naegosi anyị óké iheegwù pụrụ ịdị n’ịtụfu oge; Jisọs agabigaghị kwa site na Jeriko ọzọ. Nka bụ náánị ohere Bātimiọs nwere ịnata inyeaka; “oge ọzọ” abịaghị kwa. Asị na Bātimiọs tụfuru oge tutu ya ekpee ekpere, eleghịanya ọ gaghị ahụworị ụzọ, ọ gaghị enwekwa oge ọzọ ịrịọta ebere, ọ gaghị enwe kwa ohere iso Jisọs.

Ebere

Site n’okù ọ kpọrọ, Bātimiọs gosirị na ya kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke ahụ ekwere ná mkwà. Mgbe Bātimiọs kpọrọ Jisọs “nwa Devid,” ọ bụ otù ihe ahụ dịka mgbe asịrị, “Jisus¸Onye-nzọputa ahu ekwere ná nkwà.” Bātimiọs rịọrọ maka ebere. Ọ sịghị na ya kwesịrị ịhụ ụzọ, maọbụ na ọ bụ ụgwọọlụ ya lụtara, maọbụ na ya kwesịrị inwe ya. Ekpere ya bụ ka Onyenweanyị meere ya ebere. Mkpu o tiri bụ maka inyeaka nke onweya -- “Merem ebere.”

Adaghị Mbà

Agwaghị anyi na Jisọs gosipụtara na Ya nụrụ mkpu nke nwoke ahụ kpuru ísì tiri na mbụ. Ndị niile nọ Bātimiọs gburugburu gbalịrị ịkwụsị ya ịkpọòkù ahụ. Eleghịanya ha gbalịrị ịgwa ya na ọ naegbochi ndịọzọ ịnụ ihe, maọbụ na Jisọs agaghị ege onye dị ka ya ntị. Ndịọzọ enwewo nnwapụta dị otú a na mgbe ha bu ụzọ kpọkue Jisọs maka ebere. Eleghịanya ọ dị ha ka azaghị ekpere ha na mbụ ahụ. Ọ gaabụ na ndị nọ ha gburugburu gbalịrị ime ka ha daa mbà. Naagbaghị agụgọ ekwensu gaabịaworị ịgbalị ime ka ha kwenye na Jisọs enweghị ohere maka ha, na ọ gaghị anụ kwa ekpere ha.

Ọ gaabụ ihe dị ukwuu karịa okwu ọnụ nke ndị ahụ nọ gburugburu ime ka Bātimiọs daa mbà. Ọ chọrọ inyeaka, ọ matakwara na ọ dị ya mkpà. Ọ matakwara na Jisọs pụrụ inyere ya aka, n’ihi ya o wee tie mkpu karịa -- naagbaghị kwa agụgọ, o tikwara karịsịa.

Jisọs na anụ naaza kwa ekpere nke onye nweworo mkpebi. Ọ nụrụ olu Bātimiọs. Jisọs ejekurughị ya wee gwọọ ya site n’ikwu okwu ụfọdụ mmadụ apụghị ịghọta, dịka ụfọdụ mmadụ gaele anya na Jisọs gaeme. O nyere iwu ka akpọọ Bātimiọs. Náagbaghị agụgọ olileanya dị ukwuu gaamaliworị nime obi Bātimiọs mgbe ọ nụrụ okwu ndịa, “Ọ nākpọ gi.”

Ike Niile O Tinyere

Bātimiọs yipụrụ uwe ukwuu ya, dịka mmadụ naeyipụ uwe ya, ka o wee ghara inwe ihe mgbochi ọ bụla na ihe ọ bụla ga-ejide ya. Bātimiọs jekuuru Jisọs. O nyeghị ihe ngọpụ. Ọ sịghị na ya chọrọ onye gaedu ya, maọbụ na ísì ya kpuru bụụrụ ya ihe mgbochị. O jikeere ijè mgbe Jisọs kpọrọ ya. Eleghịanya ọ mataghị otú ọ gaesi jekuru Jisọs, ma ọ biliri wee malite ijé. Ọ bụ ihe agaagba agụgọ na ọ kpọbiri ụkwụ maọbụ were aka naachọgharị ụzọ, n’ihi na ọ bụ olu Jisọs kpọrọ ya, ọ naachọ kwa ịza okù ahụ.

Otù Iruọma Pụtara Ìhè.

