Lesson 200 - Junior
Memory Verse
“JEHOVA kpọrọ Samuel òkù: ọ we si, lem” (I Samuel 3:4).Notes
Otuto N’ihi Ekpere nke Azara
Ekpere nke Hana bụ abụ ekele. Obi ya jupụtara n’otuto nye Chineke n’ihi na Ọ zara ekpere ya. Na nwa mgbe garaaga ya na di ya jere Shailo “ikpọ isi-ala na ichuru JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha àjà.” Hana achọwo ihe dị óké ọnụahịa nke obi ya na achọsị ike ọ ga enye Jehova. O nweghị ụmụ, ma o kpere ekpere ka Chineke nye ya otù nwa nwoke. O kwekwara mkwà na ya ga edo nwa nwoke ahụ nsọ nye Onyenwe anyị na ozi Ya. Dịka ọ kwáworo ákwá were kwa obi ya chụọàjà n’iru Onyenwe anyị ọbụ site n’obi ya dum ka o kpere ekpere. “Náni egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọrọ, ma anugh olu-ya.”
Edoro Nsọ nye Chineke
N’ịzá ekpere ahụ, Chineke nyere Hana otù nwa nwoke onye ọ kpọrọ Samuel. Mgbe ọ bụ náánị nwaokoro ntà nne ya kpọọrọ ya jee n’ụlọ Chineke nke dị nime Shailo. N’ịkwụghachị mkwà o kwere, ọ kpọọrọ nwa ya nwoke -- náánị nwa o nwere n’oge ahụ -- ka ewee doo ya nsọ nye Chineke. Ilai bụ onye na elekọta ụlọ Chineke na mgbe ahụ. Hana wee rapụ Samuel n’aka ya ka nwa ya wee mụta ụzọ niile nke Chineke wee jeekwara Ya ozi.
Otuto dịrị Onye-onyinye
Abụ nke Hana bụ ekpere nke obi ya mgbe enyefere Samuel n’aka Chineke. Ọ ñụrịrị ọñụ nwee kwa obi ụtọ n’ihi óké ihe niile nke Chineke mewooro ya. Lee otú ekpere ụfọdụ mmadụ na adị iche mgbe ha na achọ ịgwá Chineke otú ihe ha meere Ya na ihe ha nyere Ya ra! Hana ekwughị ọbụná ihe ọ bụla banyere onyinye pụrụ iche nke ịbụ abụ nke Chineke nyere ya. O bughị kwa amụma na nwa ya ga abụ onye ukwu lụọ kwa ezi ọlụ dị icheiche. Hana buliri Chineke elu bụ Onye nyere onyinye -- ọ bụghị Samuel bụ onyinye ahụ. Ọ sịrị, “Añuriwom ọñu na nzọputa-Gi … ọ digh onye ọzọ ma-ọbugh Gi.”
Abụ ekele nke Hana dị nnọọ ka abụ mmeri Devid: “Anamahu Gi n’anya nke-uku, JEHOVA, bú ikem. JEHOVA bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m’gbapu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anāmagbabà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam na ulo-elum. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku JEHOVA” (Abụ Ọma 18:1-3).
Hana kpọrọ isiala nye Chineke n’ihi ịdịnsọ Ya na n’ihi amamihe Ya. Dịka ọ gbara àmà banyere ike na ikwesị ntụkwasịobi nke Chineke o kwupụtara ihe niile ọ nwapụtaworo. Ụmụmmadụ na achọ inye onwe ha otuto n’ihi ezi ihe ọ bụla dị ná ndụ ha. Ma Hana matara na ọ bụ Chineke na enye ike, àkụnaụba, ọnọdụ, na ngọzi ọ bụla dị ná ndụ anyị. “JEHOVA nānapu madu ihe, nēme kwa ka aburu ọgaranya: Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.”
