Ndi-ikpe 4:1-24; Ndi Hibru 11:32-40

Lesson 190 - Junior

Memory Verse
“JEHOVA dirim; m’gagh-atù egwù: gini ka madu gēmem?” (Abù Ọma 118:6).
Notes

Ojujuafọ nke Onweonye na EnweghịEkele

Ụmụ Israel kwesịrị ịmataworị na nsogbu naabịakwasị ha mgbe ọ bụla ha si n’ebe Chineke nọ wezuga onwe ha, ma ọ dị ka ọgbọ niile ọ bụla naapụta naachọ ịmụta iheọmụmụ a n’onweha. Ala Israel ezuwo ike ogologo oge mgbe ọgbọ ọhụụ naetolite.

Ọtụtụ mgbe àkụ na ụbà na ihe onwunwe nke ụwa a naeme ka mmadụ chefue Chineke. Onye ahụ naèchè na ya naaga nkeọma na inyeaka nke Chineke adịghị ya mkpà. Nka bụ ọnọdụ jọgburu onwe ya mmadụ ịbà. Anyị aghaghị icheta na ngọzi anyị niile naesi n’aka Chineke abịa, anyị kwesịrị ịgụ ha n’ihe óké ọnụ ma kelee kwa Ya n’ihi ha.

Karịa iwere ọñụ nara ihe ha nwetara, ụfọdụ ewee naachọ náánị nke onweha, ha achọghị kwa ka ndịọzọ keta òkè n’ihe ha nwere. Mgbe niile Chineke naawụkwasị anyị ngọzi, Ọ naele anyị anya inyere ndịọzọ aka. Karịsịa ihe niile, anyị aghaghị inyeghachị Ya ekele bụ onye nyeworo anyị ihe niile ra otú a.

Mgbe Israel ghọrọ ndị afọ onweha juru na ndị naenweghị ekele, ha wee chigharịa pụọ n’ebe Chineke nọ, óké nsogbu wee bịakwasị ha. Jebin wee dọrọ ha n’agha, bụ eze nke ndị Kenean -- otù nime ndị Chineke nyere ndị Israel iwu ka ha bibie ma ha nyere ha ohere ka ha nọgide naachị onwe ha. Ọ dịwo otù mgbe Ụmụ Israel mebiri obodo ya, bụ Hezoa, ma ha anọgideghị na nche, o wee wughachị kwa ya ọzọ n’iru ha.

Narị Ụgbọalaigwè Iteghete

Sisera bụ ọchịagha n’ụsụ ndịagha nke Jebin bụ eze, o nwekwara ike nke ukwuu. Ndị naagbanarị iwu na eziokwu si n’obodo ọzọ naachọta ebe mgbaba n’ebe ọ nọ wee sonye ndị agha ya rue mgbe o nwere ụsụ ndị agha dị ike, tinyere narị ụgbọala igwè iteghete (900).

Ugbu a Jebin naachị ndị Israel, óké nsogbu dị n’etiti ndị ahụ. Ọ dịghị iwu na ime ihe n’usoro dị. Egwù naejide ụmụ mmadụ ijé ijè maọbụ ịgbá ịnyịnya ha n’okporoụzọ n’ihi ọtụtụ ndị naapụnarị mmadụ ihe nke anaadịghị kwa enye ahụhụ. Ọ bụ ihe óké egwù ọbụná ịgafe n’azụ mgbidi ikuru mmiri, nke ha naaghaghị inwe. Iri arọ abụọ ka ndị Israel hụrụ ahụhụ nke enweghị iwu a, n’ikpeazụ ha wee kpọkue Onyenweanyị ka O nyere ha aka. Ha ekwughị ihe ọ bụla banyere inwe nwuta n’ihi mmehie ha, ma nsogbu ha dị ukwuu karịa ka ha pụrụ ịnagide.

Otù Nne nime Israel

Onyenweanyị nwere obiebere n’arụ ha wee nye ha Debora, nwayị amụma kwesịrị ntụkwasịobi onye hụrụ Chineke n’anya naeme kwa ihe O nyere n’iwu. Ndị niile si n’akụkụ dị icheiche nke obodo Israel naabịakute ya ịnara ndụmọdụ. Otù ụbọchị Chineke nyere ya iwu ka ọ gwa ndị Israel ka ha bilie imegide eze Jebin. Dịka nwayị, ọ gaghị adịrị ya mfé idú ndịagha gaa n’agha, n’ihi nka ọ kpọrọ Berak ka ọ bụrụ ọchịagha. Ọ gaebu agha megide Sisera onye nwere ndịagha na narị ụgbọala igwè iteghete.

