Matiu 21:33-46

Lesson 197 - Junior

Memory Verse
“Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu” (Ndi Hibru 12:25).
Notes

Otù Ubivine

Mgbe Jisọs naezi ihe n’Ụlọukwu Chineke nime ụbọchị ikpeàzụ ndị ahụ tutu ọnwụ Ya, Ọ sịrị, “Nurunu ilu ọzọ.” Nke anyị gaje ịmụ taa bụ nke a naakpọ Ilu nke Ndị ọlụubi Ọjọọ. Onye ọlụubi dị ka onye naalụ ọlụn’ụbi; ọ bụ onye náakọ ihe n’ubi. Nime ilu a, ndị ọlụ ubi ahụ bụ ndị egoro ọlụ ilekọta otù ubivine anya.

Onyenwe ubi ahụ ewerewo ezi nleruanya dozie ubivine ahụ, n’ụzọ kachasị mma. Náarụghịụka, onyenwe ụlọ maọbụ onyenwe ubi ahụ akpachapụwo anya dozie alaubi ahụ, wee rọpụta iheọkụkụ kachasị mma maka ubivine ya.

Ịkụ Ihe ọkụkụ

N’ubi ụfọdụ a naakụ mkpụrụ -- dịka iheàtụ, ọka. Ma a naamalite ubivine site n’ịkụ ụmụ osisi vine ntà nime ya. Ọ dịghị igwè ọlụubi dị apụrụ iji kwaa ụmụ osisi vine ntà niile ahụ. Eji aka kụọ ha n’otù n’otù. Eleganya ị pụrụ ichè échìchè ụzọ nwoke a ji were nleruanya kụọ ụmụ osisi vine niile ahụ n’otù n’otù. Ndị nwere ogologo mkpọrọgwu ka o tinyere nime ala dị omimi. Ndị ọzọ nwere mkpọrọgwụ náadịghị ogologo chọrọ náánị ala a naegwumighị egwumi. Aghaghị ịkụ osisivine ma dozie kwa ya ka o wee too nkeọma. Náarụghịụka, onye a náakụ osisi ndịa mere ka ha sieike guzozie kwa, nye kwa ha ohere zuuru ha itó. O ji nlezianya jide ha ka ha ghara ịgbaji ebe ha dị ntakịrị.

Otù Ebumnuche

Mgbe akụsịrị osisi vine niile ahụ, agana agba ha mmiri nye kwa ha nri. Nnanwe ubivine ahụ nwere àtụmààtụ. Ọ dị ihe o bu n’uche kụọ osisivine niile ahụ. O mere ihe niile O nwere ike iji nye ha ezi mmalite. Ọ kwụsịghị ilezi ha anya mgbe ọ kụsịrị ha. Onyenweya gbara ubivine ahụ ogige ichebe ya. Mgbe ụfọdụ ụmụ anụmanụ maọbụ mmadụ ndị náenweghị nleruanya pụrụ ịzọgbu, gbajie maọbụ ropụ mkpụrụ niile ahụ ná epute ọhụụ. Nke a apụghị ime n’ebe ubivine ya dị n’ihi na agbara ya ogige gburugburu.

Mkpụrụ

Onyenwe ubi ahụ lereanya ịghọta mkpụrụ n’osisi vine niile ahụ, n’ihi nke a o jikere kwa maka owuweiheubi. Egwuru ebe nzọcha mkpụrụvine, dozie ya n’ihi mgbe aga achịkọta mkpụrụ vine wee zọchapụta iheọñụñụ sitere na ha. Ewuru otù uloelu, eleghịanya n’ihi onye nlekọta nke ubi ahụ, ka o wee site n’ebe ahụ na ahụzụ ubivine ahụ niile.

Ihe ndịa niile furu onyenwe ubi ahụ oge, nleruanya, na ego. Mgbe o jere obodo dị anya ọ rapụghị ubivine ya náenweghị onye nlekọta. O tinyere ubivine ahụ n’aka ndị ọlụubi. Ọ ga abụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na onyenwe ubi ahụ gaachọ mkpụrụ ná mkwụghachị n’ihi ubivine ahụ, n’ihi nke a n’oge owuweiheubi o zipụrụ ndị orù ya ịchịkọta mkpụrụ site n’ubivine ya.

