Ndi-ikpe 16:4-31

Lesson 195 - Junior

Memory Verse
“Ikem na abù ọmam ka Ja bu, Ọ we ghọrọm nzọputa” (Ọpupu 15:2).
Notes

Udo na ọgan’iru nke ndị Israel naadịgide mgbe niile ha naefè Chineke n’ikwesị ntụkwasịobi. Mgbe ha nọ n’akụkụ nke Onyenweanyị ha naadị ike, nwee kwa ike, imeri mbà ọzọ dị icheiche. Chineke ekwewo mkwà na ọ bụrụ na ha erubere Ya isi na Ya gaeme ka ha bụrụ isi, mbà niile ọzọ ewee bụrụ ọdụ. Ọtụtụ mgbe Israel naabụ ọdụ n’okpuru mba ndị naekpere arụsi ndị naahụghị Chineke n’anya. Ọnọdụ ha naabụ mgbe niile ikpé n’ihi mmehie ha.

Mmalite nke Nnapụta

Samson bụ otù nime ndị ikpé Chineke welitere ịnapụta ndị Israel n’orù. Chineke ekweworị nne Samson mkwà na nwa ya gaamalite ịnapụta Israel n’aka ndị Filistịa. Ka ọ naetolite o wee dị ike nke ukwuu, eleghịanya karịa ka mmadụ ọ bụla dịworo. Mmụọ nke Chineke gaabịakwasị ya mgbe ụfọdụ, ọbụná ka ọ naetolite, ọ gaeme kwa ihe dị icheiche ndịọzọ naapụghị ime.

Ndị Filistịa bụ ndị mmehie, Chineke ekwubiwo kwa okwu ikpé n’isi ha. Ha enwewo ohere ichègharị ma ha jụrụ ikwenyere Chineke. Ugbu a ahụhụ amalitewo ịbịakwasị ha site n’aka Samson.

Ọgụ Megide Mmehie

Ụmụ Chineke n’ụbọchị taa aghaghị ịlụ ọgụ megide mmehie. Anyị adịghị alụagha ibibi onyemmehie n’anụarụ, ma anyị naemegide omumeọjọọ ebe ọ bụla anyị hụrụ ya. Anyị naagbalị iduru onyemmehie bịakute Jisọs ka o wee chègharịa ewee zọpụta ya, ma anyị agaghị ekwenyere mmehie maọbụ nwere òkè ọ bụla nime ha. Anyị aghaghị iguzoro n’eziokwu nke Okwu Chineke wee kpọsaa agha megide iheọjọọ. “Egwù JEHOVA bu ikpọ ihe ọjọ asi” (Ilu 8:13).

Samson nwere ọtụtụ ohere ibibi ụfọdụ ndị Filistia; aka náánị ya gburu ọtụtụ ndịiro ahụ. Ndị Filistia wee nwee nsogbu n’ihi ike Samson. Òlee otú ha pụrụ isi jide ya dịka onye mkpọrọ? Òlee otú ha gaesi bibie ike ya?

Ndị Filistia zigara ụsụ ndị agha ijide otù nwoke a onye wetaworo óké mbibi n’etiti ha. Mgbe ndị Israel hụrụ ụsụ ndị agha Filistia ka ha naabịa, ha tụrụ egwù. Karịa ijé nyere Samson aka, ha zigara puku ndikom atọ sitere n’ebo Juda ka ha kee ya agbụ nye féé kwa ya n’aka ndị Filistia. Ha sịrị Samson: “Ì magh na ndi Filistia bu ndi nāchi ayị? gịnị bu kwa nka i meworo ayị?” Gịnị mere omume nke Samson gaeji kpọdakwasị ha iwe nke ndịiro, naeme ka Israel niile nwee nsogbu?

Ikwenyere Ihe Ọjọọ

Nka bụ ile nsogbu ha anya n’ụjọ. Chineke welitere Samson ịmalite nnapụta nke Israel ọ bụrụ kwa na ndị Israel soro ya lụọ ọgụ, ha gaenweworị mmeri dị ngwa megide ndị Filistia. Kama nke ahụ, ndị Israel nwere afọojuju ibi n’etiti ndị mmehie, na ịbụrụ ha ndịorù. Ha naatụ egwù iguzoro ihe ha maworo na ọ bụ eziokwu.

