Lesson 205 - Junior
Memory Verse
“Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n’anya gi onwe-gi, ma ọ bugh onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi” (I Samuel 15:17).Notes
Nrọpụta nke Chineke
Ụmụ Israel ekwesiwo olu ha ike na ha chọrọ eze ga achị ha, ka ha wee dị ka mba niile ọzọ. Nwaokoro a Chineke rọpụtara ịbụ eze bụ onye Benjamin, nwanwoke Kish onye bụ dike nke bụ dimkpà. Sọl bụ nwaokorọbịa maramma. Ọ na asọpụrụ nna ya. O nwere agụụ ime ihe dị ukwuu ọ dị kwa umeala n’obi. Asị na ọ bụ ndị ahụ rọọrọ Sọl, ná enweghị obiabụọ ha ga arọrowo yari n’ihi ụdị ya, n’ihi na Sọl toro ogologo dị kwa ike. Ná arụghịụka, Chineke rọpụtara sọl n’ihi na nime obi nke nwaokorọbịa ahụ Ọ pụrụ ịhụ ntoru dị icheiche Ọ pụrụ iji mee ihe n’ihi eze n’oge ahụ. N’ụzọ nke Chineke akpọtara ya n’iru Samuel, onye nke Chineke, onye ga ezi ozi banyere onye Chineke rọpụtara ịbụ eze.
Irubeisi
Ezigara Sọl ịchọta anụulo nke nna ya furuefu. O rubeere nna ya isi, n’ihi na ọ dịghị akpá nganga ịlụọlụ. Ụfọdụ ụmụokorọbịa ga azaworị nna ha mgbe ọ rịọrọ arịrịọ dị otú a, sị, “Enwerem àtụmàtụ ọzọ dị iche iche”; “Ka onye ọzọ jee chọta ha”; maọbụ “Gịnị mere m’ga eji lụa ọlụ ebe anyị nwere ndị na eje ozi?” Mgbe Sọl rubeere nna ya isi, ọ maghị ihe ọ bụla banyere ihe Chineke na akpadoro ya. O rubere isi n’ihi na ịhụnanya na nrubeisi dị n’obi ya n’ebe nna ya nọ. Eleghịanya Chineke agaghị arọrọwo yarị ọ bụrụ na ọ jụrụ irubere nna ya isi.
Otù Ozi
Sọl na onye ahụ na ejéozi chọrọ ọtụtụ ebe dị icheiche ma ha achọtaghị anụulo niile ahụ furuefu. N’ikpe-àzụ Sọl kpebiri ka ha laghachị ulo ka nna-ya wee ghara ịmalite ichègbu onwe ya banyere ha ebe ọ bụ na ọ dịwo anya ha gara. Onye ahụ na-eje ozi sịrị na ọ dị onye nke Chineke bi n’obodo nọ nso ebe ahụ. Ọ tụpụtara na eleghị anya Onye amụma ahụ pụrụ ịgwa ha ụzọ ha kwesịrị iso. Sọl chèrè na nke a bụ ezi ntụpụta, n’ihi nke a ha wee malite ijé chọọ Onye amụma ahụ -- maọbụ onyeọhụụzọ dịka a na akpọ ha na mgbe ochie. Mgbe ndịkom abụọ ahụ bịaruru nso obodo, ha jụrụ ajụjụ banyere Onye amụma. Agwara ha na ha bịara nnọọ n’oge na ọ na ejikere inye “àjà ndi Israel.”
Chineke Zitere
Chineke edoziwo nzute Sọl na Samuel Onye amụma. Ọ bụ ezie na ọ dị ka ihe ndaba, nzute ha bụ ihe Chineke tụpụtaworo. N’ụbọchị buteere ụbọchị ahụ ụzọ, Chineke agwawo Samuel na Ya na ezitere ya otù nwaokorọbịa onye ọ ga ete mmanụ ịbụ onye ndú ndị Israel. Ọ dị ka Sọl enweghị ọnọdụ nsọpụrụ maọbụ dị elu tupu oge a. Ọ bụ Chineke na ebuli ya ịbụ eze.
Eduziwo Sọl ịbịakute Samuel; ma mgbe o zutere onye amụma ahụ, ọ mataghị ya. Ma Samuel matara sọl, n’ihi na Chineke sịrị, “Le nwoke ahụ onye M’siri gi te manu! Onye a gēgbochi ndim n’ime ihe ọjọ.”
Mgbe Sọl jụrụ ụzọ ijeru n’ulo Onye amụma, Samuel sịrị, “Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu.” Samuel gwara sọl banyere anụulo ahụ tutu ya ajụọ ajụjụ banyere ha. Chineke enyewo Samuel ọzịzá. Samuel gwara Sọl ka o chefue ihe banyere nne ịnyịnyaibu niile ahụ nwamgbe ntà na achọtawo harị. Samuel kpọrọ Sọl ka o soro ya jee ebe ịchụàjà iri ihe, na ịnọnyere ya rue echi ya.