Jisọs jụrụ nwoke ahụ kpuru ísì ihe ọ chọrọ. Bātimiọs asịghị na Onyenweanyị maara mkpà ya. Nwoke ahụ kpuru ísì rịọrọ otù iruọma pụtara ìhè, “Rabonai, ka eme ka m’hu uzọ.” Ọ gaadị ka Jisọs kwesịrị ịma ihe nwoke kpuru ísì gaachọ. Jisọs matara. Jisọs chọrọ ịnụ arịrịọ ahụ site n’egbugere ọnụ nke nwoke ahụ.

N’okwu Chineke ahụ ekwuru N’eluugwu (Iheọmụmụ 21), Jisọs kuziri, “Riọnu, agēnye kwa unu” (Matiu 7:7). Taa, mgbe ụmụ mmadụ nwere ihe ha gaarịọ, Onyenweanyị gaachọ n’obiụtọ ka ha kwupụta arịrịọ ha ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ebere n’aka Chineke n’ezie, ọ gaarịọ maka ya. Ọ bụrụ na ị naekperị ekpere, naele anya ịnata ọgwụgwọ nye arụ gị maọbụ otù nnwapụta nye mkpụrụobi gị, eleghịanya ịnatabeghị n’ihi na ịrịọbeghị. “Riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọñu-unu we zue” (Jọn 16:24).

Okwukwe

Jisọs sịrị Bātimiọs, “Laba, okwukwe-gi azọputawo gi.” Okwu ahụ abụghị, “Okwukwe-gi ga-azọpụta gị.” Jisọs sịrị, “Okwukwe-gi azọputawo gi” maọbụ na okwukwe ya azọpụtawo yarị -- ngwangwa ahụ o kweere “Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ.”

Lee ụbọchị ebube ọ naaghaghị ịbụwororị Bātimiọs! Ịmalite náahụ ụzọ! Ọ bụghị inyoghị inyoghị na mbụ, ọ bụghị kwa ntakịrị ntakiri; kama ngwangwa o wee pụ ịhụ ụzọ. Okwukwe ya nime Jisọs webatara ìhè ebe ahụ ọchịchịrị dịworo. O wetara inwere onwe site n’egwù na ụkọ. Ọ nọghị kwa naenweghị inyeaka na naenweghị olileanya. Lee obiụtọ ọ naaghaghị inwe na ọ rịọrọ Jisọs maka ebere! Lee ụdị mgbanwe weere ọnọdụ mgbe Bātimiọs kweere!

Agwaghị anyị oge ra añaa Bātimiọs kpuru ísì, maọbụ na ọ dị mgbe ọ bụla ọ hụrụ ụzọ. Agwaghị anyị ihe kpuru ya ísì. Ihe niile a abụghị ihe Kraist naatụle. Jisọs naele anya okwukwe nime obi. Onye ọzọ ka Jisọs sịrị: “Ọ buru na i puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile” (Mak 9:23).

Agwọrọ Ndịọzọ

Ọ bụghị náánị Bātimiọs natara ọgwụgwọ nye arụ ya n’ihi na o kweere. Anyị amụwo ihe banyere nwayị ahụ agwọrọ mgbe o metụrụ ọnụuwe Jisọs aka (Iheọmụmụ 80), na onye Jisọs sịrị, “Nwam nwayi, okwukwe-gi azọputawo gi” (Mak 5:34). Anyị agụwo ihe banyere orù nke ọchịagha ahụ naachị otù narị ndịagha (Iheọmụmụ 32) onye agwọrọ n’otù “oge hour ahu” nke Jisọs gwara ọchịagha ahụ naachị otù narị ndịagha okwu sị: “Laba; dika i kwere, ka emere gi” (Matiu 8:13).

Ọ bụghị náánị Bātimiọs bụ onye kpuru ísì natara ịhụ ụzọ ya n’ihi okwukwe ya. N’oge ọzọ, ndikom abụọ kpuru ísì tikuru Jisọs maka ebere. O metụrụ aka n’anya ha wee sị, “Dika okwukwe-unu si di ka emere unu” (Matiu 9:29, 30). Anya ha wee meghee.

