I Samuel 11:14, 15; 12:1-25

Lesson 206 - Junior

Memory Verse
“I nwawo obim; … I nuchawom, ma I digh-achọputa ihe” (Abù Ọma 17:3).
Notes

Óké Ọñụ n’Israel

Óké iñụrị ọñụ dị n’etiti ndị Israel. Étéwo eze ha mmanụ; n’ule mbụ elekwara ya o gosiwo onwe ya dịka dike na onye pụkwara ịchịkọta na iduzi óké ụsụ ndị-agha. Chineke enyewo ya mmeri n’ebe ụmụ Amon nọ; ndị Israel pụkwara ịna atụgharị ya n’uche ha na ọdịniru ha ga adị mma ọ bụrụ na Sọl abụrụ onye ndú ha. N’ezie Sọl bụ ihe niile ha chọworo dịka eze.

Otú ọ dị, ọñụ ahụ esiteghị na Chineke. Ha nwere obi ụtọ n’ihi na ha na eme ihe dị ha mma. N’ọdịniru ha ga ahụ ihe ga eme ka ha kwáá m’makwaara n’ihi uche nke ha ahụ.

Ime Eze

Oge eruwo ugbu a na ọchịchị Sọl ga amalite, Samuel wee kpọọ ndị ahụ niile òkù bịarue Gilgal maka ime eze ahụ. N’ebe ahụ n’iru Jehova, na n’etiti àjà na onyinye dị icheiche, emere Sọl eze Israel. “Ndikom nile nke Israel we ñuria ọñu nke-uku n’ebe ahu.”

Mgbe emesịrị eze, Samuel wee kwueokwu dị mkpà. O chetaara ụmụ Israel na ha enwewo eze ugbu a n’ihi na ha rịọrọ maka ya, ọ bụghị kwa n’ihi na ọ bụ uche Chineke, na ihe ọjọọ ọ bụla nke ga adakwasị kwa ha site n’ọchịchị ahụ ga abụ ihe ha wetaara onwe ha. N’iji tụnyere ya, ọ gwara ha na ya chịrị ha n’irube-isi n’uche Chineke. O jegharịwo n’etiti ha ụbọchị ndụ ya niile ọ dịghị kwa ihe ọ bụla o mere ọ na-ezonarị ha. Site na mgbe ọ bụ nwata o tinyewo ndụ ya n’ime ihe ga atọ Chineke ụtọ na inyere ụmụmmadụ aka.

Ugbu a ndụ ya na abịaru n’ọgwụgwụ, ọ gwara ndị ahụ ka ha kpee ya ikpe. Ò werewo ihe onye ọ bụla dịka onye ọchịchị nwere ike ime otú ahụ? Ọ narawo ihe mgbapụta n’aka onye ọ bụla ka e wee nápụta ya n’ikpé? Ọ dịghị mgbe ọ chọrọ ihe ọ bụla ha nwere, ọ kpagbughị kwa ha n’ụzọ ọ bụla. Ndị Israel hà ga agba àmà na ọ bụ onye eziokwu na onye ezi omume mgbe niile ahụ? Ndị ahụ kweere na Samuel bụ onye kwesịrị ntụkwasịobi dịka o kwuru. Ha enweghị ihe ọ bụla ikwugide ụzọ o si chịa ha.

Ọ bụghị náánị ndị ahụ ka Samuel sịrị ka ha kpee ọlụ ya ikpé, kama ọ rịọkwara Chineke, onye ná ahụ échìchè niile na ihe niile dị n’obi, ka Ọ bụrụ onyeàmà na ya emewo ihe ziriezi mgbe niile. Ihe mbụ dịworo n’obi Samuel bụ ime ihe gaatọ Chineke ụtọ. N’Okwu ahụ anyị na agụ: “Ọ digh ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo di nime JEHOVA, bú Chineke-ayi” (2 Ihe Emere 19:7). Chineke chọkwara ka ụmụ Ya dị ka Ya n’ebe a, mgbe anyị na ebi ndụ nime ụwa nke a. Ọ bụrụ na anyị rịọ Ya, Chineke ga enye anyị ike ibi ndụ ezi omume dịka Samuel bịrị, ka onye ọ bụla wee ghara ịchọpụta mkpesa eziokwu ọ bụla megide anyị ịchọta ntụpọ ọ bula n’ihe anyị na eme.

