Ndi-ikpe 7:1-8

Lesson 193 - Junior

Memory Verse
“Ọ bu kwa ihe nādigh ike nke uwa ka Chineke rọpụtara, ka Ọ we me ka ihere me ihe di ike” (I Ndi-Kọrint 1:27).
Notes

Njikere Maka Ime Ihe

Gideon emeriwo agha mbụ ya nye Onyenweanyị. O gbutuwo ebe ịchụàjà niile nke Beal, o dokwara ndị ahụ anya na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla gaabịakwasị ha n’ihi asọpụrụghị chi niile nke ndị ahụ naekpere arụsị. Ndị Israel ejikerewo ugbu a ịgba Gideon gburugburu na ijé lụsoo ndị Midian na ndị Amalek ọgụ, dịka iwu nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile si dị.

Ndị Israel nke ọgbọ a alụbeghị agha mbụ. N’ihe ruru arọ asaa ha naebi n’ọgba na n’ebe mmiri si naerupụta, náezopụ onweha site n’iru ndị naemekpá ala ha arụ, ọ naesikwara ha ike inweta ihe ha gaeji rijue afọ. Hà gaadị ike ịlụso ndịa azụrụazụ agha?

Ndikom Bara Ụba

Mgbe Gideon gụrụ ndikom niile soro ya bịa ịlụ agha, ha dị puku iriatọnaabụọ (32,000) bụ ndị naalụ agha. Eleghịanya o chère na ihe ha naapụghị ime site na amamihe ha, ha gaemezu ya site n’ọnụọgụgụ ha. Chineke wee sị ya na ndikom ahụ dị ọtụtụ. Gideon arụghị ụka, kama o rubeere Chineke isi; ọ bụrụ na Chineke sịrị na ndikom ahụ riri nne, ha riri nne n’ezie.

Eleghịanya ọ ganaeju anyị anya ihe Chineke ji kwue na ndị agha ahụ riri nne. N’ezie, ọ ka mma inwe ọtụtụ ndịagha karịa ịbụ na ha ezughiezu. Òlee iheọjọọ dị na ha niile naeso aga, eleghịanya enwere ike chọọ ha. Ma nka bụ agha nke Chineke nwere n’Onweya, Ọ sịwo kwa na ndịagha ahụ dị ọtụtụ. Na ha nwere egwù nime ha bụ otù eziokwu mere na ha adịghị Chineke mkpà. Chineke gwara Gideon ka o zighachị ndị ahụ egwù naatụ. Eleghịanya Gideon gaamaworị jijiji mgbe ọ hụrụ ka ọkara abụọ nime atọ nke ndịagha ya naala ụlọ n’abalị ahụ agaalụ agha n’echi ya. Ma ntụkwasịobi ya dị na Chineke.

Enweghị Inyeaka Ma Ewezuga Chineke

Chineke gaje ịlụagha ahụ megide ndị Midian. Ọ bụrụ na puku ndikom iriatọnaabụọ niile ahụ agaa n’agha ahụ ha gaasịworị, “Ayị di ike. Ayị pụrụ imeri agha nka ma ewezuga inye-aka nke Chineke.”

Ọtụtụ mgbe ndị Kraist ndị malitere ifè Chineke òfùfè n’ozuzuòkè naadabere kwa na Ya kpamkpam aghọwo ndị naadabere n’onweha wee ghara ịhụta na inyeaka nke Jisọs dị ha mkpà n’ihe niile ha naeme mgbe niile. Jisọs sịrị: “Unu apugh ime ihe ọ bula ma Mu anọgh ya” (Jọn 15:5). Ọlụ ọ bụla anyị naalụrụ Chineke naabụ ihe náánị mgbe Mmụọ Nsọ naedu na ya. Ka anyị lezie anya nkeọma ịrịọ Ya ka O due nzọụkwụ anyị ọ bụla zi kwa anyị ihe anyị gaekwu ka anyị wee bụrụ ngọzi nye ndị anyị naagbalị inyere aka.

Akọrọ akụkọ banyere otù onyeozi (minista) onye chère na ya bụ onye nkwusa naadịghị ike, o wee kpesie ekpere ike na Chineke gaenye ya ozi gaabà n’obi ụmụ mmadụ. Chineke zara ekpere wee gọzie ijéozi ya. Ma mgbe naadịghị anya adịghị enwe kwa mmetuta nke Mmụọ ahụ n’Okwu Chineke ọ naekwu dịka na mbụ. Achọpụtara ihe kpatara nka mgbe ọ sịrị: “Na mmalite enweghim inye-aka m’wee na-adaberesike n’Onye-nwe-ayị, ma ugbu a apurụm ime nke-ọma n’onwem.” Onye bụ onyeozi nke Chineke n’ezie onye Mmụọ nke Chineke naebi kwa na ndụ ya, agaghị enwe mmetụta mgbe ọ bụla na ya pụrụ ime ihe ọ bụla n’onweya.

