Abù Ọma 66:1-20

Lesson 187 - Junior

Memory Verse
“M’gākwughachi Gi nkwàm nile m’kwere Gi” (Abù Ọma 66:13).
Notes

Otuto site N’ọnụ Mmadụ niile

N’àmàokwu olenaole mbụ nke Abù Ọma 66, anaagwasị mmadụ niile na mba niile ike ka ha fèe Chineke òfùfè. Ọ bụ ọlụ na ohere nke mmadụ niile, n’ihi na Chineke kwesịrị ka enye Ya otuto.

Onye dere Abù Ọma naagwa anyị otù ụzọ nke anyị pụrụ isi fèe Onyenweanyị òfùfè -- site n’iti “mkpu ọñu.” Náagbanyeghị ebe anyị nọ, anyị pụrụ ifè Onyenweanyị site n’otuto. Eleghịanya òfùfè ahụ agaghị abụ otù abụ ụtọ maọbụ nke maramma na ntị ma ọ pụrụ ịdị Onyenweanyị ụtọ. Mgbe mmadụ malitere ito Chineke, anaagọzi obi ya ọ naejupụta kwa n’ọñụ. Inye Chineke otuto na ekele bụ mkpu ọñụ n’ebe Chineke nọ, nye ndị na anụ, nye kwa onye ahụ nke naeto Onyenweanyị.

Otuto Óké Ọñụ

Náagbaghị agụgọ anyị anụwo ka ụmụ mmadụ naekwu banyere ọnwụnwa na ọrịa ha, n’iru gbarụrụagbarụ na olu jupụtara n’iruuju. Nka abụghị otuto ọñụ. I nwere ike nụ onye ọzọ naekwu otú Chineke jiworo nọnyere ma gọzie ya site n’ọnwụnwa na ọrịa. Otuto ya bụ nke ọñụ jupụtakwara n’ebube, n’ihi na ọ naekwu banyere ịdịukwuu na ịkwesị ntụkwasịobi nke Chineke. Lee otú onye dị otú a gaejupụta n’ekele na ọ naefè Chineke dị ndụ Onye naaza kwa ekpere! Chineke naanara nsọpụrụ na otuto, anaeme kwa ka ndịọzọ dị ike n’okwukwe.

Ọlụ Dị Ukwuu Dị Icheiche nke Onyenweanyị

Onye ahụ dere Abù Ọma naagwa anyị ka anyị tụlee óké ọlụ niile nke Onyenweanyị, ihe dị icheiche nke O meworo. O meworo anyị ọtụtụ ihe nke anyị gana añụrịọñụ nime ha. Ụfọdụ mmadụ naenwe obiụtọ n’ọtụtụ ihe maramma nke Chineke kère ma ha adịghị ekele Chineke n’ihi ha. Mgbe ị hụrụ okoko osisi, ị naatụgharị uche otú Chineke si naeme ka ọ naeto? Mmadụ pụrụ ịhụ óké ọlụ nke Chineke ebe ọ bụla o lere anya.

Ewezuga idozi ihe dị icheiche nke dị mma n’anya, Chineke naeme ọtụtụ ihe nye mmadụ niile. Ọ bụ Ya naarọpụtara anyị iheoriri. Ọ dịghị ezite anyanwụ naenye okpomọkụ na mmiriozuzo dị nwayọ nke ọ bụrụ na ọ dịghị, ihe akụrụ n’ala agaghị eto? Chineke naenye anyị ikuku nke anyị naekuru n’ume -- n’ezie, ndụ anyị kwa. Ezi ihe niile sitere n’aka Chineke (Jemes 1:17). Ọ bụghị ihe ijuanya na Onye ahụ dere Abù Ọma sịrị anyị “Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.”

Ifè Òfùfè

“Le ka ọlu-Gi nile si di óké egwù!” Ọ bụ na anyị apụghị ikwu: lee ka O si jupụta n’ike, n’ịdịukwuu, dị ebube, kwesị kwa ọjịjá! Ọlụ Chineke dị ọtụtụ -- nke imemmụọ na nke anụarụ, nke ukwuu na nke ntà -- otù ọlụ ebube n’elu ibe ya. Dịka anyị naahụta ịdịukwuu nke Chineke, anyị naenwe mmetụta n’ezie na anyị kwesịrị ifè Ya òfùfè.

Otù ụbọchị naabịa mgbe mmadụ niile nke ụwa gaakpọ isi ala nye Onyenweanyị. “Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayị kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēgburu, ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke” (Ndi Rom 14:11). Lee ka o si bụrụ ihe kachasị mma ìfè Onyenweanyị òfùfè ugbu a, n’ihi na i nwere ekele n’obi gị, karịa mgbe aga akwagide gị ịmara Ya dịka Chineke otù ụbọchị.

