Ndi-ikpe 5:1-31

Lesson 191 - Junior

Memory Verse
“Ma ndi nāhu Ya n’anya gādi ka anyanwu mgbe ọ nāputa n’ike-ya” (Ndi-ikpé 5:31).
Notes

Mmeri

Anyị amụwo ihe banyere ahụhụ niile nke Ụmụ Israel, n’ihi nnupụisi ha nye Chineke. Alụgburu ha mgbe ha naefeghị Onyenweanyị òfùfè. Ihe niile gbanwere mgbe ha chigharịkutere Chineke ma soo kwa Ya. N’iheọmụmụ anyị nke Sọnde gara aga anyị gụrụ maka Debora, nwayị onyeamụma, onye Chineke mere onyeikpé n’Israel. Ya Onweya, tinyere Berak, duuru ndịagha Israel rue mmeri. Edepụtara Berak n’isi iri na otù nke akwụkwọ Ndi Hibru dịka otù nime ndị nwere mmeri nke okwukwe. N’ihi na ha rubeere Chineke isi, O wee rara ndị iro ahụ nye n’aka ha.

Abụ nke Inyeekele

Debora na Berak matara na ọ bụ Chineke bụ onye wetaara ha mmeri. Ha anaraghị otuto ahụ nye onweha. Ka Chineke wee nara nsọpụrụ na otuto, ewee kpalie ha ịbụabụ nke inyeekele na mmeri nye Onyenweanyị n’ihi ebere Ya nye ha. Obi ha jupụtara n’ekele nye Chineke ebe ọ dị ukwuu, na naenweghị obiabụọ otù ụbọchị ahụ ha chọrọ itò Ya n’abụ. Ha échèreghị ka ọtụtụ ọnwa gasịa tutu ha amalite ìtò Chineke. Nka gaabụ iheọmụmụ nye anyị. Ànyị naeto Chineke n’ikwesị ntụkwasịobi na kwa n’oge dịka Debora na Berak mere?

Ka anyị tụlee abụ a. Eleghịanya ọ gaabụ ihe nlereanya nye anyị. Debora na Berak kwesịrị ịbụku Onyenweanyị abụ; otù aka ahụ anyị onweanyị kwa. N’akwụkwọ Jemes 5:13 anyị naagụ, “Ọ di onye ọ bula nwere obi-utọ? Ya bùa abù ọma.” Abụ bụ nnọọ otù ụzọ ka mma iji gbasaa akụkọ, na ime kwa ka anaecheta ya. Otù nime Abụ Ọma Devid sịrị na “Otù ọgbọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọgbọ ọzọ, we gosi idi-ike Gi nile” (Abù Ọma 145:4).

Ijèozi n’Afọofufo

Gịnị mere Chineke ji kpepụta ndị Ya? N’ihi na ha jeere Ya ozi n’afọofufo. Nka bụ ihe nzuzo nke onye naemeri emeri site n’ike Chineke -- “Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha.” Ihe ha mere, ha meere ya Onyenweanyị ọ bụghị na elere anya maọbụ na achọrọ ya n’aka ha, ọ bụghị n’ịjụ ajụjụ na ntamù sị, “Àyị kwesịrị nnọọ ịbịa?” Ndị agha nke Debora na Berak bụụrụ ndị mmeri n’ihi na ha ji obi ha niile lụọọlụ. Anyị gaabụ ndị mmeri ma ọ bụrụ na anyị alụọ ọlụ anyị n’ikwesi ntụkwasịobi nye Chineke. Gịnị bụ ụdị ọlụ anyị naenye Onyenweanyị?

Otuto nke abụ a dịrị náánị Onyenweanyị Chineke nke Israel. Náenweghị obiabụọ, n’oge garaaga, mgbe Ụmụ Israel feworo chi ọzọ òfùfè, abụ ha naabụ nye chi ụgha dị icheiche.

