I Samuel 8:1-22

Lesson 203 - Junior

Memory Verse
“Abàla n’okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, aga-kwa-la n’iru n’uzọ ndi ọjọ” (Ilu 4:14).
Notes

Ikwesi Ntụkwasịobi nke Samuel

Samuel Onyeamụma bụ otù nime ndị kachasị mma anyị na-agụ ihe banyere ha na Baịbụl. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla ekwuru banyere ya. Mgbe ọ bụ náánị nwata ka o jiworo ndụ ya na ọlụ ya chụa àjà nye Onyenwe anyị; mgbe o tolitekwara, ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ bụ ihe nọgidere na-abụ ọchịchọ ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o mebiri nkwà ya.

Samuel hụrụ Ụmụ Israel n’anya dịka nna na-ahụ nwa ya n’anya, ọ na-enwe nwuta ebe ọ dị ukuu mgbe onye ọ bụla nupụrụisi. Ibu-arọ dị n’obi ya bụ ịhụ ka azọpụtara ha, o wee nekpesikwara ha ekpere ike.

Ndị ahụ hụrụ Samuel n’anya n’ihi ịdị mma na eziokwu ya; na mgbe ọ ghọrọ agadi, wee jụa sị “Ònye ka m’megbuworo? ònye ka m’zọpiaworo? Ma-ọbu n’aka onye ka m’naraworo ihe-ngbaputa iji zopu anyam n’aru ya? Ndi ahụ zara ya sị “I megbughi ayi, ì zọpiagh kwa ayi, i naragh kwa ihe ọ bula n’aka nwoke ọ bula” (I Samuel 12:3, 4). Ọ bụghị ọtụtụ ndị ndú n’akụkọ ụwa nweworo ịgba àmà dị otú a mgbe ha nwụsịrị.

Mgbanwe na Gọvment

Ndị ahụ nwere afọ ojuju ọtụtụ mgbe n’oge ndụ Samuel ikwe ka ọ bụrụ onyeikpé ha, ha bikwara ndụ n’iwu nke Chineke dịka ọ kụziirị ha. Ma mgbe Samuel ghọrọ agadi, ụmụ ya ndịkom elezighị kwa anya ime eziomume, dịka nna ha meworo, ndị Israel wee kpebie itinye ihe niile n’aka onwe ha wee ghara ichere Chineke iweliri ha ezi onyeikpé ọzọ.

Ndị Israel chọrọ eze. Nke a megidere ọchịchọ nke Chineke, n’ihi na Ọ chọrọ ịbụ Eze ha. N’ọgbọ niile kemgbe Israel siworo n’Ijipt pụta -- n’oge nwagharị ha n’ọzara na mmeri nke Kenean -- Chineke bụ onye ndú ha. Mgbe ọ bụla ọ dị mkpà, Chineke na-arọpụtara ha onye ikpé ga-achị ma kuzikwaara ha ezi omume. N’ihe niile ndịa, Chineke bụworo ha Eze.

Chineke dịka Eze

Chineke bụ Eze dị mma nke uku nye ndị ahụ karịa ka mmadụ ọ bụla pụrụ ịbụrụ ha. Chineke maara ihe niile, pụ kwa ịhụ ọnwụnwa niile ga-abịakute ha, ọbụná tutu ha emee, pụ kwa inyere ndị ahụ aka imeri. Chineke bụ Onye kachasị ike, Ọ pụkwara iwetara ndị Israel mmeri mgbe ha na-enweghị olileanya. Chineke arọpụtaworo ha ihe oriri na uwe na ụlọ ụdị nke eze ọ bụla nke ụwa apụghị inye ha. Ihe niile Chineke mewooro Israel bụ maka ọdị mma ha.

Ọjụjụ

Ugbu a Israel na-èchigharị àzụ ya n’ebe Onyeamara, Onyepụrụ ime ihe nile, Eze nke Eluigwe, Onye na enye ezi onyinye na ihe niile dị mma, wee na-achọ na aga-eme otù nwoke n’etiti ha onye eze gana achị ha. Akụkọ nke ọchịchọ efu nke Israel wutere obi Samuel. Chineke bụ Enyi ya kachasị mma, Samuel chọkwara ka ndị ahụ hụ Ya n’anya dịka ya onwe ya hụrụ Ya. Kama, ha na-ajụ Onye Nsọ nke Israel ná-achọ kwa ka ha mee ihe dị ha mma.

