Lesson 188 - Junior
Memory Verse
“Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu JEHOVA, bú Chineke-unu, n’anya” (Joshua 23:11).Notes
Imeri Kenean
Mgbe niile Joshua dị ndụ, Ụmụ Israel malitere imezu àtụmatụ nke Chineke imeri ndị Kenean. Ha mebiri arụsị dị icheiche, ha arapụghị kwa ndị naekpere arụsị ná ndụ, dịka Chineke nyeworo n’iwu, ka ewee ghara ịnwa ha ịrapụ ezi Chineke nke dị kwa ndụ ifè chi ọzọ dị icheiche òfùfè.
Ebo Juda na ebo Simeon kwekọrịtara inyerịtara ibe ha aka n’ọgụ ahụ. Ha naalụkọta ọlụ n’otù wee naaga kwa n’iru imeri ndịiro ha. Ebo ndịọzọ fọdụrụ ejikọtaghị onweha ọnụ ịlụso ndịiro ha ọgụ. Ọtụtụ nime ha anọgideghị n’irubeisi n’iwu nke Chineke nke gwara ha ka ha chụpụ ndịiro ha. Ha kwere ka ndị Kenean soro ha biri n’ala ahụ. Ọbụná mgbe Israel dị ike arapụrụ ndịiro ha ka ha nọgide n’ala ahụ. Kama irubere Chineke isi, ụmụ Israel manyere maọbụ kwagidere ndị Kenean ịtụ ụtụ (dịka ụtụisi) nye ha -- n’ọnọdụ ịchụpụ ndị ahụ kpamkpam.
Ịdọakanántị
Ọtụtụ arọ garaaga, Moses gwara harị na ndị Kenean gaenye ha nsogbu ọ bụrụ na arapụ ha ka ha biri n’ala ahụ. “Ma ọ buru na unu anāpugh n’aka ndi bi n’ala ahu ala-ha n’iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site ná ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n’anya-unu, ghọ kwa ogwu n’akuku-unu, ha gākpagbu kwa unu n’ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya” (Ọnu-ọgugu 33:55).
Tupu Joshua anwụọ, ọ dọrọ Ụmụ Israel akanántị ọzọ banyere ndị Kenean. Ọ sịrị na ọ bụrụ na ha anọgide ibi n’ala ahụ ha gaaghọ igbudu na ọnyà nye ndị Israel rue mgbe Ụmụ Israel gaalapụ n’iyi n’ezi ala ahụ nke Jehova bụ Chineke nyeworo ha (Joshua 23:13).
Ịhụ Onyenweanyị N’anya
Joshua gwakwara Ụmụ Israel mkpà ọ dị nye ha ịhụ Onyenweanyị n’anya. Mgbe onye ọ bụla ji obi ya niile hụ Onyenweanyị n’anya, ọ gaghị abụ ihe dị irè ijide ya n’igbudu na n’ọnyà nke onyeiro. Mgbe mmadụ naahụghị Onyenweanyị n’anya, ọ naatụkwasị ịhụn’anya na chi ụgha dị icheiche -- wee laa n’iyi.
Ndụmọdụ ahụ -- ịhụ Onyenweanyị n’anya -- nke Joshua nyere Ụmụ Israel dịkwara anyị onweanyị taa mma. Anyị onweanyị, kwa, kwesịrị ilezi anya, iche nche na ileru anya, na anyị hụrụ Onyenweanyị n’anya; Ụmụ Israel mere nkeọma mgbe niile ha hụrụ Chineke n’anya. Oge bịara mgbe ha kwụsịrị ịhụ Onyenweanyị n’anya. Ọzọ, ha malitere ịhụ chi ụgha dị icheiche n’anya na ifè ha òfùfè. Mmadụ apụghị ịhụ Chineke na ụwa n’anya otù mgbe. Na I Jọn 2:15 agwara anyị “Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahù uwa n’anya, ihu-n’anya nke Nna-ayi adigh nime ya.”
Onye mmadụ hụrụ n’anya ka ọ gaerubere isi naefè kwa òfùfè. Nke ahụ bụ otù ihe mere o ji dị anyị mkpà iwere obi anyị niile, were kwa uche anyị niile, were kwa mkpụrụobi anyị niile, were kwa ike anyị niile, hụ Onyenweanyị n’anya.