Odudu nke Chineke

Ọzọ, Samuel gwara ndị Israel ka ha tụlee akụkọ ochie ha. Ọ bụ Chineke bụ onye welitere Moses na Eron idú ndị bụ nna ha ochie pụta n’agbụ nke Ijipt. Ọ bụ kwa Jehova bụ onye nyere ha uwe nye kwa ha iheoriri ha riri n’iri arọ anọ ahụ ha wagharịrị n’ọzara. Ma mgbe Israel mehiere, Chineke n’ikwesị ntụkwasịobi Ya kwere ka ahụhụ dakwasị ha igosi ha na ha emehiewo. Ọ lụwo agha ha, duba kwa ha n’ezi ala ahụ.

Ugbu a Samuel jụrụ ndị Israel ọ bụrụ na ha apụghị ịhụta na ọ bụ náánị otù Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile dị, náánị otù Chineke onye hụrụ ezi omume n’anya, onye nwekwara ebere na ọmiko n’ebe ndị Ya nọ. Òlee chi ọzọ ga apụworị idú úsù mmadụ ra otú a dịka Chineke duworo ndị Israel?

Chineke ewelitewo ndị ikpé ịchị ndị Israel mgbe ha nọ ná mkpà. Chineke arọpụtawo ndị ọchị agha ndị pụrụ iduru ndị agha ha rue na mmeri doro anya. Ihe niile a ka Chineke mewooro ndị Ya n’ihi na Ọ hụrụ ha n’anya na n’ihi ọgbụgbandụ Ya na Abraham.

Enweghị Obi Ekele

Ndị Israel hà nwere obiekele? É-è, ha agbakutawo Onye ndú ha nke eluigwe àzụ wee rịọ kwa n’anya-ike ka enye ha eze. “Ma ugbu a”, ka Samuel sịrị, “Le eze nke unu rọpụtaworo, onye unu riọrọm n’aka!” Ọ chọrọ ka ha mata na ya enweghị òkè ọ bụla n’ịrịọ eze ahụ.

Moses, n’onwe ya kwa, nwere mgbe ọ bára Ụmụ Israel mbá n’ihi omume enweghị ekele a. Otù mgbe ọ jụrụ ajụjụ sị “Ùnu nēnyeghachi JEHOVA otú a, unu ndi-nzuzu ndi nāmagh ihe? Ọ bugh Ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi? Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike” (Deuteronomi 32:6).

Anyị na emere ndị nne na nna ebere, ndị n’oge nke ha, ụmụ ha na arapụ ha, ụmụ ha jiworo n’ihi ha lụsie ọlụ ike, rapụ ọtụtụ ihe, gosi kwa ịhụnanya niile. Ma òlee ihe banyere ịjụ Nna anyị nke Eluigwe Onye meere anyị ihe niile anyị nyere Ya ohere ime? Otù mgbe Ọ kpọrọ ndị Israel ubivine Ya, wee jụa: “Kpenu ikpe n’etiti mu na ubi-vine nkem. Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m’nēmegh ya? (Aisaia 5:3, 4). Gịnị ọzọ ka Chineke ga emere anyị ime ka anyị jikere ịbà n’Eluigwe? O zitere otù Ọkpara Ọ mụrụ náánị Ya ịnwụ n’ihi anyị; Jisọs nyekwara ihe O nwere, buru kwa mmehie anyị niile na Kalvari, ka ewee zọpụta anyị. O zitewo Mmụọ Nsọ nime ụwa ịrịọ anyị ịbata n’Alaeze Chineke, na iduru anyị bàà n’eziokwu niile. Gịnị ọzọ ka Ọ ga eme? Ànyị ghọtara omimi nke ịhụnanya na àjà Ya?

