Matiu 21:12-32

Lesson 196 - Junior

Memory Verse
“Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu gāriọ n’ekpere, ma asi na unu kwere, unu gānata kwa ha” (Matiu 21:22).
Notes

Ụbọchị Mbụ n’Izu

Izúụkọ ikpeàzụ tutu akpọgide Kraist n’obe agafeworị. Mgbe náadịghị anya Ọ gaalaghachị n’Eluigwe wee rapụ ndị náesoụzọ Ya ka ha gbasaa Oziọma nke Alaeze Ya. Nime arọ atọ na ọkàrà nke ijéozi Ya Ọ gwawo ha ọtụtụ ihe nke gaeme ka ha bụrụ ndị kwesịrị ibi n’Alaeze Eluigwe, ma o nwekwara ihe mmụta olenaole Ọ gaezi ha.

Izuụkọ nke a meghere site ná mbànye mmeri nke Onyenweanyị nime Jerusalem. N’okporoụzọ ntà niile nke obodo ahụ anaeti mkpu náasị “Hosanna diri nwa Devid,” na “Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayị bu: udo di n’elu-igwe, otuto di kwa n’ebe kachasi ihe nile elu” (Luk 19:38). Ọ dị ka ụbọchị ahụ abịawo mgbe Jisọs gaeme onwe Ya ka Ọ pụta ìhè dịka Eze ndị Juu. N’ezie Onyemgbapụta nke hà chèrèworo ọtụtụ arọ naabịa iwere ọchịchị!

Ma é-è! Ndị agha nke ndị Rom gara n’iru, n’ụzọ ha dịka ha naeme na mbụ. Alaeze niile nke ụwa a gara n’iru, n’ihi na Alaeze Ya abụghị nke ụwa nke a. Ọ banyere na Jerusalem dịka onyeamụma kwuru, “onye ewedara n’ala, nke nānọkwasi kwa n’inyinya-ibu.”

Oge Ememe Ngabiga

Ọ bụ oge ememe ngabiga, ndị Juu esiwo kwa n’obodo niile dị gburugburu bịa ịchụàjà ha n’Ụlọukwu Chineke dị na Jerusalem. Okporoụzọ niile jupụtara ná ndị náanụ ọkụ n’obi ịkpọ isi ala nye Chineke, ebe gburugburu Ụlọukwu Chineke jupụtara na mmadụ ndị náejégharị, náakwado banyere oge izuike dị nsọ nke náabịa.

Enyeghị Ulo Chineke Nsọpụrụ

Chèè échìchè banyere ihe Jisọs hụrụ mgbe Ọ bànyere n’Ụlọ ukwu Chineke, ụlọ nke Nna Ya, ụlọ ekpere! Kama ikpé ekpere, ndị ahụ naazụahịa, náazụ ụmụ anụmanụ eji achụàjà dị icheiche, náewere ego ha ji si ala ọzọ bịa náagbanwere ego dị na Jerusalem. Ndịa naazụ náere kwa bụ ndị aghụghọ nke mere na Jisọs kpọrọ ha ndịori. Ha naapụnara Chineke ịhụn’anya na ezi òfùfè nke ha ji ụgwọ inye Ya. Ihe dị ha mkpà bụ omenala na ememe dị icheiche karịa ifè ezi òfùfè.

Jisọs batara n’etiti ọgba aghara niile a. Nke a bụ izuụkọ agaje ịkpọgide Ya n’obe, ndị Juu naachọ kwa ụzọ ha gaeji jide Ya. Ma mgbe Ọ batara nime Uloukwu Chineke náánị Ya, ọ dịghị onye ọ bụla metụrụ Ya aka. O wee guzo n’iru ha ná mkwukwaokwu megide ha n’ihi ịzụ na ire ahịa ha. N’etiti ụzụ ahụ anaatụ, O wee sị “Edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere; ma unu onwe-unu nēme ya ọgba ndi nāpunara madu ihe.”

O wee kpue tebụl ndị ahụ náagbanwe ego iru, ego ha wee wụpụsịa n’ala! Onyenwe Uloukwu ahụ nọ n’ebe ahụ, ndị ahụ enweghị kwa ike ọ bụla n’iru Ya. Nduru niile esi nime nkata ha wepụtasịa wee felaga, ndị na-ere ha apụghị ime ihe ọzọ ma ọbụghị ịchụ ha n’àzụ.

