Ndi-ikpe 3:1-31

Lesson 189 - Junior

Memory Verse
“Umu Israel we tikue JEHOVA, JEHOVA we me ka onye-nzọputa biliere ha” (Ndi-ikpe 3:15).
Notes

Ndị Arọpụtara Iche

Mgbe Chineke kwere Ụmụ Israel Ala Kenean ná Mkwà, Ọ sịrị na Ya gaeje n’iru ha, na Ya gaachụpụ ndị ahụ naekpere arụsị, si n’otù obodo rue obodo ọzọ, ka ndị Israel naaga n’iru. Ọ bụ àtụmàtụ nke Chineke na Israel gaenwe ala ahụ niile, wee chụpụ ndị niile bi nime ya. Kama nka ha meere ndị Kenean enyi, ụmụ ha ndikom wee lụrụ ụmụ ndinyom Israel, ụmụ ha ndinyom kwekwara ka ndikom Kenean lụọ ha.

Dịka inye ha ahụhụ, Chineke sịrị na Ya gaarapụ ụfọdụ ndị bi n’ala ahụ bụ ndị O kweworo mkwà ịchụpụ. Ọ gaahụ ihe ha gaeme mgbe ahụ; ma ha gaechègharị wee kpọkue Chineke inyere ha aka, maọbụ na afọ gaeju ha ka ndị Kenean naachị ha.

Ndị obodo Kenean naefè arụsị. Mgbe ha na ndị Israel bikọtara, ha kpọọrọ Ụmụ Israel baa n’ụlọ ha na n’èzinaụlọ ha ngwangwa ndị Israel malitere ifè arụsị. Dịka anyị maara, nka adịghị Chineke mma. Ha bụ ndị Ya ọ bụ kwa náánị Ya ka ha ji ụgwọ nsọpụrụ na òfùfè.

Ikpé

Ndị Israel hụrụ ahụhụ n’ihi mmehie ha, ọbụná dịka onye ọ bụla naahụ. Chineke kwere ka Kushan-rishataim bụ eze Mesọpọtemịa, lụsoo ha agha merie kwa ha; n’ihe ra ka arọ asatọ ndị Israel naejere eze ahụ ozi. Ha achọghị ịbụ orù nye eze ọzọ, ha makwaara ụzọ ha gaesi nwere onweha. Ha kpọkuru ezi Chineke.

Ndị mmehie bụ orù nke ekwensu, ọ bụ kwa onye ọchịchị akaike. N’ikpeazụ ha gaanata ọnwụ ebighịebi dịka ụgwọọlụ ha. Ma onye mmehie ọ bụla pụrụ ime ihe ndị Israel mere ka o wee nata ebere; ọ pụrụ ịkpọku Chineke ná nchègharị Ọ gaanụ kwa wee napụta ya. Mgbe onye mmehie naechègharị náekwere kwa na Jisọs na azọpụta ya, ekwensu enweghị ike n’ebe ọ nọ. O nwerewo onweya pụọ n’ebe mmehie dị ọ gaeje kwa Eluigwe ma ọ nwụọ.

Nnapụta

Mgbe ndị Israel kpọkuru Chineke, Ọ nụrụ olu ha wee zitere ha onyeikpe eziomume, Otniel, nwa nne ntà Keleb, ịbụ onyendú obodo ha. O duru ndị Israel gaa n’agha megide eze Mesọpọtemịa, wee napụta Ndị Israel n’agbụ nke ịbụ orù.

Udo wee dị n’ala ahụ arọ irianọ. Ndị Israel rubeere Chineke isi, O wee lụara ha ọlụ megide ndịiro ha niile. Mgbe niile Chineke naelekọtazi ndị hụrụ Ya n’anya naefè kwa Ya òfùfè site n’obi ha niile.

Otú ọ dị, oge bịara, na Otniel nwụrụ, ndị Israel wee chefue Chineke -- Chineke wee kwee ka ikpé bịakwasị ha ọzọ. Chineke wee mee ka otù eze naekpere arụsị dị ike o wee merie ndị Israel. Chineke agaghị ekweworị ka ihe dị otú ahụ mee ọ bụrụ na ndị Israel fère Ya òfùfè site n’obi ha niile rubekwara Ya isi. Ma n’ihi na ndị ahụ mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, Chineke wee kwee ka Eglon, bụ Eze Moab, nweta otù nime obodo ha niile, wee chịa kwa Israel. Ha nọ n’agbụ nke ịbụ orù arọ irinaasatọ.

