Abù Ọma 50:1-23

Lesson 204 - Junior

Memory Verse
“Kpọkukwam n’ubọchi nkpagbu; M’gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram” (Abù Ọma 50:15).
Notes

Òfùfè

N’oge a n’arọ, Govment anyị ewepụtawo otù ụbọchị iche nke onye ọ bụla ga-enye Chineke ekele nime ya. Iheọmụmụ anyị taa na-agwa anyị ụdị otuto na ekele nke Chineke na-anara.

Onyenwe anyị na-akpọ mmadụ niile ifè Ya òfùfè. Ọ ga-eduzi anyị n’ụzọ ezi òfùfè. Jisọs gwara nwanyị ahụ nọ n’akụkụ òlùlù miri, onye Sameria, na ndị na-akpọ isi-ala n’ezie “gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu” (Jọn 4:23). Ndị ahụ ka Chineke na-achọ ka ha fèe Ya -- ndị ga-akpọrọ Ya isi ala n’eziokwu. “Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghagh ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu” (Jọn 4:24).

Site n’Obi

Otù nime ụbọchị ndịa Chineke ga-abịa n’ikpé, mmadụ nile kwa ga-akọ akụkọ otú ha si bie ndụ na ụzọ ha si kpọọ isi ala n’iru Ya. Ọkụ ga-ere ndị na-amaghị Chineke na ndị na-enupụ isi (II Ndi Tesalọnaika 1:8). Eluigwe niile na ụwa ga-agba àmà megide ndị niile na-efèghị òfùfè dịka ndụmọdụ nke Chineke si dị. Chineke n’Onwe ya ga-agba àmà megide ndị na-akpọghị isi ala nime mụọ na n’eziokwu. Ọ dị mkpà na otuto na inye-ekele anyị niile bụ ụdị ana-anara. Chineke adịghị-enwe obiụtọ n’òfùfè nke mmadụ ga-enye dịka ọ na-ejere Ya ozi dị ukuu karịa, maọbụ n’ihi na mmadụ chèrè na ọ bụ náánị òfùfè ana-aghaghị ime bụ inye Chineke otuto. Ụdị òfùfè ahụ bụ náánị òfùfè ana-ahụ anya. Chineke na-achọ ezi òfùfè nke na-esite n’obi, nke ana-enye site n’ịhụnanya na okwukwe. Chineke adịghị enwe obiụtọ n’ebe ndị ahụ nọ bụ ndị na-asọpụrụ Ya n’egbugbere-ọnụ ha ma obi ha dị anya n’ebe Ọ nọ (Aisaia 29:13).

Ọgbụgbandụ site n’Àjà

Ndị nke Chineke, ndị nsọ, ka aga-achịkọtara Onyenwe anyị. Ndị nsọ bụ ndị ha na Ya gbaworo ndụ n’elu àjà. Ọ dịghị ndị nsọ ọzọ dị, náánị ndị nkwekọrịta ha na Chineke furu ihe. N’Abù Ọma nke na-eso anyị na-agụ “Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa” (Abù Ọma 51:17). Àjà nke Chineke na-achọ bụ ezi mụọ nke nchègharị. Obi etiwara etiwa, nke nwere nwuta n’ihi mmehie o meworo, Ọ dịghị eleda ya anya. Chineke na-anara àjà nke furu mmadụ ihe. Àjà nke mbụ aghaghị ịbụ mmehie niile ya.

Ezi nchègharị bụ ichigharị pụa ná mmehie. Ọbụná n’oge Àgbà Ochie, mgbe ana achụàjà mmehie mgbe niile, Onyenwe anyị sịrị, “Sinu n’uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M’nyere n’iwu, na ukpurum nile” (II Ndi-eze 17:13).

Iji-obi-chụa-àjà

Ndị-nsọ na-achụrụ Chineke ha àjà ọzọ -- iji ndụ ha chụa àjà. Pọl degaara Ndị Rom akwụkwọ banyere nke a; “Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n’iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di” (Ndi Rom 12:1).

Mgbe mmadụ na-ekpe ekpere ka azọpụta ya, ọ na-eji ndụ ya chụara Chineke àjà. N’ịchọ odudo-nsọ na baptizim nke Mụọ Nsọ, mmadụ na-eji kwa ndụ ya chụa-àjà dị omimi ọbụná karịa ka o meworo na mbụ. Chineke pụrụ iji oge na talent anyị mee ihe. Anyị na-eji kwa ha chụara Chineke àjà ka O wee kpọọ anyị n’ọlụ dị uku karịa nye Onwe ya. Chineke na-achọ iji obi chụaàjà -- ọ bụghị náánị n’oge mmadụ na-achọ onyinye amara, kama iji obi chụaàjà ụbọchị niile, ibi-ndụ nye Onyenwe anyị na ime uche Ya. Ụmụ-ntakịrị na ndịokenye kwa aghaghị ịchụàjà niile a ka ha wee nwee ike ibi-ndụ nwere ọganiru dịka ndị Kraist, ha pụkwara ime ya.