Ndị Israel anọwo n’orù ogologo oge na ha enweghị ịnyịnyaịbu na ụgbọala maọbụ ngwá agha ọ bụla. Ọ dị ka ha dị ntà nke ukwuu n’ebe ndị ha naebuso agha nọ. Ọ gaabụworị otú ahụ ọ bụrụ na Chineke enyeghị ndị Israel iwu ka ha gaa. Mgbe Chineke nyere anyị iwu ime ihe ọ bụla, Ọ naenye anyị ike na ume niile dị anyị mkpà iji mezue ihe niile ahụ O nyere n’iwu.

Obi tọrọ Berak ụtọ na Israel gaenwe ohere ịtọpụ agbụ nke ịbụ orù, ma ọ matara na ya apụghị ịtụkwasị náánị puku ndịagha iri (10,000) obi imeri n’agha ahụ. Chineke aghaghị isoro ya jee. Dịka Debora bụ onye naanọchita anya Chineke, ọ rụgide ya ka o soro ya gaa n’agha.

Debora nwere ọñụ ime ihe niile ọ pụrụ ime n’ihi ozi nke Chineke, o weere obi ya niile rapụ ulo na èzinaụlọ ya ijé lụọ agha n’ihi obodo ya. Ọ chọghị nsọpụrụ ọ bụla n’ihi onweya, kama ọ chọrọ ka ebibie mba ahụ naekpere arụsị ka ewee nye Chineke otuto. Ọ chọkwara udo na izuike nye ndị nke Chineke. Nke ahụ bụ ibuarọ nke ezi OnyeKraist ọ bụla kwesịrị ibu; o kwesịrị ichefu ihe niile dị ya mma ka ewee mee ka eziomume nke Chineke gaa n’iru. Debora dọrọ Berak aka ná ntị na ọ gaghị enweta nsọpụrụ ọ bụla site ná mmeri ahụ n’ihi na Chineke gaenye Sisera, bụ ọchịagha nke ndịiro, n’aka otù nwayị.

Agha ahụ n’Ugwu Teboa

Ndikom naalụ agha sitere n’ebo Zebulun na Naftali mere ngwa pụta n’ịza òkù ahụ maka agha, ha wee zukọtakuru Berak na Debora n’Ugwu Teboa ịlụ agha. Mgbe Sisera nụrụ na ndị Israel naachịkọta ndị agha ha, o mee ngwangwa chịkọta ndịagha ya; tinyekwara narị ugbọala igwè iteghete ya ọ purụ ijé kwụsị mbili mmegide ahụ. Naenweghị obiabụọ o nwere nchekwube na apụghị imeri ike ya. Debora échereghị ka ọ bịakwasị ha n’Ugwu Teboa, kama o zigara Berak na puku ndikom iri (10,000) ya ka ha rịdakuru Sisera.

Óké agha wee dị n’ụbọchị ahụ, Onyenweanyị naalụrụ Israel agha. Ebibisịrị ndị Kenean kpamkpam. Sisera nwererị óké ntụkwasịobi na narị ụgbọala igwè iteghete ahụ; ma mgbe ebibiri ndịagha ya, o siri n’ụgbọala ya mapụta wee were ụkwụ ya gbaa ọsọ maka nchebe.

Nchebe Ụgha

Onyemmehie pụrụ iche na ya nwere nchebe n’ego ọ tụkọbawooro onwe-ya, èzinaụlọ o doziwooro onweya, ezi aha ọ kpadoworo; ma otù itiaka nke Chineke gaekpochapụ ha niile. Ọbụná Aisaia Onyeamụma kwuru banyere ndị ha na ọnwụ gbaworo ndụ. Ha chere na nsogbu apụghị ịbịaru ha nso. Ma Chineke sịrị, “Agēhichapu kwa ọgbugba-ndu unu na ọnwu gbara, nkwà unu na ala-mọ kweritara agagh-eguzosi kwa ike; mgbe utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda” (Aisaia 28:18). Chineke gaekpe ụmụ mmadụ ikpé, ọ bụrụ kwa na ha agaghị échègharị ha gaadaba n’aka iwe nke Chineke, ha agaghị enwe kwa inyeaka.

