Ndi-ikpe 7:9-25; 8:1-35

Lesson 194 - Junior

Memory Verse
“Ufọdu nēhota Ugbọ-ala, ndi ọzọ inyinya: ma ayi onwe-ayi nēhota aha JEHOVA, bú Chineke-ayi” (Abù Ọma 20:7).
Notes

Òtù Ntà

N’ihe ra ka arọ asaa ka Ụmụ Israel nọworo n’okpuru mmekpáarụ nke ndị Midian ndị batara n’Ala Kenean n’ọnụọgụgụ dị ukwuu ibibi ala ahụ. Mgbe Ụmụ Israel kpọkuru Onyenweanyị ịnaụta ha, Chineke weliteere ha Gideon, “nwoke bú dike na dinkpa.”

Ndị Midian dị ọtụtụ ka igurube. “Ọnu-ọgugu adigh kwa ha, ọ digh kwa Camel-ha.” Ndịagha nke Israel dịrị puku iriatọnaabụọ tutu Chineke ewepụ ndị ụjọ na ndị ejighị ihe kpọrọ ihe. Mgbe etinyere ndịagha ahụ n’ule nke Chineke, náánị narị ndikom atọ fọdụrụ n’òtù ndịagha nke Gideon. Ndị fọdụrụ laghachiri n’ọmụma ụlọikwu ha. N’òtù ndịagha Chineke nke taa enwere ọnọdụ nye náánị ndị nwere obiike, náeché nché, náerube kwa isi. Ọ bụ ezie na ha nwere ike ịdị náánị olenaole n’ọnụọgụgụ, ha naenwe mmeri site n’okwukwe nime Onyenweanyi.

Agwawo Gideon na Chineke gaenye ndị Midian n’aka ya. Agaesite kwa na narị ndikom atọ ahụ merie ndịiro kpamkpam. Chineke adịghị-enye onye ọ bụla ọlụ ọ na-apụghị ịlụ, n’ihi na mgbe O nyere iwu Ọ naenye ike agaeji mezue iwu ahụ. Chineke enyeghị Gideon ihe ọ naapụghị ime. N’ịtụle ihe banyere ibu agha mgbe ahụ, ọ dị ka ihe amamihe naadịghị nime ya bụ mmadụ iduru narị mmadụ atọ ijé busoo ụsụ ndị agha ra otú ahụ agha; ma ọ bụ Chineke zigara Gideon. Ọ lụrụ agha ahụ site n’okwukwe.

Agbamume

Chineke matara na ndịa ezuworo Gideon; ọ chọrọ agbamume inyere okwukwe ya aka. Nke ahụ bụ ihe Chineke nyere ya. Enyere Gideon ndumọdụ ka o jee, n’abalị ahụ, n’ọmụma Ụlọikwu nke ndịiro ịnụ ihe ha nwere ikwu. Gideon rubere isi. Ọ kpọọrọ Pura, orù ya, dịka onyeàmà. Gideon bụ nwoke nwere obiike nwee kwa ume; karịa nke ahụ, ọ rubeere Chineke isi; okwukwe ya dị n’Onyenweanyị. Náenweghị obiabụọ ha ji nwayọ ná nleruanya dị ukwuu n’ọchịchịrị gbebaa ka ndị nché nke ndịiro wee ghara ịnụ mkpatụ ha. Ka ha naabịaru nso ọmụma ụlọikwu nke ndị Midian, ha nụrụ olu dị icheiche. Gideon na Pura wee guzo ige ntị, n’ihi na Chineke asịwo na ha gaanụ ihe ndịiro nwere ikwu.

Gideon nụrụ ka otù onye Midian naekwu banyere nrọ nke ọ rọworo. Ọ rọrọ nrọ na otù achịcha ọka barley naakpọre baa n’ọmụma ụlọikwu ha tie ya o wee daa kpue iru n’ala. Gideon emeghị ọsọsọ wee pụọ. Ọ dị mma na Gideon gaege kwa ntị ná nkọwa nke nrọ ahụ, n’ihi na nke ahụ bụ okwu agbamume ahụ nke Chineke chọrọ ka ọ nụ. Ụfọdụ mmadụ naatụfu ngọzi na agbamume nke dị ha mkpà n’ihi na ha naala ọsọsọ -- eleghịanya ha naarapụ ụlọnzukọ na ebe anaekpe ekpere, náenwetaghị ihe Chineke nwere inye ha.