Ọgwụgwọ nye Gị

Ọ bụghị náánị n’oge edere Baịbụl ka Jisọs gwọrọ ndị arụ ha naadịghị ike. Ọtụtụ ìgwè mmadụ, n’oge nke anyị a, ndị nweworo otù ụdị okwukwe ahụ nke Bātimiọs nwere na Kraist, anatawo ọgwụgwọ nke ọrịa na mmekpáarụ siri ike. Ike dị n’Ọbara Jisọs ịzọpụta mkpụrụobi, na ịgwọ anụarụ. Ọgwụgwọ dị dịka Okwu Chineke si dị. Aisaia Onyeamụma, n’ịtụaka n’ihe banyere Jisọs, dere, “Ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike” (Aisaia 53:5). Enyere anyị ndụmọdụ a banyere ọgwụgwọ: “Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayị gēme kwa ka o bilie … nēkpe kwa ekpere n’ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike” (Jemes 5:14-16).

Tutu Jisọs arịgoro n’Eluigwe, O nyefere ọlụ ukwuu ahụ ịga “n’uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè.” Ọ gara n’iru naekwu sị “Ihe-iriba-àmà ndia gēso kwa ndi kwere … ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike” (Mak 16:17, 18). Jisọs lụrụ ọtụtụ ọlụ ịrịbaàmà nke ọgwụgwọ. Ọ gwara ndị naesoụzọ Ya na ndị niile kwere gaeme ihe nke Ya onweya meworo, na “ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa” (Jọn 14:12).

Ịgbaàmà Dị Icheiche

Anyị nwere ọtụtụ ịgbaàmà nke edere n’akwụkwọ na agwọwo ndị arụ naadịghị ike site n’ekpere nke okwukwe. Agwọwo ụmụ mgbe ndị mụrụ ha kpere ekpere n’okwukwe. Chineke naasọpụrụ kwa ekpere na okwukwe nke nwata. Ọtụtụ mmadụ ka agwọworo site n’ekpere na okwukwe nke nwata.

N’ụbọchị ndịa Jisọs emewo ka ndị kpuruísì hụ ụzọ, dịka O mewooro Bātimiọs. Otù nwaokoro naeso anyị efè òfùfè, kpuru ísì site n’otù ihe gbawara n’oge Agha Ụwa nke abụọ. Enweghị olileanya ọ bụla na ọ gaahụ ụzọ ọzọ. Emere njikere izila ya ụlọ, dịka onye kpuru ísì. O kpere ekpere, nwee kwa okwukwe n’otù Jisọs ahụ nke gwara Bātimiọs okwu. Dịka Bātimiọs, Onyenweanyị gwọrọ anya ya. Ịgbaàmà nke nwaokoro ahụ ka edere na mpempe akwụkwọ mgbasa Oziọma nke Apostolic Faith: “Nime Ụgbọ-miri Enterprise.”

Iheọmụmụ anyị bụ banyere ọgwụgwọ nke onye kpuru ísì n’anụarụ. Ka mmụta nke Okwu ahụ tinye olileanya na obiike ọhụụ nime obi ndị niile nwere ọrịa n’arụ ha. Jisọs ka naalụ kwa ọlụebube nke ọgwụgwọ. Eleghịanya ikpewo ekpere maka ọgwụgwọ ma ị natabeghị ya; kpee ọzọ n’okwukwe. Ụmụntakịrị, unu pụrụ ikpé, ọ bụghị náánị nye onwe unu kama unu pụkwara ikpé n’ihi ndịọzọ, Chineke gaanụ zaa kwa ekpere unu.

Náenweghị obiabụọ Bātimiọs natakwara ịhụụzọ nke imemmụọ, n’ihi na ọ “nēso Jisus.” N’iheọmụmụ anyị ọzọ anyị gaamụ ihe banyere ọgwụgwọ na nzọpụta nke onye kpuru ísì nime mmụọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ Bātimiọs?
  2. Gịnị mere nka ji bụrụ náánị ohere o nwere izute Jisọs?
  3. Gịnị bụ mkpu ahụ Bātimiọs tiri?
  4. Gịnị ka o mere mgbe asịrị ya “kpuchie ọnu ya”
  5. Gịnị mere Jisọs ji jụọ ya ihe ọ chọrọ?
  6. Òlee otú o si nweghachị ịhụụzọ ya?
  7. Gịnị ka Bātimiọs mere mgbe agwọsịrị ya?
  8. Òlee otú mmadụ n’ụbọchị taa pụrụ isi nata ọgwụgwọ n’aka Onyenweanyị?