Mmeso Emesoro Ndị Orù Ahụ

Òlee otú esi emeso ndị orù ahụ? Hà natara mkpụrụ na ụgwọ ọlụ inye onyenwe ha? É-è. Ndị ọlụubi náelekọta ubivine ahụ tiri otù ihe, tụọ onye ọzọ nkume, gbue kwa otù onye. Ezipụtakwara ndị orù ọzọ ịnata ihe dịrị onyenwe ha, emesokwara ha n’otù ụzọ ahụ.

Onyenwe ubi ahụ abụghị onye náenweghị uche. Ubivine ahụ bụ nke ya. Anyị agụtaghị na ọ chọrọ ego ọ bụla n’aka ha rue mgbe owuweihe ubi. Ụfọdụ mmadụ na achọ ego na ụgwọ ọlụ ha tutu alụara ha ọlụ. Ndịọzọ ga achọwokwarị ka akwụọ ha ụgwọ mgbe mkpụrụ náadịghị. Ndịọzọ dị kwa ndị gaachọ ka ebutere ha mkpụrụ ahụ n’ulo ha karịa izipụ ndịorù ibute ya. Onyenwe ubi ahụ sịrị ka enye ya náánị ihe kwesịịrị ya. Ọ bụ ndị ọlụubi ahụ bụ ndị náenweghị uche na ndị obi ọjọọ.

Ọkpara nke Onyenweubi ahụ

Mgbe oge gasịrị, onyenwe ubi ahụ zigara ọkpara ya n’ubivine ahụ n’ihi na o chèrè na ndi ọlụubi ahụ aghaghị ịsọpụrụ ya. Ha emeghị otú a. Mgbe ha hụrụ ka ọkpara ahụ na abịa, ha gbara izù megide ya. Ha nápụrụ ya ihe onwunwe ahụ dịka agaasị na ọ bụ nke ha. Ha gburu ya wee chọọ ụzọ iwere ihe nketa ya. Ọ dịghị mfé ichè na ọ dị ndị nwere obi ọjọọ dị otú a.

Ahụhụ

Nke ahụ bụ ilu Jisọs kuziri. O wee jụọ ndị ahụ gbara Ya gburugburu ndị jụkwara Ya ajụjụ, ihe gaeme ndị ọlụubi ahụ mgbe onyenwe ubi ahụ bịara. Ndị ahụ wee zaa sị na ọ gaalá ndị ọlụubi ọjọọ ahụ n’iyi, were kwa ubivine ahụ nyefee n’aka ndịọzọ bụ ndị gaakwụ ụgwọ mkpụrụ ahụ n’oge ha.

O nwere ihe Jisọs bu n’obi wee tụọ ilu a. Ndị isinchụàjà na ndịokenye ndị ná ege Ya ntị bụ ndị Juu ndị náekpe kwa okpukpé nke ukwuu. Ha ajụwo Jisọs ike O nwere nke O ji náezi ihe dịka Ọ naeme. N’ezie, ha dị ka ndị ọlụubi ahụ dị n’ilu a.

Ubivine nke Onyenwe anyị

Onyenwe ubivine ahụ nọchịrị anya Onyenwe anyị. Chineke akụwo ndị nke Ya dịka otù Nzukọ nime ụwa. Ọ bụ nke Ya. O furu Ya ihe. Aisaia Onyeamụma kwuru banyere ubivine nke Onyenwe anyị, na O ji ihe niile dị mkpà dozie ya (Aisaia 5:1, 2). Aisaia Onyeamụma kwuru banyere ndị nke Chineke na ha bụ “ihe-ọkuku nke JEHOVA” (Aisaia 61:3). Onye dere Abù Ọma dere banyere ubivine nke aka nri Chineke kụworo (Abù Ọma 80:15). Jisọs sịrị, “Agēropu ihe-ọkuku ọ bula nke Nnam nke elu-igwe nākugh” (Matiu 15:13).

