Lesson 186 - Junior
Memory Verse
“Nwa nke madu abiagh ila ndu madu n’iyi, kama ka ọ we zọputa ha” (Luk 9:56).Notes
Ịchọsiike Ịmata
Udé Jisọs na ọlụ ịrịbaàmà niile Ọ lụworo agbasawo na Judịa na Galili niile. Ebe ọ bụla Jisọs nọ óké igwè mmadụ naesoro Ya, naachọsiike ịhụ ka ọ naeme ihe ha naahụtụbeghị mbụ, ọbụná na ọ bụ ezie na ndị ka n’etiti ha achọghị ife Ya òfùfè.
N’otù nime ijè Jisọs ịga Jeriko, otù onye ọnaụtụ aha ya bụ Zakiọs hụtara onweya n’etiti igwè ndị ahụ naakwarịta onweha ịbịaru nso ịhụ ka alụrụ otù ọlụebube. Eleghịanya o chebeghị échìchè banyere ịbụ onye naesoụzọ Jisọs, ma ọ dị ka onye ọ bụla ọzọ naachọ ịhụ Onye Nazaret ahụ, n’ihi ya ọ naabịaru kwa nso. Ma ọ dị mkpụmkpụ nke ukwuu ịhụ ụzọ gafee isi ndị nọ ya n’iru, ọtụtụ mmadụ nọ kwa ndị naeguzogide onweha na ọ pụghị ịgaru n’iru. N’ihi nka, Zakiọs gbara ọsọ gaa n’iru n’elu osisi sycomore nke dị n’akụkụ ụzọ ebe Jisọs gaesi agafe. Site n’ebe ahụ ọ gaenwe ike ilekwasị Jisọs anya mgbe Ọ naabịa, agaghị ahụkwarị ya onweya.
Àkụ
Zakiọs bụ ọgaranya, Jisọs akụziwo kwa na ọ bụ ihe siriike nye ndị ọgaranya ịbà n’Eluigwe. Ọ bụghị na Jisọs ahụghị ndị ọgaranya n’anya dịka Ọ hụrụ ndị ogbenye, kama na ha ahụghị Ya n’anya. Ọtụtụ mgbe ndị nwere àkụ naéchèkarị banyere ego ha karịa ka ha naéchè banyere Chineke. N’ihi nka n’uche nke ndị Farisii, ha chère na ọ bụ ihe ana apụghị ime na agaazọpụta onye ọnaụtụ mkpụkpụ ahụ rịgooro n’elu osisi. Ndị Ju kpọkwara ya asị n’ihi na ọ bụ onye ọnaụtụ. Ná ntụle nke ha ndị dị otú ahụ agafewo inwe olileanya nke mgbapụta. Nka gaabụworị otù nime ihe mere na ha ekweghị ka Zakiọs nwee ike rue Jisọs nso n’etiti ìgwè mmadụ ahụ.
Odudu Nke Chineke
Ònye gaéchèworị na ịrịgo n’elu osisi nke Zakiọs rịgoro gaèdubawo yarị na nchèharị? Eleghịanya anyị pụrụ ileghachị anya n’azụ wee hụ ọtụtụ ihe mere n’oge garaaga nke duworo anyị bịakute Jisọs. Anyị gaécheworị na anyị naatụ àtụmàtụ maka ndụ anyị; maọbụ na ihe dị icheiche bụ nnọọ ihe-mberede; ma dịka anyị nwere agụụ n’obi anyị maka nzọpụta Chineke duru n’ụzọ nke Ya onweya rue mgbe anyị nụrụ eziokwu ahụ kwere kwa na ya.
“Onye Na-achọ”
Ozízí nke Jisọs bụ: “Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.” N’anya nke Ya, onye ọ bụla naéchègharịbeghị ná mmehie ya bụ onye mmehie. Ma ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye nke ahụ abụghị ihe ọ bụla, Ju maọbụ Onye mbaọzọ, orù maọbụ onyenwe onweya, onye gụrụ akwụkwọ maọbụ onye naagụghị maọlị; onye ọ bụla nwere otù ohere ahụ ịbụ onye azọpụtara ọ bụrụ na ọ gaéchègharị kwere kwa na Jisọs.
Onye ọ bụla kweere n’eziokwu maara na apụrụ ịzọpụta onye ọ bụla nke chọrọ, ma ọ bụghị mmadụ niile nụworo ozízí ahụ. Ná mmalite nke ijéozi Jọn Wesley ndị mmadụ kweere na ọ bụ mmadụ olenaole nwere iruọma ka apụrụ ịzọpụta. Ndikom naalụ ọlụubi, ụmụokoro naelekọta anụụlọ, ndị ogbenye naalụsi ọlụ ike n’ụlọọlụ dị icheiche na ebe anaegwupụta unyi enweghị olileanya. Ma mgbe azọpụtasịrị Jọn Wesley doo kwa ya nsọ, Chineke zipụrụ ya ka ọ gaa kwusaa n’akụkụ obodo niile nke England na ámá niile nke London, na “onye na-achọ” pụrụ ịbịa ka azọpụta ya: onye ọlụubi na nwaeze, nwaokoro naazụ anụụlọ na kwa onye nkwusa, onye nọ n’apịtị nke mmehie na onye naaga ụkọ anaasọpụrụ.
Ọ bụghị ihe ijuanya na óké ọñụ gbawara gburugburu obodo ahụ! Ụfụ nke ụkọ wee gabiga. Ọñụ nke dị n’obi ụmụ mmadụ mere ka ha chefue na ha bụ ndị ogbenye. Óké ntute wee gbasaa, ewee mụbata ọtụtụ puku mmadụ n’Alaeze Chineke. Ha bụrụ abụ otuto nye Chineke onye hụrụ ha n’anya were kwa Ọbara Ya dị óké ọnụ gbata ha. Ka ha naaga kwa n’iru n’ikpe ekpere naagwa kwa Jisọs ka ịhụn’anya ha hụrụ Ya ra, edokwara ha nsọ.