Otuto site n’ọnụ Ndi nke Chineke

“Jenu, hu ọlu nile nke Chineke.” Onye dere abụ a naeweta n’iru anyị ụfọdụ ụzọ nke Chineke siworo lụara ndị Ya ọlụ. Ì chetara na ọ bụ Chineke mere ka mmiri niile nke Osimiri Uhie kewaa, Ụmụ Israel wee gafee n’ala kpọrọ nkụ (Ọpupu 14:21, 22)? Ì chetara na Miriam (nwanne nwayị Moses) ghọrọ onye ekpentá mgbe ya na Eron nwanne ya nwoke biliri megide Moses, bụ onyendú ha, site n’ikwu sị: “Ọ bu ezie na náni Moses ka JEHOVA wereworo kwue okwu? Ọ bugh kwa ayi ka O wereworo kwue okwu?” (Ọnu-ọgugu 12:1, 2, 10). Chineke nụrụ ya. Enyere ha ahụhụ n’ihi mbili mmegide ahụ na n’ihi ibuli onweha elu.

Chineke naanụ ihe naahụ kwa ụzọ. “N’ebe nile ọ bula ka anya abua nke JEHOVA di, nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche” (Ilu 15:3). “N’ihi na JEHOVA, anya-Ya nējeghari n’uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n’akuku ndi obi-ha zuru òkè n’ebe Ọ nọ” (II Ihe-Emere 16:9).

Ọ bụghị náánị Ụmụ Israel ndị Chineke nyeere aka n’ụzọ dị ebube, kwesịrị inye Ya otuto, kama ndị nke Chineke niile “me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya” site n’ikwupụta ihe Chineke mewooro ha.

Nnapụta

Ụfọdụ ngọzi nke Onye ahụ dere Abù Ọma kwupụtara bụ nke imemmụọ na nke anụarụ kwa. Chineke enyewo mkpuchi nke ime mmụọ na nke anụarụ. O duziwo ndị Ya n’oge nsogbu. Mgbe ụfọdụ nsogbu naapụta, ma Chineke naarọpụta ụzọ mgbapụ. Chineke chebere ụmụ Hibru atọ -- Shedrak, Mishak, na Abed-nego -- mgbe atụbara ha nime ọdọ ọkụ ahụ naenwu ajọ onwunwu n’ihi na ha bụ ndịorù nke Chineke dị ndụ (Daniel 3:26). Jona gabigara mmiri (Jona 1:15), ma Chineke gupụtara ya n’udo n’ihi na o kpere ekpere (Jona 2:1) Jona sịrị, “Mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; ihe nke m’kweworo na nkwà ka m’gākwughachi” (Jona 2:9).

Nnwapụta Dị Icheiche

Ụfọdụ mgbe Chineke naenye ohere ka ọnwụnwa bịakwasị ndị Ya. Ọ dị ihe ọ naalụpụta -- ịnwa okwukwe anyị, na inwapụta ịhụn’anya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. NdịKraist pụrụ ileanya nnwapụta. Ọ bụghị ihe ana ahụghị na mbụ nye ndị nke Chineke; ọ bụ ile ha ule (I Pita 4:12).

Nime Abù Ọma ọzọ, Devid rịọrọ Onyenweanyị ka ọnwaa ya. “Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: nānwam, we mara iche-uchem nile: hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-ngbu di nimem, durukwam n’uzọ ebigh-ebi” (Abù Ọma 139:23, 24).

Baa N’Ebe Àkụ Dị

Rịbaàmà na ekwuru okwu otuto mgbe anaekwu banyere nnwapụta niile a n’ihi na ha dị mma nye ndị nke Chineke. “I we me ka ayi puta ba n’inwebiga ihe-okè” -- ebe ọtụtụ ngọzi dị. Anaanwa ndị nke Chineke, dịka anaanwapụta ọlaọcha maọbụ nụchaa ya ime ka ọ dị ọcha. Job kwuru banyere ezi ihe ọ natara site ná nnwapụta mgbe ọ sịrị: “Ọ mawo uzọ m’nāga; mgbe Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m’gāputa” (Job 23:10).

Ijiobichụaàjà

Onye dere ihe a naakwagide mmadụ niile ka ha naeto Chineke. Ndị nke Chineke gaeto Onyenweanyị. N’akụkụ ikpeazụ nke Abù Ọma a, Onye dere Abù Ọma a, n’onweya, nyere otuto n’ihi ebere nke Chineke nye ya.

