1 Samuel 7:1-17

Lesson 202 - Junior

Memory Verse
“JEHOVA aburuworom ulo-elu; Chinekem bu kwa oké nkume ebe-mgbabam” (Abù Ọma 94:22).
Notes

Ọchịchịrị na Ìhè nke Ime Mụọ

N’oge niile ahụ mgbe Igbé Chineke nọworo n’etiti ndị Filistia, obodo ha niile edebere ya hụjuru anya n’ikpé nke Chineke. Ndị Filistia ñụrịrị ọñụ iwepụ ya n’etiti ha, ka ndị Israel were kwa ya debe n’obodo nke ha.

Nime Igbé ahụ ka Okwu Chineke dị, iwu niile ahụ bụkwara ndị Israel ihe Baịbụl bụrụ anyị. Anyị anụwo ka ana-ekwu na Baịbụl na-ebutere obodo imepe ụzọ; na ebe ọ bụla ụmụ mmadụ na-erubere iwu Ya niile isi, Chineke na-agọzi. Ọ bụ gịnị kpatara na ndị Filistia enweghị ọñụ nke ngọzi Ya mgbe Igbé ahụ nọ n’aka ha? Ọ bụ n’ihi na ha erubeghị isi n’iwu niile nke Chineke, ha adịghị efè kwa Chineke òfùfè. Ha bụ ndị na-ekpere arụsị ndị na-achọghị ịmata eziokwu; n’ihi ya mgbe Okwu ahụ bịakụtere ha, ha jụ kwa ya, amárá ha ikpé n’ihi mmehie ha.

Taa, Okwu Chineke na-ewetara ndị niile ga-ekwere na ya ìhè. Ma mgbe ụmụ mmadụ nwere ohere ịmata eziokwu nke Baịbụl, ha wee jụ ibi-ndụ na ya, ìhè ahụ na-aghọrọ ha ọchịchịrị -- lee kwa otú ọchịchịrị ahụ ra ukuu! Ha nọ n’ọnọdụ jọrọ njọ karịa ndị na-anụbeghị ihe banyere Jisọs.

Igbé ahụ nọ n’otù èzí na ụlọ nke ndị Livai ugbu a nime Juda, ha wee na-elezi kwa ya anya nkeọma. Chineke na-agọzi ha. Mgbe arọ olenaole gabigasịrị nke Igbé ahụ nọ n’ụlọ Obed-edom, Onye amụma kwuru banyere ya sị: “Igbe Jehova wee gọzie Obed-edom na ulo ya nile” (II Samuel 6:11).

Ngọzi nke Inwe Amamikpé

Ọ dị ngọzi pụrụ ìche nke ndị Israel na-añụrị na ya n’oge a mgbe Igbé ahụ nọ n’etiti ha. Ọ bụ ngọzi nke inwe amamikpé n’ihi mmehie, inwe mmetụta nke ihe ọjọọ niile ha meworo megide Chineke. “Ulo Israel nile we kwaso Jehova.”

Eleghị anya ị gaghị eche na ụdị enweghị obi-ụtọ nke amamikpé na-eweta bụ ngọzi, ma amamikpé a bụ ihe na-ewerute onyemmehie, nso Chineke. Mgbe amamikpé bịakwasịrị mmadụ ọ na-enwe óké iru-uju nime ya. Mgbe ụfọdụ ọ gaghị-achọ iri ihe maọbụ ịrarụ ụra. Eleghị anya egwù ga-adị nime ya na ya ga-anwụ na mberede, maọbụ na Jisọs ga-abịa ewee rapụ ya ịgabiga mkpagbu ahụ. Onye ahụ nke Chineke na-agwa okwu n’ụzọ dị otú a pụrụ ịchọ mgbe ụfọdụ ka Chineke rapụ náánị ya. Ma lee otú mmadụ na-aghaghị inwe obi-ekele n’ihi amamikpé nke obi!

Ọ bụrụ na ị bụ onyemmehie, chèè ihe ọ ga-alụpụta ọ bụrụ na Jisọs agaghị-eme kwa ka mmehie gị metụta gị. Ị gaghị-enwe agụụ ichègharị na inwe nzọpụta, ị ga-efu kwa ebighị-ebi. Ị pụghị ịbịakute Jisọs mgbe ọ bụla ị chọrọ. Mụọ nke Chineke aghaghị ịdọrọ gị bịakute Ya. Záá ya mgbe Ọ na-akpọ na-arịọ kwa gị n’ịhụnanya ka ị bịa n’ulo Nna ebe ị ga-enwe nchébe ebighị-ebi!

