I Samuel 4:1-18; 5:1-5; 6:1-3, 7-15, 19, 20

Lesson 201 - Junior

Memory Verse
“Ònye puru iguzo n’iru JEHOVA, bú Chineke nsọ a?” (I Samuel 6:20).
Notes

Agha ha na Ndị Filistia

Ilai nọgidere n’ọkwá onye nchụàjà rue mgbe Samuel tolitere. Ilai elezighị anya ikuziri ndị ahụ banyere Chineke, Okwu Jehova dị kwa ókéọnụ, maọbụ dị ụkọ. Ilai ejisighi kwa ike inye Ụmụ Israel ndụmọdụ ikpé ekpere na ịchọ Chineke. Eleghịanya Ilai báára ha mbá, ma ọ nọgidesighị ike ná ekwu banyere irubere Chineke isi.

Anyị agụtaghị na Ụmụ Israel rịọrọ ndụmọdụ nke Chineke mgbe ha jere ibu agha megide ndi Filistia. Ọ dịghị ihe ọ bụla gosịrị na ndị ahụ kpere ekpere. Ndị Filistia tigburu Ụmụ Israel, egbukwara ihe ra ka puku mmadụ anọ n’etiti ha.

Mmehie N’ọmụma ụlọikwuu

Ọtụtụ arọ garaaga, mkwà nke Chineke nye Ụmụ Israel bụ, “Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgụ iri: n’ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ogù” (Joshua 23:10). Ụmụ Israel adịghị erubekwara Chineke isi ha adịghị efe kwa Ya òfùfè, n’ihi nke a Ọ dịghị alụkwara ha ọgụ.

Ndị ahụ wee na ekwurịta okwu n’etiti onwe ha ọ na eju kwa ha anya ihe kpatara na ndị Filistia tigburu ha. Eleghịanya ha gaata Chineke ụta na O nyere ndị Filistia ohere imeri n’agha niile ahụ, ma ndị Israel ebubeghị ọnụ kpee kwa ekpere maọbụ rịọ ọbụná Ilai ka o kpeere ha ekpere.

Ọ bụ ezie na ọbụná Ilai arapuwo ikuziri Ụmụ Israel ụzọ niile nke Onynwe anyị, o doro anya na ụfọdụ nime ha ga anụworị otú Chineke jiworo meso Ụmụ Israel n’oge garaaga mgbe ihe dị otú a. N’oge niile nke Joshua, emeriri ha na Ai n’ihi na mmehie dị n’etiti ha mgbe Ekan weere ihe ewezugara nye Jehova (Joshua 7:1). Joshua, bụ onye ndú ha, dọwara uwe ya, otú ahụ ka ndịokenye nke ndị ahụ mekwara wụsa ntụ n’isi ha dịka ihe àmà nke nchègharị n’iru Chineke. Joshua kpere ekpere n’iru Igbe Jehova rue mgbe anyasị. Chineke gwara Joshua na ha emehiewo, nke mere na ha apụghị iguzo n’iru ndị iro ha. Nkekanke, Chineke sịrị na Ya agaghị anọnyekwara ha ọzọ maọbụghị na ebibiri mmehie ahụ nye kwa onye ikpé mmehie ahụ márá ahụhụ (Joshua 7:12). Ụmụ Israel kpughere mmehie ahụ. Esurere ihe niile ahụ ewezugara n’ọkụ n’àzụ ọmụma ụlọikwuu, nye kwa nwoke ahụ ikpé mara ahụhụ. Mgbe Ụmụ Israel siworo otú a rubere Chineke isi, ha jere agha megide Ai, Chineke wee nye ha mmeri.

Nnọkọ Ikpé

N’oge a ndị Israel nwere nnọkọ ikpé. Ha mere ihe nzuzu site n’ịgbalị inweta iruọma nke Chineke ná ekpeghị ekpere na ná enweghị nchègharị. Ụmụ Israel wee kpebie ibupụ Igbé Ọgbụgbandụ ahụ site na Shailo. Igbé Ọgbụgbandụ bụ ụdị nke Mmụọ Chineke na nnọnyere Ya n’Oche Ebere.