Nnwapụta Nke Abụọ

Chineke gwakwara Gideon na puku ndịagha iri (10,000) fọdụrụ ka riri nne, n’ihi ya O nye ha ihe nnwapụta ọzọ. Gideon kpọọrọ ndịagha ahụ gaa na mmiri ka ha wee ñụa mmiri. Òlee otú ha si ñụa? Puku iteghete na narị asaa nime ha gburu ikpere wee kpudo iru ha na mmiri. Ha adịghị elepụ anya maọbụ naeché nché maka ndịiro. Ma ọ dị narị ndị agha atọ ndị nọ na nché. Ị lewo nkita ebe ọ naara mmiri? Ọ naadị ka ọ dị ihe ọ naachọ mgbe niile ọ naañụ mmiri. Chineke chọrọ ka ndị ya nọrọ na njikere maka ndịiro -- naeché nché. Ọ bụ ihe pụrụ ime eme na narị mmadụ atọ ahụ naakwọrọ mmiri n’aka ha naañụ náerudaghị isi ha maọbụ mechie anya ha. Ndịa bụ ndikom Chineke chọrọ iji buso ndị Midian agha mbụ a.

Ngwa Agha nke Chineke

Òtù ahụ aghaghị ịdịworị ntà nke ukwuu n’anya ma ewere ha tụnyere ụsụ ndị Midian nọ na ndagwurugwu. Náenweghị obiabụọ ndị Midian gaechèworị na ọ gaabụ ihe dị ka egwùri egwú ịchụ ndịagha ntà nke Gideon (nke náánị iheagha ha ji bụ náánị opiike, ite na ọwa) ọsọ.

E, opiike, ite na ọwa bụ ngwá agha nke ndikom ahụ naebu -- ha abụghị kwa ngwá agha nke mmadụ efu ji emeri n’agha. Kama ha bụ ngwa agha nke Chineke. Ihe ọ bụla Chineke ji mezue ọchịchọ Ya bụ n’ezie ihe dị mma karịa ihe ọ bụla mmadụ chère na ọ dị ya mkpà. Ọ dịghị mmaagha maọbụ ube dị n’etiti ndị Israel. Ha bụ ndị nọ n’orù, ọ bụ kwa ihe dị mfé karịa ime ka obodo naenweghị ngwa agha ọ bụla nọ n’orù. N’ihi nka mgbe Israel jere agha ahụ ọ dịghị ihe ọ bụla ha nwere ha gaeji sị mgbe emesịrị, “Ọ bụ site n’ike na ume ayi ka ayi meriri ndi-iro.”

Nwayị Anaalụ Ọhụụ Nke Kraist

Ka anyị were òtù nke Gideon tụnyere Nzukọ nke Kraist. Otù ụbọchị naadịghị anya Jisọs gaabịa ọzọ ịkpọrọ Nwunye Ya jee n’ọriri Agbamakwụkwọ. Mmụọ Nsọ nọ n’ụwa taa náejikere ndị Ya, náanwapụta ha igosi ha nguzo ha n’iru Ya. Enyere anyị ogo anyị náaghaghị itoru n’Okwu Chineke. Mgbe azọpụtasịrị anyị, doo anyị nsọ, anyị wee nata kwa ike nke Mmụọ Nsọ, ọtụtụ ihe dị kwa anyị naaghaghị ime. Akụziiri anyị: “Nyezu-kwa-nu idi-nma n’okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n’idi-nma-unu; nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n’ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachị-obi n’ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu; nyezu kwa ihu-n’anya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n’anya nime ihu-n’anya-umu-nna-unu” (II Pita 1:5-7).

Ndị agha niile nke Gideon bụ Ụmụ Israel, ụmụ nke Chineke. Ọtụtụ mmadụ dị n’ụbọchị taa naasị na ha bụ ụmụ Chineke ndị kwekwara na Jisọs. Ma Chineke naezite ule dị icheiche iji nwapụta ndị kweere n’ezie ndị naejikere kwa onweha izute Jisọs, Onye ahụ naalụ nwunye ọhụụ ahụ, mgbe Ọ gaabịa. Ndị naatụ ụjọ na ndị naekweghị ekwe gaachọpụta na ha abụghị ụmụ Chineke maọlị ha gaenwe kwa ókè ha nime ọdọ ọkụ. Ha nwere ike ikwu na ha kweere, ma ha aghaghị igosipụta ya site n’ime ihe Jisọs nyere n’iwu. Ọ sịrị: “Ọ buru na madu ahum n’anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n’anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n’ebe ọ nọ” (Jọn 14:23).