Dịka ha naeto Chineke n’ihi mmeri ha nwere na nso nso, ọtụtụ ngọzi dị icheiche ha nweworo n’oge garaaga wee bata n’obi ha. Chineke na anọnyere Ụmụ Israel oge niile mgbe ha naefè Ya. Otú ahụ kwa, taa, mgbe ndị Chineke naeto Ya n’ihi ihe niile Ọ naeme, ha naecheta ngọzi niile garaaga nke ebere na inyeaka nke Chineke.

Nime Nsogbu

Debora gụrụ abụ banyere ụdị ọnọdụ ndị Israel nọ nime ya tutu Chineke ewelie ya elu ịbụ onye ikpé. O mere ihe a igosi ịdị ukwuu nke nnapụta Chineke. Anọchibeghị okporoụzọ niile, òlee ebe ndị naazụ ahịa, ndị naeji ịnyịnya ebu ibu, na ahịa ha naere nọ? Ndị naaga njèm naaga ụzọ warara naabụghị ezi ụzọ kama iso ezigbo okporoụzọ; hà gaanọ n’ihe egwù n’ihi ndị ori na ndị naapụnara mmadụ ihe? Ọ dịghị ndị bi n’obodo ntà dị icheiche; hà agbawo ọsọ gaa zoo nime obodo agbara mgbidi gburugburu n’ihi ya ha enweghị kwa ike ilekọta ihe ha kụrụ n’ubi anya? Agha dị n’ọnụ ụzọ ama ebe ndịikpé na ndịisi nọ; ò nweghị ebe ha gaewere nsogbu ha gaa maka ikpé ziriezi? Ọ dịghị ụta maọbụ ubé aga ahụ; àlụgburu ha wee napụsịa ha ihe agha ha? Anaanụ ụzụ ndị naeji ákụ na ụta naagba n’ebe anaekute mmiri; ọ bụ na mmadụ enweghị ike ikute ọbụná mmiri n’udo?

Ọ bụ gịnị kpatara nsogbu ndịa niile? “Ha rọputara chi ọhu di iche iche.” Mgbe ndị bụ nna ha rọrọwororị ifè Chineke òfùfè mgbe Joshua sịrị, “Rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfe òfùfè (Joshua 24:15)¸ ha rapụrụ Chineke ifè chi ọhụụ dị iche iche òfùfè”. Nka bụ ihe mere nsogbu niile a ji dakwasị Israel. Ụmụntakịrị aghaghị ịrọrọ taa, kwa, onye ha gaefè òfùfè, naagbanyeghị nrọrọ nke nne na nna ha. Ị naefè Chineke òfùfè, kàọbụ onyeiro nke mkpụrụobi gị?

Óké Ọlụ nke Chineke

Debora bụkuru Chineke abụ n’ihi ọtụtụ óké ihe Ọ lụrụ. Ugbu a ha pụrụ ijé ijè n’ụzọ ha ma nọdụ ala n’udo n’ikpe ikpe. Ugbu a ha nwere ike ikute mmiri naatụghị egwù. Debora kwupụtara óké ọlụ niile nke Chineke ọzọ n’olu dị elu -- ọ bụghị nke madụ. Nka bụ ihe Chineke lụrụ.

Debora hụrụ na o kwesịrị ya ito Chineke. O wee kpalie onweya elu karịa n’ịbụ abụ otuto, n’ihi na Chineke enyewo Israel mmeri n’ebe ndị iro ha nọ ndi nwere narị iteghete (900) ụgbọala igwè na ndị kpagbuworo ha arọ iri abụọ (20) (Ndi-ikpe 4:3). Chineke enyewo Debora, otù nne n’Israel, ịbụ onye ọchịchị n’ebe ndị bụ dike n’agha nọ. Eleghịanya ọ bụrụ na o nweghị nwoke ọ bụla ahụrụ n’oge ahụ onye Chineke pụrụ ịtụkwasị ọlụ nke ịbụ onye ikpé ahụ. Ma otù nwayị nọ, Debora, nwayị onyeamụma, onye nwere obi ike na ntụkwasịobi, otù onye Chineke pụrụ ịdabere na ya. Chineke ewereworị ọtụtụ ụmụ nwayị lụọọlụ àtụmàtụ Ya, otù aka ahụ. Dịka Jisọs naanọ ọdụ, Chineke gaeji ndị ahụ niile kwesịrị ntụkwasịobi, ndị nwere obi ike, na ndị nwere nrubeisi lụọ ọlụ.