Ọ bụ náánị otù ugbò ka ebuworo Igbé ahụ jee agha. Na mgbe ahụ, Jehova nyere ntụziaka otú Ụmụ Israel ga esi were Jeriko. Ụmụ Israel bu Igbé Ọgbụgbandụ ahụ mgbe ha na agba obodo ahụ gburugburu. Chineke gwara ha ka ha buru Igbé ahụ n’oge ahụ.

Ebe Chineke Rọpụtara

Ọ gwakwara ha na aghaghị idebe Igbé ahụ “n’ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile” (Ọpupu 26:34) nime ụlọikwuu, ebe ha na efè òfùfè. Nime ebe Chineke ga arọrọ (Deuteronomi 12:5), adọrọ ha akanántị ifè òfùfè mgbe ha bara n’Ala Kenean. Na Shailo ka ewuru Uloikwuu ebe ana efè òfùfè (Joshua 18:1), ọ dịbeghị kwa ndụmọdụ sitere n’ebe Chineke nọ ka ebugharịa ya. Ọ ga abụ ihe ga eweta ihe jọrọ njọ ibugharị Igbé ahụ mgbe Chineke na ekwughị; ma ụmụ Ilai, Hofnai na Finehas, ndị nchụàjà, buuru Igbé ahụ wee jee.

Ọ dị ka ha aghọtaghị, ọ bụ ezie na ha ka bu Igbé ahụ ma Mmụọ nke Jehova arapụwo ha n’ihi mmehie ha. Ụmụ Israel tụkwasịrị Igbé ahụ obi karị Jehova onye Igbé ahụ na anọchị anya ya. Ha kwesịrị ilekwasịworị Chineke anya, n’ihi na ọ ga abụwoworị ike Ya ga achụsa ndị iro. Ụfọdụ mmadụ nọ n’ụbọchị taa ndị ná enwe afọojuju n’ụdị nke okpukpé ma ha na agọnarị ike dị na ya. Ihe náadị ha mkpà bụ ihe ana ahụ anya karịa inwe obi dị ọcha.

Igbé ahụ na Ndị Iro

Mgbe ebubatara Igbé ahụ n’ọmụmaụlọikwuu, Ụmụ Israel tiri óké mkpu dịka ha enweworị mmeri. Ndị iro nụrụ itimkpu ahụ, hụ kwa Igbé ahụ. Ndị Filistia matara na Igbé ahụ bụ iheatụ nke nnọnye nke Jehova. Itimkpu ndị Israel na Igbé ahụ nọ n’etiti ha tinyere egwù n’obi ndị Filistia. Ebe ha bụ ndị náekpere arụsị ha amaghị ihe ọzọ ma ọbụghị na Igbé ahụ bụ Chineke Onweya. Ha chètara ọtụtụ ọlụebube Chineke lụworo mgbe Ụmụ Israel na awagharị n’ọzara mgbe ha na ebu Igbé ahụ n’etiti ha. Ndị iro ahụ matara na ejibeghị otú ahụ buru Igbé ahụ bịa imegide ha n’agha. Ndị Filistia achịlighị aka wee nyefee onwe ha kama ha gbara onwe ha ume ịdị ike, ime dịka nwoke, na ịlụ ọgụ.

Nlụgbu na Ọnwụ

Akụkọ banyere agha ahụ dị mkpụmkpụ. Emeriri Israel; n’egwù nwoke ọ bụla wee gbagaa n’ụlọikwuu ya. Egburu ndị Israel ji ụkwụ aga mmadụ puku iri atọ, egbukwara Hofnai na Finehas, ụmụ ndịkom Ilai. Ndị Filistia burukwara Igbé Jehova. Ụmụ Israel enwewo agbamume na ntụkwasịobi doro anya, ma ha nwekwara mmehie. Ha tinyewororị okwukwe ha n’Igbé ahụ karịa itinye ya nime Onyenwe anyị n’Onwe ya. Mmadụ pụrụ inwe obi ike bụrụ kwa onye eziokwu n’ihe o kweere; ma ndabere na okwukwe ya aghaghị ịbụ ihe etinyere n’ụzọ ziriezi, n’ezi Chineke dị ndụ.

