I Samuel 13:5-14; 15:1-35

Lesson 207 - Junior

Memory Verse
“Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iña nti di nma kari abuba ebulu” (I Samuel 15:22).
Notes

Mbuso Agha nke Ndị Filistia

Eze Sọl chịrị nnọọ nkeọma rue ihe ra ka otù arọ, afọ jukwara Israel niile. Ma n’arọ nke abụọ nsogbu bịara. Ndị Filistia, ndị iro Israel, chịkọtara úsụ ndị agha ruru puku ụgbọ ala iri atọ (30,000), puku ndị ịnyịnya isii (6,000), na ìgwè ndị agha ji ụkwụ a na apụghị ịgụta ọnụ maọbụ kwa ịlụso ha agha. Gịnị ka ndị Israel pụrụ ime izute ndị iro ra otú a? Ọ bụ ezie na ndị ahụ nwere ọbụná eze ha chọrọ, iduru ha gaa n’agha, ụjọ tụrụ ha, ha wee zoo onwe ha n’ọhịa ogwu na n’ọgba. Lee otú ọ ga adị mma karịa ọ bụrụ na ha tụkwasịrị Chineke obi.

Chineke ekwewo mkwà na Ya ga enyere eze Israel aka ọ bụrụ na ndị Ya niile ga eje ijè ná nleruanya n’iru Ya. Samuel gara n’iru n’ịchụrụ ha àjà na ikuzikwara ha uche Chineke, ha agbalịwo kwa irubeisi. Ugbu a ndị Filistia na abịa imegide Israel, ọ dị óké mkpà na aga achụ àjà kpee kwa ekpere maka inyeaka nke Chineke, Eze Sọl na ndị agha ya zukọtakwara na Gilgal ebe Samuel ga abịa ịrịọchitere ha arịrịọ.

Enweghị Ndidi

Samuel ekwewo mkwà na ya gaabịa n’etiti ụbọchị asaa, ma mgbe o cheere rue ụbọchị ikpe-àzụ, ndị-agha ahụ dara mbà n’obi, ụfọdụ lakwara n’ulo ha. Sọl atụkwasịghị Chineke obi ịlụpụta ihe niile banyere nsogbu ahụ n’ọdịmma nke ndị Israel; mgbe ọ hụkwara ndị agha ya ka ha na adị ala ala o kpebiri ime ihe n’onwe ya. Kama ìchérè Samuel ịchụ àjà ahụ, Sọl tụkwasịrị ya onwe-ya ịlụ ọlụ nke onye nchụàjà.

Ngwangwa ọ chụbiri àjà Samuel wee bịa. Ọ pụrụ inwe mmetụta nnupụisi nke Sọl, o wee jụọ, “Gini ka i meworo?” Sọl wee malite ime ngọpụ dị icheiche: ndị Filistia ejikerewo ịlụso ha ọgụ, ndị agha ya na ala kwa; Samuel abịaghị n’oge, n’ihi ya Sọl wee jisie onwe ya ike ime ihe o chèrè na ọ dị mkpà ijikere ndị agha ya maka agha.

Ọ bịaghị Na Azụ Oge

Nke a bụ ọlụ Chineke, Ọ makwaara otú oge o nwere ra. Ọ dịghị kwa mkpà na Sọl ga enye onwe ya nsogbu ọ bụrụ na ọ tụkwasịrị obi n’amamihe nke Chineke. Chineke agaghịri eledawo Sọl anya kama Ọ gara ịlụworo ha ọgụ mgbe oge ka riri nne. Lee otú mmadụ ná adịghị enwe ntachịobi mgbe niile ọ na échéré Chineke -- ma ọ dịghị mgbe oge na aganarị Ya!