Náenweghị Onyendú
Mgbe niile Joshua dị ndụ, Ụmụ Israel fère Chineke òfùfè. Na nwaoge site na mgbe Joshua nwụsịrị, ha enweghị onyendú. Mgbe ọgbọ ọzọ biliri, ha anọgideghị n’ikpere Chineke. Ọ ghaghị ịbụ na ha arapụwo òfùfè Onyenweanyị, n’ihi na Ụmụ ha amaghị ihe banyere ya. Ọ gaabụ na agha niile ha naalụ ewerewo oge ha nke ukwuu na ha enweghị ohere kuziere ụmụ ha. N’ịrapụ Chineke, ụmụ ha “nāmagh JEHOVA, ha amagh kwa omume nke Ọ mere Israel.” Ka anyị ghara ịbụ ndị ikpé nke ekwupụtaghị ihe Chineke meere anyị mara. Ọbụná ụmụntakịrị pụrụ ịgwa ndị nọ ha gburugburu ihe banyere Onyenweanyị. Ọtụtụ mgbe ụmụntakịrị naelekọta ụmụnne ha ndikom na ndinyom maọbụ ndị agbataobi ha na ndịenyi ha, apụrụ ikuziri ndị ntà ahụ banyere Onyenweanyị na Baịbụl. Mgbe ahụ ha agaghị adị ka ọgbọ ndị Israel ahụ ndị naamaghị ihe banyere Chineke na ọlụ Ya dị ebube nye ha.
Otù Ozi
Mgbe Ụmụ Israel nupụrụisi n’iwu nke Onyenweanyị, na na ndụmọdụ nke Moses onye nyere iwu, na n’okwu niile nke Joshua onyendú ha onye oge ọnwụ ya naabịaru nso, Chineke zipụrụ otù mmụọozi iwegara Israel ozi site na Gilgal. Echetaara ha ebere nke Chineke n’ebe ha nọ n’ịkpọpụta ndị bụ nna ha n’orù na mmekpaarụ nke Ijipt baa n’izuike na inwebiga ihe ókè n’Ala Mkwà ahụ. Agwara ha na ha kwere nkwà irubeisi -- ịkwatusị ebe ichụàjà niile nke chi ụgha dị icheiche na ịchụpụsị ndị Kenean. Ma ha enupuwoisi.
Mmụọozi nke Onyenweanyị sịrị “Gini bu nka unu meworo?” Ụmụ Israel enyeghị ọzịzá ọ bụla. Ụfọdụ mmadụ taa naéchè na ha nwere ọzịzá nye ihe niile, nkekanke banyere mmehie dị ná ndụ ha. Ha naagbalị mgbe niile ime ngọpụ banyere ya. Mgbe oge gaabịa na ha aghaghị iguzo n’iru Chineke n’ikpé, ha agaghị enwe okwu ọ bụla nke ha gaekwu. Ha gaekpuchi ọnụ ha dịka nwoke nke ekwuru ihe banyere ya n’ilu ahụ onye naenweghị ihengọpụ mgbe ọ gbalịrị ijé n’oriri ọlụlụnwunye naeyikwasịghị uwe ọlụlụnwunye ahụ (Matiu 22:12). Lee Iheọmụmụ 148.
Ịta Ahụhụ
Mmụọozi nke Onyenweanyị wee gwa Ụmụ Israel na ndị Kenean ahụ gaaghọ ogwu n’akụkụ ha na chi ụgha ahụ dị icheiche gaabụkwara ha ọnyà. Mgbe ahụ Ụmụ Israel kwara ákwá. Náagbaghị agụgọ ihere mere ha. Eleghịanya ha nabatara na ha enupụwo isi, na mmehie dị kwa na ndụ ha. Ọ bụ ezie na ha kwara ákwá chụa kwa àjà nye Onyenweanyị, anyị agụtaghị na ha chègharịrị. Anyị agụtaghị kwa na emebisịrị arụsị niile dị n’ala ahụ.
Ọ bụ ihe apụrụ ime na mmadụ gaekwere na mmehie dị na ndụ ya, ma ọ gaghị échègharị. Ọ pụrụ ịkwa ákwá n’ihi mmehie niile ya, chụkwaara Chineke àjà dị icheiche; ma náánị ma onye ahụ o jikeere ịgbakụta mmehie niile ahụ azụ ma rapụ kwa ha niile n’otù n’otù, o chègharịghị n’ezie. Aisaia Onyeamụma sịrị: “Onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya nile, onye nēme ajọ ihe ya rapu échìchè-ya nile: ya laghachikute kwa JEHOVA, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n’aru ya; ya laghachikute kwa Chineke ayi, n’ihi na Ọ gāgbaghara ya nmehie-ya n’uba” (Aisaia 55:7).