Mmadụ nwere ike gbanarị mmekpaarụ maọbụ mkpagbu site n’ịdịnyere ndị mmehie, ma Chineke naahụzu. Ikpé Ọ gaezidakwasị ndị naekwenyere mmehie n’ikpeazụ gaadị ike nke ukwuu ịnagide karịa ahụhụ ntà mmadụ gaedi ugbu a n’ihi iguzoro eziokwu.

Ọkpụkpụàgbà Ahụ

Ndị Israel wee chịgharịa megide onyennapụta ha, wee were ụdọ ọhụụ kee Samson agbụ nyefe kwa ya n’aka ndị Filistia dịka onyemkpọrọ. Ma Chineke ewelitewo Samson ka ọ malite ịnapụta Israel, O wee nye Samson ike ịdọbi ụdọ ahụ dịka ha bụ flax reworo ọkụ.

Samson wee were ihe mbụ ọ hụrụ mee iheagha megide ndị Filistia. Ọ bụ ọkpụkpụàgbà ịnyịnyaibu. Samson jiri náánị ọkpụkpụ ahụ gbue otù puku ndị Filistia. Chineke naamalite ịnapụta Israel site n’ike nke otù nwoke nwere obiike. Anyị anụwo ka anaekwu ya na Chineke nọrọ n’akụkụ anyị, anyị karịrị ọtụtụ ọbụná asị na náánị anyị naeguzo.

Samson emeriwo agha dị ukwuu. Ugbu a akpịrị naakpọ ya nkụ. Gịnị ka ọ gaapụtara ya ọ bụrụ na ọ hụghị mmiri? Mmeri o nwetaworo ọ gaabụ n’efu, ọ bụ na ọ ghaghị ịnwụ n’ihi akpịrị ịkpọnkụ? Samson kpọkuru Chineke maka inyeaka, inyeaka wee bia n’ụdị mmiri nime ọkpụkpụagba ịnyịnya ahụ. Samson wee ñụa nwee kwa ume ịlụ agha ọzọ dị icheiche.

Mmaagha nke Mmụọ Nsọ

Anyị pụrụ iwere ọkpụkpụàgbà ịnyinyaibu a tụnyere Okwu Chineke, iheagha nke Onye Kraist n’ọgụ ya megide mmehie. Pọl Onyeozi dere: “Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọpụta, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke” (Ndi-Efesọs 6:17); ọzọ kwa: “Okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua” (Ndi Hịbru 4:12). Chineke chọrọ ka anyị were Okwu Ya lụso iheọjọọ ọgụ. Ọ bụrụ na ekwensu naanwa anyị ime ihe ọ bụla, anyị pụrụ ịzaghachị ya sị, “Okwu Chineke gwaram ka m’ghara ime otú ahụ; n’ihi ya agaghịm eme ya.” Mgbe ekwensu nwara Jisọs, ihe O ji chee Onweya bụ, “Edewo ya n’akwukwọ-nsọ si.” Setan adịghịike megide iwu nke Chineke.

Ọ bụghị náánị iheagha ka anyị naenweta n’Okwu Chineke kama site kwa n’Okwu ahụ anyị naenwe ume. Otù oge mgbe Jeremaia Onyeamụma chère na ọ gaabụ náánị ya fọdụrụ n’ụwa niile bụ onye hụrụ Chineke n’anya naerubekwara Ya isi, ọ chọtara otù akụkụ nke Baịbụl; o wee sị: “Achọpụtawo okwu-Gi, m’we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọñu obim” (Jeremaia 15:16). Ọ taghị akwụkwọ nke edekwasịrị okwu ahụ, kama ihe ọ gụrụ ka o chetaworo debe kwa ha n’obi ya. O nyere ya ume ọhụụ ịnọgide n’ịdịịrị Chineke ndụ.

Onye Nazaret

Anyị apụghị ịkọwa otú mmeri niile Samson nwetara gaadịworị ukwuu karịa ka ha ra ugbu a ọ bụrụ na o biri ndụ gaadị Chineke ụtọ mgbe niile. Nne ya edowo ya iche ijere Chineke ozi, dịka onye Nazaret, tutu amụọ ya; ọ bụrụ kwa na o mezuru ijiobichụọàjà ahụ ọ gaebiworị ndụ dị nsọ, ndụ bàra urù nye Chineke na mmadụ. Chee échìchè banyere ngọzi dị icheiche nke gaabịakwasịwo yarị ọ bụrụ na o debere ike nke imemmụọ dịka o debere nke anụarụ!