Jisọs kuziiri ndị ná eso ụzọ Ya otù iheọmụmụ a mgbe akpọrọ Ya ka Ọ bịa gwọọ Lazarọs “Ya mere mgbe Ọ nuru na aru-ya adigh ike, mgbe ahụ Ọ nọgidere ubọchi abua n’ebe Ọ nọ” (Jọn 11:6). Eleghịanya ọ ga ejuworị ndị ná eso ụzọ Ya anya ihe kpatara na Ọ gaghị otù mgbe ahụ, n’ihi na Lazarọs pụrụ ịnwụ tutu Ya ejerue.

Lazarọs nwụrụ n’ezie tutu Jisọs erue, ma oge aganarịghị Onyenwe anyị ime ihe Ọ chọrọ ime. Jisọs chọrọ ịlụ ọlụebube n’ihi otuto nke Chineke, nke ga akuziri ụmụmmadụ na Ọ bụ Mmalite nke ndụ, Ya onwe ya bụ mbiliten’ọnwụ site ná ndị nwụrụanwụ. O gosịrị na Ya pụrụ ime ka onye nwụrụanwụ n’anụarụ na kwa onye nwụrụanwụ nime mmụọ dị ndụ ọzọ. Ọ kpachara anya bịa mgbe ụmụmmadụ chèrè na oge agasịwo.

Atụfuru Ihe Nketa Ahụ

Eleghịanya Samuel kpachara-anya chéré, ịhụ ihe Sọl ga eme. Ime ngwangwa nzuzu nke Sọl wutere ya nke ukwuu, Ọ hụrụ Sọl n’anya dịka onye etere mmanụ nke Chineke, Sọl amalitewo kwa ọchịchị ya nkeọma. Gịnị mere o jiworo si n’iwu nke Chineke chigharịa ngwangwa? Ọ bụrụ na o kwesịrị ntụkwasịobi Chineke garaeme ka alaeze ya guzosieike rue ebighịebi. Nwa ya nwoke gara abụ kwa eze, emesịa nwa nwa ya esote, ọ gara esi kwa otú a gbadaa n’ọgbọ niile rue mgbe aga amụ Jisọs ime èzí na ulo ha ịbụ Eze nke mgbe ebighịebi.

Chèè échìchè ihe otù nupụisi furu Sọl. O jidere alaeze ahụ n’ezie n’oge ndụ ya, ma site n’omume nke nrọrọ onwe onye ahụ o mere, ekewapụrụ èzí na ulo ya site n’ịbụ eze n’Israel. Atufukwara olileanya nke ịmụ Mesaia site n’èzí na ulo ha mgbe ebighịebi.

Otù Nwoke Dịka Obi Chineke Si Chọọ

Samuel sịrị Sọl: “Ugbu a ala-eze-gi agagh eguzosi ike: JEHOVA achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, JEHOVA enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-ya, n’ihi na i debegh ihe ahu nke JEHOVA nyere gi n’iwu.”

Ohere Ọzọ

Ụbọchị ọzọ bịara mgbe Sọl nwere idozi ekwesịghị ntụkwasịobi ya ahụ. Chineke nyere ya otù ọlụ dị ukwuu ka ọ lụọ. Ihe niile Chineke na enye anyị mee dị mkpà, ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịhụta ihe dị ukwuu ikwesị ntụkwasịobi anyị ga alụpụta n’ọdịniru site n’ihe ahụ ga adị anyị ka ọlụ dịkarịrị ntà.

Ezigara Sọl na ndị agha Israel ijé bibie ndị Amalek. Ọ bụghị otù ndọlị efu nke ha na ndị agbataobi ná ekpere arụsị ndị nwere ike inye ha nsogbu. Ọ bụ ikpé nke Chineke megide otù mbà nke mere ka ọtụtụ nsogbu dakwasị ndị nke Chineke ihe ra ka narị arọ anọ (400) garaaga.

Mgbe ndị Israel pụtaworo n’Ijipt ndị Amalek bịakwasịrị ha site n’àzụ wee bibie ndị ike gwụworo ná ala kwa àzụ n’usoro ahụ.