Ọtụtụ ndị ahụ anaasọpụrụ ndị chèworo na ọ bụ náánị ha ka apụrụ ịzọpụta were iwe n’ihi ozízí nke Jọn Wesley. Ha wezugara onweha iche site n’etiti ndị ahụ nwere obiụtọ ndị mụtaworo ma nwapụta kwa nzọpụta ahụ zuruòkè, ha wee tụfue ngọzi ahụ gaabụworị nke ha ọ bụrụ na ha ñara ntị n’ozízí niile nke nwoke ukwuu nke Chineke ahụ. Ha dị ka ndị Farisii ahụ mara Jisọs ikpé n’ihi ijé n’ụlọ Zakiọs.
Mgbe Jisọs bịaruru nso osisi ahụ nke onye ọnaụtụ mkpụmkpụ ahụ zobere onweya, O weliri anya legide ya ka agaasị na Ọ hụrụ Zakiọs mgbe ọ naarịgo n’osisi ahụ. Jisọs mazuru ihe niile, Ọ matakwara na nwoke mkpụmkpụ ahụ nọ n’elu ebe ahụ. Ọ matakwara na Zakiọs gaachọ ka Ya bịa n’ụlọ ya.
Idoziụzọ
Jisọs sịrị Zakiọs: “Me ngwa, ridata; n’ihi na aghaghm inọdu n’ulo-gi ta.” Ọtụtụ nime ndị Farisii ahụ naagụ onweha na ndị ezi omume achọghị Jisọs n’èzínaụlọ ha, ma Zakiọs rịdatara ngwangwa otú o nwere ike. Ọ sịghị na Jisọs bụ nnọọ ogbenye na O kwesịghị kwa iri ihe n’ụlọ ahụ maramma nke Zakiọs. Ọ hụtara Jisọs dịka onye karịrị mmadụ efu. Ọbịbịa nke Jisọs ewetawo amamikpé n’obi ya n’ihi mmehie ya niile, ngwangwa ọ pụkwara ikwu okwu, ọ sị Jisọs; “Le, Onye nwe-ayi, nkera ihe m’nwere ka m’gēnye ndi-ogbenye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ.”
Gịnị mere Zakiọs ji kwue otú ahụ? Dịka ihe ọ matara ra o chere na Jisọs amaghị ihe ọ bụla banyere ihe niile naadịghị mma o meworo. Ma Zakiọs nabatara Onyenweanyị n’ọñụ, ọ bụghị náánị dịka onyeọbịa n’ụlọ ya, kama dịka Onyenzọpụta nime obi ya. Mgbe ọ bụla Jisọs batara nime obi onye ọ bụla mmehie niile aghaghị ịpụ. Mgbe mmehie pụrụ n’obi ya azọpụtawo ya, ọ matakwara na ya aghaghị idoziụzọ ya. Ọ dịghị mkpà na mmadụ gaagwa onye azọpụtara n’ezie na ọ ghaghị idozi ihe niile o mebisiworo; Mmụọ nke Chineke na Okwu Ya gaakuziri ya nke ahụ. Ọ bụ Chineke gbagharaworo OnyeKraist ahụ, ọ gaachọ kwa ka mmadụ gbaghara ya.
Agbaghaara Ya
Zakiọs wee pụọ, naaga n’akụkụ Onyenzọpụta ya n’ọñụ, o nwere obiụtọ n’ihi na agbagharawo ya mmehie ya niile. Òlee ihe banyere ndị naele anya nọ n’akụkụ? Hà nwere ọñụ na azọpụtara otù onyemmehie? Obi ọ dị ha ụtọ na onye ọnaụtụ mkpụmkpụ ahụ agaghị aghọgbu kwa ha ọzọ? É-è. Ha ahụtaghị mgbanwe ahụ. Ezi omume nke onwe ha ekpuchiwo ha anya. Ha ka naakpọ ya onyemmehie, wee naechè kwa na n’ezie na Jisọs gaemeru Onweya site n’ịga n’ụlọ onyemmehie dị otú ahụ. Ha gụrụ ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii dịka ndị nke Chineke nwetara, ụmụ nke Abraham, n’ihi na ha naalụsi ọlụ ike idebe Iwu ahụ. Ma Jisọs agwawo ha n’oge ọzọ na ọ bụrụ na ha bụ ụmụ Abraham na ha gaalụ ọlụ Abraham lụworo.
Abraham kweere rị na Jisọs bie kwa ndụ nke ezi omume. Jisọs wee gwa ha n’ụzọ pụtara ìhè “Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bụ kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime” (Jọn 8:44). Ndị niile naeme ihe Jisọs naachọ bụ ndị bụ ụmụ Abraham n’ezie, ma ha bụ ndị Ju maọbụ Ndị Mbaọzọ. “Ọ buru na unu-onwe-unu bu ihe di n’aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwà si di” (Ndi-Galetia 3:29).
Questions
AJUỤJỤ DỊ ICHEICHE- Ònye bụ Zakiọs?
- Gịnị mere ndị Ju ji kpọ ya asị?
- Gịnị ka o mere ka o wee hụ Jisọs?
- Gịnị ka Jisọs mere mgbe Ọ bịaruru n’ebe osisi ahụ dị
- Òlee otú Zakiọs si zaghachị Jisọs?
- Gịnị bụ idoziụzọ?
- Gịnị bụ ozízí nke Jọn Wesley kwụsara nke bụ ihe ijuanya nye ndị bi n’England?
- Òlee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị hụrụ Jisọs n’anya?