Ụlọ nke Otuto Ahụ

Lee otú Ụlọukwu ahụ dara jụụ mgbe ndị ahụ náere ahịa naeme ụzụ gbapụsịrị, ha na ndị náazụ ha ahịa náenweghị ojuju afọ. Itimkpu nke ehi na atụrụ kwụsịrị.

Mgbe ahụ gịnị ka anyị nụrụ? Ụmụntakịrị náabụabụ, “Hosanna diri nwa Devid.” Ha naeto Jisọs Onye bịara ịzọpụta ndị furuefu, ikechi ọnyá ndị obi ha tiwaraetiwa, inye obi nọ ná nsogbu udo. Ebube nke Chineke arịdakwasịwo nime ulo Ya, Nwa Ya Ọ hụrụ n’anya wee gwọọ onye ngwụrọ bịakutere Ya, wee mee ka onyeisi hụ ụzọ. Nke a bụ ihe Chineke chọrọ ka anaeme n’Ụlọukwu Ya. Nke a bụ ụlọ ebe anaefè òfùfè, ụlọ ekpere.

Lee otú anyị kwesịrị ilezianya nkeọma inye ụlọ Chineke nsọpụrụ! Anyị aghaghị ichèta na mgbe anyị batara nime ulo nzukọ anyị na anọ n’iru Chineke na anyị abịawo kwa ịkpọ isiala nye Ya. Ọ chọrọ ka ụmụntakịrị bụọ abụ otuto Ya dịka ha mere n’ụbọchị ahụ mgbe dị anya garaaga n’Ụlọukwu Chineke dị na Jerusalem.

Akpọrọ Ụmụntakịrị

N’ụbọchị ndị a anyị nọ nime ha anyị naahụ na ọtụtụ ndị nnenanna arapụwo ifè Chineke, ha adịghị ejé kwa n’uloụkọ. Ọtụtụ mgbe ụmụntakịrị naebu nnananne ha ụzọ nye Jisọs obi ha. Onyenwe anyị naachọ ndị gaebi n’Alaeze Ya, ọbụná asị na ndị okenye ghara ịbịakute Ya, Ọ gaakpọ ụmụntakịrị ka ha fèè Ya. Ọtụtụ nime ha gaanata ụgwọọlụ ebighịebi n’Eluigwe n’ihi na ha hụrụ Jisọs n’anya. O kwuru banyere ụmụntakịrị sị “Unu egbochi-kwala ha: n’ihi ala-eze elu-igwe bu nke ndi di otú a” (Matiu 19:14).

Jisọs jiri otù nwatakịrị gosi iheàtụ ndị gaebi n’Alaeze Ya: “N’ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharigh, bia di ka umu-ntakiri, unu agagh-abà n’ala-eze elu-igwe ma-ọli. Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n’ala-eze elu-igwe. Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n’aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma” (Matiu 18:3-5).

Moses ejiworị nleruanya nye Ụmụ Israel ndụmọdụ banyere izi ụmụ ha iwu niile nke Chineke: “I gējisi kwa ike izi ha umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mgbe i nānọdu n’ulo-gi, na mgbe i nēje ije n’uzọ, na mgbe i nēdina ala, na mgbe i nebili ọtọ” (Deuteronomi 6:7). O chèghị na ọ bụ ihe emere mgbe oge ya akaerughi bụ izi ụmụ ihe banyere Onyenwe anyị mgbe ha ka dị ntà.

Mgbe ụmụntakịrị nwere mmetụta nke ọkpụkpọ òkù Chineke¸ ka onye ọ bụla ghara ịsị na ha dị ntakịrị. Ọtụtụ mgbe ụmụntakịrị naebu ndị okenye ụzọ ghọta ụzọ esi abụ ndị amụrụ ọhụu. Ụzọ Oziọma si dị mfé nghọta bụ ihe obi naachọsiike, nwatakịrị gaekwere kwa na Jisọs agbagharawo mmehie ya ebe okenye nọ náatụle n’obi ya ma ọ bụ eziokwu.

Ọ bụrụ na ị naeche na Onyenwe anyị naakpọ gị, zaa Ya site n’ịhụnanya na ịnụọkụ nke obi gị. Were ndụ gị kwe Ya mkwà ugbu a na mgbe ebighịebi. Ọ hụrụ gị n’anya náachọ kwa otuto site n’obi na egbugbereọnụ gị. “Lenu aha ihu-n’anya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke” (I Jọn 3:1).