N’ụzọ atọ ka ọ chọrọ isi kelee Chineke. Nke mbụ, ọ chọrọ ịkwughachị mkwà niile o kwere mgbe ọ nọ ná nsogbu. Ụfọdụ mmadụ adịghị emezu mkwà niile ha kwere Chineke. Mkwà niile anaemezughị naeweta mgbochi ná ndụ nke imemmụọ mmadụ. Kwụghachị Onyenweanyị mkwà niile i kwere ma hụ kwa otú Ọ gaagọzi gị.

Nke abụọ, ọ chọrọ ito Chineke site n’ịchụàjà dị icheiche maọbụ ijiobichụọàjà. Ọ chọrọ inye “anu nwere abuba,” ọ bụghị àjà nke tara arụ maọbụ nke ụkwụ gbajiri, kama nke kwesịrị na nke toruru.

Nke atọ, ọ chọrọ ito Onyenweanyị site n’ịgbaàmà. “Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwù Chineke, m’gākọ kwa akukọ banyere ihe O meworo nkpuru-obim.” Ụdị ịgbaàmà dị otú a pụrụ iweta otuto nye Chineke na ngọzi nye ndị niile naanụ ya. Ọgbụgbaàmà ya abụghị site na nganga; ekwuru ya n’ihi otuto nke Chineke.

Ekpere Niile Azara

Onye ahụ dere Abù Ọma kelere Chineke n’ihi ọzịzá ekpere. Ọ matara na Chineke anụwo ekpere ya n’ihi na o leghị ihe ọjọọ anya nime obi ya. Ohere adịghị nime obi nke ụmụ Chineke ọbụná ilegide ihe ọjọọ anya nime obi ha maọbụ inwe ọñụ nime ya. Onyeiro nke mkpụrụobi anyị gaagbalị ịnwa anyị ka anyị nwee obiọma n’ebe mmehie dị nwee kwa nsọpụrụ nye ihe ahụ nke bụ mmehie. Setan matara na ọ bụrụ na ya enwee ike ịrara OnyeKraist ka ọ tụlee ma legide mmehie anya n’obi ya, ọlụ ọjọọ ahụ naegbu egbu amalitewo. “Ọ buru na o bu ajọ ihe ka m’leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agagh-anu olum.” Ụdị ọnọdụ ọjọọ dị añaa ka onye anaadịghị anụ ekpere ya nọ! Ngwangwa okwukwe na ndabere ọ bụla pụrụ, onye ahụ abụrụ orù nke ekwensu.

Ilegide mmehie anya nime obi pụrụ ịbụ nzọụkwụ mbụ ịbà na mmehie. Ọ pụrụ nnọọ ịbụ náánị ileanya dị ụtọ, nka gasịa nnabata amalite; ngwangwa mmehie ahụ agaghị adị kwa njọ n’anya anyị dịka ọ dịrị: nke ọzọ, onye ahụ pụrụ ịhụ onweya ka ọ naeme ihe jọrọ njọ n’anya Chineke.

Otuto dị n’egbugbereọnụ nke Onye ahụ dere Abù Ọma, n’ihi na obi ya dị ọcha n’iru Chineke. Onyenweanyị egosiwo ya ebere dị ukwuu, Ọ nụwo ma zaa kwa ekpere ya. Ka anyị naatụle ebere nke Chineke n’ebe anyị nọ na otú O si naanụ ekpere anyị niile, ka anyị nwee otuto ọ bụghị náánị n’obi anyị kama n’egbugbereọnụ anyị kwa. Ka anyị bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi mgbe niile inye Chineke otuto.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ụdị otuto naatọ Onyenweanyị ụtọ?
  2. Òlee otú mmadụ pụrụ isi fèe Onyenweanyị òfùfè?
  3. Kpọọ aha ụfọdụ ọlụebube Onyenweanyị lụụrụ Ụmụ Israel.
  4. Kpọọ aha ụfọdụ ngọzi nke Chineke naenye taa.
  5. Gịnị mere NdịKraist ji enwe ọnwụnwa?
  6. Gịnị ka onye dere abụ niile a bu n’obi mgbe ọ sịrị na Onyenweanyị kpọbatara ha “n’inwebiga ihe-òkè”?
  7. Kwue ụzọ atọ ahụ nke Onye ahụ dere Abù Ọma gaesi nye Chineke otuto.
  8. Gịnị na gịnị bụ ijiobichụọàjà?
  9. Gịnị mere mmadụ gaeji kwụghachị mkwà ya niile?
  10. Gịnị naeme ọ bụrụ na mmadụ elee ajọ ihe anya nime obi ya?