Chineke ahụwo omume ọjọọ nke ndị Amalek ahụ, wee gwa Moses ka o dee ya n’akwụkwọ ka ndị Israel wee ghara ichèfu ya. O wee tụkwasị kwa, “M’gēhichapusi ncheta Amalek n’okpuru elu-igwe” (Ọpupu 17:14). Mgbe Moses na enye Israel ndụmọdụ ikpeàzụ ya ọ sịrị: “Cheta ihe Amalek mere gi n’uzọ, mgbe unu siri n’Ijipt puta: otú o zutere gi n’uzọ, tigbue ndi-ikpe-azu n’etiti gi, ndi nile nādigh ike n’azu gi, mgbe gi onwe-gi nāda mbà, mgbe ike gwu-kwa-ra gi; ma ọ tugh egwu Chineke. Ọ gēru kwa, mgbe JEHOVA, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n’aka ndi-iro-gi gburugburu, zuru ike, n’ala nke JEHOVA, bú Chineke-gi, nēnye gi n’ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n’okpuru elu-igwe; echezọla” (Deuteronomi 25:17-19).

Ndị Amalek nweworo ohere arọ niile ahụ ichègharị na ịtụ egwù Chineke, ma ha échègharịghị. Ugbu a, Chineke na eziga Sọl iweta ikpé n’ebe ndị Amalek nọ. Sọl nwere ohere ibibi mmehie ekpokọtaworo narị arọ anọ (400) -- ma o meghị ya.

Ile Mmadụ Anya N’iru

Sọl na ndị agha ya malitere ibibi ndị Amalek, dịka enyere ha iwu; ma ọtụtụ atụrụ na ehi mara mma dị n’ebe ahụ na Sọl kpebiri na ọ bụ ihe ihere ibibi ha niile, o wee zọpụta ndị kachasị mma ná ndụ. Egag bụ eze nọ kwa n’ebe ahụ, onye dị mkpà, eleghịanya o nwere àkụ riri nne, sọl wee gosi ya ebere. Chineke agwawo ha ịlụso ndị iro a agha rue mgbe “ewezugara” ha niile bibie kwa ha. Egag bụ otù onye nime ndị mmehie ahụ, o so kwa n’amamikpe ahụ.

Nime Okwu Chineke anyị na agụ sị: “Ọ buru na unu ele madu anya n’iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n’ihi na iwu ahu nātu unu nmehie unu n’anya dika ndi-njehie. N’ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n’otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara” (Jemes 2:9, 10). Dịka ihe banyere irubere Chineke isi si dị, aga asị na Sọl egbughị onye ọ bụla ebe ọ rapụrụ eze ahụ ndụ. O lewo mmadụ anya n’iru, o mejọwo kwa ma eleghị-anya n’otù ụzọ a; ma nke a o gosịrị ya dịka gịnị? Okwu Chineke na ekwuwa na “ikpe iwu ahu nile mara” ya. Ikpé mara ya dịka o mebiri iwu ahụ niile.

Ihe Ngọpụ dị icheiche

Chineke gwara Samuel banyere nupụisi nke Sọl, Samuel wee nwee mwute nke ukwuu na ọ kwárá ákwá kpee kwa ekpere ogologo abalị ahụ niile. Mgbe o jere izute ndị agha ahụ ná alata n’ụtụtụ, okwu mbụ Sọl gwara Samuel bụ, “Emewom ka okwu JEHOVA guzosie ike.” Ọ maara nkeọma karịa, ọ matara na ya emezughị uche niile nke Chineke, ma ọ gbalịrị ime ka Samuel chèè na ya erubeworo Jehova isi n’ikwesị ntụkwasịobi.