Otù nwoke sitere ná ndịagha ndịIsrael, onye hụrụ ihe mere, gbara ọsọ rue Shailo iweru ozi nke nlụgbu ahụ. N’akụkụ ụzọ ka Ilai nọ, ná echere akụkọ sitere n’ọgbọ agha ahụ. Obi ya ná ámá jijiji n’egwù n’ihi ịnọ n’udo nke Igbé Jehova. O nweghị obi ike ịjụ ka ndị ahụ ghara ibupụ Igbé Jehova na Shailo, ma n’obi ya ọ matara na ha emehiewo.

Ọ dịghị ka Ilai nwere mmetuta mgbe ọ natara ozi nlụgbu na ọnwụ nke ụmụ ya ndịkom abụọ, dịka aga asị na ọ na eleanya mmezu nke amụma Chineke megide ha n’oge a. Ma mgbe Ilai nụrụ na ndị Filistia eburuwo Igbé ahụ, ọ dalaa àzụ n’oche ya n’akụkụ ọnụụzọ ámá, olu ya wee gbajie. Mgbe ọ gbara arọ iri iteghete na asatọ (98), mgbe o kpewokwara Israel ikpé iri arọ anọ (40), Ilai wee nwọ otú a ná ekwughị okwu ọ bụla ọzọ.

Ofufu nke Igbé ahụ

Ikpé dị ukwuu bịakwasịrị ụmụ Ilai dịka Chineke kwuworo: “N’otù ubọchi ka ha abua gānwu” (I Samuel 2:34). Hofnai na Finehas ewepụwo onweha n’ebe ọlụ ha dị wezuga kwa onwe ha n’okpuru nchébe nke Chineke. Ọgbọ agha ahụ abụghị ebe kwesịịrị ha ịnọ. Ha ghọtara nzuzu na ọdịda ha mgbe oge gasịworo; ma anyị pụrụ ịmụta ihe site ná nnwapụta ha.

Ntị Ụmụ Israel zụrụ wuruwuru n’ezie (I Samuel 3:11), dịka Chineke kwuworo, mgbe ha nụrụ akụkọ banyere agha ahụ. Nlụgbu ahụ bụ nnọọ óké ihe ọjọọ. Israel ịtụfu Igbé ahụ n’aka ndị iro ha ewetaghị nsọpụrụ ọ bụla nye Chineke. O wetaara Israel óké ụsụ na enyeghị Shailo nsọpụrụ, n’ihi na ebe ahụ agaghị enwe kwa Igbé Jehova ọzọ.

Igbé ahụ na Otù Arụsị

Na nwaoge a, ndị Filistia na añụrịọñụ ná anyà kwa isi ná mmeri ha nweworo. Ha emeghị Igbé ahụ ihe ọjọọ kama ha bubatara ya n’ụlọ arụsị, n’ụlọ Degon nime Ashdod, otù nime obodo ukwuu ha. A dịghị efè Chineke maọlị, ọ bụrụ na efèghị náánị Ya. Igbé ahụ meriri Degon nime ụlọ ya. Agaghị efè Chineke na chi ọzọ, kama aga efè Ya karịa chi niile ọzọ. Arụsị ahụ dara kpue iru ya n’ala n’ụdị onyeiro emeriworo, n’iru Igbé Jehova. Ndị nchụàjà Degon mere ngwa bulie ya debe kwa ya n’ọnọdụ ya. N’echi ya, Degon adaghị kpue iru n’ala náánị, kama ọ gbajisịrị. Isi ya na aka ya abụọ agbajipụwo na ọ fọdụrụ ogwe náánị na Degon. Mmadụ pụrụ ichè na ndị Filistia gaaghọta na ekpughere Degon dịka arụsị efu, na arụsị ahụ adịghị kwa ike, na o kwesịghị kwa ekwesị ikpere ya maọbụ inye ya nsọpụrụ ọ bụla, ma o doghị ndị Filistia anya na Jehova Chineke nke Israel náánị Ya bụ ezi Chineke. Emesịrị obi ha ike n’ikpere arụsị ha.