Ihe kpatara ndị isi nọ n’Uloukwu Chineke enweghị ọñụ n’abụ ụmụntà ahụ naabụ bụ n’ihi na ndị isi ahụ naekwo ekworo n’ihi nsọpụrụ anaenye Jisọs. O wee gwa ndị nchụàjà ahụ na ebe ha jụrụ itò Ya mata kwa Ya dịka Mesaia ahụ, Nna ewerewo ọnụ ụmụntakịrị bụọ otuto nye Ya.

Ndị ndú òfùfè ndị a achọghị ịnụ ọbụná ekele nke ndị agwọrọ ọrịa ha, mee kwa ka ike ha laghachị. Ndịa kwesịrị ịbụ ndị náejéozi wee nyere ụmụmmadụ aka, rọọrọ ịnụ iseokwu nke ndị náagbanwe ego na ndị náere atụrụ.

Osisi Fig ahụ Náamịghị Mkpụrụ

N’ụtụtụ echi ya mgbe Jisọs na ndị náesoụzọ Ya naalaghachị Jerusalem site na Betani, ebe ha nọrọ ọnọdụabalị, agụụ gụrụ Ya; mgbe Ọ hụrụ otù osisi fig, O wee chọọ mkpụrụ n’elu ya nke Ọ gaeri. Ma náánị akwụkwọ ndụ jupụtara n’elu ya. O wutara Ya, O wee sị osisi fig ahụ, “Ka nkpuru ghara iputa n’elu gi ọzọ ebigh ebi,” osisi ahụ wee kpọnwụọ.

Mgbe anyị ghọrọ ụmụ Chineke anyị bụ ihe ọkụkụ Ya, osisi Ya. Mgbe náadịghị anya Ọ gaabịa ile ma anyị naamị mkpụrụ. Ụfọdụ pụrụ ichè na mkpụrụ dị otú ahụ bụ ezi ọlụ, ma Pọl naagwa anyị na mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ ihe ndịa: “Ihu-n’anya, ọñu, udo, ogologo-ntachi-obi, obi-ọma, idi-mma¸ ikwesi-ntukwasi-obi, idi-nwayọ, imeru-ihe-n’okè” (Ndi Galetia 5:22). N’ezie, ọ bụrụ na anyị nwere mkpụrụ a nke ikwesị ntukwasiobi ịhụnanya anyị gaegosi ọtụtụ ọlụ ọma ime ka ọ pụta ìhè na anyị nwere ya. Jemes Onye ozi dere sị: “Amam-ihe ahu nke si n’elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n’ebere na ezi nkpuru, nēnwegh obi-abua, nēnwegh iru-abua” (Jemes 3:17). Nke ahụ bụ ihe Jisọs náatụ anya ịhụ n’elu “osisi” Ya niile.

Ime Ka Osisi Ahụ Dị Ọcha

Ọ bụrụ na Jisọs bịakute otù nime “osisi fig” Ya wee hụ ụfọdụ nime mkpụrụ niile ahụ, dịka ikwesị ntụkwasiobi na ịhụnanya na udo, ma hụ ntakịrị ịdị nwayọ na ogologontachịobi, Ọ gaasị na osisi ahụ chọrọ ka eme ka ọ dị ọcha kụgharịa kwa ya. Ọ gaenye ya ohere ka ọ mịa mkpụrụ karịa. “Alaka ọ bula nimem nke nādigh-amị nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, Ọ nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mịa nkpuru kari” (Jọn 15:2). Mgbe Onyenwe anyị naeme ka ụmụ Ya “di ọcha”, ọ naegbu mgbu; ma ọ naabụ ihe óké ọñụ nye ndị ritara urù site na ya! “Ozizi nile site n’inye ahuhu nādi ka ihe nādigh-eweta ọñụ n’oge di ugbu a, kama nwuta; ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n’udo, bu nkpuru nke ezi omume” (Ndi Hibru 12:11).

Ọ bụrụ na “osisi” ahụ agaa n’iru jụ ịmị mkpụrụ, aga-egbutu ya. Jisọs tụrụ ilu iji kọwa ya: “Otù onye nwere osisi fig akuru n’ubi-vine-ya; O we bia nāchọ nkpuru n’elu ya, ma Ọ hugh. O we si onye-ọlu-vine-ya, le, site n’arọ atọ rue ugbu a ka m’nābia nāchọ nkpuru n’osisi fig a, ma ahughm: gbutue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n’iyi?” Ma onye na-elekọta ubi sịrị, “Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mgbe m’gēgwu ala-ya gburugburu, wusa kwa ya nsi-anu: ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n’ugbu a, o di nma; ma ọ buru na ọ migh i gēbutu ya” (Luk 13:6-9).

