Matiu 22:1-14

Lesson 198 - Junior

Memory Verse
“Le, anameguzo n’ọnu-uzọ, nāku kwa aka” (Nkpughe 3:20).
Notes

Otù ọkpụkpọ òkù Nke Ọlụlụ Nwunye

Óké ìgwè mmadụ nke ndịkom, ndịnyom, na ụmụntakịrị gbara Jisọs gburugburu ige ntị n’akụkọ Ọ na akọ. Ha bụ akụkọ mara mma, nke akọkwara n’ụzọ dị mfé nke ọbụná ụmụntakịrị pụrụ ịghọta ha. Ọ bụghị náánị nke a, akụkọ niile ahụ zikwara iheọmụmụ banyere alaeze Eluigwe. Akụkọ niile ahụ ka akpọrọ ilu dị icheiche.

N’otù oge Jisọs kọrọ akụkọ banyere otù eze nwere àkụ, onye nwa ya nwoke gaje ịlụ nwunye. Ọ bụ ezi eze onye nwere ịhụnanya n’ebe ndị ya nọ, ọ chọrọ ka ha niile bịa soro nwee ihe ụtọ nke ọlụlụ nwunye na óké oriri ga eso ya.

Ị pụrụ ichè na mmadụ niile gaachọ ka ha gaa hụ ọkpara eze ahụ na adaeze ka a naejikọ ha n’ọlụlụ di na nwunye, hụ kwa otú ime obí eze dị. Chèèkwa échìchè banyere ihe oriri ọma niile nke ha ga eri! Ndị náejé n’ebe a na alụ ọlụlụ di na nwunye dị otú ahụ taa na amalite n’oge idebe ego ka o wee dịrị ha mfé ịzụta uwe kachasị mma nke ha ga eyikwasị n’ụbọchị ahụ; ha na agbalịsi kwa ike inweta onyinye kachasị mma nke ha ga enye di na nwunye ahụ obi na atọụtọ.

Ma ndị a Jisọs na-ekwu ihe banyere ha achọghị ijé n’ọlụlụ nwunye ukuu ahụ. Eze a zigara ndị orù Ya n’ulo ndịa niile ọ na-achị ka akpọọ ha òkù n’otù n’otù -- ná-agbanyeghị nke a ha egeghị ya ntị. Ụfọdụ jere n’ubi ha ịlụ ọlụ kama inwe izu-ike nke eze chọrọ ka ha nwee. Ndị ọzọ wee jee nime obodo ịzụ ahịa. Onye ọ bụla n’otù n’otù wee nwee ihe ọ na-eme nke gbochirị ya ijé n’ulo eze maka óké oriri ahụ.

Eze wee chèè na ọ ga-abụ na nghọtahie dị n’ozi ahụ n’ezie. Ọ pụrụ ịbụ na ndịa akpọrọ amataghị oge kwesịrị izukọ. N’ihi nke a o zipụrụ ndị orù ya ọzọ ịgwa ha na edozisiwo ihe oriri, egbusiwo kwa óké ehi niile na anụ niile azụrụazụ, anụ ukwuu niile arụrụ n’ọkụ adịwo kwa nke a gaenye ụmụmmadụ. Náagbanyeghị kwa nke a, ndị ahụ jụkwara ijé. Ọbụná ụfọdụ nime ha gburu ndị orù ahụ wetaara ha ozi ọma ahụ. Ọ bụ ihe sịrị ike ịghọta otú mmadụ gaesi mee ihe dị otú ahụ, ọ bụghị eziokwu? Ọ bụrụ na akpọrọ gị n’ọlụlụ di na nwunye dị otú ahụ n’ezie, ị gaachọ ka ị jee; ọñụ gaadị n’obi gị gaeme ka ị mụrụ anya n’ogologo abalị ná ebutere ụbọchị ahụ ụzọ.

Oriri nke Chineke

Anyị kwuru na ilu bụ akụkọ nke ụwa nke nwere nkọwa nke ihe eluigwe. Ka anyị hụ onye eze a nke chọrọ igosi ndị ya ịhụnanya nọchitara anya ya. Ọ bụ Chineke Nna, Onye ike niile dị n’Eluigwe na nke dị n’ụwa bụ nke ya, onye nwekwa anụ niile dị n’elu puku ugwu. Náánị ihe Ọ chọrọ bụ imere ndị Ya ihe ọma n’ihi na Ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu.