Ọ dị ndịọzọ kwa ndị soworo Chineke eleghịanya n’ikwesị ntụkwasịobi na nwa mgbe, ma n’ihi na Jisọs abịaghị ngwangwa dịka ha chère na Ọ gaabịa, ha elefuruwo anya, ha adịghịele kwa anya Ya otú o kwesịrị. Ha nwere ike naebi ezi ndụ naasị kwa na ha naele anya Jisọs. Ma hà naele anya Ya n’ezie? Mgbe ha naedina n’àkwà ha n’abalị hà naechè na Jisọs pụrụ ịbịa tutu chi gaabọ? Lee échìchè ebube ọ bụ nye onye nọ ná njikere!

Ọtụtụ mmadụ ole ghọworo ndị naelefuru anya wee mee kwa ihe ntà ụfọdụ dị icheiche ha agaghị achọ ka ha naeme mgbe Jisọs gaabịa? Ọ bụ na ha gaachọ ka Jisọs ghara ịbịa rue mgbe ha gaenweta ihe ụfọdụ n’ụwa a, maọbụ nwee oge inwe ọñụ n’iheụtọ nke ụwa? Gịnị naabụ ihe mbụ ha naechè n’ụtụtụ? Hà naeme àtụmàtụ nke onweha, maọbụ ha naasị, “Jisọs, ọ ga-abụ taa?”

Inwe Agụụ Maka Ọbịbịa nke Kraist

Ị chọrọ ka Jisọs bịa taa? Ọ bụrụ na i jikeere izute Ya, ị chọrọ. Jisọs kuziiri ndị naeso ụzọ Ya ikpe ekpere, “Ka ala-eze-Gi bia.” Onyenweanyị chọrọ ka ndị Ya nwee agụụ siri ike otú a ịhụ Ya na ha gaetiku Ya mkpu sị, “Bịa, Onye-nwe-ayị Jisọs, bịa ọsọsọ.” Nwayị ahụ anaalụ Ọhụụ naeme otú ahụ. Ọ naechere ịnụ okwu niile ahụ: “Ka ayi ñuria ọñụ, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayị were kwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya” (Nkpughe 19:7).

Chineke nyere Jọn nnyoba anya n’Agweetiti Patmos ihe banyere Jerusalem Ọhụụ ahụ na ebube nke gaadị ma emesịa. Échìchè banyere ebube ahụ nke anyị niile gaetoru kwesịrị itinye mkpebi n’obi niile jikeere izute Jisọs náagbanyeghị ihe ọ gaewe ya.

Jisọs ekwewo mkwà na ndị Ya gaadị ka Ya. “Ọ buru na agēme ka Ọ pụta ìhè, ayi gābu ndi yiri Ya, n’ihi na ayi gāhu Ya otú ọ di” (I Jọn 3:2). Nwunye Nsọ nke Kraist gaenwe arụ ebube dịka Jisọs nwere mgbe O siri n’ọnwụ bilie, ha gaeso kwa Ya naachị naabụ kwa eze mgbe niile ebighịebi.

Akụkụ ahụ nke Nzukọ Kraist naele anya Jisọs, naeleru anya ime ihe niile Ọ sịrị ha mee, naeje kwa ijè n’ìhè nke Ọ naezite, gaabụ Nwunye ahụ anaalụ ọhụụ. Ha gaadị ka narị ndikom atọ nke Gideon ndị Chineke sitere na ha merie agha ahụ nye Israel. Ha gaadị ntà n’ọnụọgụgụ ma eji ha tụnyere ọtụtụ ndị naakpọ onweha Ndị Kraist ma otú ọ dị, ha adịghị eme ihe niile Chineke nyere n’iwu. Nwayị Ahụ Anaalụ Ọhụụ gaabụ onye arọpụtara n’ihi na o kwesịworo ntụkwasịobi mezue kwa ihe niile Chineke chọrọ. Onye ọ bụla nwere ohere ịnọ n’etiti ndị kwesịrị ntụkwasịobi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ndikom ole zara òkù ahụ mgbe Gideon kpọrọ Israel maka ibuagha?
  2. Gịnị ka Chineke kwuru banyere ọnụọgụgụ ha?
  3. Gịnị bụ ule mbụ elere ha iji mara ma ha bụ ezi ndịagha?
  4. Gịnị bụ ule nke abụọ?
  5. Ndiagha ole laghachiri ulo n’otù oge ọ bụla? Òle fọdụrụ?
  6. Ngwá agha dị añaa ka òtù ndịagha Gideon ji?
  7. Ònye gaabụ Nwayị Ahụ Anaalụ Ọhụụ nke Kraist?