Obiumeala
Karịa nke a, Samuel sịrị na “ihe nile anàchọsi ike nke Israel” dịkwasị Sọl na ulo nna-ya. Ọchịchọ nke Israel bụ ka otù eze ná achị ha. Otú a agwara Sọl na arọpụtawo ya ịbụ eze ndị Israel. Sọl jiri obiumeala zaghachi. Ọ sịrị na ya sitere n’ebo Israel nke dịkarịsịrị ntakịrị na n’agbụrụ pekarịsịrị mpe. Ezigawo Sọl n’otù ozi, ịchọta nne ịnyịnyibu nna ya furuefu; ma o ji obi umeala nara ọkpụkpọ ịnọ n’ebe dị elu.
Nsọpụrụ
Samuel ji nsọpụrụ niile kwesịrị onye ga abụ eze na ọdịniru mesoo Sọl. Enyere Sọl “isi ọnọdụ n’etiti ndi akpọrọ n’oriri ahu” -- ndị ahụ ra ka iri mmadụ atọ. Akụkụ anụ ahụ kachasị mma ka adọbara n’iru ya -- apataụkwụ. N’ụzọ dị otú a, site n’inye ya ọnọdụ kachasị mma na nri kachasị mma, emesoro Sọl dịka ọbịa pụrụ ichè na onye a na asọpụrụ.
Tutu ha ararụ ụra n’abalị ahụ, Samuel kpanyeere Sọl ụka. Eleghịanya ọ gwara ya ọlụ dị icheiche dịrị ya dịka onye ọchịchị nke Israel. Náagbaghị agụgọ, Samuel ga agbaworị Sọl ume n’ọlụ nke ọ ga alụ. N’echi ya ha bilie n’isiụtụtụ. Mgbe Sọl na onye na ejere ya ozi na ala, Samuel soro ha rue ná nsọtụ obodo. Enyere onye ahụ na ejéozi iwu ka ọ na aga n’iru. Onyeamụma ahụ sịrị Sọl, “guzogide ugbu a, ka m’we me ka i nu Okwu Chineke.”
Sọl amataghị ụdị ngọzi Chineke kwadooro ya n’ụtụtụ ahụ. Sọl na Onyeamụma ahụ wee guzo n’iru Onyenwe anyị. Dịka nduzi Chineke si dị, Samuel wụkwasịrị mmanụ n’isi Sọl ité ya mmanụ. Chineke arọrọwo Sọl ịbụ onye ndú nke ihenketa Ya, Ụmụ Israel.
Ọtụtụ Mkwà
Igosi na Chineke nọnyeere Sọl, Onyeamụma ahụ nyere ya ihe-àmà atọ nke ga-emezu. Ihe-àmà niile ahụ bụ kwa nkwà. Nke mbụ, ndịkom abụọ ga agwa Sọl okwu banyere ọlụ ya: “Achọtawo nne-inyinya-ibu nke i jere ichọ.” Nke abụọ, a ga egbo mkpà nke anụarụ nke Sọl site n’aka ndịkom atọ ọ ga ezute n’ókèala Teboa: “We nye gi ogbe achicha abụa; i gānara kwa ha n’aka-ha.” Nke atọ, Sọl gaabụ onye dị ike nime mmụọ mgbe ọ ga ezute ụsụ ndị amụma n’ugwu ntakịrị nke Chineke: “Mọ nke JEHOVA gādakwasi gi n’ike, i gēsoro kwa ha bú amuma … n’ihi na Chineke nọnyere gi.”
Iguzo Duu
Mkwà niile ndịa ga abụworị óké agbamume nye Sọl. Chèta, Chineke ziteere ya mkwà niile ahụ mgbe agwara Sọl ka o guzo duu ịnụ okwu niile nke Chineke. Gịnị ka Chineke ga emere anyị ọ bụrụ na anyị èchéré n’iru Ya? O nwere ike dị ka o siri ike “iguzo duu” mgbe ụzụ na ọgbaaghara nke ụwa ná adịghị ezu ike dị anyị gburugburu. Ndị ná ekpé ekpere na atụgharị kwa uche n’iru Chineke n’ụtụtụ ná achọpụta na Ọ ga enye agbamume n’ihi ọlụ ha na inyeaka n’oge mkpà. Nwatakịrị ọ bụla ná ekpe ekpere ná agụ kwa Baịbụl tutu ya a gaa ụlọakwụkwọ ga achọpụta mkwà dị icheiche na Chineke ga anọnyere ya inye ya mmeri n’ọnwụnwa ọ bụla. Ọ bụ ihe óké urù nye anyị ịtụgharị uche na ichè échìchè banyere ihe nke Chineke -- “iguzo duu” n’iru Chineke -- n’ehihie dịka kwa n’ụtụtụ. Ngọzi na adịrị nwoke ahụ onye “n’iwu JEHOVA ka ihe-utọ-ya di; ọ bu kwa n’iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali” (Abù Ọma 1:1, 2).