Amụma Dị icheiche
Ọ bụghị náánị ihe Chineke mewororị na mgbe garaaga ka Hana kwuru banyere kama o kwuru okwu banyere ọdịniru. Ikwesị ntụkwasịobi nke Chineke na mgbe garaaga nyere ya okwukwe maka ọdịniru. N’ilepụ anya n’iru hụ mmeri dị icheiche site n’inyeaka Chineke, Hana wee tinyekọta ụmụ Chineke niile. “Ukwu ndi-ebere Ya ka Ọ nēdebe.” Okwu ndịa dị ebube ná egosi okwukwe na ntụkwasịobi na Chineke. Ha bụ kwa mkwà nye ụmụ Ya, n’ihi na Chineke mejuru Hana ikwu ha. Ụmụ Chineke kwesịrị náánị ikwere, rubeisi, ma tụkwasị kwa Ya obi.
“Ọ bugh ike ka madu gēji kari n’ike.” Chineke ga echebe ma nye kwa ndị ná adabere Ya mmeri. Gideon bụ ezi iheàtụ na mmeri adịghị esite n’ike nke ịbaụba nke ọnụọgụgụ mmadụ. Anyị amụwo banyere Gideon na ndị agha ya dị narị atọ (300) bụ ndị chụsasịrị ma bibie kwa ndị Midia bụ ndị ọnụọgụgụ ha bara ụba rue na apụghị ịgụta ha na kamel ha (Iheọmụmụ 194).
Ndị ná emegide Jehova bụ ndị ahụ ná eguzogide Ya. Ha bụ ndị iro Ya. Hana sịrị na “agētipia” ha. Nke a bụ ihe anwapụtaworo n’ụbọchị niile nke Ụmụ Israel o wee ná aga kwa n’iru n’ụbọchị niile ná eso mgbe Hana busịrị amụma. Nime ọtụtụ arọ gabigaworo, Chineke echébewo nápụta kwa ndị nke Ya ma bibie ndị iro Ya. Otú a ka ọ ga adịgide rue mgbe aga ebibi onyeiro ikpeàzụ (I Ndi Kọrint 15:25, 26) Kraist wee bụrụ kwa eze rue mgbe niile ebighịebi (Nkpughe 11:15).
Anyị nwere ọtụtụ ihe mmụta site n’ekpere ọma Hana nke a. Ka anyị mụta itinye otuto na ekele nime ekpere anyị! Ka anyị bulie Chineke nke nzọpụta anyị elu, wee ghọta na anyị ga enwe ọñụ ahụ Hana nwere mgbe anyị nyere Chineke ihe ahụ dịnsọ dị kwa óké ọnụahịa nye mkpụrụ obi anyị, mgbe anyị kwụghachịkwara mkwà anyị kwere, ọbụná ndị anyị kwere mgbe anyị nọ nime nsogbu (Abù Ọma 66:13, 14)!
Samuel
Gịnị mere nwaokoro ntà ahụ bụ Samuel onye Hana binyere Onyenwe anyị? O chefughị ya maọbụ chèè na ya enweghị kwa ọlụ n’ebe ọ nọ. Kwa arọ ọ neme uwe mwụda ntà wee chịgaara ya mgbe ọ bụla o jere Shailo n’ihi ịchụàjà. Ná arụghịụka, mgbe ọ bụla ọ hụrụ Samuel, Hana na echèta óké ịkwesị ntụkwasịobi nke Chineke n’ịzá ekpere ya.
Ijere Chineke Ozi
Samuel wee gaa n’iru ná etó. Ọ hụtara iruọma n’ebe Chineke na mmadụ nọ. Ọ naalụsị ọlụ ike wee “nējere JEHOVA ozi n’iru Ilai.” Ụfọdụ mmadụ nwere ike chèè na ọ dịghị ọlụ dịrị nwatakịrị ịlụ nime Oziọma. Ọlụ dịịrị Samuel -- maọbụ nwaokoro ntà. Eleghịanya ọ na ejere Ilai ozi ntà dị icheiche wee ná enye aka idozi ihe nime ụlọ Jehova. O ñomighị ihe ọjọọ site ná ajọ iheatụ nke ụmụ Ilai ndị ná enupụisi ná eme kwa omume masịrị ha. Samuel jikeere ịlụọlụ ahụ nke nne ya jiri nyefée ya n’aka Chineke. Ọ sịrị “Ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye JEHOVA.”