Chèè échìchè ngọzi niile na-eso inwe amamikpé, mgbe onyemmehie ahụ zara chègharịa kwa site ná mmehie ya ewee mee kwa ka o nwere onwe ya. Ibu arọ ahụ wee pụa. Ndụ niile wee dịrị ya ọhụụ. Ọ bụ onye ekère ọhụụ nime Kraist Jisọs. Iwe, obi-ọjọọ, okwu iwe niile ọ na-ekwu, agabigawo. N’ọnọdụ ha, abụ ọñụ, mụọ nke obi-ọma n’ebe ndị ọzọ nọ, inye-aka nye ndị nọ ná mkpà; ma, nke kachasị, olileanya nke ndụ ebighị-ebi n’ebe Jisọs nọ. Ihe niile a na-abịa kwa n’ihi na Chineke na-ekwe ka amamikpé nke obi bịakwasị onyemmehie ime ka o nwee nwuta n’ihi mmehie ya wee chọọ mgbaghara.

Nchègharị nke Ndị-Israel

Amamikpé nke obi mere ka Ndị Israel kwáá ákwá n’iru Jehova. O gosịrị ha na ha emebiwo iwu Ya, ha wee nwee mwuta dị ukuu n’ihi mmehie ha. Òlee ihe ha pụrụ ime ugbu a?

Samuel bụ onye-ikpé ha, ọ bụ kwa ezi Onyeamụma nke Chineke, ọ pụkwara ịgwá ndị ahụ ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ na ha ga-echègharị, Chineke ga-agbaghara ha mee kwa ka obi dị ha ụtọ. Ha ga-ebibi mmehie na arụsị niile dị n’etiti ha.

Obi jọrọ Israel njọ nke-ukuu na ha nwere ọñụ ime ihe ọ bụla Chineke chọrọ ka ha mee. Ha mere nrọrọ ha n’ụbọchị ahụ isoro Onyenwe anyị jee n’ụzọ niile. Ọtụtụ mgbe anyị na-anụ ka ụmụntà na-emechi ịgba-àmà ha n’okwu ndịa, “Achọrọm ịjé n’ụzọ ahụ nile.” Nke ahụ bụ nnọọ ihe Chineke chọrọ ka anyị mee -- “jee n’ụzọ ahụ nile.”

Mgbe onyemmehie chègharịrị n’ezie, ọ na-ekwe nkwà inye Chineke ndụ ya, ime ihe ọ bụla Chineke kwuru. Ọ na-adị njikere ịrapụ ihe niile na-adịghị Chineke mma, dịka ihe-ụtọ nke ụwa, okwu ụgha, na ịlụ-ọgụ. Eleghị-anya, ọ gaghị agwa Chineke na ya ga-arapụ ha site n’ịkpọ ha aha n’otù n’otù -- ọ pụghị icheta ha niile mgbe ọ na-ekpe ekpere -- ma mgbe o kwere nkwà inye Chineke ndụ ya nkwà ahụ na-ejikọta ihe niile.

Ndị-Israel bibiri arụsị niile ha. Nke a bụ nzọụkwụ gosipụtara na ha ná-echègharị. Mgbe ahụ Samuel wee kpọọ ha na Mizpa maka nzukọ ekpere. Samuel bụ onye-ozi kwesịrị ntụkwasịobi, onye na-agba gburugburu si n’otù obodo rue obodo ọzọ ikuziri ndị ahụ otú esi efè Chineke òfùfè; na, dịka ezi orù ọ bụla nke Onyenwe anyị, ọ na-enwe kwa ọñụ ikpere ndị na-achọ inwe nzọpụta ekpere.

Ntute ahụ na Mizpa

Lee óké ntụte na-aghaghị ịdịworị na Mizpa mgbe óké ụsụ nke ndị Israel ahụ chigharịkutere Chineke n’obi ha! Chèè otú obi-ụtọ ra nke Samuel na-aghaghị inweworị ịnụ ka ndị ahụ na-ekpe ekpere maka mgbaghara! Ịhụ otù onyemmehie nke agbapụtara ọhụụ na-emejupụta obi Onye Kraist ọ bụla n’ọñụ; ọñụ na-adị kwa n’Eluigwe mgbe achọtara otù mkpụrụobi furu efu. Óké ọñụ ra añaa bụ ihe na-aghaghị ịdịworị n’etiti ndị mụọ-ozi n’ebube mgbe ha nụrụ otuto niile nke óké igwè nke ndị mmehie a agbagharaworo n’ebe a! Otuto na-ejupụta obi nke mkpụrụobi agbapụtara nye Chineke. Etiwawo ike nke ekwensu, ịhụnanya nke Chineke ewee na-achị kwa obi ha. Ma ekwensu adịghị akwụsị ịlụ-ọgụ.