Onye ọ bụla ka ana akpọòkù ịbịa n’Oriri nke Oziọma, ọ dịghị onye ọ bụla kwesịrị ịtụfu ohere a. Ma ụmụmmadụ ka na enye ihe ngọpụ dịka ha mere nime ilu ahụ nke Jisọs tụrụ. Ha jupụtara n’ịlụ ọlụ nke onwe ha -- ná achọ ka ha nweta àkụ, maọbụ inwe ihe ụtọ nke ụwa -- karịa ịzá òkù nke Onyenweanyị na akpọ ha inwe nzọpụta.

Ndị Juu Na Mbụ

Òkù mbụ akpọrọ dịrị náánị ndị Juu. Ha bụ ndị Chineke rọpụtara nye Onwe ya, O nyekwara ha ohere mbụ. Ma ọtụtụ ugbò ha na agbakụta Chineke àzụ wee fee arụsị òfùfè. Ha adịghị ege kwa ndị amụma ndị ná agwa ha banyere ọkpụkpọ òkù nke Chineke ntị Chineke zipụkwara ọtụtụ ndị amụma ọzọ ijekuru ọgbọ dị icheiche, O wee sị: “M’we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n’isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n’uzọ ọjọ ya, lata, ma unu atọgh nti-unu n’ala, unu egeghkwam nti” (Jeremaia 35:15). N’ezie ha tụrụ ndị amụma ahụ nkume, ọbụná n’ihi òkù ịhụnanya ha na akpọ ha.

Ma mgbe Jisọs nọ n’ụwa O nyere ndị Juu ohere ọzọ; O zipụrụ ka akpọọ kwa ha ọzọ. Ọzọ kwa, ha jụrụ ịbịa. O wee dọọ ha aka ná ntị gwakwa ha na ha ekwesịghị kwa ịnata ngọzi Ya niile, ma ndị ọñụmanya na ndị ná emebiiwu gaenwe kwa obi ụtọ ịbịa n’oriri ahụ.

Ikpé

E

ze ahụ nọ nime akụkọ nke Jisọs na akọ banyere ya, nwere ike zuruókè n’ebe ndị Ọ na achị nọ, iwe wekwara ya nke ukwuu n’ebe ha nọ n’ihi na ha niile jụrụ ịzá òkù akpọrọ ha, nke mere o ji zipụ ndị agha ka ha ga bibie ha niile. Emesia o wee zipụ ndị orù ya ka ha gaa n’ámá niile nke obodo gaa kwa n’agbata ụzọ niile, kpọbata ndị ọbịa niile ka ha bịa nọdụ ná nri ya. Ọ sịkwara na ndị nke ya ekwesịghị ịnọdụ ná nri ya, n’ihi nke a na ya gaakpọ ndị ga anabata mmeso ọma ya. Ọtụtụ mmadụ wee bịa n’obí eze. Ụfọdụ nime ha bụ ezi mmadụ, ma ụfọdụ abụghị, ma eze ahụ nabatara ha niile.

Mgbe ndị Juu kpọgburu Jisọs, emere ka Ndị Mbaọzọ chọta iru ọma n’ebe Chineke nọ. Ọtụtụ ndé ndị Juu natara ikpé ọmụma dịka ndị ahụ ebibiri ndị Jisọs kọrọ akụkọ banyere ha. Ihe karịrị otù ndé ndị Juu nwụrụ mgbe ebibiri Jerusalem ná arọ 70 A.D. (iri arọ asaa mgbe Kraist nwụsịrị) ọtụtụ ka nọ kwa ná ahụ ahụhụ rue taa. Nime agha Ụwa nke abụọ, egburu ihe karịrị ndé mmadụ isii (6,000,000) nime ha, náánị n’ihi na ha bụ ndị Juu. Ndị Juu jụrụ ịzá òkù Chineke kpọrọ ha, gbue ndị orù wetara ozi ahụ, n’ikpeàzụ kpọgide Jisọs n’onwe Ya n’obe.