Chineke matara na Samuel emeworo ndị Israel ihe niile ọ pụrụ ime, na ọ bụghị kwa ihe sitere n’aka ya na ha rịọrọ eze. Chineke sịrị Samuel: “Ọ bugh gi ka ha juworo, kama ọ bu Mu ka ha juworo, ka M’ghara iburu ha eze.”

Ọtụtụ oge ọzọ adịwo kwa mgbe ndị nke Chineke chigharịworo pụa n’ebe Ọ nọ, nlụpụta ya na-abụ kwa otù ihe mgbe niile: mmadụ ọ bụla maọbụ mba ọ bụla nke na-ajụ Chineke aghaghị ịhụjụ anya n’ihi ya.

Ọjụjụ ndị Israel jụrụ Ya bịaruru n’òzùzù òkè mgbe ha kpọgburu Jisọs. Ọ kwárarị ákwá sị: “Jerusalem, Jerusalem, … ọtutu mgbe ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọgh!” (Matiu 23:37). Chèè échìchè banyere obi dị arụ nke Onyenzọpụta anyị nwere ịkwá ákwá n’ihi Jerusalem ná-enupu isi! Nụrụ kwa ọzịzá ha: “Ọbara-Ya di ayi n’isi, di kwa n’isi umu-ayi” (Matiu 27:25). Ọ dịghị anya mgbe ndị Ju malitere ịhụjuanya nke ukuu, ikpé wee sogide kwa ha n’ọtụtụ rue n’ụbọchị ndịa. Nke a bụ ihe na-abịa site n’ịjụ Onyenwe anyị; ìkpé kachasị na-echere kwa n’ụbọchị ikpe-àzụ.

Anabatara Ọchịchọ Ahụ

Chineke gwara Samuel ka ọ gwa ndị Israel na ha pụrụ inwe eze ọ bụrụ na ha chọrọ. Ọ bụghị uche Ya; ma ọ bụrụ na ha ekwesie olu ha ike, Chineke ga-ekwe ka ha mee ihe ahụ dị ha mma. Ọ bụrụ na anyị arịọgide Chineke ihe, O nwere ike kwee ka anyị mee ihe ahụ bụ nrọrọ anyị ọbụná na ọ bụ ezie na Ọ matara na ihe ọzọ ga-adịrị anyị mma karịa. Eleghị anya obi anyị ga-ejupụta n’ekele mgbe emezuru ihe ahụ anyị rịọrọ; ma mgbe na-adịghị anya anyị ga-amalite inwe mgbakasị arụ, maọbụ anyị nwere ike hụa ahụhụ; mgbe ahụ anyị ga-amalite ịhụta na anyị kwesịrị ịrịọworị Chineke ka O mee ihe dị Ya mma. Anyị kwesịrị ikpé ekpere dịka Jisọs kpere, na dịka Ọ kuziirị ndị na eso ụzọ Ya ikpé ekpere, “Ka eme ihe I nāchọ.”

Ndị Israel achọghị ịmata ihe Chineke na-achọ. Ha chọrọ eze, ha agaghị-ezu kwa ike rue mgbe ha nwetara otù. Ha chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ dị iche iche nọ ha nso. N’ụzọ ọzọ, anyị ga-asị na ha chọrọ ịdị ka ụwa. Otú ọ dị kwa, n’ịrịọ Samuel eze ọ dị ka ha chọrọ ka Chineke kwagide ihe ahụ bụ ụzọ nke aka ha.

Iyi Ụwa

Anyị na-ahụ ụmụ mmadụ taa ndị na-achọ ịga Eluigwe. Ha ga-achọ ịbụ Ndị Kraist, ma ha adịghị achọ ịdị iché site na ndị enyi ha na-eme mmehie. Ụfọdụ ụmụagbọghọ ga-ekwe ka ụmụ ihe ntakịrị dị ka ité ihe-otite dị iche iche gbochie ha inye Jisọs obi ha. Ha na-atụ egwù ịkwáemo nke ndị enyi ha ana-azụghị azụ nọ n’ụlọakwụkwọ. Ndị ntorọbịa ọzọ na-echè na ha aghaghị ịñụ sịga n’ihi na “onye ọ bụla na-añụ ya.” Ha dị ka ndị ahụ chọrọ eze n’ihi na ndị agbataobi ha nwere ụdị onye-ọchịchị ahụ.