Ndịiruabụọ

Otú a Chineke na-akụziri anyị ihe bụ onyinye ana-anara n’iru Ya -- nke mbụ, ihe niile banyere nchègharị; na nke abụọ, ihe niile banyere iji obi chụaàjà. Ma na-agbanyeghị ịdọ aka nántị a Chineke nyeworo, ụfọdụ ka dị kwa ndị, site na ngosi nke elu arụ, ga-eme ka ndị ọzọ chèe na ha bụ ndị eziomume. Ha bụ ndị iruabụọ, na-eme ka ha na-enye Chineke otuto. Ma adịghị anara ụdị otuto ahụ.

Irubeisi

Ihe atụ nke onyinye Chineke na-anaraghị ka enyere site n’aka otù nime ndị eze niile nke Israel, onye rapụrụ ihe nke Chineke nyere n’iwu ka ebibie. Ọ nwara ime ngọpụ site n’ikwu na ya rapụrụ atụrụ na ehi niile ahụ iji chụara Jehova àjà. Samuel Onye amụma zárá sị: “Aja-nsure-ọku na àjà ọzọ, ha nātọ JEHOVA utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iña nti di nma kari abuba ebulu” (I Samuel 15:22).

N’oge ọzọ, mgbe Ụmụ Israel na-egosipụta ikpé okpukpé site n’inye ọtụtụ onyinye, Chineke sịrị, “Afọ ejuwom n’àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu … ọbara oké-ehi atọghm utọ.” Òfùfè ha abụghị ezi òfùfè. Chineke nyere ha ndụmọdụ ka ha saa arụ dị kwa ọcha, ka ha wezuga ihe ọjọọ nke omume ha, ka ha rapụ ime ihe ọjọọ wee mụta ime ezi ihe (Aisaia 1:11-17).

Site n’ọnụ Hosea Onye amụma, Chineke sịrị, “Ebere atọwom ụtọ, ọ bugh àjà; ọmuma Chineke atọwokwam utọ kari àjà-nsure-ọku nile” (Hosea 6:6).

Otù oge, otù onye amụma nke Israel jụrụ ụzọ ya kwesịrị isoro bịa n’iru Onyenwe anyị. Ọ jụrụ ma Chineke Ọ ga-enwe obi-ụtọ na “nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbụ orù nnù kwuru orù nnù iyi manu” n’ihi ajọ omume na mmehie nke obi ya. Nke a bụ ọzịzá ya: “Gi madụ, O gosiwo gi ihe di nma; ọ bu kwa gini ka JEHOVA nāchọ n’aka-gi, ma-ọbugh nánị ime ihe ekpere n’ikpe na ihu ebere n’anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije” (Maika 6:7, 8).

Otuto

Onye dere Abù Ọma na-agwa anyị ka anyị “chuara Chineke ekele dika àjà.” Ana-anara àjà nke otuto. Nke kachasị, ana-adụ anyị ọdụ ịkwụghachị nkwà anyị kweworo. Ná-arụghị ụka onye ọ bula ekpewo ekpere kwe Chineke nkwà mgbe ọ nọ ná nsogbu Abù Ọma 66:13, 14). Chineke ekwerewo ihe onye ọ bụla kwuru na-ele kwa anya ka edebezue nkwà niile ahụ. Nkwà bụ ụgwọ ana-aghaghị ịkwụ, na kwa ihe ana-aghaghị imezu. Chineke emewo akụkụ nke Ya. Ànyị emewo nke anyị?

Inye Chineke Otuto

Mgbe mmadụ na-edebezu nkwà ya nye Chineke, lee ụdị ntụkwasịobi ọ na-enwe nime Onyenwe anyị! Ọ matara na Chineke ga-anụ ekpere ya napụta kwa ya na mgbe mkpà. Ọ dị kwa otù ihe ọzọ Chineke na-ele anya ya -- “I gāsọpu-kwa-ram. Nke ahụ bụ ezi òfùfè, inye Chineke nsọpụrụ na otuto. Anyị amụwo ihe banyere ọgwụgwọ Jisọs gworo ndị ekpenta iri n’otù oge (Ihe ọmụmụ 127). Náánị otù onye nime ha laghachịrị, “were oké olu nēnye Chineke otuto … nēkele Ya.” Jisọs siri, “Èmegh ka arụ ndikom iri ahu di ọcha? Ma òle ebe iteghete fọduru nọ? Àhugh ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbugh onye ala ọzọ a?” (Luk 17:15-18). Eleghị anya ọ bụghị ekpenta ka agwọworo anyị, ma onye ọ bụla anatawo ngọzi dị iche iche site n’aka Chineke. Ànyị alaghachịwo inye Chineke otuto? Maọbụ àgaagụkọta anyị na iteghete ahụ ndị gara n’ụzọ nke ha, ná-abịaghachịghị ọbụná ikele Ya ekele?