Obi Ọzọ
Chineke akpọwo Sọl ịnọchi ọnọdụ dị mkpà. Chineke enyewo Sọl ụfọdụ mkwà dị ebube. Anyị agụtaghị na Sọl jiri okwuọnụ zaghachị òkù ahụ nke Chineke kpọrọ, ma n’obi ya ọ zara Chineke “E.” Òlee otú anyị si mata? Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya o wee bụrụ onye agbanwere -- “o wee ghọọ nwoke ọzọ.” Mmụọ nke Onyenwe anyị adịghị anọnyere onye ọ bụla náánị ma akpọrọ Ya chọọ kwa Ya. Chineke adịghị azọpụta onye ọ bụla náánị ma onye ahụ ọ chọrọ ka azọpụta ya. Mgbe ọ bụla Mmụọ nke Chineke batara ná ndụ mmadụ, mmehie na apụ ewee gbanwee mmadụ ahụ. Chineke nyere Sọl “obi ọzọ” -- “obi ọhụ” dịka nke Chineke kwere mkwà inye ndị Israel niile ọ bụrụ na ha chigharịkute Ya (Ezikiel 36:26, 27), “obi imaram, na Mu onwem bu JEHOVA,” nke Chineke ga enye mgbe ndị ahụ ji obi ha niile chigharịkute Ya (Jeremaia 24:7).
Otù Ụdị Mgbanwe Ahụ
Chineke na eme kwa otù ụdị mgbanwe ahụ taa; Ọ na agbanwe obi mgbe azọpụtara mmadụ. Ọ dịghị ihe dị iche dị ma onye ahụ ọ bụ nwatakịrị maọbụ okenye. Chineke na ewepụ ịhụ ihe ọjọọ na mmehie n’anya; Ọ na ewepụ agụụ nke ihe ụtọ nke ụwa. Ekworo, ịkpọasị, iwe, “omume nke anu-arụ,”na omume ọjọọ niile ná agabiga. Chineke na etinye ịhụnanya Ya nke ná akpali mmadụ ime ezi ihe na ịchọ ịmara Chineke karịa nime obi. Mgbe agbanwere obi, omume nke onye ahụ na adị iche. Ndị ọzọ ga apụ ikwu na mgbanwe nye ezi ihe ewerewo ọnọdụ.
Iheàmà niile banyere Sọl bịara ná mmezu, ndị ahụ hụkwara mgbanwe nime Sọl. Ha sịrị, “Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ di kwa n’etiti ndi-amuma?”
Enweghị Ebe Nzuzo
Sọl agwaghị ọbụná ndị èzí na ulo nke ya na etewo ya mmanụ ịbụ eze. Mgbe oge ruru, Samuel kpọkọtara Ụmụ Israel ichètara ha na ha ajụwo Chineke wee rịọ eze. Oge eruwo na ndị ahụ ga amara nrọpụta nke Chineke. Mgbe ekpugheere ndị ahụ na ọ bụ Sọl bụ nwoke ahụ, ahụghị kwa ya ebe ọ bụla. N’obi umeala ya, o zobewo onwe ya. Ma Sọl dị ogologo karịa ha niile site n’ubu rue elu isi ya, n’ihi nke a ọ gaghị adịrị ya mfé ìzó onwe ya n’etiti igwè mmadụ ahụ. Sọl ezoghị ogologo oge, n’ihi na Chineke maara ebe ọ nọ. Chineke kwuru banyere Sọl sị, “Le, onye ahu ezowo onwe-ya n’etiti ihe.” Akpọtara Sọl; Samuel wee gosi ya n’iru ndị ahụ dịka eze ha. Ndị ahụ wee tụọ óké ụzụ.
Sọl wee laghachị n’ụlọ ya, ndịkom ụfọdụ na erubeisi so kwa ya. Ka anyị na amụ ihe banyere eze mbụ nke Israel, ka anyị tinye nke a n’obi na enyere ya óké ohere na nsọpụrụ a mgbe ọ bụ nwoke nwere obiumeala nke ukwuu.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee ebo nke Israel ka Sọl sitere?
- Òlee ozi dị umeala ezigara ya?
- Ònye ka Sọl jekuuru?
- Gịnị ka Samuel meere Sọl?
- Òlee mkwà dị icheiche ekwere Sọl?
- Òlee otú Sọl si gosipụta obi umeala ya?
- Gịnị na eme mgbe Mmụọ Chineke batara nime obi mmadụ?
- Gịnị kpatara ndị ahụ ji jụọ ma Sọl ọbụ otù onye nime ndị amụma?