Ka Gideon na Pura naege ntị, onye Midian ọzọ kọwara isi nrọ nke onye agha ibe ya. Ọ sịrị, “Nka abugh ihe ọzọ ma-ọbugh mma-agha Gideon.” Ọ gakwara n’iru ikwu na Chineke enyewo ndị Midian n’aka Gideon. Ọbụná ndị iro matara na Chineke nke Israel gaemeri ha.

Òfùfè

Mgbe Gideon nụrụ nkọwa nrọ ahụ, ọ kpọrọ isiala nye Chineke. Ọ nọ náánị n’azụ ọmụma ụlọikwu nke ndịiro, n’ala nke ndịiro, ma ọ kpọrọ isiala nye Chineke. O chèreghị rue mgbe ọ laghachirị n’ụlọikwu ya. Ka anyị soro ihenlereanya nke Gideon ikele Chineke n’ihi ịdịmma Ya n’ebe anyị nọ, inye Ya otuto n’ihi anya nchebe Ya nlekọta na ịgbaume Ọ naenye anyị. Ebe ọ bụla anyị nọ, anyị pụrụ ibuli obi anyị n’òfùfè. Ọtụtụ mmadụ achọpụtawo na aha Jisọs n’ekpere ntà bụ ngwá agha dị ike megide onye iro, na ezi nchebe n’oge ihe ọjọọ.

Ngwá Agha Anaahụbeghị Mbụ

Gideon nwetara agbamume dị ukwuu. O wee laghachikuru ndikom ya, kewaa ha ụzọ atọ, wee jikere ha site n’inye ha ngwá agha anaahụbeghị mbụ. N’aka onye ọ bụla n’etiti narị ndikom atọ ahụ, Gideon nyere opiike, otù ite nke ọwa dị nime ya. Otú a ka ejikeworo ndịagha nke Israel maka agha ahụ. Enyere ha ndụmọdụ ka ha mee ihe ọ bụla Gideon mere -- ka ha fụa opi mgbe Gideon fụrụ, tie kwa mkpu mgbe Gideon tiri mkpu.

Ngwa agha nke imemmụọ dịkwara ndị nke Chineke taa adịghị ka ngwá agha niile ọzọ. Pọl kwuru ihe banyere nka n’iheodide o dere (II Ndi-Kọrint 10:4; Ndi Efesọs 6:17; Ndi Hibru 4:12). Mgbe nwa okoro ahụ naazụ atụrụ bụ Devid, jere ịlụso dike ahụ na eyikwasị iheagha dị icheiche ọgụ, Gọlaiat, Devid meriri n’aha Onyenweanyị. Devid sịrị: “Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha JEHOVA nke ùsù nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta” (I Samuel 17:45).

Kraist Onye Nlereanya Anyị

Ọtụtụ ndị nke Chineke amụtawo na ha pụrụ ịbụ ndị mmeri n’agha ọ bụla. Ha naesoro ihe nlereanya nke onyendú ha -- Kraist. “Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, nārapuru unu ihe ilere-anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile” (I Pita 2:21). N’oge ọnwụnwa, òlee iheagha Jisọs ji? Okwu Chineke. Ọ gwara ekwensu, sị “Edewo ya n’akwụkwọ nsọ, si” (Matiu 4:4, 7, 10). Ndị nke Chineke naemeri onyeiro site n’Okwu nke Onyenweanyị na site “nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi” (Ndi Hibru 12:2).

Ndikom nke Gideon kwere ka ọwa ha nwue n’ọchịchịrị. Agwara anyị ka anyị kwee ka ìhè anyị “nēnwu n’iru madu” (Matiu 5:16), na ka anyị bụrụ “ndi nēnye ìhè n’uwa” (Ndi Filipai 2:15). Ikwere ka ìhè nwupụta n’ọwa ha nyere ndikom Gideon aka imeri n’agha ahụ.