Ọlụ Nke Eze

Samuel nyere ndị Israel olileanya ntakịrị. Ọ bụrụ na ndị ahụ na eze ha ga erubeisi n’iwu niile nke Chineke, Ọ ga agọzi kwa ha mee kwa ka ihe gaara ha nkeọma. Ọ bụrụ na eze ga atụ egwù Chineke, ọ ga anata amamihe iji chịa nkeọma na ime ka obi dị ndị nọ n’okpuru ya mma.

Chineke matara na Israel ga achọ eze, O wee gwa Moses ka o dee ọlụ nke eze dị otú a n’akwụkwọ. Nke a bụ ihe Moses dere: “Ọ gēru kwa, mgbe ọ nānọkwasi n’oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n’akwụkwọ, site n’akwukwọ ahu nke di n’iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai: ọ gādi n’aka-ya, ọ gāgu kwa ihe di nime ya ubọchi nile nke ndu-ya: ka o we muta itu egwù JEHOVA, bú Chineke-ya, idebe okwu nile nke iwu a na ukpuru ndia, ime ha; ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n’ihe enyere n’iwu wezuga onwe-ya, n’aka-nri, ma-ọbu n’aka-ekpe” (Deuteronomi 17:18-20).

Mmiriòzùzò n’Ọkọchi

Samuel enyewo ha ihe ngosi buruibu ime ka ndị ahụ mara na Chineke nke Eluigwe náánị Ya bụ Chineke, ma o nyekwara otù iheàmà ọzọ. Ọ bụ oge obibi ọkà wheat mgbe mmiri ná adịghị ezo na Palestain. Ma ugbu a Samuel sịrị, “M’gākpọku JEHOVA, O gēnye kwa égbè eluigwe na miri ozuzo.” Nke a bụ igosi ndị Israel nzuzu ha n’ịjụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile onye ná achi ọbụná ihe ekèrè ekè, wee rịọ ka enye ha mmadụ efu ịchị ha. Chineke zárà ekpere Samuel wee zite égbè eluigwe na mmiriòzùzò. Egwù tụrụ ndị ahụ nke ukwuu na ha chèrè na ha ga anwụ. Akọnauche ha nwere ihe mgbu n’ihi nnupụisi ha mgbe ọ dị ka ikpé na adakwasị ha.

Ndị Israel tikuru Samuel: “Kpere JEHOVA, bú Chineke-gi, ekpere banyere ndi-orù-gi.” Ha nábatara na ha emewo ihe jọrọ njọ n’ịrịọ ka enye ha eze, ha wee chọọ ka Samuel nọchie n’etiti ha na Chineke iwé na ewé. Samuel wee mee ka o doo ha anya na Chineke agaghị ebibi ha.

N’eziokwu ọ tọghị Chineke ụtọ na ha rịọrọ ka enye ha eze; ma ugbu a, emewooro ha eze, Chineke ga emekwara ha ezi ihe ọzọ ọ bụrụ na ha ga erubere Ya isi n’ọdịniru. Ụwa niile na ele anya ọ ganiru nke ndị Israel, ebe ha matara na ha bụ ndị nke Chineke rọpụtara; n’ihi nke a, n’ihi otuto na nsọpụrụ nke Onwe ya, Ọ ga agọzi ha mgbe ọ bụla nke a kwere omume. Ma ahụhụ dịrị ha ọ bụrụ na ha enupụisi ọzọ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Israel si nábata eze ha?
  2. Òlee otú Samuel siworo chịa Israel?
  3. Gịnị ka ndị ahụ kwuru banyere ọchịchị nke Samuel?
  4. Gịnị kpatara ndị Israel ji chọọ eze karịa onye ndú dị ka Samuel?
  5. Gịnị ka Samuel gwara ndị Israel nke gosịrị na Chineke nọnyeere ha na mgbe garaaga?
  6. Òlee iheàmà Samuel nyere igosi na Chineke na aña ntị n’arịrịọ ha niile?
  7. . Gịnị bụ ụfọdụ iwu ahụ nke Chineke gwara Moses na eze ga ede n’akwụkwọ, ka ndị eze ná esoro?

  8. Gịnị kpatara Chineke ga eji gọzie Israel ọbụná na ọ bụ ezie na o nwere eze?