N’akwụkwọ-ozi Pọl degaara ndị Rom, ọ na-ekwu ihe pụrụ ime mgbe ana-enyeghị Chineke nsọpụrụ, otuto, na ekele. Ndị ahụ na-atụfu ịhụnanya nke Chineke. Ana-enyefe ha n’aka mmehie na ikpé nke mmehie. “Ọ bụ ezie na ha mara Chineke, ma ha enyegh Ya otuto dika Chineke, ha ekelegh kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n’ihe nile ha natule n’obi-ha, obi-ha nke nēnwegh kwa nghọta gba-kwa-ra ọchichiri” (Ndi Rom 1:21).

Ikpé

Ụfọdụ mmadụ na-ahụ inye ndụmọdụ n’anya na ịgwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme, ma nime obi ha, ha kpọrọ ndụmọdụ nke Chineke asị. Ha na-agbalị n’ụzọ nke aka ha inye Chineke òfùfè karịa ịmụta ụzọ ezi òfùfè n’aka Ya. Chineke na-amata ihe ana-eme megide Ya, na ezi ihe ebu n’obi nọ n’àzụ ha niile. N’ihi na Ọ gbara nkịtị rue ugbu a apụtaghị na Ọ ga-agba nkịtị ebighị-ebi banyere ihe niile ndịa. “N’ihi na emegh ihe ekpere n’ikpe megide ọlụ ọjọ ọsọsọ, n’ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ” (Eklisiastis 8:11). Ọtụtụ ndi mmehie na-ewere ịgba-nkịtị Chineke dịka nkwenye Ya. Ekwela ka aghọgbue gị; Chineke nwere akwụkwọ eji edekọta ihe nke aga-emeghe mgbe oge ya ruru. Chineke na-enye ndụmọdụ -- echèfula Chineke -- n’ihi na nchèfu ahụ maọbụ nlefuruanya na-abụkarị mkpọrọgwụ nke ajọ omume.

Ka anyị na-amụ Abù Ọma nke iri ise a, ana-eme ka anyị mara na ezi òfùfè na-esite n’obi. Ụfọdụ mmadụ dị ndị na-arara “ọnụ gi nye n’ikwu ihe ọjọ” na “ire-gi nējikọta kwa aghughọ.” “Ezi madu nēsi n’ezi aku-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n’ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe” (Matiu 12:35).

Ka anyị tinye ihe anyị mụtara n’iheọmụmụ a n’ọlụ, ka óké ịla n’iyi nke na-echere ndị iruabụọ, ndị ná aghọgbu mmadụ ibe ha na ndị mmehie niile, wee ghara ịdakwasị anyị. Anyị kwesịrị inye Chineke nsọpụrụ niile nke obi anyị; site kwa n’inye aka Ya, duzie mkparịta-ụka anyị nke bụ ndụ anyị, mmekọrịta anyị, na ndị ọzọ, omume anyị, na kwa ikwu okwu anyị. Ka anyị ghara ịrapụ inye Chineke nsọpụrụ na otuto na ekele -- ezi òfùfè -- n’Ụbọchi inye-ekele; e, n’ụbọchị niile nke arọ kwa. Otù onye ekwuwo na “inye-ekele dị mma ma ibi-ndụ ekele dị mma karịa.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye ka Chineke na-akpọ ifè Ya òfùfè?
  2. Ònye ga-abụ onye aka ebé nke ga-agba kwa àmà megide ụmụ mmadụ
  3. Gịnị bụ ụdị àjà abụọ nke Chineke na-anara nkeọma?
  4. Gịnị bụ ụdị òfùfè nke Chineke na-adịghị anabata?
  5. Òlee ndị bụ ndị nsọ?
  6. Gịnị mere ịkwụghachị nkwà ekwere ji dị mkpà?
  7. Òlee ụzọ Chineke chọrọ ka anyị si fèe Ya?
  8. Òlee otú anyị pụrụ isi duzie ndụ anyị nkeọma?