Ka anyị kpalie onweanyị karịa n’ito Chineke n’ihi ọlụ ukwuu Ya n’ebe anyị nọ. Ònye maara ma ọ gaabụ n’etiti ndị ị naakụziri ihe, ka Chineke gaesi welie otù onye -- nwoke maọbụ nwaagbọghọ -- onye Ọ pụrụ isi na ya lụọ ọlụ ebube dị icheiche?

Ndị Lụrụ Ọgụ n’ihi Israel

Debora matara ndị bụ ndị iro ha, otù aka ahụ kwa, ọ matara ndi soro Israel lụọ agha ahụ. O lefughị kwa anya ọbụná ịmata ndị nọ nkịtị, ndị nọdụrụ n’azụ naemeghị ihe ọ bụla. Site ná mmeri a, ebuliri Chineke elu, ma ndị ahụ o jiri lụọ ọlụ natara iribaama nime abụ nke Debora.

Ebo Efraim ndị Debora bi n’etiti ha bụ otù nime ndị soro Israel lụa agha ahụ (Ndi-ikpe 4:5). Ebo Benjamin soro Debora na Berak n’agha ahụ. Makịa, nkera nke ebo Manase bi n’ọdịdaanyanwụ zitere ndị ọchịchị inyeaka, na ndịisi sitere n’Isaka nọnyekwaara Debora. Site n’ebo Zebulun ka ndị gụrụ akwụkwọ si bịa, ọ gaabụ na ha dị mma n’ide ihe odide karịa ịlụ ọgụ, ma ha atụfughị oge ime ihe kwesịrị ka ha mee. Ha, na ndị Naftali (ebo Berak), tinyere ndụ ha n’ihe egwù n’ụzọ na ha bụ dike. Ebe obibi ha adịghị anya site n’ebe ndị iro nọ, naenweghị obi abụọ ha gaachọworị ịnwụ n’ọgụ karịa ka adọta ha n’agha. Chineke hụrụ ha niile.

Ọbụná ihe ekère èkè lụsoro Sisera ọgụ ma dịnyere Debora. Chineke ji kpakpando, na mmiriiyi nke Kaishon wee kpochapu ọtụtụ ndịiro ahụ.

Ndị Naesoghi Lụọọgụ

Debora kwukwara nime abụ ahụ ndị naesonyeghị n’akụkụ ọ bụla nke agha ahụ megide Jebin eze Kenean, na Sisera onyeisi ụsụ ndịagha ya. Ebo nke Juda na Simeon ka anaakpọtụghị aha. Eleghịanya, ọ gaabụ n’ihi na ebe ha bi dị anya n’akụkụ ndida o nweghị mgbe anaele ha anya isonye n’agha ahụ. Ọ dị ọtụtụ ndị bi na nso, ndị gaenyeworị aka ma ha enyeghị. Ndikom nke Ruben nọnyeere anụụlọ ha, kama ịlụ ọlụ ha n’isoro ndịọzọ lụọ agha. Ọ bụ ezie na ha bi n’ofè Jọdan dịka ndi Gilead (Gad), ha gara ekwesị ntụkwasịobi. Ebo nke Dan na Asha ejighị ọkpụkpọòkù nke agha ahụ kpọrọ ihe ọ bụla. Ha nọdụrụ n’ụlọ ha n’akụkụ osimiri. Ọ bụbụọnụ pụrụ iche ka ekwupụtara megide Miroz, naenweghị obiabụọ ọ bụ na nso ebe ọgbọ agha ahụ, ka anaele anya ndị bi nime ya ka ha bịa “iyere JEHOVA aka.” O nweghị ihe ọ bụla ọzọ ekwuru maka ebe a na ndị bi nime ya. Ekweere na ebibiri ya site n’ọbụbụọnụ ahụ, n’ihi emeghị ihe o kwesịrị ime.