Onyinye nke Eze

Samuel dọrọ ndị Israel aka ná ntị na eze ha na-arọrọ ga-anara ụgwọ dị ukuu site n’aka ha. Ọ ga-anara otù ụzọ n’ụzọ iri nke igwè ewu na atụrụ ha; ọ ga-ewere ụmụ okoro ha kachasị mma ịbụ ndị agha ya maọbụ ịbụ ndị orù n’obí eze. Ụmụ ha ndịnyom ga-abụrụ eze ndị osiite na odozi-anụ. Ọ ga-ebi kwa n’ụlọ mara mma nke ukuu na-eri nri kachasị mma; ọ ga na-emefu ego riri nne nke ha na-aghaghị inye site n’ịbụ ogbenye ha.

N’ezie nke a abụghị ọdịniru dị mma ile anya ya, ma Samuel tụkwasịrị otù ịdọ áká ná ntị dị egwù. Mgbe oge ruru na ha na-ahụju anya dị otú a, Chineke agaghị-anụ olu ha ma ha kpọkue Ya maka inyeaka. Inyeaka sị n’ebe Chineke nọ dị mmadụ niile mkpà. Chèè ihe ọ ga-abụ bụ enweghị Chineke ga-aña ntị n’ekpere gị mgbe ị nọ na nsogbu, enweghị onye ga-akasị ndị onye ha nwụrụ obi, na-enweghị onye ga-agwọ ndị-ọrịa, na-enweghị onye ga-eme ka ndị obi ha tiwara etiwa nwee ndajụ.

Ma obi Ụmụ Israel esiwo ike. Ha ga-enwe eze, ná-agụghị ihe ọ ga-efu ha. “É-è; kama, eze gēchiri ayi.”

Ekwenyere N’uche Ha

Ọ bụ na anyị adịghị-ahụ ndị na-adịghị achọ nduzi nke onye ọzọ gburugburu anyị mgbe niile? Ha matara na ha ga-ata ahụhụ nke mbibi ebighị-ebi ọ bụrụ na ha enupụrụ Chineke isi, ma ha adịghị eme ka ọ gbasara ha. Ọ dị ka ụbọchị olenaole ha ga-adị ndụ n’ebe a dị ha mkpà karịa ihe ga-abụ ókè ha mgbe ndụ nke a gasịrị. Ha adịghị akwụsị, tụgharị uche na oge mkpagbu ntakịrị n’ebe a -- oge ntakịrị nke “ịdị iche” -- bụ ihe aga-èchèfu n’otù ntabianya mgbe anyị hụrụ Jisọs. Karịa kwa nke ahụ, mgbe azọpụtasịrị mmadụ ọ dịghị agụ kwa ịkwáemo nke ndị ya na ha na-ayikọ banyere ndụ ịbụ Onye Kraist ya n’ihe ọ bụla. Ọbụná mgbe ụmụ mmadụ hụworo ahụhụ rue n’ịnata mmerụ arụ maọbụ nwụa n’ihi iguzoro nye okwukwe ahụ n’eziokwu, Jisọs eguzoworị n’akụkụ ha inyere ha aka imeri; eritawo kwa ndịmmehie n’úrù nye Onyenzọpụta site n’ịhụ ọñụ nke ndị egburu n’ihi okwukwe ha ji ezute ọnwụ karịa ịgọnarị Onyenwe anyị onye zọpụtaworo ha.

Ọ dị àjà dịkarịrị ukuu iji nweta ndụ ebighị-ebi? Ụtọ ka ọñụ nke Onye Kraist ọ bụla ga-adị bụ onye pụrụ iguzo n’iru ikpé, mara na ekpere ya bụworo, “ka eme ihe I nāchọ.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kọwaa omume Samuel.
  2. Gịnị bụ ọnọdụ Samuel n’Israel?
  3. Gịnị kpatara Ụmụ Israel ji chọọ eze?
  4. Òlee otú o ji metụ Samuel banyere ọchịchọ ụwa nke ndị Israel na-achọ?
  5. Gịnị ka Chineke gwara Samuel banyere ihe Ụmụ Israel rịọrọ?
  6. Gịnị na-adakwasị ndị na-ajụ Chineke?
  7. Gịnị ka Samuel gwara ndị ahụ banyere ndụ-ha site n’ọchịchọ nke eze ga-achị ha?
  8. Òlee akụkụ ekpere nke Onyenwe anyị nke ndị Israel kwesịrị ịkpé n’oge a?