Onye nnapụta Náeme Akaekpe

Otù ụbọchị ibu nke agbụ ha wee dị arọ nke ukwuu, Ụmụ Israel wee cheta na Chineke bụ inyeaka ha, ha wee tikue Ya. O wee mee ka ezi onyeikpe ọzọ biliere ha, Ihud. Ọ naeme akaekpe. Eleghịanya ọ gaeju anyị anya ihe kpatara Baịbụl ji kwue na Ihud naeme akaekpe. Mgbe naadịghị anya anyị gaahụ otú o si were ya mee ihe bara urù n’ịnapụta Ụmụ Israel n’ịbụ orù.

Mgbe ndị Israel nọ n’okpuru ọchịchị ndị Moab ha naatụ ụtụ obodo maọbụ ụtụisi dị elu nye eze ndị Moab. Eleghịanya mgbe ụfọdụ ha gaenyewo kwa yarị onyinye, ka o wee nwee obiọma n’arụ ha.

Ozi Nzuzo Ahụ

Mgbe Ihud bụụrụ onyeikpé, ndị Israel wee si n’aka ya zigaara Eglon bụ eze onyinye. Mgbe Ihud bataworo n’iru eze wee chee kwa onyinye ahụ n’iru ya, ọ gwara eze na o nwere ozi nzuzo nke onye ọzọ naekwesịghị ịnụ. N’ihi nka eze wee zipụ ndị naejere ya ozi wee zute Ihud náánị ya n’ime ụlọ elu ọjụjụ oyi ya.

Ihud gwara eze na ozi ya sitere n’ebe Chineke nọ. Chineke gaje ịnapụta ndị Ya n’okpuru ọchìchị nke eze a, ụzọ kachasị mfé ime ya bụ igbu eze ahụ. Ihud wee ji akaekpe ya mịpụta mmaagha nke dị n’apataụkwụ akanri ya. Eze ahụ chere na eleghịanya ọ naewepụta akwụkwọ ozi dị n’akpà uwe ya, naéchèghị mgbe ọ bụla na ọ gaeji aka ekpe ya ahụ wepụta iheagha. Ma ọ bụ mmaagha iruabụọ ka ọ mịpụtara; ọ dị n’aka nwoke dị ike, mmaagha ahụ ehieghi kwa ụzọ. Oge adịghị nye eze ime ihe ọ bụla. Náánị ya na onyeiro ya nọ, n’ime ụlọelu nke ọjụjụoyi ya. Eze ahụ buru ibu nke ukwuu, mgbe mmaagha ahụ dụbaworo n’afọ ya, Ihud apụghị kwa ịdọpụta mma ahụ.

Mgbe Ihud zisịrị “ozi” ya -- mmaagha ahụ bara n’afọ Eglon bụ Eze -- o chigharịa pụọ n’ụlọ ahụ. Ọ kpọchie ụzọ niile ka ọ naapụ. Ọ dịghị onye chere na o gbuwo eze ha, n’ihi nka ọ dịghị onye nwara ịkwụsị ya. Mgbe ndị naejere eze ozi laghachiri wee hụ na akpọchịsịrị ụzọ, ha chere na ọ kpọchirị ụzọ na ọ chọghị ka enye ya nsogbu. Ndị ahụ naejere eze ozi chere ogologo oge, ma eze apụtaghị. Ha wee nwee mmetụta na ijeozi ha aghaghị ịdị ya mkpà, n’ihi nka ha wee chọta mkpịsị ugodi ọzọ wee baa ijere eze ozi. Ma lee eze ha adawo n’ala, nwụa. Ewo! Ha arapụwo kwa onye ahụ gburu ya ka ọ laa n’udo!

Mmeri nye Israel

Tupu ndikom eze náachọpụta ihe mere eze, Ihud ejemiworị n’ụzọ ya ịlakuru ndi ya. Ọ fụọ opiike, naakpọ ndị Efraim ibuso ndị Moab agha. Ọ sịrị ha: “Gbasonum n’azu: n’ihi na JEHOVA enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n’aka-unu.” Alụbeghị agha ahụ, ma Ihud emezuwo uche Chineke n’ikwesị ntụkwasịobi, wee nwee kwa nchekwube na mmeri bụ nke ha.

Ha wee pụọ ịlụ agha. Arọ irinaasatọ ha anọworị n’orù; ma ebe Chineke nọ n’akụkụ ha ugbu a, ha nwetara ike n’otù ntabianya igbu puku ụmụ ndikom iri (10,000) dị ike nwekwara obiike bụ kwa ndị naalụ agha. Ọ dịghị otù nwoke gbapụrụ. Ndị Israel wee nwere onwe ha! Chee échìchè ihe Chineke meere Ụmụ Israel ngwangwa ha chigharịkutere Ya! Ala ahụ wee nọdụ jụụ ogologo oge. Ọ dịghị kwa agha ọ bụla ọzọ dị n’Israel rue ihe ra ka iri arọ asatọ (80).