Ụmụ nke ndị mụrụ ha naasọpụrụ Chineke nwere ihenketa dị ebube, na ọlụ dị ukwuu rie nne. Ọ bụrụ na nne na nna anyị edowo anyị nsọ nye Onyenweanyị, anyị nwere ezi mmalite inwe nzọpụta na ibindụ ịsọpụrụ Chineke. Ngọzi niile ahụ naamalite site na mgbe amụrụ anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ajụ ijé ijè n’ụzọ niile nke Chineke tụworo àtụmàtụ ya nye anyị, anyị gaata ahụhụ dị ike nke ukwuu ọbụná karịa ndị naamaghị Oziọma. O doro anya na Chineke gaezite amamikpé nke mmehie nime obi ụmụ ndịa n’ọzịzá ekpere nke ndị mụrụ ha, ma Ọ pụghị ịzọpụta onye ọ bụla nke naachọghị. Onye ọ bụla aghaghị ichègharị n’onweya; ọ bụrụ kwa na ọ jụ ime otú ahụ, ọ gaefu ebighịebi naagbanyeghị ekpere niile nke ndị mụrụ ya.

Otù akụkụ nime mkwà nke onye Nazaret bụ ikwe ka agịrịisi ya too ogologo, Chineke enyewo kwa iwu pụrụ iche banyere Samson na agụba ọ bụla agaghị aga n’elu isi ya. Ọ bụghị mmadụ niile naekwe ka agịrịisi ha too ogologo, n’ikwe mkwà, naenwe ike dịka Samson, ma ọ dị ka enwere ihe naejikọta agịrịisi ya na ike ya. Mgbe niile agịrịisi ya naadị ogologo, ndị Filistia apụghị imeri ya.

Ime Otù Onye Filistia Enyi

Samson nyefere onweya ná mmegide nke onyeiro mgbe o jere n’etiti ndị Filistia wee zute Delaila. Mgbe ha nụrụ na ọ nọ n’etiti ha, ndị Filistia nyere Delaila ihe iringo ka ọ rara ya nye n’aka ha. N’ụzọ aghụghọ dịka ọ hurụ ya n’anya, ọ rịọ ya ka o gosi ya ihe nzuzo nke ike o nwere. Samson wee si na ọ bụrụ na ewere akwara ọhụụ asaa ana amịkọghị amịkọ (Udọ dị ike dịka wilo) kee ya agbụ na ya gaabụ onye naadịghị ike dịka mmadụ ọ bụla ọzọ. Ndiiro nọ n’ebe ahụ iwere akwara anaamịkọghị amịkọ kee ya agbụ ngwàngwà; ma mgbe Delaila tiri mkpu, “Ndi-Filistia nādakwasi gi, Samson,” o bilie dọbisịa agbụ ahụ dịka eriri añara n’ọkụ. O wee gbanarị.

O kwesịrị ka Samson si n’ebe Delaila nọ wezuga onwe ya, nkekanke mgbe ọ chọpụtara na ọ raara ya nye. Ma ọ laghachịrị ọzọ; ọ gbalịkwara ịmata ihe nzuzo ahụ. Ugbu a ọ gwara ya na ọ bụrụ na ewere ụdọ ọhụụ nke akaejighi jee ozi ọ bụla ke ya agbụ, ike agaghị adị kwa ya. Ndi Filistia weere ụdọ ọhụụ kee ya agbụ mgbe ọ naararụ ụra, ma mgbe o tetara ọ dọbisiri ha dịka ha bụ ogho. Samson dị ka ọ naañụrị ọñụ ime ndị Filistia ndị nzuzu site n’ịkọrọ ha akụkọ iro niile ndịa, ma ọ bụ iheegwù ka ọ naeleda anya, mgbe naadịghị kwa anya ọ ga adabà kwa n’aka ndịiro n’ihi ịkpọ ihe a ihe ntà.

Si n’ụbọchị rue n’ụbọchị Delaila na arịọ ya ka o gosi ya ihe nzuzo ya, n’ikpeazụ o merie site n’anyammiri ya. Ọ gwara ya eziokwu, na ya nọ na mkwà dịka onye Nazaret na agụba agabeghi kwa n’elu isi ya, na ọ bụrụ kwa na akọpụ ya isi, ya gaadị ka mmadụ ọ bụla ọzọ. O wee mee ka akọpụ ya isi o wee rue na mgbe ọzọ ndịiro bịakwasịrị ya ike adịkwaghị ya.