Agha nke Imemmụọ

N’ụbọchị taa ọ dị ọgụ dị n’etiti eziihe na iheọjọọ. Ndị nke Chineke nwere onyeiro, nke mkpụrụobi ha -- setan -- onye gaakpagbu ma dọrọ kwa ha n’agha ọ bụrụ na enye ya ohere. Ndị nke Chineke bụ ndị mmeri site n’ike Chineke, dịka Debora na Berak bụrụ ndị mmeri n’ebe onyeiro nọ. Ndị nke Chineke naejikọta onweha ọnụ n’ekpere wee busoo setan agha. Ha matara na setan bụ onye iro ha, dịka Debora matakwara na Jebin eze ndị Kenean, na Sisera onyeisi ụsụ ndiagha ya, bụ ndị iro ha.

Chineke amarawo, ndị isi anyi amarawo ndị so ha n’agha nke eziihe megide iheọjọọ. Ha amarawo kwa ndị ahụ, ọbụná n’etiti nzukọ, ndị nọdụrụ ala n’etiti nzukọ, ndị nọdụrụ ala naenwe obi ọgbasaram ma naelefuru ọlụ anya, naewere ọtụtụ oge n’ọlụ nke aka ha, bụrụ ndị tụbara onweha n’urù nke ụwa, náahụ izuike n’anya karịa ịlụọgụ, náeleda Chineke na ọlụ Ya anya.

Ngọzi Dị Icheiche

Abụ nke Debora buliri Jael elu onye ọlụ ya mezuru mmeri ahụ. Jael abụghị onye Israel, ma o rubeere Chineke nke Israel isi mgbe ọ gaara enwetaworị iruọma n’ebe ndị Kenean nọ. Jael, nime ụlọikwu ya, naenweghị obiabụọ natara ụgwọọlụ buru ibu ọbụná dịka Berak onye ụlọ ya dị n’ọgbọ agha. Gị onwegị, kwa, nwere ụgwọ naechere gị ma ọ bụrụ na ị gaeji ikwesị ntụkwasịobi na nrubeisi nọchie ebe Chineke nyere gị.

Nne Sisera dị ka onyemmehie onye nwere ọchịchọ siriike náenweghị kwa ndidi. Okwukwe ya na ntụkwasịobi ya abụghị nke náanọgide, n’ihi na ọ bụ n’elu urù nke ụwa ka ọ dị. Ịlan’iyi na iruuju bịakwasịrị ya ọ bu ezie na ọ naele anya mbuli elu na àkụ.

Debora ji ekpere na ibu amụma mechie abụ ya nke bụ na mgbe naadịghị anya ndịiro niile nke Chineke gaalapụ n’iyi. Abụ ya bụ ịgbaama na ọ dị mma iji afọofufo lụọrọ Onyenweanyị ọlụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Debora na Berak jiri bụọ abụ a?
  2. Òlee ụdị abụ ọ bụ?
  3. Gịnị ka Chineke mewooro Ụmụ Israel?
  4. Ònye ka Debora bụ?
  5. Gịnị mere Ụmụ Israel jiri baa na nsogbu?
  6. Gịnị mere na ọ bụghị Ụmụ Israel niile gara n’ọgụ ahụ?
  7. Òlee ụdị ọlụ ndị ahụ lụrụ nye Onyenweanyị?
  8. Gịnị mere Ụmụ Israel ji bụrụ ndị mmeri?