Ọkpụkpọ nke Onweonye
Náánị na nne ya ji ya nyefee Chineke ezughi. Chineke kpọkwara Samuel onweya òkù. Nwata ọ bụla ndị mụrụ ya nyefere n’aka Chineke nwere iruọma karịa. Eleghịanya ndị mụrụ gị weere gị otú a “binye” Chineke, ma Chineke chọrọ ka i were ndụ gị chụọàjà nye Ya na ọlụ Ya. Chineke chọrọ ka ị záá òkù Ọ na akpọ gị. Chineke chọrọ ndị ọlụ jikeere -- ndị gaalụ ọlụ enyere ha site n’obi ha niile.
Ịzá Òkù nke Chineke
Chineke kpughere Onweya nye Samuel n’ụzọ pụrụ iche. N’otù abalị, mgbe Ilai dinasịrị n’ihendina ya, Samuel wee dina kwa ala ịrarụ ụra, Samuel wee nụ ka akpọrọ aha ya. Ebe o chèrè na Ilai na achọ ka ọ bịa, Samuel wee gbaa ọsọ jee n’ulo ndina Ilai ná nrube isi. Ma Ilai sịrị na ya akpọghị òkù ọ bụla, wee zighachi kwa ya ịrarụ ụra. Nke a mere ugbò atọ, rue mgbe Ilai ghọtara n’ikpeàzụ na Jehova naakpọ Samuel. Ilai wee gwa Samuel ka ọ záá mgbe olu Chineke kpọrọ ya.
Ọzọ kwa Samuel wee dina, eleghịanya ná atụle n’obi ya ma Chineke ọ gaakpọ kwa ọzọ ebe ọ ná azaghị òkù Chineke kpọrọ ya na mbụ. Samuel wee jikere ìñantị n’olu Chineke. Ọ bụ óké ohere bụrụ kwa ọlụ nye Samuel ịmata uche Chineke. Jehova wee bịa, guzo Onweya, wee kpọọ òkù, “Samuel, Samuel.” O wee záá sị, “Kwue; n’ihi na oru-Gi nānụ.”
Ọkpụkpọ nke Chineke
Ọkpụkpọ òkù nke Chineke nye gị nwere ike ọ gaghị adị ka nke Ọ kpọrọ Samuel. Chineke pụrụ ịkpọ gị n’aha dịka Ọ kpọrọ Samuel, maọbụ O nwere ike ghara ime ya. Mgbe ụfọdụ Chineke na ekwuokwu n’olu apụrụ ịnụ. Ọtụtụ mgbe Ọ na ekwuokwu nime obi. Ọ na egosi mmadụ na mmehie dị nime obi na ndụ ya. Chineke na egosi mmadụ mkpà Onyenzọpụta dị ya. Eleghịanya o metuwo gị n’obi ikpé ekpere wee rịọ mgbaghara nke mmehie gị. Eleghịanya ọ gụwo gị agụụ ịbụ Onye Kraist wee mata na gị na Chineke dị n’udo. Nke ahụ bụ ọkpụkpọ Chineke nye gị. O nwere ike ịbụ na i mataghị ya na mbụ. Site ugbu a gaa n’iru, ị ga-amata na Chineke chọrọ ka ị záá dịka Samuel sịrị -- “Kwue; n’ihi na oru-Gi nānu.” Ọbụná mgbe azọpụtasịrị mmadụ, Chineke pụrụ ịkpọ ya òkù ịlụ otù ọlụ pụtara ìhè, ịlụ ọlụ pụrụ iche nye Ya. Ka ịhụnanya gị nye Chineke na ọlụ Ya kwalite gị ka ị záá Ya sị, “Lee.kwam.”
Ozi ahụ nye Samuel
Chineke nwere ozi nye Samuel. Ọ bụghị banyere Samuel onweya. Chineke asịghị na Ya ga eme Samuel onye ukwuu maọbụ na ọ ga eme óké ihe. Ozi mbụ Chineke ziri Samuel dị nkenke; ọ dị ilu; bụrụ nke dịrị onye ọzọ. Ozi ahụ bụ banyere èzí na ụlọ Ilai.