Osisivine Dị Icheiche

Onyenwe anyị “akuwo” Onye Kraist ọ bụla dịka osisi. Ọ rọpụtara ha ịbụ Nzukọ na ubivine Ya n’ihi na ha zara òkù Ya. Chineke na enye mmadụ ọ bụla nleruanya na agbamume niile ọ chọrọ. Chineke akwadowo iheoriri na iheọñụñụ nke imemmụọ nye ndị Ya. Jisọs sịrị: “Onye ọ bula gāñu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agagh-akpọ ya nku ma-ọli rue mgbe ebigh-ebi; kama miri ahụ nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebigh ebi” (Jọn 4:14). Jisọs sịrị: “Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n’elu-igwe. N’ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n’elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu” (Jọn 6:32, 33).

Chineke na ekpuchi ndị nke Ya. “Mọ-ozi nke JEHOVA nāma ulo-ikwu-ya gburugburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha” (Abù Ọma 34:7). Chineke edoziwo ihe ndịa niile n’ihi ndị Ya. “Ọ bugh unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa” (Jọn 15:16). “Alaka ọ bula nimem nke nādịgh-ami nkpuru, Ọ wepu ya” (Jọn 15:2).

Ndịọlụubi Ahụ

Chineke nyere ndi Juu Iwu ahụ. Ya na Abraham gbara ndụ (Iheọmụmụ 8 na 157). Emesịa, Chineke na ndi Juu wee gbaa ndụ n’Ugwu Sainai (Iheọmụmụ 9 na 158). Ilekọta ndị nke Chineke bụ ihe enyere n’aka ndị ndú ha. Ha bụ ndị gaelekọta ndị nke Chineke (ubivine Ya) ka ewee chịkọbata mkpụrụ nye Jehova.

Ndịorù Ahụ

Mgbe oge zuru, Chineke lere anya mkpụrụ; O wee zipu ndị orù Ya, ndị amụma, ìchètara ụmụmmadụ ọlụ dịrị ha nye Jehova na, inyeaka n’owuweiheubi nke mkpụrụobi. Ndịorù -- ndị amụma nke Agba Ochie -- nyere ndụmọdụ baakwara ụmụmmadụ mbá. Chineke achọghị ihe ha naáapụghị ime n’aka ha. O lere anya ka ndị ahụ debezue ma mee kwa ihe enyere n’Iwu.

Gịnị mere ndịorù Chineke kwesịrị ntụkwasịobi bụ ndị amụma? Etiri Jeremaia ihe (Jeremaia 37:15). O buru amụma megide ha, n’ihi na ha achọghị ịña ntị n’okwu Jehova. Ejiri nkume tụgbue Zekaraia nwa Jehoiada onye amụma mgbe o chètaara ụmụmmadụ na ha arapụwo Jehova, na ọ gaghị adịrị ha mma (2 Ihe Emere 24:20-22). “Ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchi, ha nēleli kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n’ebe ndi-amuma-Ya nọ” (2 Ihe Emere 36:16).

Nime Agba Ọhụụ anyị na agụ banyere Jọn Onyeọwụmmiri onye Chineke zitere. Egbukwara ya n’ihi okwukwe ya. Ebipụrụ ya isi mgbe o kwusara megide mmehie (Matiu 14:10).

Ọkpara Ahụ

N’oge ya, Chineke zitere Ọkpara Ọ mụrụ náánị Ya (Jọn 3:16). Ndị nke Ya, bụ ndị Juu kpọrọ Ya ásị (Jọn 15:24, 25). Ha jụrụ Kraist dịka ha jụrụ irubere ndị amụma isi. Ha tụrụ àtụmààtụ megide Ya wee rọọ òtù nke lụpụtara ịkpọgide Kraist n’obe (Matiu 26:47-49; Mak 15:9-15; Matiu 27:35).