Ọtụtụ ugbò ole ka mkpu mmeri sitere n’egbugbereọnụ nke ndị agbapụtara gbasasịworo ndịiro! Mgbidi nke Jeriko daruru ala mgbe Ụmụ Israel rubeere Chineke isi tie kwa mkpu (Joshua 6:20).

Isoro Onyendú Ha

Narị ndikom atọ ahụ (300) bụ ndịagha nke Israel nwere okwukwe na ntụkwasịobi n’onyendú ha. Ndikom ahụ mere dịka Gideon sịrị ha mee. Òtù ntà atọ ahụ gbara ndịiro gburugburu. Mgbe naadịghị anya agbanwere nché, Gideon wee nye ha iheàmà. Egburu narị opiike atọ ahụ; etiwara narị ite atọ; narị ọwa atọ wee nwue ndịiro gburugburu; mkpu wee daa, “Mma-agha diri JEHOVA di-kwa-ra Gideon” Mmaagha Jehova dị n’aka Gideon alụtawo mmeri ahụ.

Óké egwù jidere mkpụrụobi niile nke ndịiro. Ụzụ ahụ, ìhè nke sitere n’ọwa niile ahụ, na mkpu ahụ dara n’ịdị jụụ nke abalị gbara ndịiro gharịị, rue mgbe ha gbara ọsọ. N’egwù ha, ha dakwasịrị na mmaagha ibe ha. Òtù atọ ahụ nke ndị Gideon guzoro “nwoke ọ bula n’ọnọdu-ya, gburugburu ọmuma-ulo-ikwu ahu.” Ha emeghị ngwa gbabà n’agha ahụ dịka ọ naanụ ha ọkụ n’obi ịlụ agha maọbụ ịkwata ihe nkwata n’agha. Ha cheere iwu sitere n’ọnụ Gideon. Nka gaabụ ezi iheọmụmụ kwesịrị ka anyị mụta site n’ebe ndikom Gideon nọ -- ka onye ọ bụla guzo n’ọnọdụ ya. Chineke Ọ pụrụ ịdabere anyị iguzo n’ọnọdụ anyị, náechere iwu Ya?

Achọrọ Mmeri Zuruòkè

Gideon enweghị afọojuju n’ịchụpụ ndị Midian n’ala Kenean. Chineke agwawo yarị na enyewo ya ụsụ niile nke ndị Midian n’aka. Ọbụná ọ bụ ezie na egburu ndịiro narị puku na iriabụọ (120,000), ihe ra ka puku irinaise (15,000) soro Zeba na Zalmuna, ndị eze nke Midian, gbaa ọsọ. Gideon chọrọ ihe niile Chineke kweworo ná mkwà. Ọ chọrọ ịlụzu ọlụ ahụ n’ozuzuòkè -- ọ bụghị náánị imezu akụkụ ụfọdụ nke ihe Chineke nyere n’iwu.

Efraim

Ndikom nke Israel gbakọtara wee chụọ ndị Midian. Gideon zigaara ndikom Efraim ozi, ndị nwudekwara ndịisi abụọ nke Midian. Ndikom Efraim sesara Gideon okwu. Ha jụrụ ya ihe kpatara o ji mesoo ha otú ahụ, n’ihi na ọ kpọghị ha ngwangwa karịa otú o mere ịbịa n’agha ahụ megide ndị Midian. Iwe were ha eleghịanya ha nwekwara ekworo. Gideon nwere obiọma n’ebe ha nọ wee sị ha, “Gini ka m’meworo ugbu a dịka nke unu mere?” N’ihi ịdịnwayọ na obiumeala nke Gideon ndikom Efraim kwụsịrị iwe iwe nọdụ kwa n’udo. N’ụzọ dị otú a Gideon gosipụtara na “ọziza-okwu di nro nēme ka ọnuma laghachi azu” (Ilu 15:1).