Uwe Ọlụlụ Nwunye

Ọ dị ihe fọdụkwara n’akụkọ a Jisọs kọrọ. Eze anabataworị ìgwè mmadụ ahụ bịara; ma mgbe ọ na elegharị ndị ọbịa ya anya ọ hụrụ otù nwoke nke nwere nlefuruanya banyere uwe oyiyi ya. O yighị uwe ọlụlụ nwunye nke eze nyere, nke a a mere ka ọ pụọ nnọọ iche. Nwoke a enweghị akparama agwa nke ga eme ka o rubeisi nye iwu na achị obí eze.

Eze ahụ nwere obi ebere, wee kpọọ onye ọbịa ahụ “Enyi” jụa kwa ya ihe mere o yikwasịghị uwe ọlụlụ nwunye. Eleghịanya asị na nwa ogbenye a nwere ihe ngọpụ ziriezi, eze ahụ ga enyewo yarị ohere iji yikwasị uwe ọlụlụ nwunye. Ma nwoke a enweghị ihe ngọpụ. Ọ bụ enweghị nleruanya kpatara nke a n’ihi ya ọ dịghị kwa ihe ọ pụrụ ịzaghachi. O rubeghị isi n’iwu niile eze nyere, ọ ghaghị kwa ịta ahụhụ ya ugbu a. Eze ahụ wee sị ndị ná ejere ya ozi ka ha kpọpụta ya n’èzí tụba kwa ya nime ólùlù nke ọchịchịrị ebe ịkwá ákwá na ịta ikekereezé dị.

Ọkpụkpọ òkù nke Ozọma ka nọ kwa ná aga n’iru. Akpọwo anyị niile òkù ahụ; anyị niile nwere ohere inwe ihe ụtọ nke ngọzi niile nke Alaeze Eluigwe. Ma anyị aghaghị inwe njikere banyere ya. Chineke na akwado “uwe ọlụlụ nwunye” nye onye ọ bụla nime anyị -- “uwe nwuda nke ezi-omume,” “ezi àkwà ọcha nēnwu enwu” nke ndị nsọ. Ndịa bụ okwu ná akọwa ọnọdụ ọlụlụ nwunye bụrụ kwa onye jikeere ijé n’Oriri Ọlụlụ Nwunye nke Ọkpara Chineke nke anyị mụwokwara ihe banyere ya. “Onye nēmeri emeri ka agēgbokwasi uwe ọcha otú a; M’gagh-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M’gēkwuputa kwa aha-ya n’iru Nnam, na n’iru ndi-mọ-ozi-Ya” (Nkpughe 3:5).

Edoziworo anyị ihe niile, ya mere anyị agaghị enwe ihe ngọpụ, ma ọ bụrụ na anyị anọghị ná njikere mgbe Jisọs ga akpọ anyị. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị inwe njikere ahụ ga emeghepụrụ anyị Ọnụụzọ niile nke Obíeze mgbe aga ama ọkwá banyere Oriri Ọlụlụ Nwunye nke Nwa atụrụ ahụ. Ihe anyị gana echè karịsịa kwa ụbọchị, kwesịrị ịbụ, “Ọ bụrụ na akpọ òkù ahụ taa, anọm ná njikere ijé.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ọ bụ onye ka ebuụzọ zigaara ọkpụkpọ òkù banyere ọlụlụ di na nwunye ahụ?
  2. Gịnị mere eji gụọ ha ná ndị ná ekwesịghị ekwesị?
  3. Ònye natara ọkpụkpọ òkù ikpeàzụ?
  4. Were mmadụ ndịa akọrọ akụkọ ha n’ebe a tụnyere obodo niile nke ụwa taa.
  5. Gịnị ka anyị ga eme iji jikere onwe anyị banyere Ọlụlụ Nwunye ahụ?
  6. Gịnị ga adakwasị ndị ahụ ga achọ inwe ihe ngọpụ?
  7. Òlee mgbe ka anyị gana eleanya banyere ọkpụkpọ òkù nke Ọlụlụ Nwunye ahụ?