Tutu oge a, Chineke adọworị Ilai aka nántị na ọ bụghị onye nchụàjà kwesịrị ntụkwasịobi, karị nke a, na ọ na asọpụrụ ụmụ ya ndịkom náeme ajọ omume karịa otú o si asọpụrụ Chineke. Ilai matara na ụmụ ya ndịkom na eme ajọ omume. Agwawo ya na ụmụ ya ndịkom abụọ ga anwụ n’otù ụbọchị, na Chineke ga eme kwa ka Onye nchụàjà kwesịrị ntụkwasịobi biliere ya. Ilai na ụmụ ya arịọghị Chineke ka Ọ gbaghara ha. Kama nke ahụ, ha na eme dịka ha na eme na mbụ, ná añaghị ntị n’ịdọ akanántị nke Chineke.
N’oge a, Ilai wedara onweya n’ala ịjụ Samuel, nwata na orù ya, banyere ozi ahụ sitere n’ebe Chineke nọ. Ilai ekwoghị ekworo maọbụ nwee obi jọrọ njọ n’ihi na Chineke gwara Samuel okwu kama ịgwa ya. Ilai mere omume ziri ezi ọ bụ ezie na ọbụ nleda anya nye ya. Samuel wee zie Ilai ozi ahụ niile. O zonarịghị ya ihe ọ bụla. Ọ tọghị ya ụtọ izi Ilai ozi jọgburu onwe ya, kama Samuel bụ onye kwesịrị ntụkwasịobi ná erube kwa ìsi nye Chineke.
Enweghị Nchègharị
Ozi Chineke zitere bụ na Ya agaghị agbaghara mmehie ụmụ ndịkom Ilai. Ikpé nke a siri ike ma o ziriezi, n’ihi na mmadụ agaghị atụ anya na ya pụrụ ime ajọ ihe wee laa n’efu. Ha egeghi ntị ịdọ akanántị Chineke, maọbụ ịbá mbá Ilai (I Samuel 2:24, 25). Ha lelịrị onyinye Jehova (I Samuel 2:15-17). Ha bụ ndị ná eso ekwensu, ha amaghị kwa Chineke (I Samuel 2:12). Ha gara n’iru imehie rue mgbe Chineke ná enyeghi kwa ha ohere ọzọ ichègharị (Jemes 6:3; Ilu 29:1). Ilai hụrụ ahụhụ, nleda anya na ụkọ n’ihi na ọ rapụrụ ịlụọlụ dịrị ya. Ọ báára ụmụ ya ndịkom mbá, ma o nyeghị ha ahụhụ mgbe ọ matara ajọ omume ha na mgbe ọ bụ onye ga aza ajụjụ banyere omume ha n’ụlọ Jehova.
Nsọpụrụ nye Samuel
Chineke mezuru ozi ahụ Samuel ziri Ilai. Nke a wetara nsọpụrụ nye Samuel, wee mee ka ọ dị ukwuu n’anya Israel niile na ọ bụ kwa onye gaje ịbụ onye amụma Jehova. Chineke nọnyeere Samuel. Nnọnye nke Chineke wetara ịbá ụba n’amamihe na amara nye Samuel dịka nnọnye nke Chineke ga ewetara anyị taa.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị mere ekpere Hana ji jupụta n’otuto na ekele?
- Gịnị kpatara o ji were Samuel “binye” Jehova?
- Gịnị mere o ji dị mkpà na Hana ga enyefe Samuel n’aka Jehova?
- Ụdị mmadụ dị añaa ka Ilai bụ?
- Gịnị mere Samuel azaghị Jehova na mbụ?
- Gịnị ka Samuel zara mgbe ọ matara na Chineke na akpọ ya?
- Ònye ka ozi ahụ Chineke ziri Samuel dịịrị?
- Gịnị kpatara Chineke agbagharaghị ụmụ ndịkom Ilai?