Ikpé

Gideon chụrụ ndị Midian fọdụrụ gafee Osimiri Jọdan. Ike gwụsịrị ndikom ya agụụ naagụ kwa ha. Ha rịọrọ ndikom Sukọt na ndikom Penuel achịcha, ha abụọ nọ n’ebo Gad (Ndi Israel). Obiọma maọbụ ileọbịa dị otú a kwesịrị ka emeere ya onye ọ bụla naeje njem, ka ọ fọdụ kwa, ndị agha nke Onyenweanyị arọpụtara. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nime ha nyere ndikom Gideon, Gideon wee dọọ ha aka ná ntị na aghaghị inye ha ahụhụ n’ihi omume nke ịmara náánị onwe ha ahụ ha mere. Chineke mesịrị nye Gideon ohere ikuziri ha ka ha ghara igbochi ndị agha nke Onyenweanyị. Ikpé ha natara siriike ma o ziriezi, n’ihi na ha añaghị ntị n’ịdọakanántị ahụ. Gideon alaghachịghị n’ụlọ ya rue mgbe ebibisịrị ndịiro ha apụghị kwa imekpá Ụmụ Israel arụ ọzọ.

Chineke, Onye Naachị Ha

Mgbe Gideon na ndikom ya laghachịrị na Kenean, Ụmụ Israel chọrọ ka ya na èzínaụlọ ya chịa ha n’ihi na ọ napụtawo ha n’aka ndị Midian. N’ụzọ nke imemmụọ, ndị niile Kraist napụtaworo site n’aka ekwensu naachọ ka Onyenweanyị bụrụ Onyendú na Onye ọchịchị nke ndụ ha. Onyenweanyị mere Gideon onyendú ha, o jigidekwara ọnọdụ ahụ rue mgbe ọ nwụrụ. Ọ gwara Ụmụ Israel sị: “JEHOVA gāchi unu.” Eleghị-anya o nwere mmetụta dị ukuu dịka Pọl onye gwara Ndi Kọrint ka ha na-eso ya dịka ya onwe-ya na-eso Kraist (I Ndi Kọrint 11:1).

Ọnwụ nke Gideon

Ụmụ Israel biri n’udo iri arọ anọ n’ụbọchị niile nke Gideon. Ọ bu ezie na o mere ndahie; ọ jụghị Chineke ase. Náagbaghịagụgọ, ọ chọrọ idebe ihencheta nke ihenkwata n’agha ahụ. Ọ chịkọtara mgbaaka ọlaedo niile anataworo ndịiro ha were ya mee ephod. Ephod a, nke bụ otù nime uwe ndị nchụàjà, wee ghọọ ihe ikperearụsị ghọọ kwa ọnyà nye Gideon. Lee otú mmadụ aghaghị iwere ezi nleruanya na ikpesi ekpere ike naebi ndụ ka ndahie ọ bụla wee ghara ịbụrụ ihenlere anya naezighị ezi nke onye ọzọ gaesoro!

Mgbe Gideon nwusịrị, Ụmụ Israel wee rapụ kwa ezi Chineke dị ndụ. Ha were arụsị mere chi. Ha chefue Chineke onye napụtaworo ha n’aka ndịiro n’akụkụ niile. Ha egosighị kwa obiọma n’arụ èzinaụlọ nke Gideon igosi obiekele n’ihi ihe o mewooro ha. Ọtụtụ mgbe ọ naadị otú ahụ; mgbe mmadụ chefuru Chineke, ọ naèchefu kwa ndị niile bụworo ndịeyi ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Gideon si ghọọ onyendú ndị Israel?
  2. Gịnị mere ndịagha ya ji dị ntà?
  3. Gịnị bụ nrọ nke onye Midian ahụ? gịnị bụ kwa nkọwa ya?
  4. Gịnị bụ ihe agha ndikom Gideon ji lụọ agha ahụ?
  5. Gịnị bụ ihe kpatara Gideon na ndị òtù ya ji nwee ọgan’iru?
  6. Òlee otú anyị pụrụ isi mee ka “ìhè ayi” náenwu?
  7. Gịnị mere anyị gaeji mee ka ìhè anyị naenwu?
  8. Gịnị mere ndikom ahụ ji tie mkpu sị: “Mma-agha diri JEHOVA di-kwa-ra Gideon”?
  9. Gịnị mere Gideon ji chụa ma bibie kwa ndịiro kpamkpam?