Sisera gbara ọsọ site n’ụgbọala ya, naenweghị inyeaka. Ọ lụsowo ndị nke Chineke ọgụ ndịagha ya na ụgbọala ya niile wee funarị ya. Ọ gbagara n’ụlọikwu nke otù nwayị ebe o chere na ya gaenwe nchebe zuruòkè. Adịghị ekwe ndikom ịbà n’ụlọikwu ndinyom, n’ihi nka o lere anya na ọ dịghị onye gaachọ ya n’ebe ahụ. Nwayị ahụ, onye aha ya bụ Jael, abụghị onye Israel, kama ọ ghaghị ịbụ na Chineke kpaliri ya inyere ndị Ya aka n’ụbọchị ahụ. O kwere ka Sisera bata wee nye kwa ya mmiriaraehi ka ọ ñụọ. Mgbe ahụ o kpuchie ya ka ewee zobe ya.

Sisera chère n’obi ya na ya enwewo nchebe zuruòkè. Ọ gwawo Jael ka ọ ghara ikwe ka onye ọ bụla mata na ya nọ n’ebe ahụ. Ike gwụsịrị ya n’ihi agha ahụ; mgbe o risịrị nrị, ọ rarụụra.

Ọtụtụ ndị mmehie adawo n’ụra n’okpuru nchebe nke anụarụ. Ha chère na n’ihi na ha nwere otù ụdị okpukpé na ha gaanọ ná njikere izute Jisọs, naagbanyeghị mmehie ha niile. Ndịọzọ agaghịrị enwe ụdị nke okpukpé, ma ha gaasị; “Emebeghim onye ọ bụla ihe-mgbu. Anam-eme ndi ọzọ otù m’na-achọ ka ha meem. Chineke ezi omume Ọ ga-amam ikpé n’ihi nka?” Chineke agaghị ama mmadụ ikpé n’ihi ezi ọlụ ya, kama Ọ ghaghị ịma mmadụ ahụ ikpé n’ihi ilefuru óké nzọpụta Ya anya. Jisọs sịrị, “Aghagh imu unu ọzọ” (Jọn 3:7). Ọ dịghị onye agaasị na o jikerewo maka Eluigwe rue mgbe o chègharịworo site ná mmehie ya niile ewee sachapụ kwa ha site n’Ọbara nke Jisọs.

Ọnwụ nye Ndịiro nke Chineke

Ka Sisera na ararụụra, Jael weere ntù ụlọikwu kpọba ya n’egedegeiru ya, wee kpọgide ya n’ala. N’ihi nka ọ nwụọ. Berak, onyeisi ụsụ ndịagha nke Israel, naagbalịsiike ịchọta Sisera; mgbe ọ bịarukwara ụlọikwu Jael nso ọ pụtara izute ya wee sị: “Bia, m’gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nāchọ.” Chee ụdị ịtụn’anya Berak gaenweworị mgbe ọ hụrụ ozu Sisera ka ọ tọgbọrọ n’ala, na ntù akpọgidere ya n’egedegeiru!

Agha ahụ agwụwo; enyewo Israel mmeri. Ararawo onyendú nke ndịiro nye n’aka nwayị dịka Debora kwuworo. Mgbe naadịghị anya ebibikwara Jebin, bụ eze ndịKenean, n’ihi na ọ pụrụ ime náánị ihe ntà ma ewezuga ndịagha ya. Otù ugbò ọzọ kwa ala ahụ wee nwee izuike.Chineke nyere ha mmeri.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ onyeikpé ọhụụ n’Israel?
  2. Ònye ka arọpụtara dịka onyendú nke ndịagha Israel?
  3. Gịnị ka o kwuru mgbe nwayị ahụ gwara ya ka o due ndịagha megide Sisera?
  4. Gịnị ka Debora mere iji nyere Ụmụ Israel aka merie agha ahụ?
  5. Òlee ebe alụrụ agha ahụ?
  6. Gịnị ka Sisera tụkwasịrị obi?
  7. Gịnị bụ ihe agha nchebe nke Ụmụ Israel nwere?
  8. Gịnị mere Sisera mgbe ọ rapụsịrị ụgbọala ya?
  9. Ònye meriri agha ahụ? ọ bụ kwa n’aka onye ka enyere Sisera?