Chèè échìchè banyere ebere Chineke inye anyị ohere ọzọ mgbe Ọ na achọtaghị mkpụrụ ọ bụla, maọbụ mgbe Ọ hụrụ mkpụrụ olenaole. O kwesịrị ịgba anyị ume iji ndụ anyị chụọàjà gaa n’iru nye Chineke ka ezi mkpụrụ mịa nime anyị wee bụrụ ihe náatọ Onye nzọpụta ụtọ.

Ọlụ site n’Okwukwe

Ọ juru ndị náesoụzọ Ya anya ịhụ na osisi fig ahụ kpọnwuru ngwangwa. Ha ahụworị ka Jisọs na alụọlụ ebube, ha anụwo kwa ebe O kwuru okwu ebili mmiri wee dajụọ. Ugbu a kwa ike O nwere n’ebe ihe òkìkè dị tụrụ ha n’anya.

Jisọs wee nwaa ime ka ndị náesoụzọ Ya ghọta na ọ bụ okwukwe nime Chineke lụrụ nke a. O wee gwa ha na ọ bụrụ na ha kwere na Chineke ha pụrụ ime otù ihe ahụ. Ihe ọ bụla ha rịọrọ nna n’aha Ya, ha gaanata ya ọ bụrụ na ha kweere. “Ma asi na okwukwe adigh ọ bu ihe anāpugh ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ” (Ndi Hibru 11:6). Ihe ọ bụla anyị na emere Chineke aghaghị ịbụ ihe emere site n’okwukwe. Ọ bụrụ na Chineke ga alụ ọlụ rue ka okwukwe anyị ra, ọtụtụ ra añaa ka Ọ gaalụpụta site na mụ? site kwa na gị?

Ịnọgide nime Ya

Jisọs asịghị na Ya gaaza ekpere imezu ọchịchọ nke anyị. Ọ sịrị: “Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, rịọnu ihe ọ bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya” (Jọn 15:7). Mgbe anyị na anọgide nime Ya, anyị gaarịọ ihe dịka Okwu Ya si dị, wee nwee kwa okwukwe na Ọ gaeme ya. “Ọ buru na obi-ayị amagh ayị ikpé, ayi nwere nkwuwa-okwu n’ebe Chineke nọ; ihe ọ bula ayi nārịọ kwa, ayi nānata ya n’aka-Ya, n’ihi na anyi nēdebe ihe nile O nyere n’iwu, ayi nēme kwa ihe nile natọ utọ n’iru Ya” (I Jọn 3:21, 22).

Okwukwe bụ otù nime mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ, anyị gaenwe ya ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Onyenweanyị nwee obi ọma n’arụ “osisi fig” ya. Ka anyị naamụ okwu Ya okwukwe anyị gaaba ụba. “Okwukwe si n’ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n’okwu Kraist” (Ndi Rom 10:17). Mgbe anyị tinyere okwukwe Chineke nyere anyị n’ọlụ ọ gaaba ụba, anyị gaekwere kwa na Ya n’ihe ka ukwuu.

N’izu ụkọ ikpeàzụ a Kraist kpere ekpere n’ihi ndị náesoụzọ Ya ka okwukwe ha ghara ịda. Ekpere ahụ rutere anyị onweanyị taa. Ka anyị dị ndụ nime Okwu Ya ka Okwukwe anyị wee too, anyị gaesi kwa ike ịlụọlụ O nyere anyị iwu ịlụ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka anyị na akpọ izúụkọ ikpeàzụ tutu mkpọgide n’obe nke Jisọs?
  2. Gịnị mere n’ụbọchị mbụ nke Izú ahụ?
  3. Gịnị ka Jisọs hụrụ n’Ụlọukwu Chineke mgbe Ọ bịaruru?
  4. Gịnị ka ndị isinchụàjà n’agbá izù ime Jisọs?
  5. Òlee ụzọ Jisọs si gosi na Ya adịghị atụ egwù ha?
  6. Gịnị mere nime Ụlọukwu Chineke mgbe achụpụsịrị ndị mmehie ahụ?
  7. Kwue nke ntakịrị banyere ụzọ Jisọs si ahụ ụmụntakịrị.
  8. Òlee ụzọ anyị gaesi lụara Onyenwe anyị ọlụ?