Ọtụtụ mgbe anyị na ahụ ndị daghachiworo àzụ ndị rapụrụ irubere Chineke isi n’ihe niile, ma otú ọ dị, ha na aga n’iru n’ikwu na ha bụ ndị Kraist ná agbalị kwa igosịpụta na ha na eme uche Chineke. Ma otù ihe ahụ nke kọrọ ha emewo ka Mmụọ Chineke si n’ebe ha nọ wezuga onwe ya, ikpé makwara ha dịka onye mmehie ọ bụla nke ná egosibeghị onwe ya mgbe ọ bụla dịka onye na efè Chineke.

Ọ bụrụ na Sọl erubewo isi n’iwu Chineke, dịka o kwuru, gịnị bụ kwa olu nke atụrụ na igwè ehi nke Samuel nụrụ? Ọ bụrụ na onye ahụ daghachịrị àzụ na eme uche Chineke, gịnị mere anyị na ahụ ihe ụfọdụ ná ndụ ya nke ná adịghị egosi Kraist? Ọ bụ ihe a na apụghị ime ibindụ rue ógó nkuzi nke Baịbụl náánị ma anyị nwere Mmụọ Chineke nime anyị. Ọ bụrụ kwa na Mmụọ ahụ ewezugawo onwe ya site n’otù nnupụisi, ọlụ niile nke ekwensu gaamalite igosi onwe ha mgbe ná adịghị anya. Eze Egag na igwe ehi na atụrụ nọ n’iru Samuel igosi na Sọl erubeghị isi n’iwu nke Chineke.

Sọl gbalịrị ugbò abụọ ịgwá Samuel na ọ bụ ndị ahụ kwatara ihe mkwata. Mgbe ejidere ya ná mmehie ya ọ chọrọ ịtụkwasị onye ọzọ ịtaụta ya. Emesịa ọ nwaa ikwu na ọ bụ n’ihi ezi ihe -- ịchụrụ Jehova àjà. Ma ọ baghị urù inye ụdị ngọpụ ahụ. Chineke chọrọ irubeisi karịa ihe niile “Ige nti di nma kari ichu àjà, iña nti di nma kari abuba ebulu.”

Ihere Emenyere Sọl

N’ikpeàzụ Sọl kwenyere na ya emehiewo, ma o chègharịghị. Ọ rịọrọ Samuel ka o soro ya laghachị ịchụrụ Jehove àjà, ka ndị ahụ wee ghara ịmata na ọ nọ n’ihe ihere.

Ọ dịghị ikwenyere ihe ọjọọ dị nime Samuel. O jikeere ibibi ihe ọ bụla bụ mmehie. Ọ kpọrọ Eze Egag wee gbukasịa ya, ná enye ya ikpé zuruókè nke Chineke tụpụtawooro ya.

Ọ bụ ezie na Samuel ahụwo Sọl n’anya, rue kwa uju n’ihi ọjụjụ ajụrụ ya, otú ọ dị, o tinyeghị kwa aka n’ọchịchị ya. Samuel meere Sọl ebere dịka onye daghachiworo àzụ, kpee kwara ya ekpere; ma Samuel ejeghị kwa hụ Sọl ọzọ n’oge ndụ ya niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Israel ji nwee eze?
  2. Òlee otú ọ dịrị ndị ahụ mgbe ndị Filistia bịara ibuso ha agha?
  3. Gịnị ka Sọl mere mgbe Samuel ná abịarughị Gilgal ngwangwa?
  4. Gịnị bụ okwu amamikpé Samuel gwara ya n’ihi omume nzuzu ya ahụ?
  5. Gịnị ka Chineke ga enyeworị Sọl ọ bụrụ na o kwesịrị ntụkwasịobi?
  6. Gịnị bụ ohere ọzọ Sọl nwere imezu iwu Chineke?
  7. Òlee otú Sọl ji mezue iwu niile nke Chineke nkeọma?
  8. Gịnị bụ ihe ngọpụ dị icheiche o mere?
  9. Gịnị bụ okwu amamikpe ọzọ Samuel gwara Sọl?