Ọnwụnwa dị iche iche

N’etiti ọñụ niile ahụ dị na Mizpa ka otù mkpụ nke ihe-egwù dara. Ndi Filistia na-ebili imegide ha. Ekwensu abịawo ịgbalị imebi ngọzi niile nke óké ntute ahụ. Ma ugbu a ndị Israel nwere iruọma n’ebe Chineke nọ, Ọ ga alụkwara ha agha. Na mbụ ndị Israel dị ka ndị chègharịrị ọhụụ ndị na-amụtabeghị óké ihe Chineke pụrụ imere ha mgbe ana-anwa ha. Ha tụrụ egwù, ha wee tikue Samuel ka o kpesie ekpere ike n’ihi ha. Samuel mere otú ahụ, lee kwa ụdị ọzịzá ọ natara! Jehova wee makwasị ha óké égbè eluigwe na egwù tụrụ ndị Filistia ha wee bàà n’ọgbá-aghara, o wee dịrị ndị Israel nfé ịchụlaga ha.

Ọ bụ ihe ọñụ ịhụ ka Chineke na-alụrụ anyị agha. Eleghị-anya onye ahụ azọpụtara ahụbeghị mgbe ọ bụla Chineke tinyeworo aka n’ụdị dị otú a na ndụ ya, ọñụ dị ukuu ka ọ na-enwe kwa n’ike ukuu ọhụụ a dị na ndụ ya.

Mmeri Zuru-òkè

Ndị Israel wee chụa ndị Filistia n’ụzọ niile rue Bet-ka. Lee óké mmeri dị ebube otú a! Israel ahụbeghị óké inwe mmeri dị otú a sitekwarị n’ụbọchị niile nke Joshua na Gideon. Ọ dịwo oge dị iche iche achụrụ ụfọdụ ndị Filistia, ma ọ bụ náánị mgbe anapụsịworo Israel ihe ha n’ike. Mgbe niile ahụ Israel enwewo afọ-ojuju ná mmeri na-ezughị ezu.

Ma ugbu a ha emeriwo mmeri zuru ókè. Ha achụghachịwo ndị Filistia n’obodo nke ha. Èzínaụlọ ndị Filistia niile nọ n’ulo ga-enweworị mgbagwoju anya mgbe ha hụrụ ndị agha ha ụjọ ji ka ha na-alata, na-agba ọsọ ịchọta nchébe, na-ejighị mkpụrụ nke ubi na anụ-ụlọ na atụrụ nke ha na-ewetarị mgbe ha na-emekpà ndị Israel arụ.

Mụọ nke Agha

Óké ihe dị iche dị n’ọmụma ụlọikwu Israel. Ha enwetawo mụọ nke ibu-agha. Ike ha sitere na Jehova ná mmekọrịta ọhụụ ha chọtaworo n’ebe Ọ nọ, ha wee tigbue ndị iro rue mgbe obodo ha nweere onwe ya. Eji ekpere mee ka ha dị ike ịlụ ọgụ megide mmehie.

Otù mmeri apụtaghị ọgwụgwụ nke ịlụ agha. Ndụ nke Onye Kraist bụ agha mgbe niile, ma “ayi nēmeribiga ókè site n’aka Onye ahu Nke huru ayi n’anya” (Ndi Rom 8:37). Site n’ụbọchị rue ụbọchị anyị aghaghị ịrịọ Onyenwe anyị ike ọhụụ. Mmekọrịta ahụ nke anyị na Chineke na-agba anyị ume ịlụso ihe ọjọọ ọgụ, anyị na-enwe kwa obi ụtọ ịpụ n’aha nke Onyenwe anyị wee nwee mmerị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ebe Igbé Chineke nọ n’oge nke iheọmụmụ a?
  2. Òlee mgbe Igbé ahụ wetara ngọzi? òlee kwa mgbe o wetara ikpé?
  3. Gịnị bụ amamikpé nke obi?
  4. Gịnị mere ndịIsrael ji kwáá ákwá?
  5. Gịnị ka Samuel gwara ha ka ha mee?
  6. Gịnị ka ndị Israel mere tutu ha agaa ná nzukọ ekpere ahụ na Mizpa?
  7. Gịnị mere na Mizpa?
  8. Gịnị tinyere mgbochị n’otuto nke ndị Israel?
  9. Gịnị ka ndị Israel mere ndị Filistia?
  10. Òlee ihe mere ndị Israel ji dị ike rue imeri ndị iro ha kpam kpam?