Ikwenyere Ọnwụnwa

Onye ọ bụla ji ọnwụnwa naegwu egwú aghaghị ile anya na ọ pụrụ imeri ya n’ikpeazụ. Okwu Chineke naadọ anyị aka ná ntị: “Guzogidenu ekwensu, ọ gāgbapụ kwa n’ebe unu nọ” (Jemes 4:7). Samson kwenyeere ọnwụnwa kama ọ gaesi n’ebe ọ nọ wezuga onweya, ndị Filistia wee jide ya ma kwa ya ikpe ịlụọlụ siri ike n’ụlọmkpọrọ. Arụkpọrọ anya ya abụọ o wee nọdụ n’ọchịchịrị.

Anyị pụrụ ịhụ óké nsogbu naabịakwasị onye daghachịrị azụ n’ihi na o chigharịrị pụọ n’ebe Chineke nọ. Onye naeme ihe naatọ Onyenweanyị ụtọ naemeri ndịiro ya; ma mgbe ọ gbakụtara Onyenzọpụta azụ, ekwensu bụ nna ya ukwu gaeme kwa ka ọ lụsie ọlụ ike n’ihi ụgwọọlụ ya nke ọnwụ ebighịebi. Onye daghachiri azụ naetufu ìhè ebube nke Oziọma wee naanọdụ n’ọchịchịrị nke mmehie kpue kwa ísì n’ebe ezi ihe niile nke Chineke nwere nye ndị niile hụrụ Ya n’anya dị.

Nchègharị

Samson nwere ohere ichè échìchè banyere Chineke mgbe ọ naalụ ọlụ ya n’ụlomkpọrọ. Ọ dị ka nwammefu ahụ onye “mara onwe-ya” n’ubi ebe anaazụ ezi n’obodo ọzọ mgbe o mefusịrị ego ya ná mmehie. Samson ghọtara na ọ bụ mmehie ya wetaara ya nsogbu niile ahụ, o were obi ya niile chigharịkute Chineke.

Agịrịisi Samson wee malite irute, ike sitere na Chineke wee so kwa ya bịa. Otù ụbọchị mgbe ndị Filistia naeto chi ụgha ha na o nyefere Samson n’aka ha, akpọpụtara Samson n’iru ha ka ha were ya mee ihe ọchị. Ọtụtụ mmadụ zukọtara n’ụlọ ahụ dị ukwuu ebe ha gaeme ememe ahụ, ndị nọ n’elu ụlọ ahụ dị puku mmadụ atọ. N’etiti ìgwè ndị ahụ naekpere arụsị Samson weliri obi ya nye Chineke nke Israel, wee kpee ekpere sị: “Onye-nwe-ayi JEHOVA, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m’di ike nánị otù ugbò a.” Chineke nụrụ ekpere ya, kwụghachị kwa ya ụgwọọlụ nke okwukwe ya. Ná Ndị Hibru isi irinaotù anyị naagụ na ọ bụ site n’okwukwe ka Samson “site n’adigh ike” bụ onye emere ka ọ “di ike.”

Ịlaghachite N’Ọkpụkpọòkù nke Chineke

Samson wee rịọ ka edurue ya n’ogidi nke ụlọ naeguzo n’elu ya nke ụlọukwuu ahụ, dịka ọ chọrọ ịdabere ha wee zue ike. Ma Chineke akpọwo ya n’ọlụ nke ibibi ndị Filistia, n’oge hour nke ikpeazụ a kwa Samson wee bulie kwa ibuarọ nke ọlụ ahụ ọzọ. Ọ kpọkuru Chineke ka O nye ya ike, n’otù nkudata ume dị ike ọ dọdata ụlọ ahụ, o wee dakwasị óké ìgwè mmadụ ahụ. Ọtụtụ puku mmadụ ka egburu. Samson soro ha nwụọ, ma o gburu ọtụtụ mmadụ n’ọnwụ ya karịa ka o gburu na ndụ ya, ewee bọọ ọbọ Israel n’arụ ndịiro ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ihe ahụ pụrụ iché banyere Samson?
  2. Gịnị bụ ebumn’obi nke eji mee ya onyeikpé?
  3. Òlee otú Samson si lụọ ọlụ ahụ?
  4. Òlee otú anyị si mata na ndị Israel adịnyereghị Samson?
  5. Gịnị kpatara na Samson tụfuru ike ya?
  6. Gịnị ka ndị Filistia mere Samson mgbe ha jidere ya?
  7. Kọwaa ụbọchị ikpeazụ nke ndụ Samson.
  8. N’ihi gịnị ka Samson ji nweta kwa ike ọzọ?