Mgbe ndị isi nchụàjà na ndi Farisi nụrụ ilu nke Jisọs, ha wee ghọta na Ọ na ekwuokwu banyere ha. Jisọs wee gosi ha na ha ajụwo Ya, dịka ndị ọlụubi ahụ jụrụ ọkpara nke onyenwe ubivine ahụ. Ọ bụ ihe jọkarịrị njọ ịjụ Jisọs, Ọkpara Chineke karịa ịjụ onye nketa nke ubivine ahụ. Ịjụ Jisọs pụtara ịjụ ndụ ebighịebi. Jisọs sịrị: “Ọ digh mgbe ọ bula unu guru n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo?” Ọ bụ ezie na ndị Juu jụrụ Kraist, ọ bụ kwa àtụmààtụ Chineke na aga ewukwasị ulo ọ bụla nke imemmụọ n’elu Kraist na òzízí Ya, dịka ezi ntọala. Kraist bụ nkume isi nkuku ulo (Ọlu Ndi-ozi 4:11; Ndi Efesọs 2:20; I Pita 2:6).

Ndị Mbaọzọ

Ndị isinchụàjà na ndị okenye mara ndị ọlụubi ahụ ikpé. Okwu nke ha onwe ha kpere ha ikpé. Enyefere ubivine ahụ n’aka onyeọzọ. Anapụrụ ndị Juu Alaeze Chineke wee nye ya Ndi Mbaọzọ. Pọl na Banabas kwuru banyere nke a mgbe ha sịrị: “Ọ di mkpa ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n’aru-unu, nēkpe kwa onwe-unu ndi nēkwesigh ndu ebigh-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu” (Ọlu Ndi-ozi 13:46).

Chineke “tinyere” (o nyere ya ná mbé, ọ bụghị n’efu) ubivine Ya n’aka anyị. Ndị Mbaọzọ, Ọ na atụ kwa anya ịhụ ezi mkpụrụ ná ndụ anyị. Ọ bụrụ na Kraist achọọ mkpụrụ ná ndụ gị taa, gịnị ka Ọ ga ahụ? Ọ bụ Vine ọhịa, nke dị ntakịrị, ná elù kwa ilu nke a na apụghị iji mee ihe ọ bụla -- mkpụrụ nke anụarụ? Maọbụ Kraist ọ gaahụ nime gị mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ -- nke apụrụ ịnara nkeọma, were ya mee ihe, nke Chineke gọzikwara? (Gụọ Ndi Galetia 5:19-23; Ndi Efesọs 5:3-9). Ụmụ Chineke na ebi ndụ dị ọcha, dị nsọ, jupụtara n’ọlụ nye Ya “Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha” (Matiu 7:16).

Eleghịanya mmadụ niile gaama ndị ọlụubi ahụ ikpé n’ihi otú ha siri mesoo ọkpara ahụ na ndịorù ahụ. Ná arụghịụka, mmadụ niile ga ama ndị Juu ikpé n’ihi ọjụjụ na ịkpọgide Kraist n’obe. Ọ bụ ihe ziri ezi ịma ha ikpé n’ihi ọjụjụ na ịkpọgide Kraist n’obe. Ọ bụ ihe ziri ezi ịma ha ikpé n’ihi omume ọjọọ niile ahụ. Ma ka anyị lee onwe anyị anya, Ndị Mbaọzọ. Ọtụtụ Ndị Mbaọzọ na eleda Kraist anya, ju Ya ọbụná kpọ Ya na ndị nke Ya ásị. Oge na abịa mgbe aga emechibido Ndị Mbaọzọ ọnụụzọ nke nzọpụta. Agaghị enye ha ohere mgbaghara ọzọ. Aga emezu oge nke Ndị Mbaọzọ (Luk 21:24). Ka onye ọ bụla n’otù n’otù lerue onwe ya anya. Èledawo Kraist anya, jụ ma chụpụ kwa ya ná ndụ gị? Maọbụ ịnabatawo Ya wee megheere Ya ọnụụzọ nke obi gị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Jisọs ji kuzie ilu a?
  2. Ònye nwe ubivine ahụ?
  3. Gịnị ka o mere na ya?
  4. Gịnị kpatara eji mesoo ndị orù ahụ n’ụzọ jọrọnjọ?
  5. Gịnị mere ọkpara ahụ?
  6. Gịnị kpatara eji nyefee ubivine ahụ n’aka ndịọzọ?
  7. Gịnị ka ilu a gosịrị ndị Juu?
  8. Gịnị ka anyị mụtara site n’ilu a?