Igbé ahụ n’etiti Ndị iro

N’ihe ruru ọnwa asaa etiri ndị Filistia ihe otiti n’ihi Igbé Jehova, ma ha achọghị ibughachị ya. Ha na ebugharị Igbé ahụ si n’otù obodo rue obodo ọzọ, ebe niile ka “ọgbugba-aghara nke ọnwu” dị. Ndị ana emeghị ka ha nwụọ, ka etiri ọrịa.

Mgbe ndị Filistia matara na ọ dịghị udo maọbụ nchébe dịrị ha mgbe niile Igbé ahụ nọ n’obodo ha, ha zukọtara ikpebi ihe ha ga eji ya mee. Akwagidere ha site n’ihe mgbu na egwù izilaga Igbé ahụ. Ha doziri ụgbọala ọhụụ, nke ehi abụọ na adọkpụ, ewee zighachiri Ụmụ Israel Igbé ahụ. Ndi Filistia anataghị ihembé maọbụ ego n’ihi ya. Ha na añụrịọñụ na Igbé ahụ pụrụ n’ala ha, wee nye àkụ dị óké ọnụ dịka onyinye, ka aka Chineke wee pụọ n’arụ ha.

Enweghị Nsọpụrụ

Ọ pụtara ìhè na Ụmụ Israel agbalịghị n’ụzọ ọ bụla ịnapụta maọbụ ịgbapụta Igbé ahụ, maọbụ ọbụná ịjụ ajụjụ banyere ya. Ha nabatara nlaghachị ya; ewee tụkwasị Igbé ahụ n’elu otù nkume ukwuu n’ubi Joshua, onye Bet-shemesh. Ekpughere Igbé ahụ n’ebe ahụ ka ewee nyochaa ya. Ọ bụ ezie na ọ bụghị dịka Iwu si dị, ndị Israel jiri ụgbọ ala ahụ mee nkụ, were kwa ehi abụọ ahụ mee ihe àjànsureọkụ. Nke a abụghị ezi ịchụàjà kwesịrị, ọ bụghị kwa ndị nchụàjà chụrụ ya n’Uloukwuu. Ndịkom Bet-shemesh ñụrịrị ọñụ ịhụ Igbé ahụ -- ma ha ekwesịghị ileba ya anya nime. Ọbụná ndị nchụàjà ekwesịghị ileba anya nime Igbé Ọgbugbandụ. N’ihi nke a aka Chineke wee dịkwasị ha n’ihe otiti, egbukwara ọtụtụ nime ha. Na ha enyeghị Igbé ahụ nsọpụrụ na ùgwù bụ ihe ọjọọ megide Chineke. Ụmụ Israel wee chọpụta na mmadụ aghaghị ilezianya otú ọ ga esi ná emeso ihensọ nke Chineke, ihe niile edoro nsọ dịịrị ụlọ Jehova, na ọnọdụ ọlụ niile dịnsọ, na mmadụ agaghị eme otú o si dị ya mma site n’okwu maọbụ omume, n’ihi na ọ dị n’aka Chineke ibuli. “Chineke bu onye-ikpe. Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu” (Abụ Ọma 75:6, 7).

Ndịkom Bet-shemesh hụtara ike na ịdịnsọ nke Chineke. Ha tiri mkpu sị, “Ònye puru iguzo n’iru JEHOVA, bú Chineke nsọ a?” Gụọ Abù Ọma I na Abù Ọma 15 maka ọzịzá.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere eji buru Igbé ahụ jee n’agha?
  2. Gịnị ka Ụmụ Israel ná emeghị tutu ha baa n’agha ahụ?
  3. Òlee otú agha ahụ si bie maọbụ kwụsị?
  4. Gịnị mere Ilai na ụmụ ya ndịkom abụọ?
  5. Gịnị mere Igbé Jehova?
  6. Gịnị mere arụsị ahụ?
  7. Ọ bụ gịnị kpatara na ndị Filistia zilagara Igbé ahụ?
  8. Gịnị mere Chineke ji tie ndịkom Bet-shemesh ihe otiti?