E, Ụmụ Israel kwara ákwá chụakwara Chineke àjà -- emesịa ha mee ihe jọrọ njọ chigharịkuru chi ọzọ dị icheiche. Site n’ime nke ahụ, ha mere ihe ọjọọ abụọ: mbụ, ha rapụrụ ezi Chineke dị ndụ: nke abụọ, ha chigharịkuuru chi ụgha dị icheiche. Ụmụ Israel ahụkwaghị Chineke n’anya. Ha ewerewo ịhụn’anya ha, òfùfè ha, na ijéozi ha niile nye arụsị dị icheiche -- Bealim na Ashtarot.
Emeriri
Ụmụ Israel arapụwo Chineke nke nna ha onye mewooro ha ihe ukwuu dị icheiche. Ha nupụrụisi site n’ịrapụ imebisi chi ụgha dị icheiche, n’ihi nka arara ha urà ifè chi niile ahụ ha rapurụ ibibi. Ọ dịda dị otú ahụ napụrụ ha ohere nke inwe iruọma na ike nke Chineke. N’ọnọdụ imeri ndịiro ha, ndịiro naemeri Ụmụ Israel. Ha apụghị kwa ịchụpụ ndị Kenean. Ha adịghị kwa ike n’agha ewee nyebiga kwa ha n’aka ndịiro ha. Otú a ka Ụmụ Israel si hụjue anya n’ihi nnupụisi ha. Mmehie bu ụzọ rafue ha ka ha rapụ ndị Kenean ná ndụ: emesịa mmehie ahụ wee chigharịa mekpaa ha arụ -- ewee nye ha “n’aka ndi nāpunara madụ ihe, ha we punara ha ihe.” Emekpara Ndị Israel arụ nke ukwuu dịka ihenlụpụta nke mmehie niile ha.
Ndịikpé
Chineke, n’óké ebere Ya, mere ka ndịikpé bilie n’etiti Ụmụ Israel. Ndịikpé bụ ndịndú Chineke sitere na ha napụta ha site n’aka ndị ahụ naapụnara mmadụ ihe. Mgbe anaemekpaghị kwa Israel arụ ọzọ, ha nupukwara isi ọzọ. Ha fère chi ọzọ dị icheiche, ndịiro ha wee mekpaa ha arụ ọzọ. Si na mgbe rue na mgbe, mgbe Ụmụ Israel kpọkuru Ya, Chineke naenye ha onyeikpé onye naanapụta ha, ma ndịIsrael akwụsịghị ime isiike. Ha merụrụ onweha karịa ndị bụ nna ha.
N’ikpeazụ, Chineke n’iwe kwupụtara ikpé n’isi Ụmụ Israel n’ihi na ha mebiri Ọgbugbandụ Ya. Ịnwapụta ma Israel gaejè ijè n’ụzọ nke ndi bụ nna ha debe kwa iwu nke Chineke, Onyenweanyị emeghị ọsọsọ ịchụpụsị ndị Kenean n’obodo ahụ. Chineke rapụrụ ụfọdụ nime ha ka ha fọdụ na Kenean ka O wee nwaa Israel nwapụta kwa nrubeisi ha.
Anyị gaamụ kwa karịa banyere ndịikpé ndịa Chineke rọpụtara ịnapụta Ụmụ Israel. Ka anyị naamụ, ka ayị buru n’obi na Ndị Israel dabara ná nsogbu n’ihi na ha ghọrọ enyi nye ndịiro nke Chineke. Na Jemes 4:4 anyị naagụ, “Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyi nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.” Ọ ghaghị ịhụ ahụhụ nlụpụta ya dịka Ụmụ Israel mere.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị mere mmụọozi nke Onyenweanyị ji gwa Ụmụ Israel okwu?
- Gịnị bụ ozi nke mmụọozi ahụ?
- Òlee otú o si metụta Ụmụ Israel?
- Gịnị mere ndị Israel mgbe ha fère chi ọzọ dị icheiche òfùfè?
- Gịnị mere ha ji fee chi ọzọ dị icheiche òfùfè?
- Ònye ka Chineke rọpụtara ịnapụta Ụmụ Israel site n’aka ndi-iro ha?
- Gịnị naeme n’ụbọchị taa mgbe mmadụ naenupuisi?