Shamga Onyeikpé

Onyeikpé ọzọ bụ Shamga, ọzọ kwa nsogbu dapụtara. Ndị Filistia wee bịa megide Ndị Israel, ma Chineke nọnyeere Shamga n’ihi na o jiri ndudu eji achụ ehi tigbue narị ndikom isii. Ndudu ahụ eji achụ ehi ruru otù pol n’ogologo nwee kwa ọnụ dị nkọ, eji ya eme ka ehi gaa n’iru mgbe ha naanọchị ụzọ maọbụ naala azụ. Eleghịanya ọ dịghị onye gaéchèworị na ọ pụrụ ịbụ ihe agaeji lụọ agha, ma otú ọ dị, Chineke nyeere Shamga aka iji ya bibie narị ndikom isii (600).

Ọ bụrụ na anyị eji ihe Chineke nyere anyị ka anyị were mee ihe, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị ntà n’ile ya anya, Chineke gaenye mmeri ahụ. Ụfọdụ mmadụ pụrụ ịnaéchè na onyinye (talent) ha dị ntà na ọ bụghị ihe dị mkpà ma eji ya mee ihe maọbụ na ejighị ya.

Otù Nwaokoro Ntà, Otù Nkume Si n’Èbè, na Chineke

Chee échìchè banyere nkume ise ahụ náakwọ mụrụmụrụ nke Devid ntà jiri ya na èbè ya gbue Gọlaiat, ewee si otú a nye Ndị Israel mmeri n’ebe ndị Filistia nọ. Devid pụrụrị ikwu sị: “Abụm nánị nwa-okoro ntà, ọ bụghị kwa ihe dịrịm ịma Gọlaiat aka n’iru.” Ma o nwere mmetuta na Chineke chọrọ ka ya mee ihe. O nwere mmetuta nke ibuarọ n’ihi nchebe nke Israel, wee sị, “Ọ bugh okwu efu, bu ihe a m’nekwu?” (maọbụ “Ọ dịghị ihe kpatara nka?”).

Ọbụná mgbe o nwesịrị mmetu nke ọkpụkpọòkù nke Chineke maka ọlụ ahụ, ọ gaasịworị: “Ọ na-ejum anya ma Chineke Ọ chọrọ ka m’jee n’ezie. Ụmụ-nnem ndikom ndia bụ okenye karịam dị kwa ike karịam ha matakwara ịlụ agha. Amataghịm iji ngwá-agha Sọl mee ihe, gịnị kwa ka èbè ntàm pụrụ ime megide dike ahụ? Eleghị-anya ọ bụ nnọọ nchèpụta nke mụ onwem na Chineke chọrọ ka m’lụsoo dike ahụ ọgụ.” Ma Devid échèghi otú ahụ. O welie èbè ya, nkume ise (ọbụná otù zuru), na Chineke n’akụkụ ya, o nwee obi na ya pụrụ imeri onye ọ bụla; o nwetakwara óké mmeri nye Israel megide ndị Filistia.

“Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?” Dịka Ndị Israel naemeri ndịiro ha mgbe ọ bụla ha tụkwasịrị Chineke obi ịlụrụ ha ọgụ, otù aka ahụ anyị pụrụ imeri ọnwụnwa ọ bụla, ibuarọ maọbụ nsogbu ọ bụla nke naabịakwasị anyị, ọ bụrụ na anyị ebie ndụ ime ihe gaatọ Chineke ụtọ, tụkwasị kwa Ya obi idubiga anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Ụmụ Israel ji nọdụ n’orù?
  2. Òlee otú ha si nwere onweha?
  3. Ogologo oge ra añaa ka ha nọ n’inwe onwe n’okpuru ikpé nke Otniel?
  4. Gịnị mere mgbe Otniel nwụrụ?
  5. Ònye bụ onyeikpé nke ọzọ?
  6. Gịnị bụ ihe anaadịghị ahụ mgbe niile nke Ihud nwere?
  7. Gịnị bụ ozi nzuzo nke Ihud?
  8. Gịnị bụ iheagha nke Shamga ji lụsoo ndị Filistia ọgụ?
  9. Gịnị ka Devid ji lụsoo Gọlaiat ọgụ?
  10. Gịnị mere Devid na Shamga ji merie n’agha nke ha lụrụ?